A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. Minista Hannatu akwubeghi ihe ọbụla banyere NYSC - Gọọmentị etiti

    A họpụtara Hannatu dịka minista na-ahụ maka nka, omenala na nwulite akụnaụba

    Ebe foto si, Hannatu Musawa

    E nwere nghọtaghie banyere minista na-ahụ maka nka, omenala na nwulite akụnaụba bụ Hannatu Musawa n’okwu iji otu afọ efe ala nna Naịjirịa ma bụrụkwa minista.

    Akụkọ pụtara n’ụbọchị ụka bu 27 Ọgọọst 2023, nke kwuru na minista a sị na na oweghi iwu ọ dara n’etu e siri họpụta ya ka ọ bụrụ minista na-agbanyeghi na o mechabeghi NYSC nke bụ iwu.

    Mana ozi si na ministri na-ahụ maka mgbasaozi kwuru na ozi ahụ esighi n’aka minista ahụ pụta

    Dika akpụ okwu a n'ọnu, nkwupụta ọzọ sitere n'ụlọọrụ ya kwuru na onye minista ekwubeghi okwu maka nke a.

    Cheta na Hannatu so n’otu n’ime mmadụ iri anọ na ise (45) Onyeisiala Tinubu họpụtara n'ime izuụka gara aga.

  2. Onye nwe ego $5m na ọlaedo adịgboroja nke a hụrụ n'ime ụgbọelu na Zambia?

    laedo na ego dọla

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe omimi gbasara ego dị $5m, ọlaedo adịgboroja, egbe na mgbọ egbe, nke a hụrụ n'ime otu ụgbọelu nke onwe na mba Zambia, abụrụla isiokwu nnyocha nke ndị ọrụ nchekwa mba Zambia malitere ugbua na Lusaka.

    Ihe a ma bụ na ụgbọelu ahụ si n'obodo Cairo, isi obodo mba Egypt, ma biarute na Zambia izuụka abụọ gara aga.

    Ka ọ dị ugbua, onweghị onye ọbụla na Egypt maọbụ Zambia kwetara na ọ bụ ha nwe ụgbọelu ahụ maọbụ ihe dị n'ime ya.

    Ihe a ma ugbua bụ na mmadụ isii ndị mba Egypt nọ n'ime ụgbọelu ahụ na ndị ọsọ sonyeere ha na Lusaka, ga-abịa n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde.

    E bokwara ụfọdụ ndị Zambia e jichiri gbasara okwu a ebubo dị icheiche ma kpụgakwa ha ụlọikpe. Mana onwebeghị ebubo e boro ndị nke Egypt e jidere.

    Onweghị onye gaara amata maka ihe a merenụma e wepụ otu onye ntaakụkọ onye dere akụkọ ahụ n'ọbaozi ya, Matsda2sh, bụkwa onye ndị ọrụ nchekwa mba Egypt jidere ma bo ya ebubo na aka ya dị na ya.

    Otu ndị ọkachamara a na-akpọ 'Egypt Technocrat' nke ọtụtụ ndị ọkachamara mba Egypt na ngalaba dị icheiche nọ na ya, ekwuola na ihe karịrị ụlọọrụ 300 na mba Egypt na-etinye aka na mbupu ego na mba ahụ n'ụzọ ezighi ezi.

    Ụfọdụ na-ekwu na ebupụla ego buru ibu na mba Egypt kamgbe onyeisiala Abdel-Fatah al-Sisi malitere ọchịchị afọ itoolu gara aga.

    Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, o nwereike ịbụ na ụgbọelu a bụ naanị otu n'ime ọtụtụ ụgbọelu merela njem dị otu a na mba ahụ.

    Dịka o dochabeghị anya onye nwe ego, ọlaedo na ngwaọgụ ndị ahụ a hụrụ n'ime ụgbọelu na Lusaka, Zambia, onweghị onye ma nke bụ eziokwu, mana a na-eche na dịka ikpe ga-amalite gbasara nchọpụta a, eziokwu niile dị na ya ga-apụta ihe n'oge adịghị anya.

