You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Egbuola nnukwu onyendu Hamas, Ismail Haniyeh n’Iran

Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụwa n'ọnwa Julaị 2024

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu

  1. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Anyị na-asị unu abọọla chi?

    Daalụ maka ị nọnyere anyị n'ụbọchị taa n'ọgbakọ BBC Igbo.

  2. Onyeisiala Tinubu na ndịọrụ enweela nkwekọrịta ka ụgwọ opekatampe bụrụ N70,000

    Onyeisiala Bola Tinubu na ekwetala ịkwụ ndịọrụ puku naịra asaa (N70,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe.

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Mohammed Idris kwupụtara nkwekọrịta a na ngwụcha ọgbakọ onyeisiala Tinubu na otu jikọrọ ndịọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) were n’obi ọchịchị dị n’Abuja taa Julaị 18, 2024.

    Idris mere ka a mata na onyeisiala Tinubu gara n’ihu kwe ndịọrụ nkwa na ya ga na-ebuli ụgwọọnwa opekatempe ndịọrụ kwa afọ atọ ọbụla.

  3. Ndị uweojii Kenya amachiela ime ngaharịiwe n'isi obodo mba ahụ

    Ndị uweojii na Kenya amachiela ime ngaharịiwe n’isi obodo ha bụ Naịrobi nakwa mpaghara niile gbara ya gburugburu.

    Ndị uweoji na-ekwu na ha enweghizi ike ichekwa ndị na-eme ngaharịiwe ahụ.

    Mmachị ahụ a machịrị ngaharịiwe mere n'otu ọnwa kamgbe ndị na-eto eto bidoro ime ngaharịiwe bụ nke tarala isi ọtụtụ mmadụ. Ma na-agbanyeghị nke a, ndị ntoroọbịa ka chọrọ ime ngaharịiwe ọzọ taa.

    Nairobi bụ ebe kpụụ ọkụ n’ọnụ mana ngaharịiwe na-aga n’ịhụ na mpaghara ndị ọzọ na Kenya.

    O bidoro n'oge ndị ntoroọbịa kpọrọ oku ka a kwụsị atụmatụ ụtụịsị gọọmenti ha weputara, mana ka gọọmenti kwụsịrị atụmatụ ahụ, ha bidoro na-akpọ oku ka Onyeisiala ha bụ William Ruto rịtuo n’ọkwa.

    Ndị na-eme ngaharịiwe gbakọrọ n'ebe a kpọrọ Uhuru Park, ha sị ebe ahụ gaa n'obi gọọmentị.

    Ndị mmadụ na-akatọ mmachị a machịrị ngagarịiwe ma na-ekwu na ndị Kenya nwere ikike ime ngaharịiwe.

    Ka ọnọdụ sị dị ugbua, ndị uweoji juputara n’igwe na Nairobi maka na ha na-atụ anya na a ga-enwe ngaharịiwe.

    Onye nọ n'ọkwa dịka onyeisi ndị uweojii bụ Douglas Kanja kwuru na ha nwere ọzị gbara ọkpụrụkpụ na-ekwu na ndị omekaome chọrọ iji ngaharịiwe ahụ kpaa mkpamkpa.

    Kamgbe ngaharịiwe ahụ bidoro, Onyeisiala mba Kenya emeela ọtụtụ ihe ndị a na-eme ngaharịiwe chọrọ.

    O kwụsịrị ụtụịsị ahụ na-ese okwu ma chụọ ọtụtụ ndị nwere ọkwa na gọọmenti ya. Onyeisi ndị uweojii na mba ahụ rịtụkwara n’ọkwa.

    Mana ndị mmadụ ka na-achọ ka gọọmenti mee ihe ndị ọzọ gbasara mpụ na ọchịchị ọjọọ. Ha chọrọ ka a taa ndị uweojii ahụ gburu ụfọdụ ndị na-eme ngaharịiwe ahụhụ .

    E gburu mmadụ karịrị 50 na ngaharịiwe ahụ, ebe mmadụ karịrị 413 meruru ahụ .

