A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. Igbo ndị ọma mma mma nụ ooo!

    Anyị ji obi ọcha anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.

    Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Daalụ!

  2. Ndị uweojii Imo steeti akpọghachila nwa agbọghọ atọọrọ n'ezinaụlọ ya

    Khadizat, ndị uweojii nakwa ndị ezinaụlọ ya.

    Ebe foto si, Imo state Police

    Otu nwa agbọghọ dị afọ 16 alaghachila n'aka nne na nna ya n'ezinaụlọ ya dị na Kogi steeti site n'ịgbambọ nke ndị uweojii Imo steeti.

    Khadizat Labaran bụ nwa agbọghọbịa ahụ bụ nke ndị uweojii nakwa ngalaba na-ahụ maka odịmma ụmụnwaanyị na ndị ọzọ nke Imo steeti gbara mbọ n'isi ya.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ otu onye obi ọma hụrụ Khadizat ebe ọ na Nkwerre n'ọnwa Jụlaị ma kpọrọ kwa ya ga nyefe ndị uweojii n'aka ebe ọ gwara ha na ọ bụ ndị ntọ kechiri ya anya ma tọrọ ya n'ebe a kpọrọ Ganaja junction na Lokoja.

    Ọ sịkwa na ndị ntọ ahụ buuru ya gbabanye n'ime oke ọhịa dị n'Imo steeti ebe o si were gbapụ ọsọ.

    Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Mohammed Barde bunyere onye obi ọma chọtara nwa agbọghọ ahụ nakwa ndị uweojii na Nkwerre maka etu ha si lekọta ya bụ nwaanyị anya tupu enyeghachi ya n'aka ezinaụlọ ya.

    Barde kwusikwere ike na ya na ndị otu ya n'Imo steeti ka kwụsị ike n'ihe gbasara nchekwa.

  3. Etu Spain si gbawaa England aka napụ ha iko mbaụwa ụmụnwaanyị

    Otu bọọlụ ụmụnwaanyị mba Spen bụ ọkaibe n'asọmpi bọọlụ ụmụnwaanyị nke 2023

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Spain ebuliela iko mbaụwa nke egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke afọ 2023.

    Nke a mere dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị ihe merie ụmụnwaanyị England n'ụbọchị Sọnde.

    Olga Carmona, bụkwa kaptịn ndị Spen, bụ onye nyetere otu goolu ha ji merie na nkeji iri abụọ na itoolu nke asọmpi ahụ.

    Spen nwetakwara penariti na nkeji 69, mana ochee bọlụ mba England bụ Mary Earps chere ya.

    Ihe ndị gbapụtara ihe n'asọmpi a

    Mary Earps

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mary Earps, ochee bọọlụ mba England, nwetara nturugo ochee bọọlụ bụ ọkaibe n'asọmpi a
    • Nke a bụ nke mbụ England na Spen na-eru n'agba nke ikpeazụ nke iko mbaụwa bọọlụ ụmụnwaanyị
    • Tupu asọmpi a, ụmụnwaanyị Spen emeribeghị asọmpi ọbụla n'agba mgbapụ nke iko mbaụwa ọbụla
    • Aitana Bonmati nke mba Spen nwetara nturugo ọgba bọọlụ bụ ọkaieb n'asọmpi a
    • Mary Earps, na-echere England bọọlụ, nwetara nturugo ọkaibe n'iche bọọlụ n'asọmpi a
    • Salma Paralluelo nke Spen nwetara nturuugo ọkaibe ọgba bọọlụ afọ ya kacha nta
    • Tupu asọmpi a, ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ Spen chọrọ ka a chụọ onye nkuzi ha bụ Jorge Vild n'ọrụ, mana ka nghọtahie ahụ dajụrụ, Vilda chụpụrụ mmadụ 12 n'ime mmadụ 15 so kpaa nkata ahụ. ndị a ọ chụpụrụ bụ ndị a ma ama n'ịgba bọọlụ n'ụwa niile, nke a mere ka ọtụtụ chee na Spen agaghị eme ọfụma n'asọmpi a
    • Nke a bụ nke ugboro abụọ onye nkuzi bọọlụ ndị England bụ Sarina Wiegman na-eru agba ikpeazụ nke iko mbaụwa ụmụ nwaanyị, dịka ọ kpọrọ ụmụnwaanyị mba Netherlands ruo n'agba nke ikpeazụ asọmpi ahụ n'afọ 2019 ebe mba France meriri ha
  4. Egbe AK 47 bụzị atọ kọbọ n'ahịa ojii na mba Sudan

    Egbe AK-47

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, A na-arụpụta egbe AK-47 na mba Rọshịa, ọ bụkwa egbe e ji alụ agha a kacha mara ama.

    Ọnụahịa egbe AK-47, nke bụ otu egbe a kcha mara ama eji alụ agha, ejirila ihe ruru pasentị 50 gbatuo n'ime ọnwa olemole gara aga na Khartoum, isi obodo mba Sudan.