  3. Mba France ga-amachi ụmụnwaanyị iyi uwe nwụda ‘abaya’ n’ụlọakwụkwọ

    Ụlọakwụkwọ na mba France

    Ebe foto si, AFP

    Ụmụakwụkwọ praịmarị agaghịzi na-eyi uwe nwụda a kpọro ‘abaya’ nke ụmụnwaanyị okpukperechi Alakụba na-eyi n’ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị nwe na mba France.

    Nke a bụ ihe minista agụmaakwụkwọ kwuru ma sị na ọ ga-amalite na mbido afọ agụmaakụkwọ ọhụrụ n’ụbọchị 4 Sepụtemba.

    Mba machiri ngosi akara okpukperechi n’ụlọakwụkwọ nakwa ụlọọrụ ndị gọọmenti nwee, ma sị na nke megidere iwu ibi ndụ ụwa.

    A machiri iyi ịchafụ n’isi kamgbe afọ 2004 n’ụlọakwụkwọ gọọmentị nwe.

    “Ọ bụrụ na ị bata n’ime ụlọakwụkwọ, e kwesighi ịchọpụta okpukperechi nwata akwụkwọ site n’ile ya anya,” Minista agụmaakwụkwọ bụ Gabriel Attal gwara ụlọọrụ mgbasaozi TV nke TFI na France, ma sị “Ekpebiela m na agaghịzi na-eyi abaya n’ụlọakwụkwọ.”

    Mkpebi a na-abịa n’ime ọtụtụ ọnwa e nwechara nrụrịtaụka banyere iyi uwe nwụda ‘abaya’ n’ụlọakwụkwọ mba France.

    Etu ụmụakwụkwọ si eyi uwe nwụda na-arị elu nke buterela nkewa ndọrọ ndọrọ n’etiti ha, ebe ụfọdụ ndị na-akpọ oku ka a machie ya ebe ndị ọzọ sị na mmachi ya bụ imegide ikike dịịrị ụmụnwaanyị okpukperechiAlakụba.

    O kwuru na ọ ga-enye iwu doro anya banyere nke a ga-ezu mba ọnụ tupu ụlọakwụkwọ emepee na ngwụcha ezumike ha.

    N’afọ 2010, mba France machiri iyi uwe na-ekpuchi ihu apụta n’ọha mana nke a butere iwu n’etiti ndị okpukperechi Alakụba ọnụọgụgụ ha ruru nde ise.

  4. Nema adọọla aka na ntị dịka mba Cameroon na-akwao imepe 'Lagdo Dam'

    Ideimmiri afọ 2022

    Gọọmentị mba Cameroon edeterela gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ ozi iji kwuo na ha ga-emepe ọdọ mmiri a kpọrọ 'Lagdo Dam' n'oge n'adịghị anya.

    Ha mere nke a ka e wee kee nkwụcha maka ideimmiri nke nwereike ime na Naịjirịa n'ihi mkpọghe ọdọ mmiri a bụ 'Lagdo Dam'.

    Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ edegerela ngalaba na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency (Nema) akwụkwọ gbasara nke a.

    Gọọmentị Cameroon kwuru na ọ bụ maka oke mmiri ozuzo zoro n'ọdị nso a mere ha ji kpebie na ha ga-emepe ọdọ mmiri ahụ.

    "N'ihi nke a, ọ dị mkpa ka ụlọọrụ ụnụ gbaa mbọ ma mee ihe niile dị mkpa ma dọọ ndị bi n'okirikiri osimiri aka na ntị ka ha kee nkwụcha iji gbochie idemmiri a imebi nnukwu ihe," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

    Cheta na n'afọ 2022, nnukwu ihe mberede ideimmiri mere na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ nakwa mbibi akụnụba ruru ijeri kwuru ijeri naịra.

    Gọọmentị kwuru na ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ karịrị mmadụ 603, ndị merụrụ ahụ karịrị 2,400, ụlọ ndị mmadụ lara n'iyi karịrị 82,035, ebe obosara ala o metụtara ruru hekta 332,327.

    Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ oke mmiri ozuzo nakwa mmepe Lagdo Dam nke mba Cameroon kpatara ọdachi ahụ.

  5. Agaghị m eso nzọmụkwụ Buhari n’okwu banyere mwulite akụnụba Naịjirịa - Tinubu

    Onyeisiala Tinubu na onye bụbu Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ gaghị eso usoro atụmatụ ọchịchị Buhari n’ihe banyere akụnaụba.

    O kwuru nke a na mgbasaozi ya na mmepe ọgbakọ otu jikọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ NBA n’ịchafụ nke e mere n’Abuja n’ubọchị Sọnde 27 Ọgọọst, 2023.

    Tinubu kwuru na ọ gaghị ejikwa ego gọọmentị nwetere obodo kwụọ Naịjirịa na mba ofesi. Na ọganihu Naịjirịa chọrọ ga-abịa na mmezu ma ọ bụrụ na e wepu ụbịam n'obodo Naịjirịa.

    Onyeisiala Tinubu gara n’ihu kwuo na ọchịchị ya agaghị akwado omenala iji pasenti 90 n’ego gọọmentị akwụ ụgwọ Naịjirịa ji na mba ofesi ebe nsogbu enweghi ezi mmepe chere ya aka n’ihu.

    Cheta na ochịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari pụrụ apụ, na-eji ego gọọmenti nwetere akwụ ụgwọ ndị Naịjirịa ji na mba ofesi dịka ọ na-aga n’ihu na-ebite ego.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Ngagharịiwe amalitela na Libya n’ihi mmekọ ha na Isreal nwere

    Ngagharịiwe na mba Libya

    Ebe foto si, EPA

    Praịm minista mba Libya akwụsịla minista na-ahụ maka mba ndị ọzọ ọrụ maka o zutere ogbo ya nke mba Isreal.

    Mba Libya na mba Isreal adịghị na mma, dịka gọọmentị ha na-akwado mba Palestine nke a mere nzukọ ahụ jiri gbalite ngagharịiwe.

    Minista mba Isreal bụ Eli Cohen kọwara nzuko ya na Najla al-Mangoush nke Libya dịka nzọmụkwụ nke mbụ n’inwe mmekọrịta ha.

    Isreal na-achọ ka ya na mba ndị okpukperechi Alakụba dịka Libya na ndị ozọ nwee mmekọrịta.

    Mana ndịisi ọchịchị mba Libya kwuru na ọ bụ ihe megidere iwu ka ha na mba Isreal nwee mmekọrịta.

    Onyeisi ụlọomeiwu mba Libya boro nwada Mangoush ebubo ibu agha megide gọọmentị dịka prịam minista Abdul Hamid Dbeibah nyere iwu ka e nyochaa ya.

    Nwada Mangoush minista na-ahụ maka mba ndị ọzọ na Libya

    Ebe foto si, Getty Images

    Maazị Cohen nke Isreal kwuru na o zutere nwada Mangoush nke Libya na mberede mgbe ha gara otu ọgbakọ na Rome ebe ha kpara nkata “banyere uru dị na mmekọrịta mba abụọ ndị a.”

    Ọ sị na ha kwuru banyere enyemaka ndị mmadụ, ọrụ ugbo, ịchịkwa mmiri nakwa uru ọ dị ichekwa okpukperechi ndị Jew na mba Libya.

    Ministry na-ahụ maka mba ndị ozọ na Libya kwuru na nwada Mangoush jụrụ ịnabata mkparịtaụka ya na ndị nnochiteanya mba Isreal, na ihe mere bụ nzukọ mberede mgbe ha gara ọgbakọ na mba Italy.

    Ozi ha wepụtara kwuru na mkparịtaụka ahụ agụnyeghi maka nkwekọrịta ọbụla.

    Ọgbaghara na ngagharịiwe dapụtara n’isiobodo Tripoli nakwa obodo ndị ọzọ na Libya dịka ha nụrụ ozi banyere nzukọ ahụ. E mechiri okporoụzọ ma gbaa ụkwụ ụgbọala ọkụ dịka ndị ngagharịiwe na-efe ọkọlọ mba Palestine, na-agbanyeghi na ngagharịiwe ahụ ebughi ibu.

