A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. Ihe ụlọọrụ Waec kwuru maka mpụtara ule nke afọ 2023

    Mpụtara ule waec 2023

    Ebe foto si, Waec/Facebook

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ule sekọndịrị bụ West African Examination Council (Waec) ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2023.

    Ha kwuru na ọ bụ mmadụ otu nde na ụma isii lere ule ahụ (1,613,733) lere ule nke afọ a.

    Ha n’ime ndị a na ha kpachiri ule mmadụ karịrị puku narị abụọ (262,803) maka ime nrụrụaka n’ule.

    Ha kwuru na a rụchaala mpụtara ule mmadụ 1,476,565 gosipụtara pasentị 91.1% ndị lere ule ahụ ebe a ka na-agụkọ mpụtara ule mmadụ 137,168 gosipụtara.

    Ha kwuru na ọtụtụ ụmụakwụkwọ anaghịzi agụ akwụkwọ ugbua kama na obi ha na-adị n’ime nrụrụaka.

    Ha kwuru na ihe na-atụ ụmụakwụkwọ n’anya bụ na mgbọ ha na-ebu abanye n’ụlọ ebe a na-ele ule abụghị ihe na-apụta n’ulo.

    Onyeisi ụlọọrụ a na Naịjirịa bụ Patrick Areghan kwuru na ha agaghị ekwe ka ndị na-eme nrụrụaka ule mebie aha e jiri maara ụlọọrụ ha.

    O kwuru na ha ga-ememina ụmụakwụkwọ maọbụ ụlọakwụkwọ ọbụla na-akwado nrụrụaka n’ule waec.

    O kwuru na ha nwuchiri ndị nwere ogige ebe a na-ele ule a kpọrọ ‘miracle centre dị n’Abia, Borno, Imo, Ogun na Oyo steeti.

  2. Ndịagha weere ọchịchị n’ike na Niger ahọpụtala Praịm minista ọhụrụ

    Ali Mahaman Lamine Zeine, praịm minista ọhụrụ ndịagha Niger họpụtara

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Zeine arụọla ọrụ dịka onye nchịkọta obiọchịchị nakwa minista akụnaụba site n’afọ 2001 ruo 2010

    Ali Mahaman Lamine Zeine ga-anọchi anya Mahamadou Ouhoumoudou, bụ onye mere njem na mba ofesi mgbe e weere ọchịchị n’ike ahụ.

    Akụkọ kwuru na Zeine nọ n’ihe dịka agbata afọ iri ise ma rụọ ọrụ dịka onye nchịkọta obiọchịchị nakwa minista akụnaụba site n’afọ 2001 ruo mgbe ndịagha chụturu Onyeisiala Mamadou Tandja n’afọ 2010.

    Ọnụ na-ekwuru ndịagha kwupụtara nhọpụta ya n’ihe onyonyo TV gọọmenti nwe a kpọrọ Télé Sahel n’abalị Mọnde.

    Zeine arụọla ọrụ n’ụlọakụ ‘African Development Bank dị na mba Chad, Ivory Coast nakwa Gabon na nso nso a dịka otu ngalaba mgbasaozi n’ịtaneti bụ Actu Niger siri kwuo.

    N’otu aka ahụ ndịagha họpụtakwara ọchịagha Amadou Didilli dịka onyeisi kọmitii na-ahụ maka udo nakwa ọchịagha Abou Tague Mahamadou dịka onyeisi nchịkọta ndịagha.

    A kpọpụtara aha Ibro Amadou Bachirou dịka onyeisi ndị ọrụ onyendu ha ebe Halibou Assoumane bụ onyendu ndị nchekwa onyeisiala a kpọrọ ‘presidential guard’.

  3. Mba Amerịka etinyela ọnụ n’okwu iwere ọchịchị n’ike mere na Niger

    Ndịagha weere ọchịchị n'ike na mba Niger

    Ebe foto si, Reuters

    Onye ọrụ mba Amerịka ọkwa ya gbagotere elu na ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba Niger nwere mkparịtaụka banyere ihe na-eme na mba ahụ.

    Victoria Nuland na-arụ ọrụ dịka osote odeakwụkwọ gọọmenti mba Amerịka kwuru na mkparịtaụka ahụ “si n’ala ala obi ma sie ike”.

    Obi ọchịchị mba Amerịka kwuru na a ga-egbo nsogbu a site na mkparịtaụka udo ma kpọghachị Onyeisiala Mohamed Bazoum n’ọchịchị mana ha akwụsịtụla ụgwọ enyemaka ha na-enye mba Niger ugbua.

    Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakwụkwọ okwu n’obodo Niamey, Nuland kwuru na mba Amerịka ga-enye aka ma ọ bụrụ na ndịagha kpachiri ọchịchị n’ike chọrọ iweghachị ya n’aka ndị nkịtị.

    O kwuru na o zutere onyeisi ọrụ ndịagha bụ ọchịagha Moussa Salaou Barmou kama na ekweghi ya zute onye ndu ọhụrụ mba Niger bụ ọchịagha Abdourahamane Tchiani maọbụ onyeisiala Bazoum.

    O kwuru na ọ gwara ha ihe izendu dị na ndịagha a ịkpọtụrụ ndịagha Wagner nke Russia ka ha bịara ha aka n’ịchekwa mba a.

    “Ndị a weere ọchịchị maara ọghọm ga-eso ma ọ bụrụ ha kpọtụrụ ma nabata enyemaka ndị otu nchekwa Wagner nke mba Russia.”

    Cheta na ọchịagha Tchiani bụbu onyeisi ndị nchekwa Onyeisiala Bazoum weere ọchịchị n’ike n’ụbọchị 26 Julaị, 2023 ma kwuo na ọ chọrọ igbochi “mmebi mba Niger ji nwaayọọ na-emebi”.

    Ndị ndu otu Ecowas ekwuola na ha ga-ezukọ n’ụbọchị Tọzde 10 Ọgọọst iji mee kpebi dịka oge ha nyere ndịagha iweghachị ọchịchị gacharala.

    Maapụ na-egosi mpaghara Sahel nke Afrịka
  4. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Obi sara mbara ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa niile.

    Daalụ!

  5. Ministeriel list: Etu nnyocha aha Festus Keyamo si kpata mkpọtụ n’ime ụlọomeiwu Naịjirịa

    Festus Keyamo

    Ebe foto si, Festus Keyamo/Facebook

    Dịka a nọzị n’agba ikpeazụ n’usoro nnyocha ndị a họpụrụ dịka ndị minista ga-anọ n’ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu, mkpọtụ dapụtara n’ụlọomeiwu Naịjirịa n’ụbọchị Mọnde a oge amalitere ime nnyocha Festus Keyamo.