  4. Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ebutela nje Covid-19 ọzọ

    A ka na-akwanye Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ọkụ n’ike ka ọ ghara ịzọ ọkwa ọzọ n’ihi okenye o merela nakwa ugbua o butere nje Covid-19.

    Ndị ndu abụọ nọ na pati ha bụ Democrats bụ Sịnetọ Chuk Schumer na Hakeem Jeffries zutere ya na nzuzo ma gwa ya nchekasị ha nwere banyere ahụike ya dịka ndị ntaakụkọ mba Amerịka si kwuo.

    Akụkọ kwukwara na onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Nancy Pelosi agwala Biden na ọ gaghị emerinwu Donald Trump na-ama ya aka n’ọnọdụ a.

    Mgbe isiụlọọrụ ya bụ White House kwuputara maka ọrịa Covid-19 o butere, ha sị na njirimaara ọrịa na-egositụ obere n’ahụ ya.

    Odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Karine Jean-Pierre kwuru na a gbaala Biden ọgwụ mgbochi nakwa nke mgbakwunye ya mana o butela ọrịa a ugboro abụọ.

    Jean-Pierre kwuru na Onyeisiala Biden ga-edopu onwe ya iche n’ụlọ ya dị na Delaware dịka ọ ga-arụ ọrụ dịịrị ya.

    Dọkịta ya bụ Kevin O’Connor kwuru na Biden nweturu nsogbu iku ume, imi na-arị ya nakwa ụkwara, kwuo na e nyela ya ọgwụ Paxlovid.

  5. Igbo ndị ọma unu abọọla chi ee!?

    Anyị na-ekele ma na-anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Bịa gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa taa.

  6. Kọmishọna abụọ agbala arụkawaghịm n’Abia Steeti

    Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti e kelela kọmishọna abụọ ahụ gbara arụkwaghịm taa na steeti ahụ.

    Kọmishọna abụọ ahụ gunyere kọmishọna na-ahụ maka sayensị na teknụzụ bụ Chima Oriaku na kọmishọna na-hụ maka ọrụugbo bụ Ọkammụta Monica Ironkwe.

    N’ozi ekele ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Alex Otti bụ Ụkoha Njoku Ukoha binyere aka na ya, Gọvanọ Otti nabatara akwụkwọ ozi arụkwaghịm ha ma kele ha maka ezi ọrụ ha rụrụ ndị Abia steeti.

  7. Onyeisiala Bola Tinubu agwala ndị omeiwu ka ha tinye N6.2trn n’ime bọjetị afọ 2024

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu agwala ndị omeiwu Sịnet ka ha bulie ma gbakwụnye ₦6.2tn n’ime bọjetị afọ 2024.

    Onyeisiala Tinubu mere ka a mata nke n’ozi akwụkwọ o degara ndị omeiwu nke onyeisi ndị omeiwu Godswill Akpabio gọpụtara taa, Julai 17.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na nke a bụ iji mee ka gọọmenti nwe ike ịrụ ọrụ na Naịjirịa gba gburubguru.

    N’okwu onyeisiala Tinubu, ọrụ ndị ahụ gọọmenti etiti ji n’aka, dị oke mkpa.

    Cheta na onyeisiala Bola Tinubu nọrọ ụbọchị Monde Januwarị 1 2024, binye aka na ọnụego N26.7trn nke ụlọomeiwu kwadoro dịka bọjet afọ 2024.

  8. O were m afọ asaa iji hibe ụlọọrụ m ọkụ gbara – Emmanuel Ebere

    Otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Ebere, akwaala arịrị maka ụlọọrụ ya ọkụ gbariri n’Ebonyi steeti n’otu abalị.

    Emmanuel Ebere gwara BBC igbo na ọ bụ ọkụ latrik lara elu karịa etu o kwesiri kpatara ọdachi ahụ dakwasiri ya.

    N’okwu ya “Mbọ niile m gbara nakwa mbọ ndị ọrụ na-emeyụ ọkụ gbara, enweghị nke mịtara mkpụrụ ọbụla, ọkụ ha gbariri ụlọọrụ m.”