    A na-erezi ya ugbua n'ọnụ $830 maọbụ £650.

    tu onye na-atụ mgbere ngwaọgụ gwara BBC na AK-47 ejupụtala ebe niile ahịa nzuzo ebe a na-ere ngwaọgụ kamgbe agha dara na mba Sudan n'ọnwa Eprel.

    Ọgụ na-adasi ike kwa ụbọchị n'etiti ndị agha Sudan na ndị otu a kpọrọ Rapid Support Forces. Ọgụ a kacha njọ na Khartoum, Bahri na Omdurman.

    Nwoke a na-azụ ahịa egbe - mana ọ chọghị ka anyị kpọpụta aha ya - kwuru na oge ụfọdụ ọ bụ ndị agha lara ezumike nka na-ebunye ya egbe ọ na-ere, mana ndị kacha ebunye ya ngwaọgụ bụ ndị otu RSF.

    Ihe mere ọnụahịa egbe ji gbatuo n'ike bụ maka na ngwaọgụ dị ọtụtụ karịa ndị na-achọ izụ ya, ọ kachasị dịka a lụchara nnukwu ọgụ na Bahri n'ebe etiti ọnwa Julaị, ebe ndị otu RSF gburu ọtụtụ ndị agha mba Sudan bụ ndị jibu obodo ahụ.

    "Ha jidere ọtụtụ ndị agha, gbuo ọtụtụ n'ime ha nke mere na ndị na-ebutere anyị ngwaọgụ nwere ọtụtụ ahịa ha ga-ere," nwoke ahụ kwuru.

    "Nke a mere na anyị anaghị echezi egbe ndị a na-esi na mba Libya, n'ọzara Sahara, ebubata."

    N'oge gara aga, ngwaọgụ si Libya abata na-abụkarị ndị ọgụ nnupuisi ka a na-eresi ya, mana ugbua, ọbụladị ndị nkịtị bi na Khartoum na-achọzi ịzụta egbe iji chekwaa onwe ha dịka enweghị nchekwa na-arị elu n'ime n'ike.

    Otu nwoke dị afọ 55, onye mụrụ ụmụ isii, kwuru na ya zụtara egbe AK-47 iji chekwaa ezinụlọ ya, maka na "e nwereike ịwakpo gị maka ihi ihe ọbụla. Ọgụ a nwereike ịghọ ọgụ agbụrụ. Onweghị onye ma. Ọ bụ nke a bụ nnukwu ụjọ anyị".

    Ọgụ dara na mba Sudan n'ọnwa Eprel afọ 2023 dịka e nwere nghọtahie n'etiti onyeisi ndị agha bụ Abdel Fattah al-Burhan, na onyeisi ndị ọgụ RSF bụ Mohamed Hamdan Dagalo, onye a ma dịka Hemedti.

    Mmadụ abụọ jikọrọ aka n'afọ 2021 iji chụtuo onyeisiala mba ahụ bụ Omar Al-Bashir, mana ha nwere nghọtahie gbasara etu a ga-esi hazie usoro ọchịchị, nke mere ha ji malite ịlụso one ha ọgụ nke onwebeghị onye ma mgbe ọ ga-akwụsị.

  5. Onyeisiala mba Gambia amachiela ndị ọchịchị ime njem ofesi, ma ya onwe ya

    Adama Barrow

    Ebe foto si, Getty Images

    Adama Barrow, bụ onyeisiala mba Gambia amachiela ndị ọchịchị mba ahụ, tinyere ya onwe ya ime njem ofesi ọbụla, iji butuo ego gọọmentị na-emefu.

    Otu ọnụ na-ekwuru onyeisiala kwupụtara nke a n'ụbọchị Satọde dịka o kwuru na Barrow binyere aka n'iwu ọhụrụ nke machiri "onyeisiala, osote onyeisiala, ndị mịnịsta, ndị welitere isi na gọọmentị, nakwa ndị ọrụ gọọmentị ọbụla, ime njem ọbụla gaa mba ofesi, ruo na ngwụcha afọ a".

    Mana o kwuru na iwu a abụghị maka ọgbakọ ọbụla ọ bụ iwu na Gambia ga-esonyerịrị, ma bụrụkwa na ndị haziri ọgbakọ ahụ ga-akwụ ụgwọ niile maka njem ahụ.

    Gambịa bụ mba kacha nta n'Afrịka, ha nwere naanị mmadụ nde abụọ. Na ngụkọ mba ụwa ndị mepere emepe dịka UN si agụkọ ya, Gambia bụ mba nke 174 n'ime mba 194.

    Otu n'ime mmadụ ise bi na mba ahụ dara oke ụbịam nke bụ na ha anaghị enweta ihe ruru dọla abụọ kwa ụbọchị, dịka ngụkọ Ụlọakụ mba ụwa si dị.

    Ego gọọmentị mba ahụ gbadara nke ukwuu n'ọdị nso a dịka ego a na-enweta n'ụtụisi gbadara, ego gọọmentị na-emefu n'ibubata mmanụ ụgbọala, fetịlaịza, na nrị ọka agbalie, n'ihi agha a na-alụ na Ukraine.

  6. Ọ bụrụ na Ecowas wakpo Niger, ọ gaghị adịrị ha mfe etu ha si chee - Tchiani

    Abdourahamane Tchiani

    Ebe foto si, AFP

    Onye isi ndị agha na-achị mba Niger Repọblik ugbua bụ Abdourahamane Tchiani adọọla otu Ecowas aka na ntị ka ha ghara ịwakpo mba ahụ maka na "ọ gaghị adịcha mfe etu ụfọdụ si chee".

    Tchiani kwuru nke a na mgbasaozi o mere n'ụbọchị Satọde, dịka o kwuru na ọchịchị ndị agha agaghị agafe afọ atọ.

    "Ecowas na-adị njikere ịwakpo Niger site n'isonyere ndị agha otu mba ofesi iji hibe otu ndị agha na mba anyị, mana ọ bụrụ na e nwee mwakpo ọbụla megide anyị, ọ gaghị adịchara ha mfe dịka ụfodụ ndị mmadụ si eche," ka o kwuru.

    Tchiani katọrọ atụmatụ dị icheiche otu Ecowas tinyere iji nye mba Niger ntaramahụhụ kamgbe ndị agha mba ahụ chụtutu onyeisiala Mohamed Bazoum n'ọchịchị n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị ma weghara ọchịchị.

    O kwuru na ntaramahụhụ ndị ahụ megidere iwu mba ụwa ma gosikwa na Ecowas enweghị obi mmadụ.

    Ọ gara n'ihu kwupụta mmalite mmkparịtaụka ọha obodo (national dialogue) ije wepụta atụmatụ dọrọ anya ma hibe ntọala maka usoro iwu ohụrụ na mba Niger.

    Ozi a Tchiani zipụtara na-abịa dịka ndị ozi nke Ecowas zipụrụ bịarutere na mba Niger n'ụbọchị Satọde, iji nwee mkparịtaụka ikpeazụ, ha na ndị agha ahụ weghaara ọchịchị, tupu e kpebie ma ndị agha Ecowas a ga-awakpo mba Niger.

    Ndị ozi a zutere Mohamed Bazoum, bụ onye ndị agha ji ya na ezinụlọ eji n'ime ụlọ onyeisiala kamgbe a chụturu ya n'ọkwa na Julaị.

    Cheta na ndị isi ndị agha mba so n'otu Ecowas nwere ọgbakọ abalị abụọ gara aga iji hazichaa atụmatụ ha ma dị njikere ịwakpo mba Niger ma ọ bụrụ na e nye ha ikike.

  7. Ụtụtụ ọma nụ

    Ụnụ asaala chi ụmụ Igbo.

    Ihe ọma meere onye mekwaara nwanne ya.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa na-egbughị oge.

  8. Niger Coup: Ndị Ecowas zigara atụọla ụkwụ na Niger

    Ndịisiala mba dị n'otu Ecowas

    Ebe foto si, Ecowas/Twitter

    Nkọwa foto, Ndịisiala mba dị n'otu Ecowas oge ha weburu ọgbakọ

    Ndị otu Economic Communities of West Africa(Ecowas zigara mba Nijie maka mkparịtaụka ha na ndịsi agha weghara ọchịchị n'ike atụọla ụkwụ n'isiobodo mba ahụ bụ Niamey n'ehihie Satode.

    Ụlọntaakụkọ AFP kwuru na ụgbọelu bụ ndị ozi ahụ tụrụ na Nijie n'Elekere mbụ nke ehihie.

    Nke bụ nke abụọ ha ghara mba ahụ maka okwu iweghachị ọchịchị onyeisiala Mohammed Bazoum mana ije ha mbụ amịtaghị mkpụrụ.

    N'ụbọchị Fraide ndịisi aha mba ndị dị n'Ecowas kwuru na ha dị njikere ọgụ ma ọ bụrụ ma ọ bụrụ na iji mkparịtaụka dozie okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ.

    Cheta na ndịagha chụturu Onyeisiala Mohamed Bazoum n'ọkwa n'abalị 27 mnke ọnwa Julai weghara ọchịchị,

    Mana otu Ecowas nyere ha iwu ka ha rituo, e meghị otu ahụ ha nwere ndịagha bịara ha ọgụ iji weghachi ọchịchị ọchịchị onyekwuoucheya.

  9. Lucy Letby: A maala nọọsụ ikpe maka igbu ụmụ ọhụrụ asaa

    Lucy Letby

    Ebe foto si, Swin

    Ụlọikpe mba Briten amaala nọọsụ ikpe maka igbu ụmụaka ọhụrụ asaa na ngalaba ụmụaka a mụrụ ọhụrụ.

    A makwara Lucy Letby gbara afọ 33 ikpe na ịnwa ikpu ụmụaka isii ọzọ n'ụlọọgwu 'Countess of Chester Hospital' na-agbata ọnwa Juun afọ 20215 na ọnwa Juun afọ 2016.

