Ihe ruru
mmadụ iri ise anwụọla mgbe ala zere na mpaghara Ndịda Ethiopia dịka ndị ọrụ gọomentị
si kwuo.
Ọdachi a
mere na mgbede ụbọchị Sọnde na ụtụtụ ụbọchị Mọnde dịka oke mmiri zochara na
mpaghara Gofa dị n’ugwu.
Ndị ọrụ nchekwa
ọdịnala kwuru na a na-agbasi mbọ ike ịchọpụta ndị nwụrụ na ndị o metụtara, na ọnụọgụgụ
ndị nwụrụ anwụ nwereike ịgbagokwu elu.
Ihe onyonyo
gosiri ka ọtụrụ narị ndị mmadụ gbakọtara n’ebe ihe a mere ma na-egwu atịtị
na-achọ ndị mmadụ tọrọ n’ime ala.
N’akụkụ ya,
ka a na-ahụta ugwu dara ada nakwa aja ụrọ bọpụtara n’ala.
Meskir
Mitku, bụ onyeisi ọrụ mpaghara Gofa, kwuru na ụmụaka, ụmụnwaanyị na ndị uweojii
so n’ime ndị ihe a metụtara.
“E nwere oke
mmiri ozuzu n’abalị ụbọchị Sọnde, ụfọdụ mmadụ nwụrụ site n’ala mbuze,” ọnụ
na-ekwuru gọọmentị na mpaghara Gofa bụ Kassahun Abayneh kwuru.
N’ụtụtụ Mọnde
mgbe ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii gbakọtara ịzọpụta ndị mmadụ mana mbuzo ọ mere
n’ihe dịka elekere 07:00 nke ụtụtụ ma gbuo ndị ahụ gbakọtara ebe ahụ.”
Gofa so n’otu
n’ebe ndị mejupụtara Ndịda Ethiopia ji kilomita 320 dị nso na mpaghara Addis
Ababa bụ isi obodo ahụ.
Ndịda Ethiopia
so n’otu n’ime mpaghara ebe oke mmiri kpara ike nso nso a, gụnyere idemmiri dịka
ụlọọrụ otu United Nations si kwuo.
Nke a abụghị
mbụ ala mbuze na-eme ebe ahụ, ihe ruru mmadụ iri ise nwụrụ n’afọ 2016 mgbe
mmiri ozuzu, idemmiri nakwa ala mbuze mere n’ebe ahụ.