Nzukọ ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ n'Enugwu
Ndịisi ndịagha na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ emeela nzukọ ime ụlọ maka nchekwa.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
"Anyị egbuola ndị ISWAP isii" - Ndị agha Naijirịa

Ebe foto si, HQ Nigerian Army/Facebook
Ndị agha Naijaria egbuola mmadụ ịsii ma merukwa otutu ndi ozo ahu bu ndị otu ọmekọme ISWAP na mpaghara Dikwa di na Borno Steetị.
Ọnu n’ekwuchitere ndị agha Najiria bụ Mohammed Yerima kwuru nkea sị na ha wakpudoro ndi omokome ahụ n'ụbọchị Tuzde oge ha chọrọ ị bata na mpaghara Dikwa.
O kwukwara sị na ndị ọyiegwu ahụ batara n’igwe, buru kwa ụgbọala puru ịche eji ebu agha, ebe ufọdụ n´ịme ha bukwa ọgba tum tum wee bata.
N’okwu ya, o sịrị na ndị agha Naijairi jịrị ma ụgbọelu pụrụ ịche ejị ebu agha ma kwa ụgbọala pụrụ ịche ejị ebu agha wee wakpudo ndi ọmekọme ahu.
Mohammed Yerima kwụrụ sị na ndị agha atọ merụrụ ahụ ka ha ebukwasịri ndị ọmekọme ISWAP ahụ agha.
Ndị ọrụ na-ahụ maka ụlọikpe na Naijirịa akwụsịla abụbọ ọrụ ha

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ndị ụlọọru na-ahụ maka ụlọikpe na Naijirịa gbara abụbọ ọrụ nke mere na ụlọikpe niile na Naịjirịa mechiri emechi akwụsịla abụbọ ọrụ ha dịka ha na gọọmentị nwechara nzụko n'ụbọchi Wenesde.
Kama ha kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri na anọ ka ha ga-ebido ọrụ ha n'uju.
Ha bidoro abụbọ ọrụ ha n'ọnwa Aprel afo 2021 dịka ha chọrọ ka nhazị ụgwo ọrụ ha diirị ha n'aka.

Nkọwa foto, Ulọikpe mkpesa a dị n'Enugwu Steeti togbọ chakoo 
Nkọwa foto, Ha ga-ebido ọrụ n'ụbochị 14 nke ọnwa Juun a. Unu abọọla chi
Daalụ ma soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa
Gere akụkọ dị mkpa n'ehihe a n'otu nkeji
BBC Igbo Townhall: Etu ndị mmadụ si achọ udo n'ala Igbo ugbua

Dịka ọnọdụ ọwụwa anyanwụ na-echu ọtụtụ ụmụafọ Igbo Ura, BBC Igbo ka enwe nrụrịtaụka pụrụ iche taa nke a kpọrọ nzụkọ 'BBC Igbo Townhall' taa.
Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ gbasara mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii na ogbugbu ndị mmadụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ, nke a mere na ọ dị mkpa ka ndị Igbo gbakọọ ma kwuo uche obi ha maka etu ihe siri dị.
Nrụrịta ụka apụrụiche ma dịkwa oke mkpa ga ebido n'elkere asaa nke abalị Wenesde, ụbọchị itolu nke ọnwa mee afọ 2021.
Ya bụ ụbọchị taa!
"Ekene dịrị Gọọmentị Naijirịa dịka ha machiri Twitter maka ịwepụ ozi Onyisiala ha" - Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images
Aka chiburụ Amerịka bụ Donald Trump akwadoola gọmenti Naịjirịa maka mmachi Twitter.
Nke a na-eme dịka Naijirịa machiri Twitter dịka ha wepụru ozi onyeisiala Naijirịa zipuru na ya bụ igwe mgbasa ozi.
Trump kwuru sị, "Kedụ onye ha bụ ị kwu ihe bụ ezi na nke bụ nke ọjọọ ebe ha onwe ha dị njọ".
Ọ bụ n'akwụkwo ozi o deputara ka o kwuru nke a ma kwuo kwaka mba ndị ọzọ machie Twitter na Facebook maka na ha anaghị akwado ikike dịrị onye ịkwu uche obi ya.
Ndị omekome atọrọla ụmụnwaanyị 60 na Zamfara Steeti

Ebe foto si, Twitter/Nigerian Army
Ka anyị ga na Zamfara steeti ebe a na-ekwu na ndị ojiegbe atọrọla ihe karịrị ụmu nwaanyị iri isii dịka ha wakporo obodo Manawa na steeti ahụ na mgbede ụnyịa.
Shehu Ahmed Fulani, bụ onye omeiwu gwara BBC Hausa na ndị omekome a gburu mmadụ anọ n'Obodo Malele na Randa nke dịna okpuru ọchịchị Maru ma gbaa ọtụtụ obodo ọkụ.
Fulani kwuru na ndị a tọoro ụmunwaanyi a dịka ndị di ha hapụrụ ha rie mbọmbọ ọsọ.
Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a n'otu nkeji
Emepeela websaịt eji akwụ ụgwọ 'Passport' ọhụrụ

Ebe foto si, NIGERIA IMMIGRATION SERVICE
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka njem na Naijirịa nke ana akpo na bekee Nigeria Immigration Service bụ Muhammad Babanded ekwuola na ha emepela websaịt eji akwụ ụgwọ ndị chọrọ akwụkwọ njem ọhụrụ. Ha mechibụrụ mbụ kemgbe onwa Mee.
Ha mechịrị ya iji hụ na ndi tinyere akwụkwọ na oge gara aga nwetara nke ha. Babanded dọkwara ndị omekome aka na nti ka ha wepụ aka na ya bụ atụmatụ.
Mmadụ 102 ọzọ ebutela Covid-19 na Naijirịa
Ngalaba NCDC edepụtala n'akara Facebook ha na mmadụ otu narị na abụọ ọzo ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa.
Ondo steeti kachasị kama ha kọwara na ọ bụ ọnụọgụgu e jịkọrọ site ụbọchị itolu nke ọnwa February ma ruo ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Febuwarị , 2021.
Steeti asatọ ndị a, FCT, Plateau, Nasarawa, Sokoto, Imo, Ekiti, Osun an Ogun enweghị ndị ha siri butere ya bụ ọrịa nsonso a.

Ebe foto si, NCDC
Unu abọọla chi
Ndewo! Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Anyị kwụ na 'Restructuring' ọ bụghị nkewa Naijiria - Ohaneze Ndigbo

Ebe foto si, Sanwo Olu/Twitter
Otu Ohaneze ndị Igbo esila n'ọnụ Alex Ogbonnaya bụ ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ zaghachi otu ndị ugwu bụ NEF.
Ha gwara otu ahụ na o nweghi mgbe ha bụ Ohaneze ji chọọ nkewa Naịjirịa kama na ihe ha chọrọ bụ ka e mee ndị Igbo ka e si eme ibe ha.
Ogbonnia kwuru sị "ihe Ohanaeze kwuru bụ ka e mee ka ọnọdụ Naịjirịa dịrị mmadụ niile mma"
"Ọzọ mmadụ niile ma ama na ebe ọbụla ndị Igbo nọ ha na-edozi ebe ahụ edozi na-awụlitekwa ya" ka o kwuru.
Nke a na-abịa dịka otu ahụ kwuru ka gọọmentị etiti nye ndị Igbo Biafra maọbụrụ na ọ bụ ihe Igbo niile gụnyere ndị isi ha chọrọ kama ịlụ agha ọzọ.
N'ihe onyonyo si n'ụlọorụ Channels TV bụ ebe ekwuputere nke a, otu ahụ bokwara ndị okenye na ndị ọchịchị Igbo ebubo na o nweghi ihe ha na-ekwu maka oke ogbugbu na-arị ibe ya elu n'ọwụwa anyanwụ.
Ndị Uweoji esipụtala ebe ndị otu ESN zoro n'Ikeduru,Imo Steeti

Ebe foto si, NFP
Ndị Uweoji etinyela imi n'ala were sipụtala ebe ndị otu Eastern Security Network (ESN) zoro n'Akabo dị n'okpuru Ọchịchị Ikeduru, ,Imo Steeti ụbọchị Tuzde.
Ọ bụ onye uweojii Kajara akaja aha ya bụ Abba Kyari na ndị otu ya wakporo ndị ahụ ma tọhapụ otu onye uweojii nwaanyị ha jichiri.

Ebe foto si, NFP
Twitter ban: Ndị omeiwu PDP ji iwe pụọ n'ụlọomeiwu taa

Ebe foto si, House of Representatives Nigeria
Ndị omeiwu otu PDP ruru mmadụ iri na abụọ gbara abụbụ were iwe pụọ n’ụlọomeiwu taa iji gosi na ha akwadoghi mmachi gọọmentị etiti machiri Twitter.
Ha mere nke a mgbe onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila gbochiri usoro Ịdọrịta ụka maka mmachị Ochịchị Onu=yeisiala Muhammadu Buhari machiri Twitter dịka ụlọọrụ ahụ wepụrụ ozi O tinyere nke kwuru na ya ga-esụfrụ ndị na-eti mkpu nwereonwe n'asụsụ ha ga-aghọta.
Mana Onyeisi Ulọomeiwu bụ Femi Gbajabiamila kwuru na dịka ha na-ege ntị na mkpu ndị mmadụ na-eti maka mmachi ahụ, na ha chọkwara ịnụta olu gọọnmenti.
Iji mee otu a, Gbajabiamila kwuru na ha enyela komiti na-ahụ maka mgbasaozi, ikpe na omenala ntuziaka ka ha mee nnyocha ihe mere gọọmenti iji tinye mmachị ahụ.
O kwuru na ha akpoola Lai Mohammed okuka ọ bịa kọwara ha etu gọọmentị siri kpaa nkata ahụ ghọrọ ngịga.