    Keyamo onye rụbụrụ ọrụ dịka minista steeti nakwa ọrụ na owuwe ọrụ n’oge ọchịchị Muhammadu Buhari bụ onye ikpeazụ ndị ụlọomeiwu Naịjirịa nyochara n’ime mmadụ 48 onyeisiala Tinubu họpụtara dịka ndị minista ya.

    Mpụta Keyamo n’ihu ndị ụlọomeiwu malitere ikpata okwu mgbe Darlington Nwokocha bụ onye omeiowu na-anọchịte mpaghara Abia Central Senatorial District kwuru ka a kwụsị ya bụ nnyocha nwa mgbe nta.

    Ogbo ya bụ Enyinnaya Abaribe nke na-anọchịte mpaghara Abia-South Senatorial District ji ọsọ nabata mkpesa a.

    Onyeisi ụlọọmeiwu bụ Godswill Akpabio gwara ndị ụlọomeiwu tụọ vootu maka mkpesa a mana ya bụ okwu tasuuru ọkụ dịka mkpọtụ malitere ịda n’etiti ndị omeiwu a.

    Nke a mere Akpabia jiri kwụrụ ọtọ gwaa ndị ụlọomeiwu okwu iji dajụọ mkpọtụ ndị dapụtara ebe ahụ. Onyeisi ndị ụlọomeiwu nke pati nọ n’ọchịchị bụ Opeyemi Bamidele, mechara rịọ ka e mezie ya bụ ọgbakọ na nzuzu ma ghara ịgba ya n’anwụ.

    Ka ọ dị ugbua, o dobeghi anya ihe ha kpara ka a gbachiri ụzọ mezie ọgbakọ a.

    Darling Nwokocha bụ onye wepụtara okwu etu Keyamo siri jụ ịpụta zaa ndị ụlọomeiwu oku metụtara ebubo nrụrụaka n'oge gara aga

    Ebe foto si, Darlington Nwokocha/Facebook

    Nkọwa foto, Darling Nwokocha bụ onye wepụtara okwu etu Keyamo siri jụ ịpụta zaa ndị ụlọomeiwu oku metụtara ebubo nrụrụaka n'oge gara aga

    Kedụ ihe kpatara okwu a?

    Nwokocha ji iwe kwuo na Keyamo kparịrị ndị ụlọomeiwu a nke agba ọchịchị itoolu n’oge nke Buhari ma boo ya ebubo nrụrụaka.

    O kwuru na a kpọbuola Keyamo oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ihu ụlọọmeiwu ajhụ maka okwu otu ọrụ (Special Public Works programme) e nyere ministri ya oge ahụ ka ọ rụọ mana o kweghị bịa zaa oku a kpọrọ ya .

    Ọ bụ ngalaba ‘National Directorate of Employment (NDE)’ bụ otu n’ime ngalaba ndị nọ n’okpuru ministri Keyamo na-elekọta mgbe ahụ ka e nyere ya bụ ọrụ.

    N’afọ 2020, gọọmentị etiti Naịjirịa wepụtara ego ijeri narị 52 maka atụmatụ iwe ndị ntorobịa mmadụ 1,000 n’ọrụ ruo ọnwa atọ bụ ndị ga-esi okpuruọchịchị 774 dị na Naịjirịa ma kwuo ha ụgwọ N20,000.

    Mana ụfọdụ okpuruọchịchị kwuru na atụmatụ a eruteghi ha aka ma ncha.

    Nwokocha kwuru na mgbe a malitere ime nnyocha n’okwu a na otu kọmịtịị ụlọomeiwu na-ahụ maka ego kpọrọ Keyamo oku mana o kweghị bịa dịka o kwuru na ndị Sịnetị chọrọ iburu ya.

  6. Niger coup: Ecowas ekwuola okwu mbụ ha kemgbe oge ikpeazụ ha nyere ndịagha weghaara ọchịchị iweghachi ya

    Ụfọdụ ndị na Niger na-efezi ọkọlọtọ mba Russia dịka ha na-ekwu na ha chọghịzị nkwado mba France bụ mba chịbụrụ ha n'oge gara aga.

    Ebe foto si, EPA

    Otu jịkọrọ mba ndị nọ n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ Ecowas ekwuola na ha ga-enwe nzụkọ n’isi obodo Naịjirịa bụ Abụja n’ụbọchị Tọọzde kpaa ihe ha ga-eme maka mweghara ọchịchị ndịagha mere na mba Niger.

    Cheta na otu Ecowas nyeburu ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a abalị asaa malite n’ụbọchị Sọnde abalị 30 nke ọnwa Jụlaị ruo ụbọchị Sọnde abalị isii nke ọnwa Ọgọọstụ iji weghachite ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Ecowas kwuru na ọ bụrụ na ndị a emeghị nke a na ha nwereike iji aka ike site n’iziga ndịagha ebe ahụ ka ha weghachite ọchịchị a.

    Mana ụbọchị Sọnde gara aga ruru, ndị weghaara ọchịchị a emeghi ihe Ecowas chọrọ.

    Ka ọ dị ugbua, mba Mali na Burkina Faso bụkwa mba Afrịka abụọ ebe ndịagha wegharala ọchịchị n’ime ha na nso nso a, ezigala nnọchịteanya ha ka ha gaa Niger iji nye ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a nkwado.

  7. Ihe ga-emezi ugbua dịka oge Ecowas nyere ndịagha Niger gwụrụla

    Ndị ndu otu Ecowas

    Ebe foto si, Ecowas Twitter

    Ndị ndu otu Economic Community of West African States (Ecowas) ekwuola ha ga-eme ọgbakọ n'ụbọchị Tọzde 10 Ọktoba, 2023 n'Abuja banyere ihe ha ga-eme maka ndịagha weere ọchịchị n'ike na mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ụbọchị asaa ha nyere ndịagha Niger iji weghachị ọchịchị n’aka onyeisiala ha chụpụrụ gwụrụla.

    Ecowas kwuru na ọ bụrụ na ha enyeghachịghị Mohamed Bazoun ọchịchị na ha ga-eme ihe ọbụla ha kwesịrị nke gụnyere iji ndịagha amanye ha n’ike.

    Ndịagha Niger kwuru na ha agbachiela ihueliugwe ha ka ụgbọelụ ọbụla ghara ifepu maọbụ febata na mba ha.

