Tinubu, Chanselọ mba Jamini ga-agbakọ aka na nchekwa, ọkụ latrik - Obi ọchịchị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Bola Tinubu na Chanselọ mba Jamini bụ Friedrich Merz ekpebiela ịkwalite mmekọrịta dị n’etiti Naịjirịa na Jamini.
Ha kwuru na ebumnobi nke a bụ iji kwalite mgbakọaka n’ihe gbasara nchekwa, ọkụ latrik na ngalaba okporoigwe.
Na mkparịtaụka ha nwere n’ekwentị na mgbede Wenezde 18 Febụwarị 2026, ndị ndu abụọ ahụ gosipụtara njikere ha dị ijikọta aka kwalite ngalaba nka na ọrụaka.
N’ozi obi ọchịchị Naịjirịa wepụtara n’abalị Wenezde, Tinubu na Merz kwuru okwu gbasara atụmatụ Presidential Power Initiative, bụ nke Tinubu kwuru na Naịjirịa ga-achọ enyemaka maka nkesa ọkụ latrik.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ozi ahụ kwuru na Chanselọ mba Jamini kwere nkwa na ụlọọrụ Siemens ga-adị njikere inye aka na ngalaba ahụ, ebe ụlọakụ Deutsche Bank ga-adị njikere iji ego kwado atụmatụ ndị ahụ.
Onyeisiala Tinubu kpọkwara oku ka e zitere mpaghara Sahel ụgbọelu helikọpta ndị e jirila mee ihe iji nye aka n’ihe gbasara nchekwa na mpaghara ahụ.
