Ebe foto si, House of Representative-Facenook
A saala Macron, Onyeisiala mba Fansi ụra ọkụ

Ebe foto si, EPA
Otu nwoke asaala onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron ụra pụrụ ọkụ dịka ọ gara njem ọrụ n'Ọwụwa Anyanwụ Fransị.
N'ihe onyonyo nke wuru ewu na soshal midia, a hụrụ Macron ebe ọ na-aga na nso ogbochie e tinyere oge ọ gara Tain-l'Hermitage dị na-apụta n' obodo Valence.
Otu nwoke yi akwa na-acha ndụndụ mara Macron ụra n'ihu dịka ọ na-eti "achọghị Macron", tupu ndị ọrụ gbara kpọpụta Onyeisisala ahụ.
Macron mechara lọghachi ahụ ka ya bụ ihe mechara ikele ọha mmadụ gbakọrọ.
Ọ bụrụ nnwereonwe Biafra ka ndị Igbo chọrọ, sị nye ha ya- Northeern Elders Forum

Ebe foto si, Hakeem Baba-Ahmed
Otu jịkọrọ ndị okenye welitere isi n' Ugwu- Awụsa bụ 'Northern Elders Forum' na Bekee, akpoola oku ka e nye ndị Igbo ohere nnwereonwe ma ọ bụrụ ihe ha niile chọrọ n'ezie.
Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Hakeem Baba-Ahmed bụ onye kwupụtara nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja sị, "Ọ bụrụ na nwereonwe bụ ihe ndị Igbo niile chọrọ, Naijiria ekwesịghị ịlụ ọgụ banyere nke a."
Ọ gara n'ihi kwuo na 'referadum' nke ụfọdụ na-akpo oku ya adịghị n'iwu, na ndị chọrọ referadum kwesịrị ịgba mbọ ka e megharịa iwu tinye ya n'iwu tupu ha ekwewee okwu itinye ya n'ọrụ.
O kwuru na ndị Ugwu soro lụọ agha iji hụ na Naijiria dị n'otu, na ha achọghịkwa ịlụ agha ọzọ iji hụ na ọ ka dị n'otu.
Baba-Ahmed gara n'ihu kwuo na Ugwu Naijiria kwadoro nhazighari Naijiria.
Ọ katọrọ ịnụ olu ọha nke ndị Ụlọoimeiwu mere na nsonso a sị na o nyeghị ohere ezuru oke ka ndị mmadụ kwuo uche ha, maa oku ka e nwe ọgbakọ ka ndị mmadụ tinye ọnụ ha.
BBC Nkeji nke ehihie
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Ihe mere onyeisi ndị uweojii jiri machie 'tinted glass permit'

Ebe foto si, NURPhoto
Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba akwụsịla inye ndị nwere ụgbọala ikike inwe mpịọ jiri oji bụ ‘Tinted glass permit’.
O nyere iwu a na nzukọ ya na ndị kọmishọna uweojii nwere n’Abuja n’ụbọchị Mọnde
O kwukwara sị ka a kwụsi inye ndị na-azụahịa akara ugbọala pụrụiche nke na-egbochi ndị uweojii ikwusi ha nke a kpọrọ 'spy plate number'.
Onyeisi uweojii sị na nke a bụ mbọ ha na-agba iji belata ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa dị na Naịjirịa ugbua.
Dịka ọ na-ekwu okwu a, ọ gara n'ihu mee ka a mata na ndị uweojii ịkwụ n'okporoụzọ ka bụ ihe a machiri amachi na Naịjirịa.
Mmachi Twitter bụ megidere ikike onye kwuo uche ya - US,UK na EU

Ebe foto si, Foreign Affairs ministry
Ndị ọrụ mba Amerịka, Briten na European Union ekwusiela ike na mmachi gọọmentị Naịjirịa machiri Twitter bụ imegide ikike dịrị onye kwuo uche ya.
Ha nke a mgbe ha na minista na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama zutere n’Abụja ma sị ka gọọmentị chekwaa ikike onye kwuo uche ya.
Onye na-anọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ Mary-Beth Leonards bụ onye kwuchitere ndị a sị na obi ga-adị ha mma ma Naịjirịa gaa n'ihu, na nsogbu ọbụla nwere ogbugbo ya.
N'aka nke ọzọ gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-ewechite Twitter ma ọ bụrụ na ụmụafọ Naịjirịa jiri mee ezi ihe n'ụzọ dị mma.
Onyeama sị na o nweghi oge ọbụla kpọmkwem gọọmentị kpọrọ aha iwehachite Twitter.
