France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa
Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa
'Indomie Noodles' dị na Naijiria enweghị ‘ethylene oxide’ -NAFDAC
Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka nrị na ọgwụ na Naijiria bụ'National Agency for Food and
Drug Administration and Control' (NAFDAC),ekwuola na kemikal a
kpọrọ ‘ethylene oxide’ adịghị n’Indomie na 'noodles' a na-ere
na Naijiria.
Na nsonso a, akụkọ fegharịrị na-ekwu na ụlọọrụ na-emepụta Indomie na Malaysia nakwa Taiwan gwara ndị mmadụ weghachi Indomie dị ha n’aka dịka ha sịrịna kemịkal ‘ethylene oxide’ dị n’ime ya.
Onyeisi NAFDAC bụ Ọkammụta Christiana Adeyeye, onye gbara
agba ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị
Tọzde sịrị na nnyocha ha mere n’izụụka isii gara aga gosiri na kemịkal ahụ
nke a sị nwere ike ibute kansa adịghị n’Indomie a na-ere na Naijiria.
Adeyeye sịrị, “Indomie
Noodle a na-eri na Naijiria esighị Malaysia maọbụ Taiwan, e sighị ofesi atụbata
ya.”
“ Na-agbanyeghị nke a, anyị nyochara ụlọọrụ ndị na-eme 'noodles',
anyị gakwara ahịa were 'nọọdles anyị nyochara.”
“Ezi oma anyị na ewetara ụnụ bụ na o nweghị ‘ethylene
oxide’ anyị hụrụ na nọọdle na Naijiria.”
Otu onye na-efu efu, azọpụtala mmadụ anọ n'ideimmiri mere na Trademore, Abuja - Nema
Ebe foto si, Screengrab
Ngalaba na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata a na-akpọ 'National Emergency Management Agency' ekwuola na otu onye ka a na-achọ acho ugbua dịka nnukwu ọdachi ideimmiri dakwasara mpaghara a na-akpọ 'Trademore Estate' nke dị na Lugbe, Abuja, n'ụbọchị Fraịde.
N'ozi ha zipụrụ n'akara Twitter ha, Nema kwuru na nwata nwoke a na-efu efu nọ n'ime ụgbọala ya oge ideimmiri buuru ya na ụgbọala ahụ.
Ha kwukwara na a zọpụtala mmadụ anọ ọzọ n'ọdachi ahụ dịka ọrụ enyemaka ka na-aga n'ihu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Nke a abụghị mbụ ideimmiri na-egbu mmadụ na mpaghara ahụ, ụdị ihe a mekwara n'ọnwa Ọgọst 2020 nke gbukwara otu onye.
Ndị bi na mpaghara a na-ekwu na ideimmiri na-enye ha nsogbu kwa afọ n'ebe ahụ, mana gọọmentị na-elekọta Abuja emebụghị ihe ọbụla siri ike iji kwụsị ya.
N'oge ahụ, onyeisi ngalaba gbatagbata nke FCT bụ Abbas Idris gwara ndị ntaakụkọ Channels TV na ọtụtụ ụlọ ndị a rụrụ na 'Trademore Estate' bụ n'elu ebe ideimmiri kwesịrị isi na-aga ka a rụrụ ha.
E meela ngagharịiwe megide ịtụ ụtụisi maka'Sanitary pad' na Ghana
Ndị na-eme ngagharịiwe awuchiela na ogige ụlọomeiwu mnba Gana na-eti mkpu ka a akwụsị ịna ụtụisi n'ihe ụmụnwaanyị ji awachi onwe ha ma ha nọrọ na nso nke Bekee na-akpọ "sanitary pad".
Ha chọrọ ka gọọmentị mba ahụ wepụ pasent 20 ụtụisi maka ihe atụbatara nakwa pasent 12.5 a na-etinye n''pad' nke mere ka ọnụahịa ya ria elu.
Ndị a na-eme ngaghariiwe kwuru na oke ọnụahịa 'pad mere ka ụmụaka ụmụnwaanyị ọkachasị ndị bi n'ime obodo, enweghị ego ịgha akwụkwọ oge ọbụla ha nọ nsọ.
Mana na agbanyeghị mkpu a, otu jịkọrọ ụlọọrụ na-emepụta ngwahịa bụ "Association of Ghana Industries
(AGI)' adọọla gọọmentị ka ọ ghara iwepụ ụtụisi n'ihe ụmụnwaanyị ji awachi onwe ha oge nsọ, si na ọ ga-etinye aja na garị dịka o si metụta ọnọdụ akụnaba mba ahụ.”
Oonyeisi AGI bụ Seth Twum-Akwaboah,kwuru nke a n'ozi wepụtara.
Ngalaba na-anọkọ ego na mba ahụ bụ 'Ghana Revenue Authority' (GRA), kwuru na ihe ụmụnwaanyị ji awachi onwe ha oge nsọ bụ ngwahịa arụchara arụcha na n'ihi nke a, o kwesịrị ka a na-atụ ụtụ maka ntụbata ya.
Legọs bụ obodo nke anọ kacha njị mmadụ ibi n'ụwa niile
Ebe foto si, Getty Images
Nnyocha e mere n'afọ 2023 egosila na Legọs bụ obodo nke anọ kacha njọ mmadụ ibi n'ụwa niile.
Otu 'Economist Intelligence Unit', nke bụ ngalaba dị n'okpuru ụlọọrụ ntaakụkọ 'Economist' nke London, bụ na-eme nnyocha a kwa afọ.
Ha kwuru na ha nyochara obodo mepere emepe 173 iji nweta mpụtara a. Mana mpụtara nke afọ 2023 gosiri na Legọs mere ọfụma karịa nke afọ 2022 oge ọ bụ obodo nke abụọ kacha njọ obibi.
Otu EIU kọwara na Legọs mere nke ọma n'afọ a dịka ha wulitetụrụ ọnọdụ ahụike na agụmakwụkwọ ha, "mana nrụrụaka ka bụkwa nnukwu nsogbu", ka ha kwuru.
Na ngụkọ a, Legọs mere ọfụma karịa ụfọdụ obodo ndị mepere emepe n'Afrịka, tinyere Algiers (Algeria), Tripoli (Libya), na Damascus (Syria).
EIU kọwara na etu ha si eme nnyocha a bụ site n'ịtule ihe dị icheiche nke na-eme ka ndụ dịtụrụ ndị mmadụ mfe n'obodo ọbụla mepere eme.
Ihe ndị a gụnyere, ọnọdụ nchekwa, ahụike, omenala, okirikiri, agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.
Obodo iri bụ ebe kacha njọ mmadụ ibi n'ụwa niile na 2023 dịka nnyocha EIU si dị bụ ndị a:
Damascus, Syria
Tripoli, Libya
Algiers, Algeria
Lagos, Nigeria
Karachi, Pakistan
Port Moresby, Papua New Guinea
Dhaka, Bangladesh
Harare, Zimbabwe
Kyiv, Ukraine
Douala, Cameroon
'Noodles' ndị e mepụtara na Naịjirịa enweghị nsogbu ọbụla maka ahụike - Nafdac
Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-enyocha nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ Nafdac n'ịchafụ ekwuola na nri 'noodles' ndị nke a rụpụtara na Naịjirịa anaghị enye nsogbu ọbụla n'ahụike mmadụ.
Onyeisi ngalaba a bụ ọkammụta Mojisola Adeyeye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Tọzde, n'Abuja.
Adeyeye kwuru na Nafdac malitere ime nnyocha a dịka akụkọ pụtara na ụlọọrụ na-emepụta 'Indomie Instant Noodles' bughachiri ụfọdụ nri ndị ha rụpụtara na mba Malaysia na Taiwan maka na nnyocha gosiri na ha nwere akụrụngwa a na-akpọ 'ethylene oxide' bụ nke e kwuru na ọ na-akpata ọrịa kansa.
Ọ bụ eziokwu na ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara emetụtaghị 'indomie' nke a na-ere na Naịjirịa, mana Nafdac malitere nnyocha nke ha iji mata kpọmkwem ma nri ndị a adịkwa mma maka ahụike mmadụ.
N'okwu ya, Adeyeye kọwara na ọ bụghị naanị 'indomie noodles' ka ha nyochara, kama ha nyochakwara ụdị 'noodles' niile dị n'ahịa Naịjirịa ugbua iji mata ma ha enwere akụrụngwa a bụ 'ethylene oxide' maọbụ ụdị ya ọzọ a na-akpọ '2-chloroethanol'.
"Anyị nyochara ihe ruru paketi 'noodle' 114 bụ nke anyị wetara n'ahịa nakwa ụlọ mmepụta ha na Legọs, Abuja nakwa Kano," Adeyeye kwuru.
Ọ kọwara na nnyocha ha gosiri na nri ndị ahụ enweghị akụrụngwa ndị a, "ma n'onwe ha ma na akụrụngwa e ji esi ha."
Adeyeye kwere nkwa na Nafdac ga na-aga n'ihu n'ọrụ ha igbochi ihe oriri ọbụla nwereike inye nsogbu n'ahụike mmadụ ịbata n'ahịa Naịjirịa.
DSS agbaala ama maka ndị na-akpa nkata mwakpo n'oge Salah
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa agbaala ama ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha kee nkwụcha n'oge emume 'Eid-El-Kabir' nke ga-adị n'izuụka ọzọ, maka na e nwere ndị na-akpa nkata ịwakpo ụlọ okpukperechi dị icheiche n'oge emume a.
Eid-El-Kabir bụ emume pụrụ iche maka ndị okpukperechi Islam, nke bụ oge ha ji egbu Ebini, na-akpọkwa oriri na nkwari.
Peter Afunanya, ọnụ na-ekwuru ndị DSS, wepụtara akwụkwọ ozi ebe ọ gbara ama a n'ụbọchị Tọzde.
Afunanya dọrọ ndị isi ahịa na ụlọ mgbakọ dị icheiche ka ha kee nkwụcha ma mụrụ anya iji gbochie atụmatụ ndị ekperima a chọrọ ibutere ụmụ Naịjirịa ihe anyammiri.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị DSS nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ ọnụ iji gbochie ọdachi ọbụla n'oge emume Salah.
Emume Eid-El-Kabir nke afọ a ga-abụ n'ụbọchị 27 na 28 nke ọnwa June. Ụbọchị ahụ na-abụkarị ezumike ọrụ na Naịjirịa.
N'ọnwa Julaị afọ 2015,mmadụ itoolu nwụrụ dịka ndị ọgụ Boko Haram tụrụ ogbunigwe n'ụlọ ekpere ndị Islam na Yobe Steeti.
Afunanya kwukwara na ndị ọrụ ncheka nke gụnyere ndị DSS wakporo ụfọdụ ogige ndị ekperima na Nasarawa na Kogi Steeti n'ime ụbọchị olemole gara aga, jide ụfọdụ ndị ekperima ahụ ma gbukwaa ndị ọzọ.
Nke a gụnyere Abubakar Muhammad onye e ji Abu Direba mara, onye na-atụ mgbere egbe na ngwaọgụ, bụ onye e jidere n'okporoụzọ si Abuja gawa Keffi, Nasarawa steeti.
Onye nke ọzọ bụ Kabir Bala, onye e ji Okwo mara, bụ onye si n'ụlọ mkpọrọ gbaa ọsọ ma hibe otu ndị ekperima na mpaghara Ejule nke dị n'okpuru ọchịchị Ofu na Kogi Steeti.
Okwo na ndị otu ya malitere ịkwa ndị ọrụ nchekwa mgbọ mana ha zaghachiri ma gbagbuo ya ebe ụfọdụ ndị otu ya ndị ọzọ gbara ọsọ.
Ụtụtụ ọma
Ụnụ asaala chi, Igbo ndị ọma.
Ka anyi malite mkparịtaụka nke taa.
Ihe ụlọọrụ RMAFC kwuru mere e ji achọ ibuli ego ụgwọ ọnwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị
Nkọwa foto, Ndị gọvanọ ọhụrụ na-achị n'okpuru Onyeisiala Tinubu bụ ndị so na ndị atụmatụ a ga-emetụta
Ngalaba na-ahazị ụgwọọnwa bụ‘Revenue
Mobilisation, Allocation and Fiscal Commission (RMAFC)’
ekwuola okwu ọhụrụ banyere ụzụ na-agba n’okwu atụmatụ iji pasentị 114 bulie ụgwọọnwa
onyeisiala, Osote ya, ndị gọvanọ, Osote ya, ndị mịnịsta, kọmishọna na ndị
omeiwu na ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ kọwara na atụmatụ a
nọrọ n’aka gọọmentị etiti kemgbe, malite n’oge ọchịchị Buhari.
O kwuru:
“Tupu onyeisiala Buhari apụọ ọchịchị, o
nyere anyị akwụkwọ si n’aka ọkaiwu gọọmentị etiti na ndị ọkaiwu ndị ọzọ bụ nke
sị ka anyị lebe anya n’okwu mbuli ụgwọ ọnwa a”.
Ọ gakwara n’ihu kwuo “ọgbakọ ime obi
gọọmentị nke ‘Federal Executive Council’ gwakwara anyị ka anyị tinye anya na
ego ụgwọ ọnwa a”.
Ọ kọwara na ndị ụlọomeiwu ga-ebuụzọ lebanya
n’atụmatụ ma binye ya aka tupu onyeisiala ebinye ya aka.
O kwukwara na a chọrọ ibuli ego ụgwọ ọnwa
onyeisiala.
N’okwu ya ọ sị:
“Na mba onyeisiala na-anata ego ụgwọ
ọnwa otu nde naịra na ụma kwa ọnwa mana atụmatụ a na-achọ ka ebulie ya gaa nde
abụọ naịra”.
Ọ gara n’ihu kwuo na ihe ndị e
tinyereaka tupu ewepụta atụmatụ a bụ etu ọnọdụ ihe dị na Naịjirịa.
Iji chịkọta okwu ọ gwara BBC o kwuru:
“Ka ọ dị ugbua, isi agabeghi aga n’okwu
a dịka onyeisiala kwesịrị itinye ya anya, zigara ya ndị omeiwu ka ha lebe ya anya
tupu ekwube okwu ma ọ ga-abụ ihe dị ire.”
Akụkọ kwuburu fegharịrị n’ụbọchị Wenezde
kwuburu na ụlọọrụ RMAFC na-akpọku ụlọọmeiwu dị na steeti 36 ka ha
hazigharịa iwu na steeti iji hụ na e weliri ego ndị ji ọkwa na steeti, ndị
ọkaikpe na ndị na-arụ na mịnịstrị ikpe nakwa ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Na mkparịtaụka ụlọọrụ mgbasaozi Arise TV na onyeisi ụlọọrụ RMAFC bụ Hassan Mohammed Usman nwere n’ụtutụ Tọọzde, o kwuru:
‘E kwesịrị ị na-ahazighari egọ ụgwọ ọnwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ gọọmentị na ndị ọrụ ikpe kwa afọ ise mana emebeghi nke a ruo afọ 15 ugbua’.
Ọ gara n’ihu kwukwa na ọnụahịa ihe n’ụwa riwanyere elu malite na afọ 2008 ruo 2022.
Nke mere ha jiri mee nga gaa mpaghara Naịjirịa niile mee nnyocha ma chọpụta ụzọ kacha mma iji bulie ego.
Ọ kọwara na etu ha siri bịa n’atụmatụ mbulie ego a ruo pasentị 114 bụ “ịgbakọ nchọpụta si ajụjụ ọnụ a gbara ndị okwu na-eru n’ọnụ na mpaghara Naịjirịa niile nakwa nnyocha ndị ọkaibe na ihe gbasara akụnụba”
N’okwu ya, Usman kọwara na nchọpụta ha gosiri na mgbakọ a ruru pasentị 200.
Ọ kọwara na ha mere mgbakọ na mwepu so ya ma tinye atụmatụ mbulie ego a n’ọnụ pasentị 114.
Mana akụkọ a akpata ọtụtụ okwu na soshal midia dịka ọha na-ajụ ihe mere gọọmentị agaghị e mere ndị ọrụ nakwa ndị ọzọ atụmatụ mbulie ego ụgwọ ọnwụ dị etu a ọkachasị n'oge a mwepu ego mbeleta mmanụ ụgbọala nakwa ọnọdụ akụnụba Naịjirịa na-eme ọnụ ego ihe a na-arị elu.
Ọtụtụ ndị ọzọ nwere agba ekwukwaala okwu banyere atụmatụ a dịka Peter Obi bụ aka chịburu Anambra steeti ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023 n'aha Labour Party.
Obi kwuru: "N'uche m, ana m eche na ndị ọchịchị na ndị ọrụ gọọmentị ga na-achọ ụzọ iji beleta ego ha ji arụ ọrụ nakwa ibelata ahụhụ ụmụafọ Naịjirịa na-ata."
"Oge a bụ oge e kwesịrị ịchepụta echiche ịgbapụta ndị mmadụ n'aka ụbịam".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Missing Titanic submersible: Oge na-agalahụ ndị na-achọ ịgbapụta ndị gara okpuru oke osimiri
Ebe foto si, Oceangate
N’abalị ụbọchị Sọnde, ụwa malitere ịchọ ụgbọmmiri 'Oceangate' pụrụiche e ji aga ime ala oke osimiri bụ nke ndị ọgaranya ise nọ n’ime ya.
A na-ekwu ugbua na ọ fọrọ awa olemole ka
ikuku ndụ ga-afọrọ ndị ahụ nọ n’ime ya bụ ụgbọ gwụchaa kpam kpam.
Cheta na ndị
a mere njem gaa n’ime ala oke osimiri iji hụ ọnọdụ oke ụgbọmmiri ‘Titanic’ kpuru ekpu
n’ebe afọ 1921 nọ ugbua.
Okpukpu ụgbọmmiri ahụ tara isi ihe karịrị mmaọdụ 1,500 bụ ihe wuru ewu n’ụwa dịka e ji akụkọ ya
mee ihe ejije a ma ama.
Ugbua, dịka ụjọ ji ndị mmadụ banyere ofufu ya bụ ụgbọmmiri
pụrụiche, bụ ihe nọ n’okpuru oke osimiri North Atlantic, ndị ọrụ mgbapụta oke
osimiri, ndị ọrụ ụgbọelu na ngalaba ndị pụrụiche na-ahụ maka ime okeosimiri ejikọọla aka ọnụ na-achọ ndị aga ime ala mmiri ahụ ruo ihe ruru 10,000 sg.
E ji ngwa pụrụiche anụ ụda mkpọtụ n’ime mmiri ahụ bụ nke a na-eche na-egosi
na ndị a ka dị ndụ mana o dobeghi anya ma ya bụ mkpọtụ a na-anụ e si n’aka ndị a
apụta dịka ụlọọrụ nchekwa oke osimiri mba Amerịka siri kwuo.
Onyeisi ụlọọrụ a bụ Kaptin Jamie Frederick aṅụọọla
iyi na a ga-aga n’ihu na-achọ ndị a dịka o kwuru “Anyị agaghị ekwe ka mmụọ anyị
daa mba, anyị ga-aga n’ihu na-enwe olileanya”.
Ka ọ dị ugbua, e zigaala ‘Victor
6000’
bụ ụgbọmmiri pụrụiche eji achọ ihe n’ime oke osimiri ka o sonye n’atụmatụ ịchọta
ndị a.
E nwekwara ọtụtụ ụgbọmmiri na ngwa ọrụ ndị ọzọ pụrụiche ezigarala
isonye n’atụmatụ ịgbapụta ndị a.
Ọtụtụ ndị ntaakụkọ agbakọọla n’ikpere mmiri ebe ihe a na-eme dịka
mmadụ niile chị obi n’aka na-atụ anya mgbapụta ndị a.
Aga m ahụ na atụmatụ 'Community policing' mịtara mkpụrụ - Kayode Egbetokun
Ebe foto si, NPF
Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ọhụrụ bụ Kayode
Egbetokun ekwuola na ọ ga-ahụ na atụmatụ ‘community police’ ihe ọtụtụ kpụ n’ọnụ
ga-abụ ihe bịara na mmezu n’oge ya.
Egbetokun kwuru nke a n’Abuja n’ụbọchị
Wenezde n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abuja.
Ọ gara n’ihu maa ọkwa nye ndị uweojii na ọchịchị
ya agaghị anabata ndị otu iji aha ụlọọrụ ahụ na-eme ihe sọrọ ha, mee nrụrụaka
maọbụ kpaa agwa ndị na-ezighị ezi.
O kwukwara na ndị e jidere na-eme ihe ndị dị
etu na ha ga-anata ntaramahụhụ.
Egbetokun gwakwara ọha na ndị uweojii Naịjirịa
ga-ewepụta echiche nakwa atụmatụ ọhụrụ dị iche iche iji hụ na akwalitere
nchekwa na Naịjirịa.
‘Community Police’
Ọtụtụ na-akpo uku ka e wepụ ikike ndị uweojii
n’aka ọchịchị etiti Naịjirịa ma mee ya ka steeti niile hibe ma na-ahazị ọrụ
nchekwa ndị uweojii dịka ihe na-eme na steeti dị iche iche siri dị.
Oku a na-adapụta kwa mgbe kwa mgbe mana dịka
onyeisi ndị uweojii ọhụrụ a na-ekwe nkwa ịhụ na enyere ọha ihe na-arịọ.
Nnọ nụ o!
Daalụ maka isonye anyị taa.
Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa niile bụ ụbọchị 22 nke ọnwa Juun, 2023 ebe a.
Mbuze eriela ụlọ ise n'Amamba Uzuakoli
Ebe foto si, Chilasa Kanu
Ndị obodo Amamba Uzuakoli dị n'Okpuru Ọchịchị Bende dị n'Abia steeti ebekuola gọọmentị etiti na nke steeti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka na nsogbu mbuze.