    “O were m afọ asaa iji hibe ụlọọrụ m a, mana lee ka ọkụ si mebie ya nakwa akụrụngwa ọrụ niile m were”, ka Emmanuel kwuru.

    Ụfọdụ ndịọrụ Emmanuel ruru mmadụ 50 nọ ugbua dịka ndị na-enweghị ọrụ, na akpọoku ka gọọmenti gbatara ha oso enyemaka.

    N’aka nke ozo, Emmanuel rịorịọ ka gọọmenti nyere ya aka maọbụ binye ya ego iji hibekwa ụlọọrụ ya n’ihi na ọnọdụ a bụ nke juru ya anya.

  9. Aga m agbagha mkpebi e nyere Philip Shaibu n’ụlọikpe – Gọvanọ Obaseki nke Edo steeti

    Gọvanọ Edo steeti bụ Godwin Obaseki agbalaisiakwara nye iwu ụlọikpe nyere taa banyere nchụpụ n’ike ụlọomeiwu steeti ahụ chụpụrụ Philip Shaibu dịka osote gọvanọ Edo steeti.

    Gọvanọ Obaseki kwuru si na Omobayọ Godwins ga-aga n’ihu na-arụ ọrụ dịka osote ya ruo oge ụlọikpe mkpegharị ga-ekpebi okwu ahụ.

    Cheta na ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nke ọkaikpe James Omotosho nọ n’isi ya nọrọ taa bụ Wenezde Julaị 17 weghachita Philip Shaibu dịka osote gọvanọ steeti ahụ ma kwuo na nchụpụ n’ike a chụpụrụ ya bụ nke megidere akụkụ 188 na 35 iwu Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu gwa onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun ka o nweghachita ndị nchekwa Philip Shaibu.

    Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka gọọmenti Edo steeti kwụọ Philip Shaibu ụgwọọnwa ya dịka osote gọvanọ steeti ahụ nke a kwusiri mgbe ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụpụrụ ya n’ọnwa Eprel 2024 dịka osote gọvanọ.

  10. Gọomenti Abia steeti etinyeela N15,000 n’ụgwọọnwa ndịọrụ

    Gọọmenti Abia steeti ekwuola na ọ ga-akwụ ndịọrụ steeti ahụ 15,000 iji nyere ha aka belata ihe isi ike na-esite na mwepụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala ‘fuel subsidy’.

    Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Prince Okey Kalu kwuputara nke a. Kalu mere ka a mata na a ga-ebido ịkwụ ndịọrụ ego ahụ n’ọnwa bụ Julai 2024.

    Ọ gara n’ihu kọwa na atụmatụ a bụ nke gosiri ezi mbọ gọọmenti Gọvanọ Alex Otti na-agba iji belata afụfụ na steeti ahụ.

  11. Ndị uweojii anwuchiela onye uweojii so ndị omekome a ga ohi

    Ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na Kogi steeti bụ William Aya kwuru na onye uweoji ha nwuchiri bụ Aminu Mohammed.

    Ha kwuru na Aminu Mohammed bụ aha nwoke ahụ na-eso ndị omekome ezu agbataobi ya ọhị.

    “Nke rapụtara Aminu na ndị ọhị ndị otu ya bụ ụgbọala agbataobi ha nke ha zulu nwere bugara Arome Moses nbụ onye na arụgharị ụgbọala ahụ ma gbagharịa ya agwa ọzọ”.

    Ha kwuru na Moses na arụgharị ụgbọala ahụ na ebe Anyigba dị na steeti ahụ.

    “Mana ndị maara ụgbọala ahụ, mara onyewe ya ma mara na ezulu ọhị na ụlọ onye ụgbọala ahụ na abalị 14 nke ọnwa Juun na afọ gbara ama oge ha hụrụ ya”

    “Agbanweela akara ụgbọala ahụ ma tinye ya akara nke Abuja. Onye uweoji ahụ a na eboebubo nweputara akwụkwọ gosiri na ya zulu ụgbọala ahụ azụ bụ nke e weghachịrị ụbọchị ya azụ ka ọ bụrụ ihe ọ gotere na afọ 2020”.

