E gbuola onye oyindụegwu, dịka ndịagha napụtara mmadụ 19

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha 7 Guards Battalion, Guards Brigade nke ụlọorụ ndịagha Naịjirịa anapụtala mmadụ iri na itoolu a tọọrọ, ma memilaa otu onye a na-enyo enyo na ọ na-eyi ndụ egwu.
Nke a mere oge ndị nchekwa buru agha a haziri nke ọma n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.
Onye na-arụgodu ọrụ dịka osote ọnụ na-ekwuchitere ndịagha n’isi ụlọọrụ Guards Brigade bụ Lieutenant Olawuyi Itunuoluwa kpughere nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Satọde, abalị asaa nke ọnwa Maachị, afọ 2026.
Ozi ahụ kwuru na ọ bụ n’akụkụ Gidan Dogo dị na mpaghara ọchịchị ime obodo Bwari ka ndịagha kpara ike ahụ site n’ozi bara uru ha nwetara gbasara ndị oyindụegwu aka ha dị na ntọrị ndị bi na mpaghara Byazhin dị na Bwari.
Ndịagha buru agha ahụ site na njikọaka ndị uweojii Naịjirịa nakwa ndị nche obodo.
Ozi ruru anyị aka kwuru na a na-elekọta ndị ahụ a napụtara anya, dịka ndịagha laghachiri n’ogige 'Forward Operating Base' dị na Bwari, iji gaa n’ihu na-akpagharị na mpaghara ahụ maka igbochi mpụ na omekome.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