  7. Igbo ndị ọma ndewo oooo!

    Anyị e burula bata n'izuụka ọhụrụ a dịka okpa ekele juru anyị aka.

    Bịa gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa niile gbaa gburu gburu.

  8. Onyeisiala Tinubu ekwela ịza oku Joe Biden nke mba Amerịka kpọrọ ya.

    Onyeisiala Tinubu na ndị ozi mba Amerịka

    Ebe foto si, Ajuri Ngelale

    Onyeisiala Naịjirịabụ Bola Tinubu ekwela ịza oku ogbo ya nke mba Amerịka bụ Joe Biden kpọrọ ya n’oge ha ga-eme ọgbọ otu United Nations n’obodo New York n’ọnwa Sepụtemba.

    Onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Ajuri Ngelale kwuru na onyeisiala Tinubu mere nke a mgbe ndị ozi pụrụiche si mba Amerịka kpọtụụrụ ya n’Abuja na Satọde.

    Ndị ozi a pụrụiche gụnyere osote odeakwụkwọ mba Amerịka n’Afrịka bụ Molly phee bụ onye kwuru na ọ bụ naanị Tinubu bụ onyeisiala mba Afrịka Joe Biden kpọrọla oku.

    Tinubu gara n’ihu gwa mba Amerịka ka nyere mba Ọdịda Anyanwụ Afrịka aka ịhụ na ọchịchị onye kwuo uche ya gbara ezi mgbọrọgwụ na mba ndị a.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọchịchị ya ga-elekwasị anya ime ka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa dị mma, na ọgbaghara na-eme na mba Niger agaghị egbochi nke ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị otu Ecowas ga-eme ihe ha nwereike n’ụzọ udo iji weghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị na Niger, na o nweghi onye chọrọ ịga agha kama na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ ihe dị mkpa n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

    Na nzaghachị, onye ozi mba Amerịka kwuru na ha kwụụ otu Ecowas n’azụ na mkpebi ọbụla ha mere banyere ihe na-eme na Niger.

  9. Ndịagha Niger adọọla onwe ha aka na ntị ma dị njikere maka mwakpo ọbụla

    Ndịagha Niger so na ndị na-ebuagha imegide ndị oyi ndụ egwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ndu ndịagha Niger weere ọchịchị n’ike agwala ndịagha ka ha kee nkwucha maka mwakpo ndịagha Ecowas.

    Ha kwuru na ntuziaka bụ iji mee ka ndịagha ha dị njikere maka mwakpo ọbụla nwereike ịdakwasị ha ka ọ ghara ime ha na mberede.

    Ọchịagha Abdouramane Tchiani, bụ onyeisi ha ekwuola na mba Niger achọghị ịlụ agha, mana ha ga-echekwa onwe ha megide mwakpo ga-esi mba ọzọ abịa.

    Ya ndị otu ya weere ọchịchị n’ike nke mba Mali na Burkinafaso nwere nkwekọrịta na ha ga-abịa nyere ha aka ma a wakpoo ha.

    Ọ dọrọ aka na ntị na “ọ bụrụ na a ga-awakpo anyị, ọ gaghị adị mfe dịka ‘ofe nkupu’ ka ụfọdụ ndị si na-eche ya.

    Ndị ndu Ecowas na-agbasi mbọ ike iji ụzọ udo eweghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị na Niger ma sịkwa na ha dị njikere iji ndịagha eme nke a.

    Mba Amerịka na France bụ ndị nwere ogige ndịagha na Niger kwadoro mkpebi ndị Ecowas.

    Praịm minista ọhụrụ nke mba Niger enyela onye nnọchiteanya mba France na mba ha ụbọchị abụọ isi na mba ha pụọ kamgbe Fraịde ma bo ha ebubo imegide ọdịmma mba ha.

    Ụmụafọ mba Niger kwadoro ndịagha weere ọchịchị n’ike gbakọtara n’isiobodo mba ahụ na-efe ọkọlọtọ mba Niger, Algeria na Russia ma na-akatọ mba France.

    Ọchiagha Tchiani nọọrọ n’izuụka gara aga sị ka e nye ha afọ atọ iji hazie obodo ma nyeghachị ndị nkịtị ọchịchị.

    Mana ndị ndu Ecowas jụrụ ịnabata atụmatụ inyefe ọchịchị n’afọ atọ ma sị na nke a bụ okwu na-akpasu iwe.

  10. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Anyị ji akụkọ ndị gbapụtara ihe bịa n'ekwentị gị taa.

  11. Luis Rubiales: Otu egwu bọọlụ mba Spen sị na ha ga-agba Hermoso akwụkwọ

    Luis Rubiales na Jenni Hermoso

    Ebe foto si, Getty images

    Otu na-ahazi egwu bọọlụ mba Spen 'Spanish Football Federation' ekwuola na ha ga-agba onye egwu bọọlụ nwaanyị mba ahụ bụ Jenni Hermoso ụlọikpe maka okwu o kwuru banyere onyeisi ha bụ Luis Rubiales.

    Rubiales jụrụ ịgba arụkwaghị m dịka okwu pụtara maka na o susuru Hermoso ọnụ dịka otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Spen meriri ogbo ha ndị Ingland n'asọmpi ikpeazụ Iko mbaụwa Ụmụnwaanyị a sọrọ na Sydney na nsonso a.

  12. Ndị agha mmiri eliela ndị ibe ha nwụrụ na Niger State

    akwamozu ndị agha mmiri

    Ebe foto si, Nigeriannavyhq/instagram

    E liela ndị agha mmiri nwụrụ n'ihi mberede ụgbọelu mere na National Military Cemetry Abuja.

    Ha nwụrụ n'ike mgbe ụgbọelu ha nọ na ya dara na Niger steetị, ebe ọgbaaghara dị. E nyekwara ndị ezinaụlọ ha bịara na ya bụ akwamozu onyinye na ihe ndị ọzọ.

    E liri ha n'ụbọchị Fraịde 25 Ọọgọst.

    akwamozu ndị agha mmiri

    Ebe foto si, Nigeriannavyhq/instagram

    Akwamozu ndị agha mmiri

    Ebe foto si, Nigeriannavyhq/instagram

  13. Nnọọ na peeji anyị

    Soro anyị maka akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ taa niile.

  14. Sexual Harrasment:Unizik ewepụla ndị nkuzi e boro ebubo n'ọkwa ha

    Mahadum 'Nnamdi Azikiwe university, Oka,Anambara steeti

    Ebe foto si, UNIZIK

    Ndịisi mahadum 'Nnamdi Azikiwe University' dị n'Ọka, Anambara steeti ama dịka 'Unizik' agọọla na akụkọ na ụmụakwụkwọ mere ngagharịiwe banyere ebubo mmekpa ahụ ha na-agabiga n'aka ụfọdụ ndị nkuzi ha.

    Ụbọchị Tọzde, akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na ụmụakwụkwọ ọ kachasị ụmụnwaanyị mere ngagharịiwe banyere ebube na ụfọdụ ndị nkuzi ha na-akpa ha aka n'ụzọ ezighị ezi.

    Mana n'ozi nke onye ndụmọdụ pụrụ iche nke onyeisi mahadum ahụ n'okwu mmekọrịta ọha bụ Emmanuel Ojukwu binyere aka ma wepụta, o kwuru na na ha napụla ndị nkuzi e boro ebubo mmetọ ọkwa ha iji nye ohere maka nnyocha na-aga n'ihu ugbua.

    Ozi ahụ nke akpọghị aha ndị nkuzi ọ metụtara sịrị,

    " Onyeisi mahadum ewepụla ozigbo ozigbo ndị nkuzi ebubo a metụtara n'ọkwa ha ma zigara ngalaba ha akwụkwọ ozi ịdọ aka na ntị."