    Ndị uweoji gara wuchie Moses na alugharị ụgbọala ahụ, ebe ndị uweoji gara wuchie otu onye na ndị omekome ahụ bụ onye kwetere na ọ bụ eziokwu na ha zulu ụgbọala ahụ ezu ma kwụọ na ọ bụ Aminu Mohammed bụ onye isi na ndị kpara nkata ahụ.

    Ọ sị na a gwara ha ga zuo nweke nwe ụgbọala ahụ ọhị ma zụpụtara ya ụgbọala ahụ.

    Mbọ BBC Igbo gbara iwete William Ovye Aya bụ ọnụ na ekwuru ndị uweoji na Kogi Steeti amịtaghị mkpụrụ maka na ekwentị ya agaghị.

  12. Onye bụ JD Vance ya na Trump ga-akwụrụ zọọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka?

    Donald Trump na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka ahọpụtala JD Vance dịka onye ya na ya ga-eso azọ ya bụ ọkwa.

    Trumo kwuru na ọ họpụtara onyeomeiwu steeti Ohio ahụ dịka "o chechara echiche ogologo oge ma hụ na ọ bụ ya tozuru ịbanye ọkwa dịka Osote Onyeisiala mba Amerịka".

    N'otu aka ahụ, otu Republican ahọpụtala Trump dịka onye ga-efe ọkọlọtọ otu ha n'ọgbakọ ha ha mere n'ụbọchị Monde.

    Lee ihe ndị dị mkpa i kwesiri ịma maka James David Vance nwereike ịbanye ọkwa osote onyeisiala mba Amerịka.

    A mụrụ ya James David Vance n'obodo Middletown dị n'Ohion'afọ 1984.

    Ọ bụ nne na nna mma ya zụrụ ya n'ebe akpọrọ Appalachian coal country.

    Vance sonyere ndị agha afọ anọ ma lụọrọ ha ọgụ n'Iraq tupu ọ gawa Mahadum steeti Ohio ebe o ritere nturugo Political Science na Philosophy

    O si ebe ahụ gaa akwụkwọ pụrụiche ịgụ maka Iwu nke dị na Yale.

    O dere akwụkwọ wuru ewu a kpọro Hillbilly Elegy nke ụfọdụ mmadụ kwuru na o gosiri ndụ ndị ọcha n'ụzọ ahụbeghi ya mbụ.

    N'afọ 2017, Vance laghachiri Ohio site na California ebe ọ na-arụbu ọrụ na Biotech ma malite ụlọorụ nke ya dịka onye bidoro PayPal bụ Peter Thiel nyere ya nkwado.

    Na mbido afọ 2021 Thiel nyekwara $10m iji kwado Kọmiti chọrọ ịme ka Vance banye ọkwa dịka Sịnetọ.

    O mechara banye ya bụ ọkwa dịka Trump nyere ya nkwado.

    Nhọpụta a nke Donald Trump mere gosiri na ebe dị mkpa itinye anya na ntuliaka a na-abịa bụ mpaghara akpọrọ Midwest.

    Site n'ebe ọ na-abịa, a na-atụ anya na Vance ga-enweike ịkpalite mmụọ ndị ọcha ahụ a na-atụ anya ịtụnyere Trump.

  13. Ndị uweojii anwụchiela nwoke gburu ụmụnwaanyị 42 n'ime afọ abụọ

    Ndị uweojii mba Kenya anwụchiela nwoke ha kpọrọ 'serial killer' bụ nke ha na-enyocha igbu ụmụnwaanyị itoolu ma tụnye ozu ha n'ebe a na-atụnye inyinyi.

    Collins Jomaisi Khalisia bụ aha nwoke ahụ a nwụchiri n'ụtụtụ ụbọchị Monde n'ụlọ oriri ebe ọ gara ịle asọmpị ikpeazụ nke Yuro 2024.

    Ndị uweojii sị na o kwuputala na o gburu ụmụnwaanyị 42 kemgbe afọ 2022 nke gụnyere nwunye ya.

