Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa
Agha Iran: E mebiela ụgbọmmiri na-ebu ngwaahịa atọ na 'Strait of Hormuz'
Ụgbọmmiri e ji ebu ngwaahịa enwurula ọkụ dịka ogbunigwe tụru ụgbọmmiri atọ n’ọwammiri ‘Strait of Hormuz' dị na mpaghara Middle East.
Ọnọdụ a bịara dịka ndịagha Amerịka kwuchara na ha memilara ụgbọmmiri iri na isii nke mba Iran jiri kwee ọnya n'oke osimiri.
A zọpụtara mmadụ 23 bụ ndị ọrụụgbọmmiri nọ n’ugbommiri ahụ.
Ịran gara n’ihu na mwakpo ha na-eme na mpaghara ahụ, na mba gụnyere Saudi Arabia, Kuwait nakwa UAE.
Mmadụ anọ nwụrụ oge igwe na-efe efe a kpọrọ ‘drone ‘ dara na nso ọdọugbọelu Dubai.
Nke a bụ nke abụọ a na-eji ‘drone’ eme mwakpo na mpaghara ahụ.
Izrel agaala n’ihu mekwaa mwakpo n’Ịran nakwa Lebanon.
Ebe ndị uweojii Ịran dọrọla ụmụamaala ha aka na ntị na ha ga-eme onye ọbụla mere ngagharịiwe "etu ha si eme ndị iro ha”.
N'agbanyeghị na naanị gọvanọ abụọ nọzị na PDP, ọ naghị amapụ anyị obi – Gọvanọ Makinde
Ebe foto si, Seyi Makinde / X
Gọvanọ Ọyọ Steeti bụ Seyi Makinde ekwuola sị n'agbanyeghị na ha dị gọvanọ abụọ nọzị
n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP), na ọ naghị amapụ ha
obi.
Seyi Makinde mere ka a mata nke a n’ọgbakọ ndị bọọdụ
otu PDP nwere n’Abuja.
Makinde kwuru na nsogbu dị na PDP ga-ebi mgbe na-adịghị
anya.
Ọ gara n'ihu kọwaa na etu ndị gọvanọ PDP si
agbaba n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) bụ ihe aka mgba
dịrị ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Makinde na-ekwu
nke a dịka Dauda Lawal bụ Gọvanọ Zamfara Steeti, mara ọkwa sị na ya apụọla n'otu PDP ma banye n’otu APC.
Ugbua, ọ bụzị
naanị Gọvanọ Seyi Makinde nke Ọyọ Steeti na Gọvanọ Bala Mohammed nke Bauchi Steeti bụzị gọvanọ abụọ nọ ugbua n'otu PDP.
Anyị agaghị ekwe ka e si Middle East bufee mmanụ ma ọ bụrụ na mwakpo Amerịka na Izrel gaa n’ihu - Ndị nche Ịran
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nkọwa foto, Ọnụahịa mmanụ ụgbọala n’ụwa arịala ruo n'ogo kachasị elu kemgbe afọ 2022 n'ihi agha mba Amerịka na Izrel na-ebu ’Ịran.
Otu ndị nche Ịran bụ Revolutionary Guards ekwuola na ha
agaghị ekwe ka e si mpaghara Middle East bufee "otu lita mmanụ" ma ọ
bụrụ na mba Amerịka na Izrel gaa n’ihu n’ịwakpo mba ha dịka ụlọmgbasa ozi Reuters
si kwuo.
Nke a kpalitere ịdọ aka na ntị sitere n'aka Onyeisiala mba
Amerịka bụ Donald Trump.
Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka ga-awakpo Ịran karịa ma ọ
bụrụ na ha gbochie mbupụ mmanụ na ngwaahịa ndị ọzọ si na mpaghara ndị na-emepụta
ihe.
Onyeisiala Trump gara n’ihu kwuo na mba Amerịka nwereike ikwu
na agha ha na-ebu megide Ịran gara nke ọma, mana o kwukwara na ndị Amerịka ga-aga
n'ihu.
Ka ọ dị ugbua, ọnụahịa mmanụ ụgbọala n’ụwa arịala ruo n'ogo
kachasị elu kemgbe afọ 2022 n'ihi agha mba Amerịka na Izrel na-ebu ’Ịran.
Mmanụ agbịdị brent crude na mba ụwa ugbua, agafeela ọnụ ego atụrụ
anya bụ $100.
Ndị uweojii Los Angeles anwụchiela otu nwaanyị aka ya dị na mwakpo mere n’ụlọ Rihanna
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Foto Rihanna
Ndị uweojii Los Angeles mba Amerịka ekwuola na ha anwụchiela Ivanna Lisette Ortiz gbara afọ iri atọ na ise a na-enyo enyo na ọ bụ ya gbara egbe n’ụlọ otiewgu a ma ama bụ Rihanna
Akụkọ ụlọọrụ mgbasaozi ‘Los Angeles Times’ kwuru na Ortiz nọ n'ụgbọala ya ma nwere egbe AR-15 gbaa n'ụlọ Rihana dị na Beverly Hills.
Ndị uweojii kwuru na ha gara n'ogige ahụ ngwa ngwa ha wetara ozi banyere ụda egbe na-ada n'ụlọ Rihana. Ha kwuru na Rihanna nọ n’ime ụlọ ya oge ihe ahụ mere mana o nweghị onye merụrụ ahụ
Otu onye uweojii gwara ụlọmgbasaozi CBS na ha hụrụ mgbọ egbe na'akụkụ ebe mwakpo ahụ mere ma hụ ụgbọala ‘Tesla’ Ortiz n'ọdọahịa Sherman Oaks Galleria ebe ndị uweojii nọ nwụchie ya.
E kwuru na Ortiz si Orlando, Florida mana enweghị onye ma ihe mere o jiri wakpo ụlọ Rihana.
Iswap ekwuola na ọ bụ ha wakporo ogige ndịagha Naịjirịa dị na Borno Steeti
Otu na-eyi ọha egwu a na-akpọ ‘Islamic
State of West Africa Province (Iswap) ekwuola na ọ bụ ha mere mwakpo n’ogige ndị ọrụ nchekwa
Naịjirịa dị na Borno steeti n'izuụka gara aga ma gbuo ọtụtụ ndịagha Naịjirịa.
Ozi ụlọọrụ mgbasaozi
Amaq ha na Iswap na-enwe mmekọ, kwuru na ọ bụ ISIS kpara agwa ahụ.
Akụkọ ụfọdụ
na-ekwu maka mwakpo ahụ mana o doghị anya ndịagha Naịjirịa ole e gburu maka na
ozi Iswap wepụtara dị iche iche na nke ndịagha wepụtara.
Iswap kwuru
na e gburu ọtụtụ ndị otu ha oge ha na ndịagha Naịjirịa kwatara mgbọ.
Ha kwuru na
ha wakporo ogige ndịagha anọ n’otu abalị mụnye ọtụtụ ụlọ na ụgbọala ọkụ ma gbuo ọtụtụ ndịagha Naịjirịa.
Akụkọ kwuru na ndịagha Naịjirịa wepụtara ozi ma kwuo na ha gbochiri ma meriri mwakpo ndị Iswap mere n'ụfọdụ
ogige ha na Borno steeti.
Ụlọ nnọchiteanya Amerịka ekwuola na ndị na-eyi ọha egwu chọrọ ịwakpo ha na Naịjirịa
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ nnọchiteanya
mba Amerịka na Naịjirịa ekwuola na ndị na-eyi ọha egwu nwere atụmatụ ịwakpo
ogige ha dị na Legọs na Abuja nakwa ụfọdụ ụlọakwụkwọ mba Amerịka dị na Naịjirịa.
Nke a na-abịa
dịka mba Amerịka na Izrel wakporo Ịran na 28 Febụwarị 2026 nke kpalitere agha n’etiti
Amerịka na Ịran.
Ozi ha wepụtara
n’akara X ha, gwara ụmụafọ Amerịka niile nọ na Naịjirịa ka ha kpachara anya
banyere ebe ọbụla ha na-aga, ihe na-eme nakwa etu ha si eme njem ha n’oge a.
Ha gara n’ihu
kwuo na ọ dị mkpa ka ụmụafọ Amerịka bi na Naịjirịa tinye anya n’ala ma kee nkwụcha
oge ọbụla ha na-aga ụlọ nnọchiteanya dị n’Abuja, Legọs nakwa ụlọakwụkwọ Amerịka
dị na Naịjirịa.
