Etu anyị si jide mmadụ anọ ọzọ aka ha dị n’ọnwụ ụmụ amaala mba Kemerun – Ndị uweojii

Ebe foto si, Anambra police command / Facebook
Ndị uweojii n’Anambra steeti akọwaala etu ha si jide mmadụ anọ ọzọ aka ha dị n’ọnwụ ụmụ amaala mba Kemerun.
Ha nyere nkọwa ahụ n’akwụkwọ ozi Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti wepụtara.
Tochukwu Ikenga kọwara na ihe ahụ mere n’obodo a na-akpọ Nando, dị n’okpuru ọchịchị Anambra East na Febuwarị 13, 2026.
O kwuru na onyeisi otu ndị omekome ahụ gbara ọsọ ma gbalaga mgbe ndị uweojii wakporo ebe ha jiri mere ọnọdụ ma jide mmadụ anọ n’ime ha.
N’okwu ya "anyị napụrụ ha egbe, mma, mgbọegbe dị icheiche nakwa ọgwụ ọtụmọkpọ ha gwọrọ".
Ikenga sị na ndị ha jidere gunyere dịbịa a na-akpọ Chukwuemeka Emmanuel e jiri “Ugoebenajah mara, dị afọ 27, onye ọzọ bụ Nwabunne Bright dị afọ 27, Chinecherem Chiama dị afọ 21 na Michael Ekwunife dị afọ 38”.
Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:








