Ogbunigwe
mba Isreal tụrụ n’ogige izerendụ nke otu United Nations dị na Gaza ebe ọtụtụ ndị
gbara ọsọndụ bi egbuola ihe karịrị mmadụ iri abụọ na asaa dịka ndị ọrụ si kwuo.
Ndịagha mba
Isreal kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n’ụlọakwụkwọ otu United Nations nwe bụ nke “otu
Hamas bi n’ime ya”.
Ndị ntaakụkọ
bi n’ebe ahụ gwara BBC na ụgbọelu agha nke mba Isreal tụrụ ọnụ ogbunigwe abụọ n’ime
ụlọakwụkwọ nke ogogo ya dị elu bụ ebe ndị gbara ọsọndụ bi.
Ọnụ
na-ekwuru otu Hamas ebola Isreal ebubo “igbu ọchụ”.
Ụgbọala e
ji ebu ozu nakwa ndị ọrụ gbata gbata agaala ebe ahụ na-ebuga ndị merụrụ ahụ na
ndị nwụrụ n’ụlọọgwụ nakwa ụlọozu.
Ihe onyonyo
na-efegharị na soshal midia gosiri ụlọakwụkwọ mebiri emebi nakwa ozu ndị mmadụ
a fụchiri na nkịrịka akwa n’ụlọozu.
“Agha atụọl
anyị ọnụ! A chụpụla anyị n’ụlọ anyị ọtụtụ oge. Ha gburu ụmụaka anyị mgbe ha
na-ehi ụra.” Ka otu nwaanyị merụrụ ahụ kwuru n’ihe onyonyo.
Onyeisi
ngalaba mgbasaozi otu Hamas bụ Ismail al-Thawabta jụrụ ịnabata ihe Isreal na ndịagha
otu Hamas zoro n’ime ụlọakwụkwọ United Nation ahụ.
“Ndị a na-akọ
akụkọ ụgha iji kwadoo mbụ na ọchụ ha na-egbu megide ọtụtụ ndị gbara ọsọndụ,” ka
ọ gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters.
Ụlọọrụ nchekwa
mba Isreal (Isreal Defence Forces) kwuru na ụgbọelu ha tụrụ ogbunigwe kpọmkwem
n’ogige ndị Hamas dị n’ime ụlọakwụkwọ Unrwa na mpaghara Nuseirat.
O kwuru na ha
gburu otu agha nnupuisi Hamas na otu Jihad na-eyi ndụ egwu bụ ndị so wakpoo
obodo ha n’ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba afọ 2023 nke butere ọnwụ mmadụ 1,200 ma tọrọ
mmadụ 251.
Kamgbe ahụ
e gbuola ihe ruru mmadụ 36,580 n’obodo Gaza dịka minista ahụike nke ngalaba
Hamas si kwuo.
Mba Isreal
kwuru na ha mere nyocha ọfụma iji hụụ na ọtụtụ ndị nkịtị agaghị emerụ ahụ tupu
ha atụọ ogbunigwe ahụ.