    Ugwu ndị Ecowas nọ na nkiri ugbua maka na ha ṅụrụ iyi na ndịagha agaghị ewere ọchịchị n’ike ọzọ.

    Na Naịjirịa bụ ndị agbataobi Niger, ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọku ka Ecowas were mkparịtaụka udo mezie nsogbu a ma ghara ibuso Niger agha.

    N’otu aka ahụ gọọmentị mba Italy na Germany akpọkuola ndị ndu Ecowas ka ha gbatịa oge ha nyere ndịagha Niger iweghachị ọchịchị n’aka onyeisiala Mohamed Bazoum.

    Praịm minista mba Italy gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ naanị otu ihe ka e ga-eme nke bụ isoro ụzọ udo.

    N’otu aka ahụ minista Germany na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ akpọọla oku ka e were ụzọ udo na-abụghị ịlụ agha.

    Ecowas akatọọla iwere ọchịchị n’ike ndịagha merela n’ihe ruru ugboro asaa kamgbe afọ atọ.

  8. A machiela ụgbọala nwere 'tinted glass' n'Enugwu Steeti

    Ụzọ Agbani dị n'Enugwu

    Gọọmentị Enugwu steeti amachiela ndị mmadụ ịnya ụgbọala glassị dị na mpo ha jiri nji a kpọrọ ‘tinted glass’.

    Ha kwuru na nke a so na mbọ gọvanọ Peter Mbah nke steeti ahụ na-agba iji buo agha megide ndị omekaome na ndi ohi na steeti ahụ.

    Akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ gọọmenti Enugwu bụ Chidiebere Onyia kwuru mmachi ahụ ga-adị ire malite n’ụbọchị 4 nke ọnwa Sepụtemba 2023.

    Iwu a kwuru na a ga-ejichi ụgbọala ọbụla dara iwu a ruo mgbe ọ ga-ewepụ mpọ agwa oji ahụ ma kwụọ ụgwọ nha na-eso ya.

    “Ọ dị mkpa ịmata na ihe mere e jiri tinye mmachi a bụ maka iji belata oke mpụ, ntọrị mmadụ nakwa ọrụ ndị omekaome n’Enugwu steeti”

  9. Ndịagha Niger agbachiela ụgbọelu ifepu na ifebata na mba ahụ

    Ndịagha Niger

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ndu ndịagha Niger agbachiela ụgbọelu ifepu maọbụ ifebata na mba ahụ maka inupuisi n’iwu otu Ecowas nyere ha ka ha nyeghachị ndị nkịtị ọchịchị.

    Na mgbasaozi ọnụ na-ekwuru ha mere na TV, kwuru na a gbachiela ihu eluigwe ha megide ofufe ụgbọelu ọbụla na onye dara iwu a ga-anata ntaramahụhụ ruru ya.

    Cheta na Ecowas kwuru na ha ga-eji uzọ udo mezie ọgbaghara ahụ mana dọọ aka na ntị na ha dịkwa njikere iji ndịagha anapụ ndị a ọchịchị.

    Ndịisiala mba ndị dị na mpaghara ahụ ga-ekpebi nke a. Mana mba Burkina Faso na Mali gbara Niger n’akụkụ bụkwa ndịagha na-achị kwuru na ha ga-adọnyere ndịagha Niger ukwu ma ọgbaghara dapụta.

    Mba Briten na France kwuru na ha ga-akwado Ecowas na mkpebi ọbụla ha mere banyere iwere ọchịchị n’ike ahụ ma ọ gụnyere iji ndịagha wakpoo Niger.

    Niger so na mba ndị kachasị emepụta akụrụngwa Uranium, ha na-agbakwa mbọ n’Afrịka nakwa n’ụwa ibuagha megide ndị oyi ndụ egwu ‘Jihad’ nwere agba n’otu Islamic State nakwa al-Qaeda.

  10. Igbo mma mma nụ ooo

    Ọ bụ n'olu ndị Ibeku, Umuahịa nke Abia steeti ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Biko buru oche gị bịa gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa nakwa Naịjirịa na Afrịka.

    Daalụ!

  11. Niger Coup: Ụbọchị ikpeazụ Ecowas nyere ndị weghaara ọchịchị iweghachi ya eruola – egwu dị na mpaghara ugwu Naịjirịa

    Echiche na-eche Zainab Saidu banyere ihe ga-eme ezinaụlọ ya ma e ziga ndịagha ka ha gaa Niger

    Ebe foto si, GIFT UFUOMA/BBC

    Nkọwa foto, Echiche na-eche Zainab Saidu banyere ihe ga-eme ezinaụlọ ya ma e ziga ndịagha ka ha gaa Niger

    Ọ fọrọ awa olemaole ka ndịagha weghaara ọchịchị na Niger nyeghachie onyeisiala Mohamed Bazoum nke ha wepụrụ n’ọchịchị ọkwa ya, ma ha emeghi nke a, Ecowas nwereike iziga ndịagha ebe ahụ ka ha tinye aka na nyeghachi ọkwa a.

    N’ụbọchị Sọnde gara aga, ndị isi otu jịkọrọ mba ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka (Ecowas) nyere ndịagha weghaara ọchịchị na Niger otu izuụka ime ihe ha chọrọ maọbụ ha “e jiri aka ha mee ihe... nke gụnyere iji ikike ndịagha”.

    Mana na mba agbataobi Niger bụ Naịjirịa – bụ ebe ọtụtụ ndịagha Ecowas na-achọ iziga si, amalitela ịnụ ụda olu ndị mmadụ na-ekwu na ha achọghi ka Ecowas ziga ndịagha ebe ahụ ugbua.

    Mba abụọ a (Naịjiria na Niger) nwere ọtụtụ mmekọ nke gụnyere njịkọ agbụrụ nakwa akụkọ ihe ndị mere na mgbe ochie.

    N’akụkụ Sokoto bụ ebe e nwere okeala jịkọrọ mba abụọ a, ma bụrụkwa ebe ogigi ndịagha Naịjirịa nke 8 Division nọ, ndị mmadụ chị obi n’aka ugbua.

    Otu n’ime ihe na-akpata egwu a ugbua dịka ndị bi ebe ahụ siri kwuo bụ na otu n’ime mmadụ ise na Sokoto si Niger maọbụ nwee ezinaụlọ ndị si ebe ahụ.

    Akụkụ Sabon-Gari Girafshi nke Sokoto bụ ebe ọtụtụ ndị si mba Niger bi. Egwu ndị a bụ na Ecowas ziga ndịagha na Niger ọ ga-emetụta ndị ezinaụlọ ha dịka ya bụ ihe ga-emetụta nchekwa Naịjirịa.