    Nọọsụ Letby na-ama ụma gbanye ụmụaka a mụrụ ọhụrụ ikuku n'ahụ maọbụ gbaa ha mmiri ara ehi, ụfọdụ ka ọ na-etinyere ha i'insulin dịka nsi.

    Oge a mara ya ikpe, Letby dakapụrụ tiwe mkpu akwa.

    A nwuchiri Letby dịka ndị uweojii Cheshire mere nnyoch afọ abụọ iji chọpụta ihe mere ụmụaka a mụrụ ọhụrụ ji anwụ aghara aghara n'ụlọọgwụ 'Countess of Chester Hospital'.

    E mechara nwuchie nwada ahụ, tọhapụ ya ma nwuchikwa ya.

  10. Mba South Africa adịla njikere ịnabata onyeisiala China, Xi Jinping

    Xi Jinping

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba China bụ Xi Jinping ga-eme njem nleta gaa mba South Africa n'izuụka na-abịanụ, ma sonyekwa n'ọgbakọ Brics a ga-enwe na mba ahụ, dịka ndị ọchịchị South Africa si kwuo.

    Brics bụ aha ịchafụ nke pụtara 'Brazil, Russia, India, China, na South Africa - nke ọtụtụ na-eji atụnyere otu G7 nke bụ otu jikọrọ mba asaa kacha mepee emepe n'ụwa.

    Nke a ga-abụ njem ofesi nke abụ Xi Jinping ga-eme n'afọ 2023, dịka ọ gara mba Russia n'ọnwa Maachị.

    Ndị isiala mba so n'otu Brics ga-enwe ọgbakọ na South Africa n'izuụka na-abịanụ, ebe otu ihe ga-akpa maka ya bụ ma a ga-enye ohere ịnabata mba ndị ọzọ n'otu ahụ.

    Mba Afrịka dị icheiche dịka Algeria, Egypt na Ethiopia ekwupụtabuola mmasị ha isonye n'otu Brics.

    Ndị mmadụ nọbu na-eche ma onyeisiala Russia bụ Vladmir Putin ọ ga-eme njem gaa South Africa iji sonye n'ọgbakọ ahụ, mana ụlọọrụ onyeisiala nke Saouth Afrịka mechara kwupụta na Putin n'onwe ya agaghị abịa ọgbakọ ahụ.

    Cheta na ụlọikpe mbaụwa a kpọrọ 'International Criminal Court nyere iwu ka e jichie Putin n'ihi ebubo mpụ agha nke ndị agha Russia na-eme na mba Ukraine.

    South Africa sokwa na mba ndị binyere aka n'akwụkwọ hibere ụlọikpe ICC. Ọ bụrụ na Putin mee njem gaa South Africa, iwu ji ha ijichi Putin ma hafee ya n'aka ụlọikpe ICC ka e kpee ya ikpe.

  11. Gịnị ka ọ pụtara mmadụ ịnwụ n'ihu ọrụ ya? - Onye ọkwọ ụgbọelu ndị agha nwụrụ na Niger Steeti

    Ibrahim Abubakar Adamu

    Ebe foto si, Ibrahim Abubakar Adamu

    Nkọwa foto, Ibrahim Abubakar Adamu lara mmụọ dịka ụgbọelu ọ na-anya kpọkasịrị na Niger Steeti

    Ibrahim Adamu Abubakar bụ onye ọkwọ ụgbọelu ndị agha Naịjirịa, onye tufuru ndụ ya dịka ụgbọelu ọ na-anya kpọkasịrị na Niger steeti, mpaghara Ugwu Naịjirịa n'izuụka gara aga.

    Nwanne ya nwoke bụ Ashiru Abubakar Adamu gwara BBC na ihe dịka izuụka abụọ tupu Ibrahim alaa mmụọ, ọ jụrụ otu onye ụkọchukwu alakụba sị: "gịnị ka ọ pụtara ma mmadụ nwụọ n'ihu ọrụ ya?"

    Ashiru Abubakar Adamu kwuru nke a dịka ọ na-akọwa ụdị mmadụ nwanne ya nwoke Ibrahim bụ oge ọ dị ndụ, nakwa etu ọnwụ ya si metụta ezinụlọ ha.

    "Nwanne m nwoke bụ ezigbo mmadụ, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ekwu okwu ọma dị icheiche gbasara ya kamgbe akụkọ ọnwụ ya pụtara," Ashiru Abubakar kwuru.

    "Oge niile ka ọ na-achọ ụzọ imere ndị mmaọ̄ụ ihe ọma."

    "N'ọdị nso a, ọ rịọrọ m ka m gbazinye ya ego, mgbe m jụrụ ya ihe ọ chọrọ iji ego ahụ mee, o kwuru na ya chọrọ iji ya gboo mkpa ụfọdụ mmadụ ndị na-ele ya anya maka enyemaka."

    Ashiru gara n'ihu kwuo na Ibrahim gụchara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ndị agha a na-akpọ 'Nigeria Defence Academy' n'afọ 2017 ma mee nke ọma n'ụlọ akwụkwọ.

    "Ọ lụrụ nwaanyị naanị afọ abụọ gara aga. Nwa ya ka dị naanị otu afọ na ụma tupu ọnwụ ya."

    Ibrahim Abubakar Adamu

    Ebe foto si, Ibrahim Abubakar Adamu

    Isi ụlọọrụ ndị agha Naịjirịa kwuru na ọ bụ ndị agha 36 lara mmụọ dịka ndị ekperima bandit wakporo ha n'okpuru ọchịchị Shiroro na Naịja steeti n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst 2023.

    Dịka mwakpo ahụ na-eme, e zipuru Ibrahim na otu onye ọzọ ka ha buru ụgbọelu helịkọpta ga zọpụta ndị agha merụrụ ahụ, mana ụgbọelu ahụ kpọkasịrị, gbuo mmadụ abụọ nọ n'ime ya.

    Ndị agha ekwubeghị ka ọ bụ ndị ekperima ahụ gbaturu ya bụ ụgbọelu, mana ụfọdụ ndị obodo ebe mwakpo a mere, kwuru na ha na-eche na ọ bụ ndị ekperima ahụ gbaturu ụgbọelu ahụ.

    Jubril Alawa bụ onye ndu ndị ntorobịa n'obodo Alawa, dị nso ebe mwakpo a mere kwuru na ha hụrụ ka ụgbọelu helịkọpta ahụ na-efe na nso obodo Badna bụ ebe ndị ekperima ahụ nọ.

    "Ụgbọelu a feturu nso n'ala nke mere ọtụtụ ji eche na ọ bụ ndị ekperima ahụ gbaturu ya," Jubril Alawa kwuru.

  12. Ụlọikpe ejichiela onye amụma na mkpọrọ maka ebubo imetọ nwa dị afọ 12

    Nwoke e boro ebubo imetọ nwata nwaanyị dị afọ 12

    Ebe foto si, FIDA Imo State

    Ụlọikpe 'magistrate' dị n'Owerri enyela iwu ka e jichie otu nwoke na-akpọ onwe ya onye amụma, aha ya bụ Emeka Michael, na mkpọrọ maka ebubo imetọ nwata nwaanyị dị naanị afọ 12.

    Ọkaikpe ụlọikpe ahụ bụ Obinna Njemanze nyere iwu a n'ụbọchị Satọde, dịka e butere ya bụ ikpe n'ihu ya, ma kwuo na ụlọikpe ya enweghị ikike ikpe ikpe gbasara mmetọ ụmụaka.

    Njemanze nyere iwu ka e jichie nwa amadị ahụ bụ Emeka Michael n'ụlọ mkpọrọ dị n'Owere ruo ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba mgbe a ga-eleba ya anya ọzọ.

    Ọ bụ otu jikọrọ ụmụnwaanyị ndị ọkaiwu na Naịjirịa a kpọrọ 'International Federation of Women Lawyers (FIDA), ngalaba nke Imo Steeti, wetere ikpe ahụ n'ụlọ ikpe.

    Akụkọ kwuru na nwata nwaanyị a dị afọ 12 na nwanne ya nwoke dị afọ 6 bụ ndị Anambra, mana ha bịara n'ụlọ nwa amadị ahụ bụ Emeka Michael na Naze, Owerri, iji nọọ oge ezumike ha.

    FIDA kwuru na nwata nwaanyị ahụ gbapụrụ n'ụlọ Emeka dịka ọ chọrọ ịkwaso ya iko n'ike, mana ndị mmadụ hụrụ ya wee kpọga n'otu ụlọọrụ mgbasaozi redio, bụ ndị kwuliri okwu gbasara ọnọdụ nwata ahụ ma kpọgakwa ya na nke ndị uweojii.

    Ọ bụ otu a ka ozi si ruo onyeisi otu FIDA ntị bụ Ọkaikpe Joy Nwosu-Azuama, bụ onye kpọkuru ndị ọrụ ya ha wee wega mkpesa n'ụlọikpe.

    Mmadụ anọ e boro ebubo idina nwaanyị n'ike

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    Akụkọ a na-abịa naanị otu izuụkaụlọikpe ọzọ n'Owere tụrụ ụmụokorobịa anọ mkpọrọ maka idina otu nwata nwaanyị dị naanị afọ 15 n'ike.

    Akụkọ kwuru na ụmụ okorobịa anọ a wakporo nwata nwaanyị ahụ dinaa ya n'ike ma yie ya egwu na ha ga-egbu ya ma ọ gwa onye ọbụla.

  13. Ihe anyị ma maka N5bn gọọmentị etiti nyere ndị gọvanọ iji nyere ndị mmadụ aka

    Ndị Gọvanọ

    Ebe foto si, Nigerian Presidency

    Gọọmentị etiti ekwupụtala na ha ga-enye steeti 36 dị na Naịjirịa nakwa FCT ego dị ijeri naịra ise iji nyere ndị mmadụ aka na steeti ha dị icheiche, iji belata nhịahụ dị na Naịjirịa ugbua dịka gọọmentị kwụsịrị ịkwụ 'fuel subsidy'.

