Osote Onyeisiala Malawi, ndị ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu
Osote Onyeisiala Malawi bụ Saulos Chilima na mmadụ itoolu ndị ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu dịka ụgbọelu agha ha nọ n'ime ya kpọkasịrị.
A malitere chọwara ụgbọelu ahụ achọ na nso Ugwu dị n'ọhịa Chakangawa. ụbọchị Monde dịka ha na-aga akwamozu onye bụbu minista mba ahụ.
N'ozi ya, Onyeisiala Malawi bụ Lazarus Chakwera kwuru na o nweghị onye nọ n'ụgbọelu ahụ ji ndụ ya pụta.
A malitere chọwa ha ozigbo mana ọnọdụ ihu igwe mere ka okwu sie ike. Chilima na onyeisiala mba Malawi esighị otu pati mana ha jịkọrọ ọnụ dịka e mere ntuliaka mba ahụ afọ anọ gara aga.