Etu mmemme “Christ The King” si aga n’Enugwu
Ndị ụka katọliki n’ụwa nille na-eme emume ncheta “Christ The King” ụbọchi Jeso bụ eze.
Mmemme ahụ bụ oge ndị ụkọchukwu, ndị echiri echichi na ndị ụka na-eburu ahụ Jeso kwuọ n’ahịrị n’ahịrị iji gosi na ha kwetara na Jeso bụ eze.
N’Enugwu steeti, parish nille nọ n’okpuru Enugwu katọlik dayọsis nke gụnyere Holyghost cathedral, Christ The King GRA, ST. Mulumba New Haven, St Michael Asata, Blessed sacrament Parish Indp. Layout, Holy Trinity parish Indpendence Layout na imirikiti ndị ọzọ gbakọrọ n'Ogige Okpara Square n’ekpere na ịgba egwu.
Bishop Callistus Onaga gwara ndị mmadụ gbakọrọ ka ha na-ekwuputa na Jesus bụ eze ụbọchi niile nke ndụ ha.