    Maazị Sulaiman Ibrahimonye gbara afọ 51 bi n’akụkụ ebe ahụ. Otu n’ime nwunye nakwa ụfọdụ ụmụ ya atọọla na Niamey bụ isi obodo Niger n’ihi mweghara ọchịchị a mere n’ọnwa gara aga.

    Maazị Ibrahim na-agba mbọ ịnụ olu ndị ezinaụlọ ya bi na Niger kemgbe mana ya bụ ihe amịtabeghị mkpụrụ

    Ebe foto si, GIFT UFUOMA/BBC

    Nkọwa foto, Maazị Ibrahim na-agba mbọ ịnụ olu ndị ezinaụlọ ya bi na Niger kemgbe mana ya bụ ihe amịtabeghị mkpụrụ

    Maazị Ibrahim gwara BBC na ọ nwaala ịkpọ nwunye n’ekwentị ugboro ugboro kemgbe mweghara ọchịchị a mere mana ọ nwebeghi ihe nụ olu ya n’ihi teknụzụ anaghị ekwe atụmatụ a mezuo.

    O kwuru dịka ihu ya gosiri na oke echiche na-eche ya:

    “Ọ bụrụ na e ziga ndịagha Ecowas ka ha gaa Niger, obi ga-aka koro ọha ndị mmadụ n’elu. Nke m ka njọ ugbua n’ihi mụ na ndị ezinaụlọ m anọkọghị dịka ma enweghi ozi ọbụla banyere etu ha dị ugbua”.

    O mechara mepee ekwentị ya gosi ndị ntaakụkọ BBC foto nwa ya nwoke dị afọ 18 nakwa nwa ya ọzọ so na ndị tọrọ na Niger nke enwebeghi ike nụ olu ha kemgbe mweghara ọchịchị a.

    Mana ọ bụghị naanị Sulaiman ka okwu a na-emetụta. Kwa ụbọchị ọ na-aga mba agbata obi Niger ajụ ese ma enweela onye nụrụ ihe ọbụla gbasara ndị ezinaụlọ ya.

    Mohamdu Ousman gbara afọ 43 gwakwara BBC na ya akwadoghi atụmatụ Ecowas iziga ndịagha ka ha gaa Niger o kwuru ‘Nke a dịka mmadụ iji aka ya kagbuo akụkọ ihe niile mere n’oge gara aga’.

    Zainab Saidu bụ onye mba Niger dị afọ 59 kọwara na egwu ji ya maka nchekwa ya na ezinaụlọ ya dịka o biela na Sokoto ogologo oge ma lụọ onye Nigeria ugbua.

    Ọ gwara BBC

    ‘Ezigbo echiche na-eche ugbua, ụjọ ji anyị niile bụ ndị mba Niger ọkachasị kemgbe anyị nụrụ na mba Naịjirịa nwereike iziga ndịagha ka ha ga-buso agha na Niger”.

    Agbanyeghi na Ecowas na-achọkwa isi ụzọ mkparitaụka udo nweta ihe ha na-achọ ndị isi ọrụ nchekwa otu Ecowas zigaara ndị isi otu a akwụkwọ atụmatụ ibuso agha ha.

    Ijikwa hụ na ndịagha a weghaara ọchịchị mere ihe otu Ecowas chọrọ, otu a enyela ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a ọtụtụ mmachị ma gbachie okeala niile e si abata ma na-apụ mba Niger. Mba Naịjirịa kwụsịkwara inye mba Niger ọkụ latrịk nke bụ na ya bụ ihe emetụtawala ndị bi na Niger. ]

    Ego fọrọ n'akpa Abdullahi agwụchawala dịka ọ maghị ihe ọ ga-eme ugbua

    Ebe foto si, GIFT UFUOMA/BBC

    Nkọwa foto, Ego fọrọ n'akpa Abdullahi agwụchawala dịka ọ maghị ihe ọ ga-eme ugbua

    Otu obodo nọ na mpaghara okeala Niger bụ Illela, abụrụla ebe ihe a na-eme na-emetụta nke ukwuu dịka ọtụtụ nnukwu ụgbọala ndị bu ibu enwebeghi ike gafee, ndị ọkwọ ụgbọala bu ya bụ ụgbọala amaghịzi ihe ha ga-eme dịka ha chị obi n’aka eche ihe ga-me ugbua.

    Ụfọdụ n’ime ha gwara BBC na ngwa ahịa ha bụ amalitela imebesi dịka ụfọdụ kwuru na ego ha ji n’akpa agwụla mkpa mkpa.

    Otu onye ọkwọ ụgbọala nke aha ya bụ Abdullahi kwuru:

    ‘Atọọla m ebe kemgbe abalị atọ gara aga”

    “Enweghizi m ego ọbụla, ọ bụ otu enyi zụtara m nri m riri n’ụtụtụ a”.

    Ndị ogbo ya niile nọ n’akụkụ ebe ahụ nọchazị ka ndị ume pụrụla n’ahụ.

    Enweghi onye ma ka ihe ga-esi gaa ugbua dịka ndị obi kooro ọha n’elu mana ka ihe si dị ugbua, ọ bịara dị ka ndịagha a weghaara ọchịchị a enweghi ebumobi ime inyeghachi ọchịchị a ugbua.

    Foto gosiri etu Niger na Naịjirịa siri nọrọ nso
    Nkọwa foto, Foto gosiri etu Niger na Naịjirịa siri nọrọ nso
  12. Anyị ga-echekwa ọchịchị 'democracy' na-agbanyeghi ihe ọ ga-efu - Ndịagha Naịjirịa

    Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Taoreed Lagbaja

    Ebe foto si, Nigerian Army

    Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ ọchịagha Taoreed Lagbaja ekwuola na ndịagha Naịjirịa ga-echekwa ọchịchị onye kwuo uche ya (Democracy) na-agbanyeghi ihe ọbụla ọ ga-efu.

    Ọchịagha a kwuru nke a n’emume mpụta n’ụlọakwụkwọ ụfọdụ ndịagha e mere n’ụlọakwụkwọ ndịagha dị na Jaji Kaduna steeti dịka ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Onyema Nwachukwu wepụtara n’ozi.