Ozi ahụ
gwara ha ka ha ghara ịga ọgbakọ nwere ọtụtụ mmadụ, ghara isonye na ngagharịiwe
ma gwa ndị ezinaụlọ ha ebe ha na-aga oge ọbụla.
A gwara ụmụafọ
Amerịka na Naịjirịa ka ha gaa na webụsaịt travel.state.gov banyere ozi dị mkpa
ndị ọzọ iji chekwa onwe ha.
Ụtụtụ ọma ndị be anyị
Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 10 Maachị, 2026.
Gaa n'ihu nọnyere anyị maka inweta akụkọ ndị mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.
Dangote sị na ha na-erezị mmanụ ụgbọala N1,175 maka otu lịta
Ebe foto si, Getty Images
Dangote bụ ụlọọrụ
na-arụpụta mmanụ ụgbọala emeela ka a mata na ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala bụzị N1175 maka otu lịta.
Nke a na-eme
ya ugboro anọ a na-eburi ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala n’ihe na-erughị abalị iri na anọ.
Ọnụ ahịa
mmanụ ụgbọala si na N995 gbagoo N1175.
O jiri pasentị iri atọ dị elu kamgbe abalị ole ma ole garaaga
maka egwu agha mba Amerịka na Izrel na-ebuso mba Iran.
Nsogbu kawenyere
njọ mgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gwara mba Iran na ihe ga-akwụsị agha ahụ bụ mgbe ha nyefere onwe
ha n’aka Amerịka rịọ maka udo.
Mba otu G7 ga-enwe ọgbakọ gbatagbata banyere oke ọnụahịa mmanụ agbidi
Ebe foto si, Anadolu via Getty Images
Mba ndị so
n’otu G7 ga-enwe ọgbakọ gbatagbata n’ụbọchị Mọnde 9 Maachị, 2026 banyere oke ọnụahịa
mmanụ agbidi dị ugbua maka agha mwakpo mba Amerịka na Izrel na-awakpo mba Ịran.
Mịnịsta na-ahụ
maka akụnaụba na mba ndị a nakwa Chanselọ mba UK bụ Rachel Reeves ga-agbakọ iji
kpaa etu agha a ga-esi metụta mba ụwa ndị ọzọ.
Ọnụahị mmanụ
agbidi gbagoro n’ụbọchị maka agha ahụ, nke a bụ maka na o metụtara mpaghara
Strait of Hormuz ebe ụgbọmmiri bu ibu si aga ebe dị iche iche n’uwa niile.
Akụkọ kwuru
na e si mpaghara Strait Hormuz eziga mmanụ agbidi na mbaụwa niile mana ugbua a,
e nweela mgbochi nke a kemgbe agha ahụ malitere kemgbe izuụka gara aga.
Mba Amerịka
na Izrel malitere ime mwakpo ọhụrụ n’Ịran na ngwụcha izuụka a ma wakpo ọtụtụ
ogige mmanụ agbaidi ha.
Ụlọikpe mkpegharị agwala Inec ka ha ghara ịnabata mpụtara ọgbakọ kọnvenshọn PDP mere n’Ibadan
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mkpegharị Naịjirịa dị n'Abuja etufuola mkpesa otu Peoples Democratic Party (PDP) wetara megide nkwado Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nyere n'Ọktoba 31 2025 nke gbochiri ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) ịnabata mpụtara ọgbakọ Kọnvenshọn PDP mere na Nọvemba 15 na 16 2025.
Mkpebi ụlọikpe ahụ nyere n'ụbọchị Mọnde 9 Maachị, 2026, kwuru na mkpesa ahụ PDP wetara enweghị ihe ọbụla nwereisi dị na ya ma kwuo na mkpebi ụlọikpe Ukwu ahụ nyere bụ nke kwesiri ekwesi.
Ụlọikpe mkpegharị gara n'ihu kwuo na PDP enweghị ikike ọbụla isi na ụlọikpe ukwu ahụ ekwesighị ikpebi n'ikpe ahụ n'agbanyeghị na ọ bụ ihe dịịrị pati PDP.
Ụlọikpe ahụ nyere iwu ka pati PDP nke Turaki nọ dịka onyeisi ha kwụọ nde naịra abụ maka iweta mkpesa na-enweghị mmiri ọbụla.
Eji m ọgbaatumtum gaa Jamini iji chọpụta ihe ndị njem na-agabiga n'okeala Afrịka na Yurop - Ogboru Akpevwe
Ogboru Akpevwe bụ nwaafọ Ajalomi Abraka dị na Delta Steeti ma bụrụkwa onye na-agba ọgbaatumtum 'powerbike'.
Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, nwaada ahụ ji ọkwa Assistant Comptroller n'ụlọọọrụ 'Customs' kọwara ihe kpaliri mmụọ ya iji ọgbaatumtum gaa mba Jamini nakwa ihe ndị ọ gabigara n'ụzọ.
"N'ụlọọrụ Nigeria Customs Service, anyị na-agba mbọ ịkwalite mgbereahịa, nke ahụ bụ nnyocha e mere n'ókèala dị iche iche, agba nke abụọ ya ka m na-ekwu. Nnyocha ahụ bụ iji ghọta ihe ndị na-atụ mgbere, ndị njem na ndị nlereanya na-agabiga n'ókèala dị iche iche na mpaghara Afrịka nakwa Yurop nakwa ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta," ka Akpevwe kwuru.
Ọ sịrị na nnyocha a ga-enyere ụlọọrụ Customs aka ịchịkọta usoro ọrụ ha nakwa ihe ndị ha chọrọ maka iji kwalite ịtụ mgbere n'ókèala dị iche iche.
Kemgbe ihe ruru abalị atọ, aha ọnụ na-ekwuru onyeisiala Bola Tinubu na-ewu na soshal midịa dịka ya na otu onye ntaakụkọ nwechara mkparịtaụka.
Daniel Bwala bụ onye ndụmọdụ mgbasaozi nke Onyeisiala Tinubu na onye ntaakụkọ Mehdi Hasan nwere mkparịtaụka, ebe Hasan chetaara Bwala ụfọdụ ihe o kwuru n'oge gara aga banyere Onyeisiala Tinubu mana Bwala gọrọ sị na ya ekwughị ihe ndị a.
Iji maa atụ, Hasan jụrụ ya sị, "Onye kwuru na Tinubu nyere aka kewapụta otu agha nnupụisi?"
"Bwala sara ya sị, "O nweghị mgbe Tinubu kewapụtara ndịagha nnupụisi. Tinubu so n'otu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa kachasị nwee agba."
Hassan jụkwara ya ọzọ sị, "Tinubu na ndị otu ya kewapụtara otu agha nnupụisi.' Onye kwuru nke a?"
Ka m jụkwaa gị nke ugboro atọ, "Tinubu na ndị otu ya kewapụtara otu ndịagha nnupụisi." Onye kwuru nke a?"
Bwala sara sị, "Tinubu enweghị mgbe o kwewapụtara otu agha nnupụisi."
Mehdi sara, "Gịnị mekwara iji kwuo n'abalị 22 nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2023 na o kewapụtara ndịagha nnupụisi?"
"O nweghị mgbe m kwuru etu ahụ," ka Bwala zaghachiri.
Mehdi jụkwara ya sị, "o nwere otu agha nnupụisi gbalịrị igbu gị?"
Bwala sara sị, "O nweghị. O nweghị mgbe m kwuru na ọ chọrọ igbu m."
Onye zọburu ọkwa onyeisiala n'aha otu YPP bụ Kingsley Moghalu kwuru sị, "Mkparịtaụka Daniel Bwala mechuru Naịjirịa, Onyeisiala Tinubu nakwa Bwala n’onwe ya ihu na mbaụwa."
O kwuru na ihe o mere gosiri na na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa "enweghị ihe ha kwenyere na ya karịa ihe ha ga-erite nakwa agha onye ga-enweta ọkwa ọchịchị."
Kemgbe ihe onyonyoo ahụ pụtara, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa akatọọla Bwala maka ihe ndị o kwuru oge gara aga dịka ụfọdụ gara wepụta ihe onyonyo ebe ndị o kwuru ya.
Mana n'ozi o wepụtara ụbọchị Fraịde 6 Maachị 2026, Bwala kwuru na okwu ndị a niile o kwuru banyere Tinubu bụ "okwu ndọrọndọrọ ọchịchị."
Pope Leo XIV ekwupụtala nchegbu ya maka ihe na-eme n'Iran
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisis ndị ụka kaọtik n'ụwa niile bụ Pope Leo XIV ji akwụkwọ ha na igwe eji ekwu okwu agbasa ozi nye ndị mmadụ
Onyeisi ndị ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Pope Leo XIV ekwuputala nchegbu maka "akụkọ na-enye nsogbu" si Iran nakwa 'Middle East' abịa banyere mwakpo a na-eme ma dọọ aka na ntị ime ihe ike, mbibi na mmụba ịkpọasị nwere ike ime ka esemokwu ahụ gbasaa ruo mba ndị ọzọ gụnyere Lebanọn.
O kwuru ka a gbaa mbọ kwụsị ihe na-eme ma chọ udo site n'inwe mkparịtaụka n'etiti ndị na-eso okwu.
Mwakpo mba Amerịka na Izrel jikọrọ ọnụ mee na Iran abụrụla okwu akpụ na ọnụ nke ọtụtụ ndị okwu na-eru na ọnụ kpọrọ okwụ ka udo chịa.
Ndị ụlọọrụ NDLEA anwụchiela onye bụbu ‘councillor’ na Legọs Steeti maka ibu ọgwụike
Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide ịtụ mgbere ọgwụike na Naịjirịa
bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela onye bụbu onye nnọchiteanya
‘councillor’ ugboro na Legọs Steeti.
Ndị NDLEA nwuchiri Sheleru Sadiq Olalekan dị afọ iri anọ na
ise (45), onye bụbu onye nnọchiteanya n’okpuru ọchịchị ime obodo Ibeju-Lekki,
ma bụrụkwa onye na-arụ ọrụ ugbua dịka onye enyemaka, n’ụlọ ya dị n’Ilado, Ibeju-Lekki
na Legọs Steeti.
N’ozi o wepụtara n’ụbọchị Sọnde 8 Maachị 2026, ọnụ
na-ekwuchitere NDLEA bụ Femi Babafemi kwuru na ndị ụlọọrụ ha wakporo ụlọ Olalekan
oge ha nwetara ozi bara uru, bụ ebe ha chọpụtara ọgwụike dị iche iche n’otu imeụlọ
ya.
Oge a gbara ya ajụjụ, e kwuru na Olalekan kwetara na ọ bụ ya
nwe ọgwụike ndị ahụ nakwa ụlọ a chọtara ha n’ime ya.
Ọ gakwara n’ihu kweta na ya agaala ozi ugboro abụọ dịka onye
nnọchiteanaya ndị obodo Orimedu dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ibeju-Lekki.
N’aka nke ọzọ, ndị ụlọọrụ NDLEA n’Abuja nwuchiri Emeka Hyginus Okwor dị afọ iri atọ na abụọ, ma bụrụkwa onye ji ego achụ nta ego.
Ndị ụlọọrụ NDLEA nwuchiri Okwor oge ọ na-eme njem n’ime ụgbọala si Obollo-Afor dị n’Enugwu Steeti na-aga Zuba dị n’isi obodo Naịjirịa.
Oge a mara ya aka n’akpa, a chọtara mkpụrụ ọgwụ ‘tapentadol’ dị otu puku o zoro n’ime akwa maamịrị ụmụaka.
Oge a gbara ya ajụjụ, onye ahụ a na-enyo enyo kwupụtara na ya na-ebuga ọgwụ ndị ahụ n’obodo Guduwa dị n’okpuru ọchịchị Gurara na Naịja Steeti, bụ ebe o nwere ụlọahịa.
Don-Anele Munachimso emeriela n'asọmpi onye kachasị mara 'Maths' n'Ọwụwa Anyanwu
Ebe foto si, Alex Onyia/X
Otu nwata akwụkwọ na-agụ n'ụlọakwụkwọ 'Diamond Special College Owerri, Imo steeti emerịala n'asọmpi ndị kachasị mara mgbakọ na mwepụ n'Ọwụwa-Anyanwụ a kpọrọ, ''South East Mathematics Olympiad' e mere na nsonso a.
Munachimso ritere nde naịra ise maka mmeri ya ma ritekwara onye nkụzi ya otu nde naịra.
N'okwu ya, onye nkụzi ya bụ Maazị Anthony Iwuegbu kwuru na mmeri ahụ gosiri na "ịgba mbọ na ịgụsi akwụkwọ ike nwere ụgwọ ọrụ."