    "Mana ihe mwute dị na ya bụ ụmụakwụkwọ ndị na-ebo ebubo enweghị nke kwere apụta n'ihu otu e hiwere inyocha ebubo ndị a gbaa akaebe"

    Onyeisi otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ mahadum ahụ bụ Izuchukwu Ejikeme,gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ekwentị na o nweghị ngagharịiwe mere , ọ bụrụ na o mere, "aga m ama dịka nwakwụkwọ nke mbụ na mahadum.

    Cheta na nsonso a ụmụakwụkwọ mahadum University of Calabar mere ngaghariiwe megide otu onye nkuzi ha bụ Ọkammuta Cyril Ndifon maka ebubo mmetọ nke mere ka ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ kwụsị ya ọrụ n'ike iji nye ohere maka nnyocha ebubo ahụ.

  15. Ọgbamgba Bray Wyatt anwụọla ka ọ gbachara afọ 36

    Bray Wyatt

    Ebe foto si, Getty Images

    Windham Rotunda bụ ọgbamgba WWE a ma ama dịka “Bray Wyatt” anwụọla ka ọ rịara ọrịa a kpọghị aha ya nke malitere ya n' ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Mana ezinaụlọ nwa amadị ahụ gbara afọ 36 n’ikwupụta ọnwụ ya kwuru na ọ nwụrụ ọnwụ atụghị anya.

    Ọnye mgbasaọzi WWE bụ Triple H, bu onye kwupụtara nke a n’ozi o wepụtara na soshal midia taa sịrị na, ‘Windham Rotunda “alaala na atụghị anya”.

    Ọgbamgba a ma ama bụ Dwayne Johnson, onye a ma dịka “The Rock” so na ndị tụrụ arịrị maka ọnwụ Wyatt.

    The Rock kwuru n’ozi ya na “obi gbawara” ya maka ọnwụ dimkpa ahụ nke o kwuru na ya nwere “ezi ịhụnanya” na “nkwanye ugwu” ebe ọ nọ.

    Onye nkwupụtaokwu n' asọmpị mgba WWE bụ Mick Foley sịrị: "Bray Wyatt bụ mmadụ na-atụ m n’anya. O so na ndị bụ ha pụta n’ọgbọ, ọ na-akpọtụ.”

    Bray Wyatt

    Ebe foto si, Getty Images

    Wyatt si n'ezinaụlọ ndị na-agba mgba. Papa nnukwu ya bụ Blackjack Mulligan bụ onye mgba, nna ya bụ Mike Rotunda na nwanne Wyatt nwoke nke obere bụ Bo Dallas bụ ndị mgba.

    Wyatt kajara akaja na mgba n’onwe ya. A ma ya dịka IRS n'ihi na ọ na-eme agwa onye ọnaụtụ si Washington DC abịa akụsu ndị mgba ibe ya nakwa ndị na-eso ya bụ ndị ọ na-ahụta dịka ndị na-agba ọsọ ịtụ ụtụisi ha.

    A mụrụ ya na Brooksville dị na Florida n’abalị 23 nke Ọnwa Mee afọ 1987.

    O meriri, bụrụ ọkaibe na mgba na steeti ya oge ọ na-agụ sekọndrị ma si ebe ahụ rite ohere agụmakwụwkọ n’efu na mahadum 'Troy University'.

    Mana ọ gụchaghị tupu ọ banye n’ọrụ ịgba mgba n’afọ 2009.

  16. Tinubu ekwuola ka ekpezie esemokwu dị n'etiti Nigeria na UAE ngwa ngwa

    Tinubu na Al-Shamsi

    Ebe foto si, Nigerian Presidency

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola ka ekpezie esemokwu na nghọtahie dị n'etiti UAE na mba Naịjirịa ngwa ngwa.

    Cheta na esemokwu a butere nkwụsị njem nakwa nkwụsị ịnye akwụkwọ ikike njem n'etiti mba abụọ a kemgbe afọ 2022.

    Mba UAE kwụsịrị ịnye ndị Naịjirịa akwụkwọ ikike njem nakwa ịme njem ebe ahụ mgbe ha enweghi ike ịsepụta ego ha tọrọ na Naịjirịa n'ihi mmachi Forex.

    Emirates bụ ụlọọrụ ụgbọelu nke mba ahụ kwukwara na ha nwara ike ha niile gụnyere ịkpesara ndị ọgbasara maka ịsepụta ego ha mana ọ mịtaghị mkpurụ.

    Tinubu kwuru nke a dịka ọ nabatara onye nnọchiteanya mba ahụ bụ Saleem Saeed Al-Shamsi n'obi gọọmentị n'Abuja.

    "Anyị kwesiri ịleba okwu a anya dịka ezinaụlọ ma kpezie ya n'otu obi...anyị kwesiri ijikọ aka rụọ ọrụ. Anyị kwesiri ịnwe nkweta n'ihe metụtara njem nakwa ọpụpụ na mbata" ka o kwuru.

  17. Ụtụtụ ọma

    Nnọnụ na peeji anyị taa.

    Sonye anyị maka akụkọ ndị dị mkpa na mbaụwa niile taa.

  18. Ndị uweojii Zimbabwe awakpola ma nwụchie otu ndị nlekọta ntuliaka

    Zimbabwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndi uweojịị mba Zimbabwe ekwupụtala na ha nwụchiri ndị ọrụ nlekọta ntuliaka ruru 39 ha siri biara ịkụsa ntuliaka na-aga n'ihu.

    Ndi oru nchekwa wakporo ebe dị icheiche na harare, isi obodo Zimbabwe, tinyere otu ụlọ ndina nakwa isi ụlọorụ nke otu 'Zimbabwe Election Support Network' nakwa 'Election Support Centre'.

    Akụkọ kwuru na otu ndị ahụ nwere atụmatụ ịgụkọ mpụtara ntuliaka ahụ n'onwe ha.

    Ọnu na-ekwurụ ndi uwe ojịị nke Zimbabuwe bụ Paul Nyathi gwara ulọ akụkọ steeti na ha jichiri ụfọdụ ekwenti na kọmputa.

    Ndị ọkaiwu kwuburu na ha nwetara mkpesa site n'aka ụfọdụ ndị a nwụchiri.

    Ha sịrị na oge ha amabughi ebe ndi ndị uweojii kpụgara ndị ahụ ha nwuchiri, ma kwukwaa na ekweghị ka ha hụ ha anya.

    N’afo a, otu dị icheiche na-agba mbọ iji aka ha gukọọ vootụ nke ha, iji tulee ma o dabakwara n’ihe ndi orụ ntuliaka kwụrụ.

    Ngụkọ vootu amalitela dika atụchara vootụ n’ubochị Wenezde, n’agbanyeghi na ntuliaka ka n’aga n'ihu na mpaghara atọ n'ihi na e gburu oge ịmalite ịtụ vootu n'ebe ndị ahụ.

  19. BRICS: Otu a anabatala mba isii ọhụrụ, mana Naịjirịa esoghi na ya

    Ndị isiala mba hibere otu BRICS

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Lula Da Silva (Brazil), Xi Jinping (China), Cyril Ramaphosa (South Africa), Narendra Modi (India), na Sergey Lavrov (Mịnịsta ofesi nke mba Russia)

    Onyeisiala Mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwupụtala na otu BRICS ga-anabata mba isii ọhụrụ isonyere ha.

    Mba ndị a gụnyere Egypt, Saudi Arabia, United Arab Emirate, Argentina, Ethiopia na Iran.

    Nke a ga-adị ire malite n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024.

    Otu BRICS nke pụtara Brazil, Russia, India, China na South Africa bụbu otu jịkọrọ mba ndị akụnaụba ha na-arịlite el n'ụwa.

    Naịjirịa sobu n'ihe ruru mba 40 kwupụtara mmasị ha isonye n'otu a bụ nke e hibere n'afọ 2001. Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima sonyekwara n'ọgbakọ otu Brics nke e nwere n'izuụka a na mba South Afrịka bụ ebe a nọ kpọpụta aha mba isii ọhụrụ a.

