Ndị ekperima egbuola onye nkuzi, tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị 25 na Kebbi
Ndị ekperima bu egbe egbuola osote onyeisi ụlọakwụkwọ ma tọọrọ o pekata mpe ụmụakwụkwọ 25 na-agụ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ụmụ nwaanyị dị na Kebbi steeti, dịka ndị uweojii siri kwuo.
Ndị ekperima ahụ wakporo ụlọakwụkwọ 'Government Girls Comprehensive Secondary School' dị nan Maga, Kebbi Steeti n' ebe Elekere anọ ụtụtụ Monde.
Ndị omekome ahụ na ndi uweojii nọ ọrụ kwarịtara mgbọ tupu ndị ekperima ahụ wụọ aja ngwuru ụlọakwụkwọ ahụ nwụchie ụmụakwụkwọ nọ n'ebe obibi ụmụakwụkwọ, dịke ozi ndị uweojii siri kwuo.
Ndị obodo ahụ gwara BBC na ndị ekperima ahụ kpọr ọụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ahụ baa ọhịa.