    Gọvanọ Borno Steeti bụ Babagana Zulum kwupụtara nke a n'ụbọchị Tọzde dịka e mechara ọgbakọ 'National Economic Council nke osote onyeisiala bụ Kashim Shettima bụ onyeisioche ya.

    Zulum kwuru na ego ahụ bụ ka ndị gọvanọ were ya zụta akpa osikapa 100,000, akpa ọka 40,000 nakwa fetịlaịza, iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'ihi ụkọ nri na Naịjirịa.

    Cheta na gọọmentị etiti kwupụtaburu atụmatụ ịkwụ ezinụlọ ha sị bụ ndị kacha daa ụbịam puku naịra asatọ kwa ọnwa, ruo ọnwa isii, iji nyere ha aka, mana ha mechara kwuo na ha ga-akwụsịtụ atụmatụ ahụ.

    Mana lee ihe anyị ma ugbua maka N5b gọọmentị nyere ndị gọvanọ steeti, dịka ozi si n'aka Asishana Okauru bụ 'director-general' nke otu 'Nigeria Governors Forum' si kwuo:

    • E kere ego ahụ ụzọ abụọ, otu ụzọ bụ ego mgbazinye (loan), nke ọzọ bụ onyinye (grant)
    • Ego mgbazinye dị na ya bụ N1.92b
    • Gọọmentị steeti niile ga na-akwụghachi ụgwọ a kwa ọnwa ruo mgbe ha kwụchara ya
    • Oge e nyere iji kwụghachichaa ụgwọ a bụ ọnwa 20
    • Ụgwọ a enweghị ọmụrụ nwa ọbụla so ya
    • Ọ bụghị iwu na steeti niile ga-anara ego a, steeti ọbụla na-achọghị nwere ohere ikwu na ha achọghị
    • Gọọmentị steeti ọbụla na-achọghị iketa oke n'ego mgbazinye a ga-akwụghaci ijeri naịra abụọ nke e nyeburula ha.
  14. Ụtụtụ ọma o

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Anyị abatala n'ụbọchị ọhụrụ, iwetara gị akụkọ dị mkpa na mpaghara ụwa niile maka taa.

    Daalụ nke ukwuu dịka ị na-esonyere anyị.

  15. Anyị dị njikere iji aka ike weghachi ọchịchị onye kwuo uche ya na Niger - Ndị agha Ecowas

    Ndị agha Ecowas
    Nkọwa foto, "Ọ bụrụ na mkparịtaụka agaghị, anyị dị njikere iziga ndị agha" - Ndị agha Ecowas

    Ndị isi ndị agha mba so n'otu Ecowas ekwuola na ha dị njikere iji aka ike weghachite ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya na mba Niger Repọblik ma ọ bụrụ na usoro mkparịtaụka amịtaghị mkpụrụ.

    Nke a na-abịa dịka a malitere nzukọ n'Accra, Ghana, nke ndị isi agha mba Ecowas dị icheiche na-esonye na ya.

    Kọmishọna udo na nchekwa nke Ecowas bụ Abdel-Fatau Musah kwuru na ihe dịka mba niile so n'otu Ecowas kwenyere ịhọpụta ndị agha ma dịkwa njikere ịbanye na mba Niger ma ọ bụrụ na e nye ha ikike.

    O kwuru na ndị agha mba Niger Repọblik ka nwere ohere ugbua iji laghachi azụ ma hafee ọchịchị n'aka ndị nkịtị, "maka na anyị na-atụle atụmatụ niile anyị nwere iji weghachite ọchịchị ndị nkịtị na mba ahụ".

    Ọnọdụ ndị agha Ecowas ịwakpo mba Niger Repọblik emeela ka ụjọ gbalie na mpaghara ọdịda anyanwụ, ọ kachasị dịka gọọmentị mba mali na Burkina Faso - bụkwa ebe ndị agha nọ n'ọchịchị - kwuru na ha ga-akwụnyere ndị agha Niger ma ọ bụrụ na ndị agha Ecowas wakpo ha.

    Otu Ecowas kwuru na ha ga-eji ego ha kwadoo ndị agha ha mana ha ga-anabatakwa enyemaka si mba ndị ọzọ.

  16. Ihe ndị uweojii kwuru maka nwaanyị onye oziọma a sị nwụrụ n'ụlọ ngwọrị n'Aba

    Nigeria Police

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Akụkọ apụtawanyela ihe gbasara etu e si hụ ozu otu nwaanyị onye a sị na ọ bụ onye oziọma (Evangelist), n'ụlọ oriri na nkwari ebe ya na otu nwoke a sị bụ Bishọp soro gaa.

    Ihe a mere n'obodo Ovom nke dị n'okpuruọchịchị Obingwa n'Abia Steeti n'ụbọchị 12 na 13 nke ọnwa Ọgọst 2023.

    Dịka ndị uweojii si kwuo, ha nwetara mkpesa na otu onye ụkọchukwu aha ya bụ Timothu Otu, onye nwe ụlọụka a na-akpọ Agape Evangelical Ministry, na otu nwaanyị dị afọ 43 aha ya bụ Happiness Echieze, gara were otu ọnụ ụlọ n'ụlọ ndina a na-akpọ Jubilee Guest House, na mgbede ụbọchị 12 nke Ọgọst 2023.

    N'ebe elekere 12 nke etiti abali ka otu onye ọrụ n'ụlọ ndina ahụ aha ya bụ Godwin Akpan banyere n'ọnụ ụlọ ebe mmadụ abụọ ahụ nọ, wee chọpụta na nke nwaanyị bụ Happines dina ka onye nwụrụ anwụ, ihe dịka ụfụfụ esi ya n'imi nakwa n'ọnụ na-apụta, mana ọ hụzighị ụkọchukwu ahụ bụ Timothy Onu.

    Mazị Akpan wegara mkpesa a na nke ndị uweojii ha wee malite nnyocha ha.

    Chioma Chinaka, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti, kwuru na ndị uweojii buuru ozu nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ buga n'ụlọozu iji chere ka e mee nnyocha 'autopsy' ma chọpụta kpọmkwem ihe kpatara ọnwụ ya.

    Chinaka kwukwara na ha ejidela ụkọchukwu ahụ ya na nwaanyị ahụ so gaa n'ụlọ oriri na nkwari ahụ ma buga ya na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii na-ahụ maka nnyocha mpụ nke a na-akpọ 'Criminal Investigative Department' (CID).

    Akụkọ kwuru na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ji ụmụ ise tupu ọnwụ ya.

  17. Ndị isi agha mba Ọdịda Anyanwụ Afrịka na-ezukọ na Ghana maka ihe na-eme na mba Niger

    Ndị agha mba so n'otu Ecowas

    Ebe foto si, AFP

    Ndị isi ndị agha nke mba dị icheiche so n'otu Ecowas amalitela ọgbakọ ha na Ghana iji kpaa nkata gbasara iziga ndị agha na mba Niger Repọblik dịka ndị isi Ecowas si nye iwu.

    Ọgbakọ a nke a ga-eme ụbọchị abụọ, ụbọchị 17 na 18 nke ọnwa ọgọst 2023, na-aga n'ihu n'isi obodo mba Ghana bụ Accra.

    Opekatampe mba 11 n'ime mba 15 mebere otu Ecowas kwadoro ka e ziga ndị agha na Niger Repọblik, bụ ebe ndị agha mba ahụ chụpụrụ onyeisiala ha bụ mohamed Bazoum n'ike ma weghara ọchịchị.

    Otu Ecowas kwuru na ha agaghị anabata ndị agha iweghara ọchịchị n'ike ma na-akụsa atụmatụ ọchịchị onye kwuo uche ya na mpaghara ọdịda Anyanwụ Afrịka.

    Ka ọ dị ugbua, ndị agha ewerela ọchịchị n'ike na mba Mali, Burkina Faso na Guinea, bụcha ndị nọ n'otu Ecowas. Mba atọ a kwuru na ha kwadoro ihe ndị agha Niger Repọblik mere, ma katọkwaa atụmatụ Ecowas iziga ndị agha ebe ahụ.

    Ọgbakọ a nke na-aga n'ihu n'Accra bụ ebe ndị agha mba Ecowas ga-anọ kwekọrịta ma ha a ga-awakpo Niger Repọblik, nakwa ihe ọ ga-ewe ha iji mee ya dịka: ndị agha ole mba dị icheiche ga-eweta, nakwa usoro ya bụ mbuso agha ga-esi gaa.

    N'oge gara aga, Naịjirịa na Ghana nọrọ n'isi otu ndị agha a kpọrọ 'Ecowas Ceasefire Monitory Group (Ecomog) bụ ndị gara lụọ ọgụ ma weta udo na mba Sierral Leone na Liberia n'ebe afọ 1990 ga.

    Ndị agha ahụ sokwa gaa mba Gambia n'afọ 2017 dịka onyeisiala mba ahụ bụ Yahaya Jammeh jụrụ iritu n'ọchịchị dịka ọ dara ntuliaka. ha ka nọ na mba Gambia ruo ugbua dịka ha na-enye aka inye ndị agha mba ahụ ọzụzụ nakwa ichekwa obodo.

    Ọgbakọ ndị agha Ecowas n'Accra Ghana na-abịa dịka ọnọdụ nchekwa na mba Niger na-akawanye njọ. N'ụbọchị Tuzde, Ọgọst 15, ndị ọgụ nnupuisi okpukperechi alakụba gburu ndị agha 17 na mwakpo ha mere na mba ahụ ma merụkwaa ihe karịrị mmadụ 20 ahụ.

  18. Etu mmadụ karịrị 60 si laa n'iyi n'osimiri dịka ha chọrọ ịgafe Europe

    Osimiri dị na mba Cape Verde

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Osimiri dị na mba Cape Verde

    Ihe karịrị mmaọ̄ụ 60 bụ ndị njem chọrọ iji ụgbọmmiri gafee Europe alaala n'iyi n'osirimiri Atlantic, na mpụga mba Cape Verde.

    ọtụtụ n'ime ndị a bụ ndị si mba Senegal. Ụgbọmmiri ha bu ihe dịka mmadụ 100 kwọpụ njem na Senegal, mana a malitere ịchọ ụgbọmmiri ahụ achọ ihe dịka otu ọnwa oji pụọ njem ahụ.,

    E mechara chọta ụgbọ ahụ ma hụ na mmadụ 60 n'ime ndị njem nọ na ya anwụọla, ebe 38 ka dị ndụ, asaa n'ime ha ka e buuru gawa ụlọọgwụ dịka ha nọ n'ọnọdụ ọjọọ.

    Ndị ọchịchị mba Senegal kwuru na ha na-atụ alo ịkpọlata ndị ahụ dị ndụ nke gụnyere ụmụaka anọ dị n'etiti afọ 12 na 16.

    Gọọmentị mba Cape Verde akpọọla oku ka mba ụwa dị icheiche tinye anya n'okwu gbasara njem ndị mmadụ site n'ụzọ osimiri iji gbochie ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ n'osimiri.

    A na-eche na ụgbọmmiri ahụ na-aga na mpaghara 'Spain Canary Island' nke bụ ebe ọtụtụ ndị njem na-esikarị abanye na mba Europe.

  19. Etu aka si kpara nwoke a sị tọọrọ nwa dị afọ anọ

    Onye a na-enyo na ọ bụ onye ntọ

    Ndị agbataobi anwụchiela otu nwoke a sị tọrọ nwata gbara afọ anọ ma napụta ya nwa ọ tọrọ na New Jerusalem dị na Dutse Makaranta n'Abuja na mgbede Wenezde.

    Ndị nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na nwaamadị ahụ gbara afọ 25, a kpọghị aha ya, onye Kogi steeti batara n'ụlọ ndị mụrụ nwata ahụ oge nne na na anọghị ya, nanị nwata ahụ na onye na-elekọta ya nọ maburu nwa ahụ.

    Otu onye n'ime ha kwuru sị, "Ya na nwa odibo ahụ zọrọ nwata ahụ nwa oge tupu ike ya akarịa nwa odibo, ya ekuru nwa ahụ gapụ ọsọ.

    "Ọ bụ mkpu gbagbagbata nwa odibo ahụ tiwere dọtara ndị mmadụ bụ ndị chụwara ma jide nwa amadi ahụ."

    Ihe igwe mmadụ gbakọrọ ebe ahụ oge onye ntaakụkọ BBC rutere mana ndị o metụtara ekweghị ekwu ihe ọbụla banyere ihe mere.

    Mbo BBC gbara ị nụta olu ndị uweojii amịtaghị mkpụrụ.

    Oge a kpọrọ ya n'ekwe ntị ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Isistanetious Bako kwuru na ọ naghị anụ ihe onye ntakụka anyị na-ekwu makwe nkwa ịkpọghachi.

    E zigara ya ozi n'ekwentị mana ọ saghị ajụjụ ndị ezigara ya oge akụkọ a pụtara.

    Ọha mmadụ gbakọrọ ebe ihe mere
  20. Tinubu akwaala arịrị maka ndị agha nwụrụ na mwakpo ndị ekperima na Niger

    Tinubu gara leta ndị agha Naịjirịa na mba Guinea Bissau, July 8, 2023

    Ebe foto si, Nigerian Presidency

    Onyeisiala Nigeria bụ Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala nnukwu mwute ya maka ọnwụ ọtụtụ ndị agha Naịjirịa n'aka ndị ekperima 'bandit' n'obodo Chukuba dị na mpaghara Shiroro nke Niger Steeti n'ụbọchị Monde.

    Tinubu kwuru na dịka Naịjirịa na-eru uju ọnwụ ndị agha a, "ncheta ha ga-adịgide n'obi anyị niile dịka ndị dike nyere ndụ ha maka udo na nchekwa nke obodo anyị".

    "Anyị ga-echeta ha dịka ndị na-eleghị anya n'ihe egwu dị icheiche nke chere ha n'ihu, kama ha ji ndụ ha chụọ aja maka ọdịmma ndị mba ha," Tinubu kwuru.

    "Anyị na-ekele ha n'ụzọ pụrụ iche maka aja ha chụrụ, maka ịkwụdosi ike nye mba anyị nke ha hụrụ n'anya nke ukwu ma gbaara ya odibọ ruo n'isi njedebe."

    Ka ọ dị ugbua, amabeghị ndị agha ole nwụrụ na mwakpo ahụ kpọmkwem, mana ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ha nwereike ịkarị 20.

    Chetakwa na otu ụgbọelu helịkọpta ndị agha gara ịzọpụta ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ kpọkasịrị, dịka ọnụ na-ekwuru ndị agha elu Naịjirịa bụ Edward Gabkwet si kwupụta.