    O kwuru na ihe kachasị mkpa na Naịjirịa n’oge a bụ ọchịchị onye kwuo uche ya, na ndịagha ga-ebu ya b’obi mgbe niile ha inyeaka ka obodo dịrị n’udo bụ isisekpu n’ọrụ ha dịka ndịagha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe bụ ebumnobi onye Naịjirịa ọbụla bụ ichekwa ọchịchị onye kwuo uche ya ka obodo dịrị n’udo ma chekwaa ndụ onye Naịjirịa ọbụla na-agbanyeghi akpụrụ na okpukperechi onye ahụ.

    “Ya mere, ana m akpọku ndịagha Naịjirịa niile ka ha tinye aka ịhụ ọchịchị onye kwuo uche ya kwudosiri ike, nke ga-eme ka udo dị ma gbochie itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ha na-arụ ọrụ.” ka onyeisi ndịagha kwuru.

    O gbatịkwara olu na ebumnobi ndịagha bụ ichekwa ndụ na akụnaụba n’obodo.

    Ọchịagha Lagbaja kwuru na ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọrụ na-agba mbọ ịhụ ụtụtụ na abalị ịhụ na ha chekwara obodo.

    N’otu aka ahụ mgbe ọchịagha Naịjirịa na-ekwu okwu n’ọgbakọ otu Ecowas nyere ndịagha ahụ kpachiri ọchịchị n’ike na mba Niger otu izuụka ka ha nyefekwa ọchịchị n’aka onyeisiala ha bụ Mohamed Bazoummaọbụ ha ezute ntaramahụhụ gụnyere iji ndịagha ebuso ha agha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. D'Tigress nke Naịjirịa amaburula Iko asọmpị nkata ụmụnwaanyị Afrịka

    Otu egwu bọọlụ nkata ụmụnwaanyị Naịjirịa

    Ebe foto si, DTigress

    Otu egwuregwu bọọlụ nkata ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ D’Tigress amanutela Iko asọmpi bọọlụ nkata ụmụnwaanyị Afrịka a kpọrọ ‘AfroBasket Women’ nke ugboro anọ n’otu usoro.

    Ha mere nke site n’iji akara 84 asatara 74 merie otu bọọlụ nkata ụmụnwaanyị Senegal n’asọmpi nke ikpeazụ a kụrụ na Kigali mba Rwanda.

    Ugbua Naịjirịa na Senegal ahatala na mba abụọ mabuuru iko ugboro anọ n’otu usoro.

    Naịjirịa mere nke a site n’imeri asọmpi anọ niile ha kụrụ na Kigali, dịka ndị ọkụ bọọlụ dịka Amy Okonkwo mere nke ọma site n’ịbụ onye kachasị kụta aka ya n’asọmpi a (Most Valuable Player).

    Dịka ọ dị ugbua, Senegal gbara ndị abụọ, Mali gbara ndị atọ ebe Rwanda a haziri asọmpi a na mba ha gbara ndị anọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Obi ọma ka anyị ji asị unu nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

  15. A na-eme nnyocha dị omimi n'akwụkwọ ọrụ ụlọọrụ CBN - Onyeisiala Tinubu

    Onyeisiala

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

    Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na a na-eme ọrụ nnyocha dị omimi n'ime akwụkwọ ọrụ Ụlọakụ etiti Naịjirịa dịka o kwuru na a ga-eme mgbanwe usoro ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ Bekee Naịjirịa.

    Dịka akwụkwọ ozi onye ọrụ mgbasaozi ya bụ Ajuri Ngelale siri kwuo, onyeisiala Tinubu gbara nke a n'anwụ na mkparịtaụka ya na onyeisi Ụlọakụ ụwa bụ Ajay Banga nwere n'ime obi gọọmentị etiti n'ụbọchị Fraịdee.

    "Amalitela ọrụ nnyocha dị omimi n'ụlọakụ etiti Naịjirịa. Anyị ga-eme mgbanwe siri ike n'usoro ịkwụ ndị ọrụ Bekee ụgwọ ọnwa ha. Ọ bụ ihe ịtụnanya ụdịrị ọnụọgụgụ anyị na-ahụ mana a hụbuola m ihe dị etu a oge m rụrụ ọrụ na steeti".

    Ọ gara n'ihu kwuo:"Mgbanwe kwụdoro mbọ Naịjirịa na-agba ịhụ na ime azụmahịa dị mfe na mba a. Anyị ga-akpachi ebe niile e si emefu ego aghara aghara. Mgbanwe ga-etinye anya n'usoro ọrụ, agwa ndị mmadụ n'ọrụ nakwa inye ndị mmadụ ọzụzụ zuru okè maka ọrụ ha. Ọ bụ ihe ga-agala oke ọnụ mana any ga-eme ya."

    Onyeisi Ụlọakụ ụwa nyere ụlọọrụ na-eme nnyocha a bụ Bretton Woods institution ntụziaka ka ha chetakwa na Naịjirịa bụ mba ebe ndị mmadụ na-agba ezigbo mbọ ma hara ile Naịjirịa anyị dịka mba ebe ndị mmadụ na-ata ahụhụ naanị. N’okwu ịgbapụta ụmụafo Naịjirịa n'aka ụbịam, onyeisiala Tinubu rịọrọ ka Ụlọakụ ụwa tinyere Naịjirịa na ya bụ ọrụ ime nke a dịka nke a ga-akwalite mmekọ ụlọọrụ ahu na mba Naịjirịa. O kwukwara okwu metụtara mbọ Naịjirịa maka mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala, okwu ibi ego n'aka ndị mba ofesi, ndakpo akụnụba, nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Niger Coup: Oge ime mkpebi ngwa ngwa adanyela n’isi mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka

    Oge ime mkpebi ngwa ngwa adanyela n’isi mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Oge ime mkpebi ngwa ngwa adanyela n’isi mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka

    Ka abalị asaa ndị isi mba Ọdịda Anyanwụ Afrịka nyere ndịagha weghaara ọchịchị na Niger ka ha weghachite onyeisiala Mohamed Bazoim dịka onye ọchịchị ọzọ na-eru, ugbua abụrụla oge ma ndịagha ma ndị ọchịchị a ime ezigbo mkpebi siri ike ma me ya ngwa ngwa.

    N'ụbọchị ụka gara aga, otu jikọrọ mba ndị ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas nke onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na-edu nyere ndịagha a ndị weghaara ọchịchị na Niger iwu ka ha weghachite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ maọbụ ha e jiri aka ike site n'ụzọ ndịagha mee ha ka ha mee ihe ha kwuru.

