Mwakpo abụọ mere na Borno steeti n'Ugwu Naijiria na abalị ole na ole ebutela egwyu na ịtụ uche na he Gọọmentị kwuru na ha akwaaala nku ndị Boko Haram na Naijiria.
O pekata mpe mmadụ 18 nwụrụ dịka ụmụnwaanyị mere mwakpo n'obodo Gwoza dị na Maiduguri, isiobodo Borno bụ akwụ ndị Boko Haram.
Nke abụ nke ugboro atọ n'ọnwa Anọ ndị Boko Haram gbara ogbunigwe gburu mmadụ ma merụọ ọtụtụ arụ.
Mwakpoo ndịa mere na nsonso a mere ọtụtụ na-ajụ ma ndị agha Jihad nwogharị ma kpawakwa ike ọzọ.
Ọkụ ndị inyom ahụ gara agwa ọkụ na nsonso a mere ọtụtụ ji ajụ ma ndị Boko Haram achọrọ iji ụmụnwaanyị akpa ike.
BBC Hausa lere anya n'etu Boko Haram si eme mwakpo ma tulekwa uche ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa.
Mwakpo Boko Haram pụtara ihe n'anya ụwa n'afọ Eprelu afọ 2014 oge ndịagha nnupuisi jihad tọọrọ 276 n'ụlọakwụkwọ n'obodo Chibok, nso Gwoza.
Ihe karịị ụmụaka 100 ka bụ ihe a na-achọ achọ.
Ka a tọchara ụmaka ụmụnwaanyị ahụ, otu ahụ mekwara amwakpo ọzọ n'ọnwa Juun bụ nke ha ji nwaanyị mmee ka ọ gachara afọ atọ ha gbara ogbunuigwe mbụ ha.
Kemgbe ahụ, kepukepu na-efegharị na-ekwu na ọ bụ ụmụnwaanyị ndị Chibok a tọọrọ ka ndị Boko Haram jizi agba ogbunigwe.
Kemgbe ahụ atụmatụ ijji ụmụnwaanyị esunye ụlọ ọkụ mabụ etinye ọgbunigwe arịala elu.
Akụkọ gosiri na ha kacha eji ụmụnwaanyị agba ogbunigwe karịa ndị agha nnupuisi ndị ọzọ enwerela.
O nweghị ụzọ e nwere ike isi kọwaa ihe mere na Ndị Boko Haram na-eji ụmụnwaanyị agba ogbunigwe maọbụ ịkpa arụ iyi ndụ egwu karuiia na ikekwe, ọ bụ n'ihi ejiji akwa mwuda n'esi n'isi rue n'ụkwụ ha kpọrọ 'hijab' nke mere ka ọ na-adịrị ha mfe izo ogbuniigwe.
Ụmụnwaanyị enweghị uwe, anaghịkwanụ ajụkarị ha ajụjụ maọbụ nyochaa ha etu e si enyocha ụmụnwoke.
Ngụkọ e mere na nsonso a gosiri na ụmụnwaanyị mere ihe karịị ọkara mwakpo Boko Haram merela.