    Nchọpụta ozu ụmụnwaanyị ahụ abụrụla ihe tụrụ mba Kenya niile n'anya ma kpasuo ha iwe.

    Mohammed Amin bụ onyeisi ngalaba na-enyocha mpụ na ekperima kwuru na nwoke ahụ "kwupurara na ọ laara ma gbuo ụmụnwaanyị ruru 42 kemgbe afọ 2022 nke ikpeazụ bụ n'ụbọchị Tọzde ka ọ ka gburu ya".

    Amin sị na ọ kpọrọ ndị uweojii gaa n'ụlọ ya eteghi aka n'ebe ha chọtara ozu ụmụnwaanyị itoolu.

    Ọ sịkwa na ha hụrụ ihe akaebe dị mkpa n'ụlọ nwoke ahụ nke gụnyere ekwentị iri, otu igwe kọmpụta, otu mma ukwu, uwe ụmụ nwaanyị, akwụkwọ njirimara ha na ihe ndị ọzọ.

    Ndịuweojii cheere na mma ukwu ha hụrụ be ya bụ nke o ji egbu ndị nwaanyị ọ chọrọ igbu.

    Kemgbe ụbọchị Fraịde, ndị uweojii agbachiela ebe ahụ a chọtara ozu ụmụnwaanyị itoolu.

    Nwoke ahụ ka nọ n'aka ndị uweojii ugbua dịka ha na-agba ya ajụjụ ọnụ iji chọpụta ihe mere o ji kpaa mkpamkpa a.

    Ha kwuru na ụmụnwaanyị ndị o gburu si afọ 18 rue 30 nakwa na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe n'ụbọchị Tuusde.

    Ngalaba na-enyocha ndị uweojii kwukwara na ha na-enyocha ndị uweojii ịma ma e nwere etu aka ha si dị n'ogbugbu a n'ihi na ebe achọtara ozu ndị ahụ dị nso n'ụlọorụ ha.

  14. Mba UAE ewepụla mmachi Visa ha machiburu ndị Naịjirịa

    Gọọmentị etiti Naịjirịa nakwa mba United Arab Emirates bụ UAE eruola mkpebi ịmalitekwa njem nakwa inye akwụkwọ ikike ịbata mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka gọọmentị mba abụọ na-enwe nzụkọ imeụlọ, nkwekọrịta nakwa nhazi nwa mgbe nta gbasara okwu mmachi amachiri ndị mba Naịjirịa ịbata mba ahụ.

    N'ozi sị n'aka Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Idris Mohammed ọ sị na ịnye ndị Naịjirịa ikike ịbata mba ha ga-amalite n'ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị.

    Ihe ndị dị na nkwekọrịta ahụ gụnyere ịwụlite nyocha nakwa usoro a ga-eji nweta akwụkwọ ikike ibata mba UAE.

    Cheta na ọ bụ n'afọ 2022 ka mba UAE kwụsịrị inye ndị Naịjirịa 'visa' bụ akwụkọ ikike iji mme njem bata mba ha.

    Ọ bụrụ na ị chọrọ ị ga mba UAE dịka onye ji akwụkwo njem mba Naịjirịa, o nwere ụfọdụ usoro ọhụrụ ị ga-eso dịka nkwekọrịta mba abụọ a si dị.

    Ị ga-ebu ụzọ nweta ihe a kpọrọ Document Verification Number (DVN) bụ nke ị ga-eji tinye akwụkwọ ịnata Visa gị.

    Dịka gọọmentị mba UAE si kọwa "ọ dị mkpa ịhụ na akwụkwọ niile mmadụ ji achọ akwụkwọ ikike mba UAE bụ nke eyochara n'ịntanetị tupu ịmalite inweta Visa gị.

    Lee usoro ị ga-esi nweta Visa mba UAE dịka gọọmentị ha si kwuo:

    - Debanye aha gị na 'form' iji malite usoro ịnweta akwụkwọ ikike njem a

    - Zigaara ha akwụkwọ niile iji chọ igosi n'usoro nweta ahụ

    - Ịzigachaa akwụkwọ ndị ahụ, ha anabata ya nyochaa ya ma nye gị DVN n'ime abalị ise.