    Kedu uru dị n'isonye n'otu BRICS

    Brics

    Ebe foto si, infobrics.org

    Dịka ozi si n'ọbaozi inforbrics.org si depụta, ihe mere ọtụtụ mba dị icheiche ji achọ isonye n'otu Brics gụnyere:

    • Ngụkọ gosiri, mgbakọta GDP nke mba ise so na Brics bụ pasentị 31.5 nke GDP ụwa niile
    • Nke a karịrị mgbakọta GDP mba ndị so n'otu G7 nke bụ pasentị 30.7
    • Mgbakọta ọnụọgụgụ ndị niile bi na mba so n'otu Brics karịrị ijeri atọ na ụma (3.14 billion), nke bụ pasentị 41 ọnụọgụgụ mmadụ niile bi n'ụwa
    • Mba abụọ kacha nwee ọnụọgụgụ mmadụ n'ụwa - China na India - socha n'otu Brics
    • Ụlọakụ 'New Development Bank' (NDB) nke otu Brics hibere n'afọ 2014 ewetala ego e ji rụpụta ihe ihe ọnụọgụgụ ya karịrị 100, nke ego e ji rụọ ha ruru ijeri dọla 34 ($34billion)

    Ihe ndị a bụ uru Naịjirịa gaara iso na-erite ma ọ bụrụ na anabatara ha n'otu Brics, mana nke ahụ agazighi.

    Ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na Naịjirịa ka nwere ohere isonye otu ahụ n'oge ọzọ ha ga-anabata ndị ọhụrụ.

  20. Ịtụ vootu ga-aga n'ihu na mpaghara ụfọdụ na Zimbabwe, dịka a na-ebo ebubo nrụrụaka

    Zimbabwe

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ọrụ ntuliaka na mba Zimbabwe enyela ikike ka ịtụ vootu gaa n'ihu na mpaghara dị icheiche na mba ahụ dịka ndị mmadụ nyere mkpesa na ha enweghịike ịtụ vootu n'ụbọchị Wenezde.

    Ntuliaka a bụ iji họpụta onyeisiala Zimbabwe, dịka onyeisiala nọ ugbua bụ Emmerson Mnangagwa na-azọ ọchịchị nke ugboro abụọ ya.

    Mnangagwa kwuru na ntuliaka nke taa ga-adị na mpaghara 40 n'ime 'province' atọ na Zimbabwe. Nke a gụnyere na mpaghara ụfọdụ na Harare bụ isi obodo Zimbabwe.

    Onyeisi ndị otu ndọrọ ọchịchị na-anọghị n'ọchịchị bụ Nelson Chamisa boro ebubo na pati nọ n'ọchịchị bụ ZANU-PF na-emekpa ndị pụtara ịtụ vootu ahụ.

    Ntuliaka a na-abịa dịka mba Zimbabwe nọ n'oke ihe isiike dịka mgbali ọnụahịa na mba ahụ so na nke kacha njọ n'ụwa niile.

    Ọ bụ ntuliaka nke mbụ a na-eme na Zimbabwe kamgbe ndị agha mba ahụ chutuchara onyeisiala ha bụ Robert Mugabe ma tinye Mnangagwa, mana ọtụtụ ndị obodo ahụ na-ekwu na onwebeghị ihe gbanwere kamgbe ahụ.

    Ha dị mmadụ iri na otu so azọ ọkwa onyeisiala a, mana onye kacha cheere onyeisiala Mnagagwa aka mgba bụ Nelson Chamisa nke pati 'Citizens Coalition for Change' (CCC).

    Tupu a kpọpụta aha mmadụ dịka onye meriri na ntuliaka ahụ, onye ahụ ga-enweta ihe karịrị pasenti 50 vootu niile a tụrụ na ntuliaka ahụ,

    Ọ bụrụ na onweghi onye nwetazuru vootu ahụ, a ga-eme ntuliaka agba nke abụọ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba.