France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa

Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Ndeewo Igbo ndị ọma!!!, Anyị ekele unu taata, lee akụkọ ndị dị mkpa na mba ụwa niile.

  2. E duola Odeakwụkwu ukwu Ebonyi, ndị ọzọ iyiọrụ

    Ndọ ọrụ ọhụrụ gọọmentị Ebonyi Steeti

    Ebe foto si, Fancis Nwifuru/Facebook

    E duru odeakwụkwọ ukwu nke Gọọmentị Ebnyi steeti bụ Ọkammụta Grace Umezurike, Odeakwụkwọ nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Mathias Adum; Onye ngụkọ ego steeti ahụ bụ Emeka Nwankwo na ndị ndị enyemaka ọhụrụ gọọmentị ndị ọzọ iyi ọrụ ụnyahụ bụ Tuzde.

    Aka na-achị steeti ahụ bụ Francis Nwifuru , onye kwupụtara nke a n'akara ya na Facebook ụbọchị Wenezde kwere nkwa na ha na ya ga-ejikọ aka ịgbara ndị Ebonyi odibo.

    Ndọ ọrụ ọhụrụ gọọmentị Ebonyi Steeti

    Ebe foto si, Francis Nwifuru

  3. Italy na-akwa arịrị ọnwụ Silvio Berlusconi bụbụ Praịm Minista

    Silvio Berlusconi

    Ebe foto si, PA Media

    Ụmụafọ mba Italy na-akwa arịrị maka ọnwụ Silvio Berlusconi bụbụ Praịm Mịnịsta ha bụ onye nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Juun afọ 2023.

    Berlusconi, onye nwụrụ ka ọ gbachara afọ 86 na-arịabu ọrịa kansa ọbara mana ọ bụ ọrịa ngụ mere ka e buga ya n'ụlọọgwụ na nsonso a ebe ọ nọ nwụọ.

    Berlusconi bụ onye ojiegoachụego nwe ụlọọrụ ntakụkọ nwere agba tupu ọbanye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1990.

    O rụrụ ọrụ dịka Praim Minista mba Italy site n'afọ 1994 rue afọ1995; afọ 2001 rue 2006 na afọ 2008 rue 2011.

    E jikwa ịnwe ụbara nwunye na ndị enyinwaanyị mara ya.

    has two children from his first marriage and three from his second. All of them have stakes in Fininvest, his holding company.

    Nwaanyị mbụ ọ lụrụ mụtara ya ụmụ abụọ, ene nke abbụọ mụrụ ya ụmụ atọ.

    Taa bụ Wenezde, gọọmentị mba Italy na-akwa ya dịka Archbishop nke Milan ga-edu ndị ọzọ na mmemme akwamozu ya n'akatamkpo Katidral dị n'obodo ahụ.

    Silvio Berlusconi

    Ebe foto si, Getty

    A ma odogwu a malitere ndụ ya dịka onye na-ere igwe e ji ahicha ụlọ nakwa onye na-agụ egwu n'ụgbọmmiri tupu ọ baa ọgara nya ma nwee ụlọọrụ ntaakụkọ, ụlọ na ala, sinima, nakwa egwuregwu ma bụrụkwa onye hiwere otu pati nwere agba a kpọrọ,Forza Italia.

    A ma ya ama maka ikwe nkwa idozzi ọnọdụ akụnaụba mba Itali mana o meli nke a oge ọ nọ n'ọchịchị.

    N'ọnwa Oktoba afọ 2012, ụlọikpe tụrụ ya mkpọrọ afọ anọ maka aghụghọ n'ịkwụ ụtụisi, a machikwara ya ịzọ ọkwa ọchịchịchị.

    E bokwara Berlusconi ebubo idina nwaanyị etorubeghị etoru dịka a rụụ aka maka idịna akwụna erubeghị afọ 18 years.

  4. Adị m njikere mụ na ndị omeiwu ịrụkọ ọrụ - Onyeisiala Tinubu

    Onyeisiala na ndị ndu ụlọomeiwu

    Ebe foto si, Tinubu/Akpabio/Abbas

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu ekeleela ndị ndu ụlọomeiwu eduru n’iyi ọrụ ma ṅụọ iyi na ya na ha ga-arụkọ ọrụ.

    Tinubu kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị omeiwu okwu dịka e duchara ha n’iyi ọrụ.

    “A kpọọla anyị niile oku ịrụ ọrụ, anyị anabatala ife ala nna anyị site n’iyi anyị ṅụrụ. Ugbua bụ oge bụ oge dịịrị anyị ịmalite ọrụ ozugbo na-egbughi oge.

    “Dịka onyeisiala, adị m njikere mụ na ndị omeiwu ịrụkọ ọrụ. Ndị Naịjirịa na-atụ anyị na ndị omeiwu ga-eme iwu ga-eme ka ọchịchị gọọmenti dị na-aga nke ọma nke ga-emetụta ndụ ndị mmadụ.”

    Aga m achọ ka onye ọbụla tinye uchu n’ọrụ dịka unu tinyere n’oge ntuliaka iji merie.”

    Cheta na ntuliaka e mere n’ụlọomeiwu na Tuzde, a họpụtara Godswill Akpabio dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu ebe Jibirl Barau, Tajudeen Abbas dịka onyeisi ụlọomeiwu nta ebe Benjamin Kalu na-esote ya.

  5. Umu asaala chi eee?

    Igbo ndị ọma anyị na-ekele ma na-anabata unu n'ọgbakọ anyị taa bụ ebe anyị ga-ewetere unu akụkọ banyere ihe ndị na-eme n'ụwa gbaa gburugburu.

  6. Etu ndị uweojii si memilaa ndị ekperima na-atọ mmadụ na Rivers Steeti

    Ndị uweojii Rivers Steeti

    Ebe foto si, Rivers State Police

    Ndị uweojii Rivers Steeti ekwuola na ha egbuola ndị ojiegbe anọ bụ ndị na-eyi ndị mmadụ egwu n'okporoụzọ East West Road dị n'okpuru ọchịchị Emohua na steeti ahụ.

    Kọmishọna ndị uweojii na Rivers Steeti bụ Nwonyi Polycarp kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Port Harcourt n'ụbọchị Tuzde.

    O kwuru na onyeisi ndị ekperima a bụ nwa amadị dị afọ 25 aha ya bụ Nwodi Amadi onye obodo Elibrada, bụ onye ndị uweojii na-achọ achọmaka mpụ dị icheiche nke gụnyere iji egbe ezu ohi, ịtọrọ mmadụ, ịnọ n'otu nzuzo na ndị ọzọ.

    "Ọ bụ n'ebe elekere 11 nke abalị ụbọchị Mọnde ka ndị uweojii nke ngalaba 'C4i Intelligence Team' wakporo ogige ebe ndị ekperima a zoro n'obodo Ogoloma nke dị n'okpuru ọchịchị Okrika, wee buso ha agha,"

    "Ha malitere ịkwa ndị uweojii mgbọ mana ndị otu anyị gburu mmadụ anọ n'ime ha nke gụnyere otu nwaanyị."

    Onyeisi ndị uweojii ahụ dọro aka na ntị na "agaghị enwe ebe nzuzo ọbụla maka ndị ekperima".

    O kwukwara na ụfọdụ ndị mmadụ ha zọpụtara n'aka ndị ekperima ahụ alaghachikwurula ndị ezinụlọ ha.

    N'otu aka ahụ kwa, onyeisioche okpuru ọchịchị Emohua bụ Mazị Chidi Lloyd, kwuru na ha kweburu nkwa inye nde naịra abụọ maka onye ọbụla ga-enye aka ka e jide onyeisi ndị ekperima ahụ.

    Lloyd toro ndị uweojii maka ike ha kpara ma kwuo na ha emezuola nkwa ahụ ha kwere.

  7. Etu mmiri si rie ihe ruru mmadụ 150 n'ihe mberede ụgbọmmiri na Kwara Steeti

    Ndị nọ n'ime ụgbọmmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru 150 alaala mmụọ dịka ụgbọmmiri ha nọ na ya eme njem miri na mpaghara Patigi nke Kwara Steeti.

    Ihe mberede a mere n'abalị fotere ụbọchị Mọnde, dịka ndị ahụ banyere ụgbọ mmiri si obodo Egboti na Niger Steeti na-aga mpaghara Kpada nke dị n'okpuru ọchịchị Patigi nke Kwara Steeti.

    Onye eze ọdịnala obodo Patigi bụ Alhaji Ibrahim Umar Bologi II, gwara BBC na "ọnụọgụgụ ndị nọ n'ime ụgbọmmiri ahụ oge o ihe mberede a mere karịrị 300".

    "Ndị a zọpụtara kwuru na ọ bụ 'engine' ụgbọmmiri ahụ mebiri nke mere o ji milaa na mmiri," ka o kwuru.

    "Ka ọ dị ugbua, azọpụta mmadụ 53 ebe ihe ruru mmadụ 150 ka a hụrụla ozu ha, dịka ọnụọgụgụ anyị nwetara si gosi."

    Onye eze a kwukwara na ọ bụ n'ime abalị, ebe ihe dịka elekere atọ nke abalị, ka ihe mberede a mere, mana ndị ọrụ gbatagbata ka na-agba mbị ịma ma e nwere ndị a ga-azọpụta.

    Gọvanọ Kwara Steeti bụ AbdulRahman AbdulRazaq ezigala ozi iti aka n'obi nye ndị obodo Patigi maka nnukwu ọdachi a dakwasara ha.

  8. Etu ụfọdụ ndị ahịa si mee ngagharịiwe n’Imo steeti maka ọnọdụ ụzọ

    Ndị ahịa osisi nke Umuonyeali
    Nkọwa foto, Ndị ahịa osisi nke Umuonyeali

    Ndị ahịa osisi nke abịa n’okpuruọchịchị Mbaitoli mere ngagharịiwe n’ụbọchị Mọnde maka ọnọdụ ụzọ si Umuonyeali gawa Akwakuma dị.

    Onye ntaakụkọ anyị n’ebe ahụ gbara ama n’ụzọ ahụ so n’ụzọ na-edu ndị mmadụ aga n’oke ahịa ebe a na-ere ihe eji arụ ụlọ na steeti ahụ.

    Dịka o si kwuo, ndị ahịa ahụ pụtara gosiiwe ha n’ihe etu ọnọdụ ọjọọ ụzọ si dị si emetụta mbata na ọpụpụ ndị na-abịa azụ ihe nakwa mbụbata na mbupụ ngwa ahịa ha.

    Ha kwuru na nke a na-emetụta azụmahịa ha.

    Otu onye n’ime ha bụ Uchechukwu Opara kwuru na “Ọnọdụ ụzọ a na-ebutere anyị na azụmahịa anyị ihe isi ike.”

    Opara gara n’ihu rịọ gọọmentị ka a pụta mezie ụzọ ahụ ngwa ngwa.

    E kwukwara na ọnọdụ ime njem ebe ahụ kawanyere njọ dịka mbuze metụtara akụkụ ụzọ ahụ nke ebe Akwakuma.

    Ndị ahịa osisi nke Umuonyeali
    Ndị ahịa osisi nke Umuonyeali
  9. Etu e si hụ nwaanyị ‘nwụrụ anwụ’ ebe ọ nọ n’ime igbe ozu ya n’eku ume

    Igbe ozu

    Ebe foto si, PHILIPPE LISSAC/GODONG

    Otu ndị na-eru uju gbakọrọ maka ọnwụ otu agadi nwaanyị n’Ecuadore danyere n’egwu dịka a chọpụtara na ọ ka dị ndụ.

    E kwuru na Bella Montoya gbara afọ 76, nwụrụ anwụ n'izu gara aga n’okwu a na-eche bụ ọnọdụ ahụike nke mkpọnwụ ahụ.

    N’ebe awa n’emume ili ya mgbe ndị ikwu ya nọ na-akwado ịgbanwe uwe e ga-eji lie ka a hụrụ ebe ọ na-alụ ọgụ ikuru ume ndụ. Nke a mere n’ụbọchị Fraịde.

    Montoya alọghachila n'ụlọọgwụ ugbua ebe a na-elekọta ahụike ya dịka ndị ọrụ misitri ahụike Ecuador ewepụtala kọmitii na-eyochaa ihe merenụ.

    N’ozi ha wepụtara, ministri ahụ kwuru na nwaanyị ahụ danyere n’ọnọdụ ahụike nke metụtara obi ya nakwa ikike ya iku umuma kwukwa na atụmtụ na mbọ agbara ikpọghachite ya ndụ amịtaghị mkpụrụnke mere Dọkịta nọ ọrụ ụbọchị jiri kwuo na ọ nwụọla.

    Ụlọọrụ mgbasaozi mba ahụ kwuru na nwa ya nwoke bụ Gilber Rodolfo Balberán Montoya sị na "a nabatara nne m n'ihe dị ka elekere 09:00 n’ụtụtụ mana na n'ebe ehihie, otu dọkịta gwara m [ọ] nwụọla."E tinyere Oriakụ Montoya n'ime igbe ozu ruo ọtụtụ awa ruo mgbe ndị ezinaụlọ hụrụ ya ka ha na-agbalị iku ume.

    Ihe onyonyo gbara na soshal midia gosiri ka ọ dinara n'ime igba ozu mepere emepe ma na-eku ume ebe ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ ma gbaa ya gburugburu.

    Onyonyo ahụ gosikwara ka ndị ọrụ ahụike wụbatara ebe ahụ ma malite inyocha ahụ Montoya tupu ha ejiri akwa ndina bugaya n'ime ụgbọ ihe mberede.

    Ugbua, a na-elekọta ahụike ya n'otu ụlọọgwụ ahụ bụ ebe ndị dọkịta kwupụtara ọnwụ ya.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi AFP kwuru na Maazị Balberán kwuru okwu sị:

    "E jirila m nwayọ nwayọna-aghọta ihe merenụ. Ugbua, ana m ekpe ekpere ka ahụike nne m dịkwuo mma. Achọrọ m ka ọ dị ndụ ma nọrọ n'akụkụ m."

  10. Trump awụchila Florida dịka ikpe ya ga-aga n’ihu taa

    Mgbe Trump pụtara ụgbọelu ya

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mgbe Trump pụtara ụgbọelu ya

    Donald ga-anọ na Miami, Florida tupu ọ pụta ụlọikpe na Tuzde a maka ikpe iji akwụkwọ nchekwa gọọmentị zoro n’ụzọ ezighi ezi.

    Trump chịbụrụ mba Amerịka ogigi golf ya dị na Bedminster, New Jersey, febata ụlọ ndịna ya ukwuu bụ Trump Doral resor n’akụkụ Miami.

    A na-ebo ya ebubo ijigide akwụkwọ gọọmentị zoro ezo n’ụzọ megidere iwu nke gụnyere akwụkwọ ebe e dere ihe gbasara igwe ogbunigwe ukwu nke nuklịa.

    Nke a bụ nke abụọ n’afọ a na-ebo ya ebubo mpụ.

    Cheta na Trump amalitela achụmnta vootu ịchị mba Amerịka ọzọ na 2024 dịka o na-ekwusiike na enweghi ihe ọjọọ o mere agbanyeghi na ọ bụ aka chịbụrụ mba Amerịka nke mbụ a na-ama ikpe.

    Na mgbede Mọnde mgbe ọ nọ na-abata Miami gold resort, o kwughi okwu ọbụla.

    Ọ mechara keele ndị ọbịa n’akụkụ ebe oriri ụlọ ahụ bụ BLT Prime restaurant dịka o weliri ha aka elu ma nọrọkwa see foto n’etitu otu ụmụnwoke ndị nọ ebe ahụ.

    Otu onye n’ime ha tiri mkpu si ‘Anyị nọnyere gị ruo na ngwụcha!”

    Trump sara ya sị “Daalụ sọ” tupu onye nchekwa ya e duru ya pụọ.

    N’ụbọchị Satọdee mgbe ọ pụtara n’ọha oge mbụ kemgbe ebubo ọhụrụ dapụtara, Trump kwuru na ikpe a dịka “ihe mmerụ ntuliaka” n’aka ngalaba FBI “bụ nke nrụrụaka” nakwa n’aka ndị ọrụ ikpe.

    Trump na otu onye enyemaka ya na anọ ya nso bụ Walt Nauta ga-eso pụta ụlọikpe dịka otu ikpe na-arụ ya aka na Florida.

    Ụgbọala Trump na ndị otu ya

    Ebe foto si, EPA

  11. Somtochukwu Udeze abụrụla onyeisi ụlọ omeiwu nke Anambra Steeti

    Somtochukwu Udeze

    Ebe foto si, Anamabra State New Media

    Dịka ehibere ụlọ omeiwu nke asatọ nke Anambra Steeti na Mọnde, bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Jun 2023, ndị omeiwu steeti ahụ họpụtara Somtoochukwu Eze dịka onye ga-abụ 'Speaker' nke ụlọ omeiwu ahụ.

    Udeze bụ onye na-anọchite anya mpaghara Ogbaru 2, kwere nkwa ịrụ ọrụ ya nke ọma nke gụnyere iduzi ndị omeiwu ka ha nye gọọmentị steeti nkwado n'atụmatụ mmepe dị icheiche nke gụnyere iweta ezi nchekwa, iwulite akụnụba nakwa ọnọdụ agụmakwụkwọ na steeti ahụ.

    Chukwuma Soludo na Somtoochukwu Udeze

    Ebe foto si, Anamabra State New Media

    N'emume a nke e mere n'ogige ụlọ omeiwu Anambra steeti dị n'Awka, Gọvanọ Chukwu Soludo kwuru na ugbua abụghịzi oge ịchụ nta vootu maọbụ oge e ji ekwu okwu maka otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye so na ya.

    "Anyị niile nwere otu ihe anyị na-elegara anya. Otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọ nwechara mmadụ n'ụlọ omeiwu a, mana anyị niile bụ ndị ọrụ nke ọha obodo," Soludo kwuru.

    "Otu ndọrọndọrọ dịka ụgbọala nke butere onye omeiwu ọbụla ebe a, mana ị ga-ahapụ ụgbọala ahụ n'ezi ebe a na-edebe ụgbọala tupu ịbata n'ime ụlọ omeiwu a. Ọdịmma nke Anambra Steeti bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị jikọrọ anyị niile ọnụ."

    Soludo rịọrọ ka ngalaba gọọmentị atọ nke gụnyere ndị ọchịchị, ndị omeiwu na ndị ngalaba ikpe ziri ezi jikọọ aka ọnụ iji weta ọganihu n'Anambra Steeti.

    N'okwu nnabata ya, Somtochukwu Udeze kelere ndị omeiwu ibe ya maka ịhọpụta ya dịka onyeisi ha, n'agbanyeghị na ha ruru mmadụ asatọ bụ ndị tozuru etozu inweta ya bụ ọkwa.

    "Ọrụ chere anyị n'ihu buru ibu, anyị ga-amalite ịrụ ọrụ ndị a na-egbughị oge ọbụla," ka Udeze kwere na nkwa.

  12. Ụfọdụ ndị APC Imo steeti na-aga Abuja alaala mmụọ n'ihe mberede okporoụzọ

    Ihe mberede okporoụzọ
    Nkọwa foto, Foto a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ

    Mmadụ atọ ndị otu 'All Progressives Congress' (APC) si Owere na-aga Abuja n'ụbọchị Mọnde a, alaala mmụọ n'ihe mberede okporo ụzọ.

    Otu n'ime ndị isi APC Imo Steeti gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị a na-aga isonye n'emume ihibe ụlọ omeiwu nke iri n'Abuja bụ nke a ga-eme n'ụbọchị Tuzde, bụ ụbọchị 13 nke ọnwa Jun 2023.

    Mmadụ abụọ n'ime ndị a nwụrụ anwụ bụ ụmụnwoke si obodo Amaraku nke dị n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano n'Imo Steeti, ebe onye nke ọzọ bụ nwaanyị si obodo Ogbor, dịkwa n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano.

    Onye APC a gwara onye ntaakụkọ anyị okwu kwuru na ndị a bụ ndị na-aga ịkwado Patrick Ndubueze, bụ Sinetọ na-anọchite anya mpaghara Okigwe, nakwa Miriam Onuoha bị onye ahọpụtara ịnọchite anya mpaghara Okigwe North n'ụlọ omeiwu nta bụ 'House of Representatives'.

    Ụfọdụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ahụ dịka e bu ha gawa ụlọọgwụ ị ga nye ha ọgwụgwọ.

    Onye a gwara onye ntaakụkọ anyị okwu kwuru sị: "Ha ji ụgbọala abụọ na-aga, mana ha na ụgbọala ọzọ jakọtara isi. Mmadụ atọ nwụrụ, ụmụ nwoke abụọ na otu nwaanyị."

    "Ọ bụ nnukwu ihe mwute. Anyị niile nọ n'iru uju. Ekpere anyị bụ ka Chineke nabata mkpuruobi ha."

    Ọnụ na-ekwuru pati APC n'Imo Steeti bụ Cajetan Duke kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu, mana o kwuru na ọ ka bụ naanị mmadụ abụọ ka ha ma nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

  13. Silvio Berlusconi, bụbu Praịm Mịnịsta mba Italy, alaala mmụọ

    Silvio Berlusconi

    Ebe foto si, EPA

    Onye jibu ọkwa Praịm Mịnịsta na mba Italy bụ Silvio Berlusconi anwụọla dịka ọ gbachara afọ 86.

    Ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ San Raffaele dị n'obodo Milan. N'ọnwa Eprel, Berlusconi natara ọgwụgwọ maka ọrịa ngụgụ nke e kwuru na ọ bụ n'ihi 'leukaemia'.

    Berlusconi malitere ọchịchị dịka Praịm Mịnịsta n'afọ 1994 ma nọgide n'ọkwa ruo afọ 2011, n'agbanyeghị na e nwere oge ọ rituru n'ọkwa tupu ọ laghachikwa.

    Praịme Mịnịsta Italy ugbua bụ Giorgia Meloni kọwara Berlusconi dịka otu n'ime ndị a kacha mara ama n'akụkọ mba Italy.

    Gọọmentị mba Italy etinyela ụbọchị Wenezde, Jun 14, 2023 dịka ụbọchị iru uju na mba ahụ niile. Ọ bụkwa n'ụbọchị ahụ ka emume olili Berlusconi ga-adị n'ụlọụka Cathedral nke Milan.

    "Ọkọlọtọ mba Italy na nke Europe niile dị n'ụlọ gọọmentị dị icheiche ga-efe n'ọkara malite n'ụbọchị Mọnde," ọnụ na-ekwuru gọọmentị kwuru.

  14. Ndị osiite Naịjirịa abụọ ọzọ na-achọ imekarị Hilda Baci n'atụmatụ 'Guinness world record'

    Hilda Baci mere ihe mmadụ emetụbeghi n'atụmatụ 'Guiness world records' dịka o siri nri ruo awa ihe karịrị awa 100.
    Nkọwa foto, Hilda Baci mere ihe mmadụ emetụbeghi n'atụmatụ 'Guinness world records' dịka o siri nri ruo awa ihe karịrị awa 100.

    Ndị osiite mmadụ abụọ ọzọ na-asọ mpị isoro osiite aha ya na-ewu bụ Hilda Baci ịbụ onye inweta ihe nrite Guinness world record maka ndị kacha sie nri ogologo awa.

    Baci onye aha ya wuru oke owuwu n’ọnwa gara ga maka isi nri karị awa 100 kụpụrụ onye nọbụ n’isi atụmatụ a bụ nwaafọ India ma nọchie ya.

    Ụlọọrụ Guinness World Records kana enyocha ihe Baci mere tupu enye ya asambodo dịka onye nọ n’isi atụmatụ ahụ.

    Cheta na ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjriịa gụnyere Onyeisiala Bola Tinubu zipụtara ozi too ya ma kwado atụmatụ nakwa ndị ọzọ a ma ama dọnyekwara ya ukwu n’oge ahụ.

    Ugbua, otu onye osiite aha ya bụ Adedamilola Adeparusi nke e ji Chef Dammy mara n’Ekiti steeti na-agba mbọ igbakarị Baci na-asọ dịka ọ na-anwa isi nri ruo awa 120 ebe ụlọ ntaakụkọ Vanguard Newspaper nke aha ya bụ Temitope Adebayo n’Ibadan ekwuopụta atụmatụ isi nri ruo awa 140.

  15. Ndị ekperima atọrọla ụkọchukwu Katọlik na Kaduna

    Fr Jeremiah Yakubu

    Ebe foto si, Catholik Diocese of Kafanchan

    Ndị ojiegbe atọrọla otu ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Fr Jeremiah Yakubu n'obodo Karku nke dị n'okpuru ọchịchị Kaura dị na Kaduna Steeti.

    Ọ bụ onye ji ọkwa 'Chancellor' na dayọsis Kafanchan, bụ Fr Emmanue Okolo kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zipụtara n'ụbọchị Mọnde.

    Okolo kwuru na ọ bụ n'ebe elekere 11 nke abalị ụbọchị Sọnde ka ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọụka Holy Trinity Catholic Church Karku ma tọrọ ụkọchukwu ahụ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na dịka ha na-arịọ ndị mmadụ ka cheta ụkọchukwu ahụ n'ekpere, ha ga-agba mbọ niile ha nwere ike iji hụ na a tọhapụrụ ụkọchukwu ahụ.

    Akwụkwọ ozi si n'aka dayọsis Kafanchan

    Ebe foto si, Catholic Diocese of Kafanchan

  16. Ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ Hadi Sirika kwuru maka Nigeria Air na ihe ndị ọzọ

    Hadi Sirika

    Onye bụbu minista njem ụgbọelu Naịjirịa ekpugheela na ọ bụ naanị ijeri Naịra atọ ka gọọmentị etiti wetere maka atụmụta ọrụ Nigeria Air.

    Nigeria Air bụ ụlọọrụ ụgbọelu nke Naịjirịa nke e hibere ịrụ ọrụ ibu ndị njem aga mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

    Na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Arise TV, o kwuru na mgbe ọ na-apụ n’ọkwa ahụ na oge gọọmentị wepụtara maka atụmatụ ụlọọrụ Nigeria Air ka fọrọ.

    Ọ kọwara, etu e siri hazie ụlọọrụ ahụ bụ:

    “Pasentị ise bụ maka gọọmentị etiti bụ nke ministri ego na-echekwa, pasentị 49 bụ nke ha na ụlọọrụ Ethiopian Airline na-eketa, pasentị 31 bụ maka MRS ebe pasentị 15 bụ nke SAHCO”

    Cheta na mkpughe ụlọọrụ kpatara ọtụtụ okwu dịka aka chịburu Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ya mechie ọrụ ya.

    Ụfọdụ ihe ndị ọzọ o kwuru

    • Na ndị nwee ụlọọrụ ahụ bụ ndị ji mkpughe ya mee ozi azụmahịa ma kpọ ya oku ka ọ bịa nyocha ọrụ ahụ dika ọ mara ọkwa na ụlọọrụ ahụ ga-amalite ọrụ n’uju ma hazichaa okwu AOC
    • Na e nweghi ego gọọmentị wetere maka mbata ụgbọelu ndị ahụ a ji mee mkpughe ụlọọrụ ahụ
    • Na gọọmentị achọghịzịdị itinye aka n’ọrụ ụlọọrụ ụgbọelu Nigeria Air , ma kwuo na ndị ọzọ aka ha nọ na ya nwereike ịga n’ihu na-elekọta ya bụ ụlọọrụ dịka ọ bụ naanị pasentị ise bụ oke gọọmentị na ya bụ ụlọọrụ
    • Na gọọmentị kwesiburu iweta ego ruru nde $350 maka ọrụ ụlọọrụ mana ihe mechara gbanwee
    • Na ọ bụ ihe ruru ijeri Naịra atọ ka ewepụtara maka ọrụ ụlọọrụ mana ego ahụ ka fọrọ
    • Na akụkọ na ihe niile gbasara ụlọorụ Nigeria Air zoro ezu dịka o kwuru na a kpọrọ ndị chọrọ itinye aka na ya bụ ụlọọrụ oku ka ha bịa weta ihe ha nwereike ya ma kere oke ha ma e mechaa
    • Iji saa okwu omeiwu Nnoli Nnaji nke sị na ihe gbasara ụlọọrụ Nigeria Air dịka ‘ihe nrụrụ aka”, o kwuru na ka o doo ọha anya na kọmitii nakwa ụlọomeiwu etinyeghi aka na mmepe ụlọọrụ Nigeria Air e mere.
  17. Etu Enugwu steeti si atufu N10bn kwa ụbọchị ‘sit at home’ ọbụla – Mbah

    Peter Mbah bụ gọvanọ Enugwu steeti

    Ebe foto si, Enugu State government

    Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah ekwuola na steeti ha bụ na-atufu ego ruru ijeri naịra iri (N10bn) kwa ụbọchị Mọnde ọbụla n’ihi iwu ịnọ n’ụlọ.

    O kwuru nke a n’ọgbakọ ya na ndị iche iche mere bụ ndị kwadoro nkagbu ọ kagburu iwu ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla n’Enugwu.

    O kwuru na ọ bụrụ na ndị mmadụ maara ego ole na ihe ndị na-efunahụ steeti ha n’ihi iwu ịnọ n’ụlọ na ha ga-amara na ọ bụ ihe e kwesịrị ịkagbu kpamkpam.

    O kwuru na a gaa n’ihu na-erube isi n’iwu a na ọ ga-eme ka ọchịchị ya ghara inwete GDP nke ego ya ruru ijeri dọla iri atọ ($30bn) site na ijeri dọla anọ na ụma anọ ($4.4bn) ọ nọ ugbua.

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa ndị obodo Enugwu steeti

    Ebe foto si, Enugu State government

    Mba kwuru na iwu a na-emetụtakwa ọdịnihu ụmụaka Enugwu nakwa akọnauche mmadụ niile.

    Ọ gara n’ihu kwuo na atụmatụ iwebata mmiri n’ime ụlọ onye ọbụla n’ime ọnwa isii kụọ afọ n’ala n’ihi ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla ka onye atala ya ụta.

    Ndị si meeọgbakọ a gụnyere ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Enugwu steeti gụnyere ndịisi ụlọụka, ndị ọrụ nchekwa, ndị ụlọụka, ụlọakwụkwọ na otu ndị ọzọ.

    Cheta na Mbah nyere iwu sị ka onye ọbụla bụ onye Enugwu steeti kwụsị irubeisi n’iwu ịnọ n’ụlọ bụ ndị chọrọ nwereonwe Biafra tinyere na South East maka nwuchi onyendu Nnamdi Kanu gọọmentị Naịjirịa ji kamgbe ọnwa June afọ 2021.

  18. Etu ọnwụ otu nwoke Naịjirịa si butere ụfọdụ ndị uweojii ikpe na Switzerland

    Otu ndị na-alụ ọgụ ikike dịrị onye apụtala gosi iwe ha maka ihe a mere

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Otu ndị na-alụ ọgụ ikike dịrị onye apụtala gosi iwe ha maka ihe a mere

    A dịla njikere ikpe ikpe ndị uweojii isii na Switzerland maka ebubo igbu ọchụ metụtara otu otu nwoke onye Naijiria afọ ise gara aga.

    Mike Ben Peter nwụrụ ka ndị uweojii wụchichara ya n'obodo Lausanne.

    Ndị uweojii kwuru na ha ji usoro ehibere ha n mwụchinwoke ahụ na-ebo ebubo ịbụ onye na-ere ọgwụ ike.

    Ndị uweojii jichiri ya n'ala mgbe ọ jụrụ ka ha nyochaa ahụ ya.

    Ndị ọkaikpe ndị uweojii ahụ na-arụ ụka na ọnwụ Mike Ben Peter nwereike ịbụ n'ihi nsogbu ahụike o nweburu.

    Ezinụlọ nwoke ahụ nwụrụ anwụ na ndị otu na-emegide ịkpaókè agbụrụ na Switzerland arụọla aka na ọnwụ ya na nke George Floyd bụ onye mba Amerịka ndị uweojii Amerịka gburu na 2020 n’obodo Minneapolis dịka otu ihe.

  19. Democracy Day: Unu nweere anyị ndịdị na mwepụ ‘Subsidy’ mmanụ ụgbọala - Bola Tinubu

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwuola okwu banyere ụfọdụ ihe ndị so ọchịchị ya nke malitere n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023.

    N'ozi ya nye ụmụafọ Naịjirịa nke o zipụtrara maka ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya, ọ rịọrọ ụmụafọ Naịjirịa ka e nwere ọchịchị ya ndidi ọkachasị dịka 'ibu arọ' nke mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala na-emetụta ha ma gaa n'ihu kwee nkwa olemole banyere mkpụrụ nakwa uru 'ịchụ ajaa' nke ha na-eme ugbua ga-amụta n'ọdịnihu.

    Kirie ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe ndị o kwuru n'uju.

  20. Democracy Day: ‘Fuel Subsidy’, 'Tribunal' na ihe ndị ọzọ nọ n’ozi Onyeisala Tinubu

    Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Onyeisiasla Bola Ahmed Tinubu n’ozi ya nye ụmụafọ Naịjirịa n’ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijirịa bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Juun kwanyereMoshood Abiola ugwu, tọọ mbọ ọ gbara na ikwa ụzọ maka ọchịchị onye kwuo ya ma kelekwaa ndị nna nna anyị ha gbara mbọ gbapụta Naijirịa n’aka ọchịchị ndị ọchị na Naịjirịa.

    O na Naijirịa enweteghi ọchịchị onye kwuo uche ya n’ụzọ dị mfe: “Enyeghi anyị ya n’elu efere ka nrị dị mfe.”.

    Ọ gara n’’ihu kwuo:

    ‘Ụbọchị ọbụla n’ụbọchị a ruo afọ ole m ole nọ n’ihu, anyị ga na-echeta ndị gbara mbọ hibe ụkpụrụ ọchịchị onye kwuo uche ya Naijirịa dịka Kudirat Abiola, nwunye Abiola, onye e gburu n’ụzọ ọjọọ ebe ọ nọ na-alụ ọgụ ikwudoro ndị nke ya. Anyịa ga-echeta, Pa Alfred Rewane, otu onye n’ime ndi nna anyi gbara mbo hu na nnwereonwe Naijiria putara ihe nakwaMejo Jenaral Shehu Musa Yar'Adua (rtd) onye ndiagha gbochiri onu oge o na-agba mbo inweta ochichi onye kwuo uche ya.

    Onyeisiala Tinubu gara n’ihu okwu banyere ndị na-enwetaghi mmeri na ntuliaka 2023. Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị nakwa pati na-agbagha mmeri ya na ya bụ ntuliaka ma na-arụ aka na usoro ntuliaka nakwa mkpọpụta aha ya dịka onye meriri ezighi ezi.

    Okwu a ka nọ ụlọịkpe ruo ugbua. Soro ikpe ahụ ebe a.

    O kwuru: “Ndị ahụ na-agaghị edinwu ụfụ mmeri e meriri ha na ntuliaka ekwesighi ịnụ ụtọ mmeri ma oge nke ha ruo.”

    Tinubu kwukwara na obi ụtọ ya bụ na ọchịchị onye kwuo uche ya nyere ndị na-agbagha mmeri ya ohere ịga ụlọikpe dịka o kwuru na ụdịrị ọchịchị bụ “ụdịrị ọchịchị kacha mma nke ụmụ ụwa mepụtara.”

    Mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala emeela ọnụego mmanụ arịa elu ruo N500 dịka ọ bụbu N184
    Nkọwa foto, Mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala emeela ọnụego mmanụ arịa elu ruo N500 dịka ọ bụbu N184

    'Fuel Subsidy Removal'

    N’okwu mwepụ ego mbelta mmanụ ụgbọala, Tinubu kwuru na ọ bụ maka ọdịnma ụmụafọ Naịjirịa ka e ji mee nke a ma kwuo rịọ ka ọha nwere ya ndidi na ga-erite uru so ya.

    N’okwu ya, ọ sị

    "Ọ bụ ya mere, n'okwu m n’ụbọchị Mee 29, m ji kwupụta mkpebi nke onye nyere nfere m ọchịchị ka e wepụ ego mbelata maka mmanụ ụgbọala ma tinye ya bụ ọkpụrụego n’ihe ndị ọzọ dị mkpa dịka ya bụ ego bụbu naanị ihe uru nye ndị ọgaranya.”

    “Ekwetara m na mkpebi a ga-etinyekwu ibu arọ n'ahụ ọtụtụ ndị be anyị. Ya bụ ihe mgbu na-emetụta m. Nke a bụ otu mkpebi anyị ga-eme iji zọpụta ala anyị na ndakpọ ma wepụ aka ndị na-achọ imebiri anyị ihe.”

    “Ọ bụ ihe mwute na m na-arịọwu unu, ndị obodo m, ka unu chụọnyekwuo àjà maka mgbapụta obodo anyị. Maka ntụkwasị obi unu na nkwenye unu n’ebe anyị nọ, ana m ekwe unu nkwa na àjà unu agaghị abụ ihe efu. Gọọmenti m na-edu ga-akwụ unu ụgwọ site na itinye ego na akụrụngwa ọha, ihazi ụgbọ njem, agụmakwụkwọ, inye ọkụ mgbe niile, ikwalite ahụike na ọrụ metụtara ọha na eze ndị ihe ọzọ ga-eme ka ndụ dịkwuo mma."