    - Ị nweta DVN gị, ijiri ya tinye akwụkwọ ị ga-eji nata Visa gị.

    Cheta na etu e si enwetabu Visa mba UAE bụ ị ga mba ahụ ma nweta ya mgbe ụgbọelu ịso bata daturu n'ebe ahụ mana ugbua, agbanweela ya bụ usoro.

  15. NDLEA ejichiela ọgwụike e zoro n’ime akpụkpọụkwụ na Lagos

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ịṅụ na ire ọgwụike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ejichiela ogogo ọgwụike cocaine dị iche iche gụnyere tramadol, pentazocine, morphine sulphate, ketamine na ọtụtụ ndị ọzọ.

    Ozi ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi wepụtara n’ọbaozi ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde 14 Julaị 2024, kọwara na e zoro ọgwụike ndị ahụ n’ime akpụkpọụkwụ, akwa na ngwongwo ndị ọzọ a chọrọ ịtụga mba Amerịka na Saịprọs.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ bụ ndị ọrụ NDLEA nke ngalaba Directorate of Operations and Investigations (DOGI) nyopuru ọgwụike ndị ahụ na Legọs steeti.

    N’otu aka ahụ, ndị ọrụ NDLEA jichikwara ọgwụike loud arụ ya dị 440 gram nke e si Kanada atụbata Legọs steeti.

    Ka osiladị, ndị ọrụ NDLEA nọọrọ n’ụbọchị Wenezde 10 Julaị 2024 jichie otu ụgbọala na mpaghara Ewu Junction dị n’Okpuruọchịchị Esan Central oge ha nwetara kepukepu banyere ya.

    Oge ha mere nnyocha, ha chọpụtara na otu n’ime ndị njem nọ n’ime ụgbọala ahụ bụ Aminu Abdullahi gbara afọ iri atọ na abụọ (32) kwajuru ọgwụike tramadol dị puku atọ (3,000) n’ime iko custard.

    Mgbe a gbara ya ajụjụ, ọ sịrị na ya zụtara ọgwụike ndị ahụ n’Ọnịcha dị n’Anambra steeti ma buru ya na-aga Mararaba dị n’Abụja ebe ọ chọrọ ịga ree ya.

  16. Ndị uweojii Anambra steeti amalitela njem ịzọpụta onye atọọrọ n'Awka

    Kọmịshọna ndị uwoejii Anambra steeti bụ Nnaghe Obono Itam ekwuola na ha amalitela ịzọpụta ndị a tọọrọ n'ụzọ si Amansea aga Ifite n'Awka.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ndị ojiegbe ji egbe mapụta n'ime ụgbọala abụọ ma tụdọ ndị ahụ egbe si ha pụta n'ime ụgbọala ha.

    Ha mechara pụta soro ndị ahụ banye ụgbọala abụọ ha ji bịa ma pụo. Ha hapụrụ ụgbọala nwoke ahụ ha tọọrọ n'ebe ihe ahụ mere ma pụọ.

    Ndị uweojii n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga binyere aka kwuru na ha ji ụgbọala nwoke ahụ dịka njikọ aka otu nchekwa dị icheiche malitere ị si imi n'ala iji chọpụta ihe mere.

    Ndị mmadụ akatọọla ya bụ ihe mere ma na-ekwu na ọ bụ "ehihie ọcha" ka ndị ahụ na-atọrọ mmadụ n'atụghị egwu.

    Michael Chibuzo dere sị "ọ bụrụ na isiobodo (Awka) enweghi nchekwa, kedụ ebe anyị ga-enwe nchekwa zuruoke?"

    Ahmed Sufi dere sị "ihe a bụ ihe na-agụ akwa ma na-atụ ụjọ".

  17. Anyim Pius Anyim esila n'otu PDP febanye otu APC

    Onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Anyim Pius Anyim esila n'otu PDP febanye otu APC.

    Nke a pụtara ihe n'ọgbakọ achumnta vootu okpuruọchịchị nke otu APC mere n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Satọde.

    Anyim kọwara na ihe mere o ji banye n'otu ahụ bụ maka udo na njikọ nke otu ahụ wetarala na steeti ya bụ Ebonyi.

    Onyeisioche APC bụ Abdullahi Umar Ganduje gwara ndị nso patị ahụ na ya bụ ọgbakọ ha jisike ịhụ na otu ahụ siri ike ma n'Ebonyi steeti ma n'ọwụwa anyanwụ niile.

    Onye ọzọ gbahapụrụ otu ya bụ Edward Nkwegu ji aha Labour Party zọ ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ nke si na Labour Party banye APC.

    Anyim esorola nzọmụkwụ Ifeanyi Ubah nakwa Uche Ekwunife dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nke Igbo banyere otu APC na nsonso a.

  18. Ụlọelu ogogo abụọ adaala n’Abuja

    Ụlọelu ogogo abụọ adaala n’okporoụzọ Cupid Road dị na mpaghara Kubwa, Abụja.

    Akụkọ ruru anyị aka kwuru na njinji ahụ jiri n’ụtụtụ Satọde 13 Julaị 2024 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri.

    Ụlọ ahụ a kpọrọ Al-Halal Apartment bụbu nke e ji mere ụlọọgwụ tupu atụgharịa ya ka ọ bụrụ ụlọ obibi.

    Ka ọ dị ugbua, anapụtala mmadụ abụọ na ndụ ma bugaa ha ụlọọgwụ ebe ndị ọrụ gbatagbata ka na-agba mbọ ịdọpụta ndị ọzọ tọrọ n’ime ya.

    Oge anyị nwetara ozi a, amatabeghị kpọmkwem ihe butere ọdịda ụlọ ahụ.

  19. Onyeisi ndịagha Naịjirịa aṅụọla iyi igbo nsogbu nchekwa n’Ọwụwa Anyanwụ

    Onyeisi ndịagha na Naịjirịa bụ ọchịagha Taoreed Lagbaja aṅụọla iyi na ha ga-egbo nsogbu nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ site n’usoro iwu na-achị Naịjirịa nakwa akparamakwa ndịagha.

    O kwuru nke a n’ụbọchị Tọzde 12 Julaị, 2024 na-apịachi ọgbakọ ndịisi ndịagha nke afọ 2024 e mere na Portharcourt, Rivers Steeti.

    Mgbe ọ na-etinye ọnụ n’ogbugbu ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha na-egbu ndịagha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Lagbaja kwere nkwa na a ka-eme ka nke a kwụsị.

    “Ndịagha ga-aga n’ihu n’ịzaghachị oku nchekwa ọbụla site n’usoro iwu na-achị Naịjirịa nakwa ndịagha. N’okwu iyi ndụ ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ndịagha ga-azaghachị n’ụzọ kwesịrị ekwesi.

    Cheta na ọnọdụ nchekwa na mpagharan Ọwụwa Anyanwụ na-akawanye njọọ, nke a bụ dịka ndị ojiegbe wakporo ndịagha n’Obikabia ma gbuo ihe ruru mmadụ ise n’ime ha.

  20. Azọpụtala ụmụakwụkwọ 40 mana amabeghị ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n’ụlọ ahụ dara na Jos - NEMA

    Ụlọọrụ gbata gbata na Naịjirịa bụ NEMA ekwuola na ha azọpụtala ụmụakwụkwọ 40 n’ụlọelu ahụ dara Busa Buji dị na n’okpuruọchịchị Jos North na Plateau Steeti.

    Ozi NEMA wepụtara n’akara soshal midia X ha mere ka amata na e bugara ndị ahụ a gbapụtara ụlọọgwụ Bingham University Teaching Hospital na Plateau Specialist Hospital ebe ha na-anata nleta.

    NEMA kwuru na amabeghị ụmụakwụkwọ ole nwụrụ site n’ọdachi ahụ.