    Otu Ecowas enyela ndị nọ n'isi mweghara ọchịchị a otutu mmachị nakwa ntaramahụhụ dịka mba Naịjirịa kwụsịrị inye mba Niger ọkụ latrik. A gbachikwara okeala jikọrọ mba a na mba ndị ọzọ nke pụtara na ha agaghị enweike bubata ngwa ọbụla maọbụ mee azụmahịa ọbụla. Ihe nke a pụtara bụ na mba a nke mba ndị ọzọ gbara okirikri abụrụla ndị na-agaghị enweike si ụzọ ọdụ ụgbọ mmiri ọbụla mee njem ọbụla maọbụ bụbata ngwa ahịa.

    Mana dịka ndị mmadụ chi obi n'aka echi ihe ga-eso okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, okwu inwe mkparịtaụka maka udo nakwa okwu ikike ndị agha ịsọ mpi, kedụ ihe nwereike ime n'oge a ma ọ bụrụ na abalị asaa a gachaa?

    1. E nwereike ịdọtị oge e nyere ndị a

    Otu ihe ndị isi Ecowas nwereike ime bụ ịdọtị oge a e nyere ndịagha a weghaara ọchịchị agbanyegi na nke a nwereike ịbụ ihe a ga-eme ụfọdụ ahụta ha ka ndị na-agba egbe ọnụ mana otu nwereike ịsịkwa na atụmatụ mkparịtaụka udo ha na-eme ebe ahụ na-amịta mkpụrụ nke mere ha ji chọọ ịdọtị oge a. Mana nke bụ nsogbu ugbua a bụ na atụmatụ mkparịtaụka udo a Ecowas na-anwa ime ebe ahụ amalitebeghi ịchịta aja dịka otu onye otu Ecowas zigaara mba ahụ maka atụmatụ a n’ụbọchị Tọọzde gba aka lọta. Mana ndịagha weghaara ọchịchị a jizi iwe gosi etu obi dị ha nye mba ndị ofesi nakwa otu Ecowas. Ha zipụtara ozi kwuo na ha mba Naịjirịa, Togo, mba Amerịka na France agaghịzi na-enwe mmekọ ma kagbuo nkwekọrịta ha na mba France nke chịbụru ha bụ nkwekọrịta kwuru ha ndịagha ha ruru mmadụ 1500 nweeike ịnọ na mba Niger.

    Onyeisiala Bazoum onye ka nọ n'aka ndịagha zipụtara ozi nye ụlọ ntaakụkọ the Washington Post nke okwu ya dara ụda n'ime ya mgbe o depụtara onwe ya dịka onye "e ji eji" ma rịọ mba Amerịka nakwa mba ofesi ndị ọzọ ka bịa nyereaka weghachite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya ebe ahụ.

    N'ụbọchị Fraịdee, mba Amerịka kwuru na ha ga-akwụsịtu ụfọdụ ọrụ enyemaka ha na Niger mana ha ga-aga n'ihu na-eziga enyemaka nri na enyemaka maka ndụ ndị mmadụ.

    2. Ha nwereike nwee nkwekọrịta oge ha ga-eweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya

    Iji dajụọ ọkụ na-agba ebe ahụ, ndị nọ n'isi mweghara ọchịchị a na ndị isi Ecowas nwereike kpebie ma nwee nkwekọrịta oge a ga-eweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya. Nke a nwekwaraike ịgụnye ntọhapụ onyeisiala Bazoum na ndị ọchịchị ndị ọzọ e ji eji, iji hụ na mkparịtaụka na-aga siriri werere nakwa iji nwetakwuo oge. Nke a bụ ihe ọtụtụ ndị na-akatọ mweghara ọchịchị a n'Afrịka na-achọ.

    Ecowas anabatala usoro mweghachi ọchịchị nke mba Mali na Burkina Faso bụ mba ebe ndịagha weghaara ọchịchị n'afọ olemaole gara aga. Agbanyeghị nke a mkparịtaụka mweghachi ọchịchị abụrụla ihe nsogbu dịka ịdọtị oge ntuliaka cheere aka mgba mana ndị nọ n'isi weghara ọchịchị ebe ndị a ka na-ekwe nkwa nyeghachi ndị nkịtị ọchịchị.

    Mba Sudan nke mepụtara otu pụrụiche nke jikọrọ ndị nkịtị na ndịagha na 2019 kara ịbụ ihe ezi immatụ n'ụdịrị okwu ndị metụtara inyeghachi ndị nkịtị ọchịchị mana etu mba a siri danye n'ọgbaghara na nso nso a emeela ka ihe a bụrụ ihe a ga-echebara echichi tupu e mee.

    3. Iziga ndịagha

    Ndị isi Ecowas ekwughị kpom kwem na ha ga-eji ikike ndịagha zute ndị weghaara ọchịchị a ma ọ bụrụ na e weghachiteghi onyeisiala Bazoum n'ọkwa ya kama ha nyere ohere gosiri na nke a kwekwaraike ịbụ ụzọ ha ga-eso. Ndị isi agha Nigeria ekwuola na ụzọ a ga-abụ "ụzọ ikpeazụ ha ga-eso".

    Onyeisiala Tinubu kwuru na e nwereike iziga ndịagha "iji hụ na ndị a weghaara ọchịchị mere ihe a chọrọ ma ha gaa n'ihu gbaa isi akwara" Ecowas emeela ihe dị etu a n'oge gara aga dịka na mba Gambia mgbe Yahya Jammeh jụrụ iritu n'ọkwa ọchịchị agbanyegi na ọ nweteghi mmeri na ntuliaka. Mana okwu iso ụzọ dị etu a n'oge a bụ ike ka taa ezigbo akpụ.

    Ihe aka mgba nke mbụ, mba Niger bụ mba kacha buo ibu ma ekwukwe okwu ala na mpaghara ọdịda anyanwụ niile ebe mba Gambia pere ezigbo mpe, nke a pụtara na iziga ndịagha ebe ahụ agaghị adị mfe ma ncha.

    Nke abụọ, Naịjirịa bụ mba nwere agba na mpaghara ma nọrọ n'isi ịchọ ka e weghachite ọchịchị onyeisiala Bazoum nwekwara nsogbu na na-echere ya aka mgba n'ụlọ bụ nsogbo enweghị nchekwa nke a pụtara na ịzipụ ọtụtụ ndịagha n'oge a ga-abụ ihe tara ezigbo akpụ.

    Nke atọ, ma Mali nakwa mba Burkina Faso ekwuola na e ziga ndịagha na Niger maka okwu a na ha ga-ahụta ya dịka "ịkpọ oku agha" nke bụ na ha ga-apụta n'igwe bịa lụchitere mba Niger agha.

    Nke a abụrụla ihe siri ike dịka okwu a nwereike itasuru ọkụ ma ghọọ agha metụtara mpaghara ọdịda anyanwụ niile.

    Marakwa na mba Niger na mba Naịjirịa nwereike ọtụtụ mmekọ dịka ụfọdụ ndị na mba abụọ sị otu agbụrụ ma na-asụ otu asụsụ nke nwereike ime ka ndịagha Naịjirịa gara ịchọ imetụta "ụmụnne ha.

    Mba ndị dịka Algeria, China na Russia arịọla ka a ghara isi ụzọ ndị agha kama ka e si ụzọ mkparịtaụka kpezie okwu a.

    Dịka ha nwechara ọgbakọ ruru abalị atọ n'Abuja, ndị isi agha otu Ecowas kwuru na ha edepụtala atụmatụ ibu agha na Niger ma nyefee ya ndị isi Ecowas ka ha leba anya.

    Mba Naịjirịa Ivory Coast, Senegal na Benin ekwuola na ha dị njikere iziga ndịagha ha na Niger ma ọbụrụ ndị isi Ecowas kpebie isi ụzọ iziga ndịagha.

    Dịka ndepụta akwụkwọ ozi "Global Fire Power index" siri kwuo, Naịjirịa na onwe ya nwere ndịagha ruru 135,000 ebe Niger nwere naanị 10,000 mana nke a apụtaghị na izi ndị agha ebe ahụ ga-abụ ofe nracha.

    Isi ụzọ udo bụ ihe ga-akacha mma nye mmadụ niile okwu a metụtara mana otu Ecowas ga-achọkwa igosi onwe ha ọkachasi dịka ha enwebeghi ike gbochie mweghara ọchịchị na-arị elu na mpaghara ahụ n'afo atọ ndị gara aga.

  17. Ndeewo nu!

    Kedụ ka unu mere? Gụọ akụkọ niile gbasara ihe niile na-eme n'Afrịka na mba ụwa niile ebe a!

  18. Ndị nnọchịteanya Ecowas e zigara Niger agbarala aka laa dịka ha ahụghị ndị weghaara ọchịchị ebe ahụ

    Mweghara ọchịchị a emeela ka ụfọdụ malite iche na Niger, bụbu mba nke France chịrị nwereike idanye n’aka ikike mba Russia.

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Mweghara ọchịchị a emeela ka ụfọdụ malite iche na Niger, bụbu mba nke France chịrị nwereike idanye n’aka ikike mba Russia.

    Ụfọdụ ndị nwere agba otu jịkọrọ mba ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka (Ecowas) zigara mba Niger maka atụmatụ ikpe udo apụọla ebe ahụ dịka ha chere awa ole m ole ma ghara ịnweike hụ ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị ebe ahụ.

    Ndị a ezuteghị ndị weghaara ọchịchị a dịka ha ahụghị onyeisiala Mohamed Bazoum bụ onye a napụrụ ochịchị ebe ahụ.

    Onyeisi otu Ecowas bụ Bola Tinubu zigaraụfọdụ ndị nwere agba maka atụmatụ ikpe udo.

    Onye na-edu ndị a nwere agba ga-aga njem udo a bụ Abdulsalami Abubakar bụ aka chịbụrụ Naịjirịa dịka ọ hapụrụ Abuja gawa Niamey bụ isiobodo Niger n’ụbọchị Tọọzde.

    Sultan nke Sokoto bụ Alhaji Muhammad Sa'ad Abubakar III nakwa onyeisi Ecowas kọmịshọn bụ Omar Alieu Touray ga-esonyekwa njem a.

    Nke a so n’ụzọ ndị o wepụtarala iji dajụọ mweghara ọchịchị ndịagha Niger na-eme na mba ahụ ugbua.

    Nke a so n’atụmatụ ndị pụtara n’ọgbakọ otu Ecowas nwere n’Abuja n’izuụka gara aga banyere mweghara ọchịchị a.

    Onyeisi Ecowas zigakwara ndị otu ọzọ maka atụmatụ ikpe udo a bụ ndị ga-aga hụ onyeisiala Libya na Algeria.

    Babagana Kingibe onye nnọchite Naịjirịa ga-edu ndị na-aga njem nke a.

    Akụkọ malitere ịdapụta na onyeisiala Tinubu chọrọ iziga ndịagha Naịjirịa mba Niger maka atụmatụ ọrụ nchekwa ebe ahụ.

    Ndịagha Naịjirịa zipụtara ozi kwuo na enweghi ozi ọbụla ha natara banyere “atụmatụ ndịagha ịrụ ọrụ megide ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị na Niger”.

    Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa zipụtara ozi a iji saa akụkụ na-efegharị nke kwuru na ndịagha Naịjirịa amalitela ọzụzụ maka atụmatụ a.

    Onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar zipụtara ozi dọọ aka na ntị ka otu Ecowas ghara isi ụzọ ọrụ ọgụ ndịagha tinye aka n’ihe na-eme na Niger kama ha ha soro ụzọ udo.

    O kwuru, "Otu ndịagha na-etinye aka n’ihe na-eme na Niger emeela ka esemokwu chọọ ịdapụta na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka, dịka ihe a bụrụla ihe mere ka mbaụwa malite itinye anya na mba agbataobi anyị (Niger).”

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Atiku katọrọ Naijiria na Ecowas maka usoro etu ha si etinyeaka n’ihe na-eme na mba ahụ ugbua.

    N’ụbọchị Tọọzde ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a mara ọkwa kwuo ka ndị nnọchịteanya ha na mba France, mba Amerịka, Naịjirịa nakwa Togo lọghachite ụlọ.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjirịa bụ Nigeria Immigration Service (NIS) nke ngalaba akụkụ opeala Nigeria na Niger dị nso Katisna steti adọọla ọha ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ime njem gaa Niger n’oge o.

    N’ozi o zipụtara n’ụbọchị Tọọzde, o kwuru:

    “Ka ụmụafọ Naịjria nọrọ n’ebe ha ugbua ma ghara ịchọ ịga Niger ruo mgbe e buliri atụmatụ ime njem gaa ebe a. Anyị ga-edula onye mba Niger ọbụla anyị hụrụ na-anwa ibata na mba a”

    Cheta na otu Ecowas nyere mba Niger ọtụtụ mmachị na ntaramahụhụ ma kwuo na ha ga-eji aka ike (site n’ụzọ ndịagha) wụba ebe ahụ ọ bụrụ na ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị etinyeghị Onyeisiala Mohamed Bozoum nke ha napụrụ ọchịchị ya.

