Anyị ga-esonye n'abụbụọrụ NLC na TUC ụcbọchị Mọnde - NUPENG
Otu ndị ọrụ Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas Workers (NUPENG) enyela ndị ọrụ ha n’Naịjirịa gba gburugburu iwu ka ha sonye n’abụbụọrụ otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) ga amalite ụbọchị Monde abali atọ ọnwa Jun afọ 2024 maka ụgwọ opekatampe ndị ọrụ.
Odeakwụkwọ NUPENG bụ Afolabi Olawale mere ka amata nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara ụbọchị Satọde Jun 1.
O kwuru na ọ bụ ihe mwute na gọọmenti etiti achọghị ime ihe ọbụla banyere okwu ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ Naịjirịa.
N’okwu ya “Ndị ọrụ na-ata afụfụ dị egwu ebe ndị ọchịchị gbara nkịtị. Anyị na-enye iwu ka ngalaba anyị niile kwadoo ma sonye n’abụbụọrụ a ga-amalite ụbọchị Mọnde.