    Onyeisiala Bazoum adọọla aka na ntị n’ozi o zipụtara site n’ụlọ ntaakụkọ the Washinton post na mba ndị nọ na mpaghara Sahel nwere ike idanye n’aka ikike otu Wagner nke mba Russia ma mweghara ọchịchị a bịazuo na mmezu.

  19. Niger: Onyeisiala Mohamed Bazoum akpokuola mba Amerịka maka enyemaka dịka ndịagha weghara ọchịchị

    Otu onye na-akwado mweghara ọchịchị a yi uwe na-egosi agwa ọkọlọtọ mba Russia n'oge igwe ndị mmadụ mere ngagharị udo na Niamey n'ụbọchị Tọọzde

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Otu onye na-akwado mweghara ọchịchị a yi uwe na-egosi agwa ọkọlọtọ mba Russia n'oge igwe ndị mmadụ mere ngagharị udo na Niamey n'ụbọchị Tọọzde

    Onyeisiala mba Niger nke a napụrụ ọchịchị arịọla mba Amerịka nakwa “nchịkọta mba ofesi ndị ọzọ” ka ha gbata ọsọ enyemaka iji “weghachite usoro ọchịchị zuruoke” na mba ahụ dịka ndịagha weghara ọchịchị ebe ahụ n’izuụka gara aga.

    N’akwụkwọ ozi o zipụtara site n’aka ụlọ ntaakụkọ the Washington Post, onyeisiala Mohamed Bazoum kwuru na ọ na-ezipụta ozi a dịka “onye e ji eji”.

    Ọ gara n’ihu dọọ aka na ntị na mpaghara Afrịka ahụ nwereike danye n’aka ikike mba Russia site n’otu Wagner Group maliterelarị ịrụ ọrụ n’ụfọdụ mba na mpaghara ahụ.

    Ụfọdụ ihe dịka ọgbaghara amalitela ịdapụta n’akụkụ mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka kemgbe ndịagha chụpụrụ onyeisiala Bazoum.

    N’ụbọchị Tọọzde ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a mara ọkwa kwuo ka ndị nnọchịteanya ha na mba France, mba Amerịka, Naịjirịa nakwa Togo lọghachite ụlọ.

    N’ozi a nke ha zịpụtara site n’ihe onyonyo TV, ha kwuru na ọrụ mmadụ anọ ndị nnọchịteanya ndị a abụrụla ihe “akwụsịrị”.

    Ka awa ole m ole gachara, onye nnọchịteanya ha na mba Niger bụ Kiari Liman-Tinguiri, gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a “kwesịrị eche ezi echiche” ma mara na “atụmatụ ahụ agaghị amịta mkpụrụ”.

    Foto gosiri mpaghara Sahel nke Afrịka
    Nkọwa foto, Foto gosiri mpaghara Sahel nke Afrịka

    Mba Niger so na mba kacha emepụta ihe ọnatarachi nke ‘uranium’ – ihe bụ mmanụ eji emepụta ikike nuklịa dịka ọ nọwka n’isi ụzọ njem e si agha mpaghara ugwu Afrịka nakwa mpaghara Mediterranean.

    N’ozi a nke Mazị Bazoum zipụtara ọ dọrọ aka na ntị kwuo na ọ bụrụ na atụmatụ mweghara ọchịchị a mezuo na “ọ ga-emetụta mba anyị, mpaghara anyị nakwa ụwa niile n’ụzọ ọjọọ”.

    Ọ gara n’ihu dee:

    "Ịlụ ọgụ maka ụkpụrụ ndị jikọrọ anyị ọnụ, gụnyere ọchịchị onye kwuo uche ya na nkwanye ùgwù maka ọchịchị so usoro iwu, bụ naanị ụzọ isi nweta ọganihu ga-adigide nke ga-ebuso ịda ogbenye na iyi ndụ ọha egwu, agha zuruoke"

    "Ndị Niger agaghị echefu nkwado gị n'oge a dị mkpa n'akụkọ ndụ anyị."

    Maazị Bazoum dọkwara aka na ntị maka mmekọ nke ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a nakwa ndị agha Russia bụ Wagner nwere. Otu a amalite ịrụ n'ebe ndị ọzọ na mpaghara ahụ, dịka ụfọdụ amalite ịhụ na aka ọrụ amalitela ịdapụta na Niger.

    Maazị Bazoum dere, "Mpaghara niile nọ n’akụkụ Sahel nwere ike ịdaba n’aka ikike ndị Russia site n’otu Wagner, bụ ndị ọrụ iyi ọha egwu ha bụ ihe agbara n’anwụ n’agha Ukraine."

    Ọtụtụ ndị na-akwado mweghara ọchịchị a na Niger na-abụ abụ kwadoro Russian dịka ụfọdụ n’ime ha amalitela iyi uwe ndị na-egosipụta ọkọlọtọ Russia.

    N’ụbọchị Tọzdee, puku kwuru puku ndị mmadụ wụpụtara n’igwe n'okporoụzọ isi obodo Niger, bụ Niamey, dịka ha mere ngagharị udo iji gosi nkwado ha nye mweghara ọchịchị nakwa iji katọọ mmachị nakwa ntaramahụh otu jịkọrọ mba ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka (Ecowas) nyere ha agwa mweghara ọchịchị a.

    Enweghị ihe gosiri na otu Wagner tinyere aka na mwakpụ Bazoum n’ọchịchị dịka mba Amerịka siri kwuo - mana onyeisi Wagner akọwala na ya bụ mweghara ọchịchị bụ ihe mmerị.

  20. A họpụtala Ganduje dịka onyeisioche APC

    Umar Ganduje

    Ebe foto si, Umar Ganduje/Facebook

    Nkọwa foto, Umar Ganduje bụ aka chịburu Kano steeti

    Ndị imeobi otu ' All Progressives Congress' (APC),ahọpụtala aka chịbiburu Kano steeti bụ Abdullahi Gandujedịka onyeisioche pati ha .

    Ha nọrọ n'ọgbakọ ahụ ha mere n'Abuja n'ụbọchị Tozde họpụtakwara onye bụbụ ọnụ na-ekwuru Ụlọomeiwu Ukwu bụ Ajibola Basiru dịka Odeakwụkwọ.

    N'okwu ya, Ganduje kelere onyeisiala ma kwee nkwa ịgaso usoro onyekwuoucheya na atụmatụ ndebanye aha zuru oke nakwa ezi usoro idozi esemokwu na pati ahụ.