Onyeisi otu jịkọrọ ụmụafọ Amamba Uzuakoli bụ Chilasa Kanu gwara ndị ntaakụkọ na mbuze ahụ eriela ihe karịrị ụlọ ise.
Kanu, onye gbara ama na obodo ha emefuola ijeri naira anọ(40m) n'igbo nsogbu mbuze nọ na nnukwu nsogbu dịka oke mmiri ozizo na ide mmiri merela ka nsogbu ahụ kawanye njọ.
N'otu aka ahụ, Okeny ọzọ bụ Chikezie Ogbonna tụrụ arịị sị na ndị obodo ha na-achị obi n'aka oge ọbụla mmiri na-ezo n'ihi egwu mbụze ma rụtụ aka na ụfọdụ agbaala ọsọ ndụ hapụ be ha.
Ebe foto si, Chilasa Kanu
Ebe foto si, Chilasa Kanu
Anyị na-achọ ebe niile a nụrụ ụda ụgbọ ime mmiri furu efu, Igwe ole ka e ji achọ ndị a?
Nkọwa foto, Kaptain Jamie Frederick, ndị ọrụ na-echekwa osisimiri na mba Amerịka gwara ndị ntaakụkọ okwu
Kaptain Jamie Frederick na ndị ọzọ gwara ndị ntaakụkọ okwu sị na ụnyaahụ, ụgbọ na-agba ime mmiri si mba Kanada bụ igwe P-3 nụtara ụda n'ime mmiri ebe ha so achọ ụgbọ n'agba ime mmiri.
“Ya mere ha jiri bugharị igwe ROV ha ji achọ ndị a nọ n'ime ụgbọ mmiri furu efu gaa ebe ọzọ, ka a mara ma ha nwereike iji ụda ha nụrụ chọta ụgbọ mmiri a furuefu. N'agbanyeghị na igwe ROV achọtabeghị ha ma na-achọkwa ha na-aga n'ihu."
Ọ sị na e nyela ndị agha mmiri data si ụgbọelu P-3 chọpụtara ka ha nyomie "nke ha ga-eleba anya n'ọdịnihu".
Nkọwa foto, Anyị na-achọ ebe niile a nụrụ ụda ụgbọ ime mmiri furu efu
Ndị ụlọọrụ na-echekwa mmiri na mba Amerịka gwara ndị ntaakụkọ na ha nwere ihe karịrị igwe ise so achọ ụgbọ ime mmiri a kpọrọ Titan. Ha kwenyere na ha ga-eru igwe 10 n'elekere 24 na-abịa.
E nwere igwe a kpọrọ Robotically Operated Vehicle (ROV) abụọ so na-achọ ya bụ ụgbọ na-agba ime mmiri makwa na igwe ROV ga-esokwa na ya bụ nchocha a n'oge adịghị anya.
Cheta na e kwuru na e chere na ikuku oxygen fọrọ n'ime ụgbọ na-agba n'ime mmiri ahụ nwereike ịgwụ n'ụbọchị Tọzde makwa na ọkụ batrị ụgbọ ahụ nwekwara ịnyụ, n'agbanyeghị nke a, ha ka na-achọ ya bụ ụgbọ na-agba n'ime mmiri a n'ike.
Nkọwa foto, Ndị ụlọọrụ na-echekwa mmiri na mba Amerịka gwara ndị ntaakụkọ na ha nwere ihe karịrị igwe ise so achọ ụgbọ ime mmiri a kpọrọ Titan. Ha kwenyere na ha ga-eru igwe 10 n'elekere 24 na-abịa.
Ọ bụrụ na ị ka na-eso ya bụ akụkọ gbasara ụgbo ime mmiri furu efu, lekwa ihe merela ka mgbe a malitere chọwa ụgbọ na-agba ime mmiri furu efu bu mmadụ ise.
Ndị a bụ:
i. Hamish Harding, dị afọ 58, bụ onye mba Briten na-eme nchọcha gawara mbaraigwe ugborougboro
ii. Onye mba Briten na-eji ego achọ ego bụ Shahzada Dawood dị afọ 48, bụkwa onye otu ezinaụlọ kacha ji ego na Pakistan ma bụrụkwa onye nkwado ndị ọrụ ebere Eze Charles na-enye aka.
iii. Nwa Shahzada bụ Suleman Dawood dị afọ 19 bụrụkwa nwata akwụkwọ
iv. Paul-Henry Nargeolet dị afọ 77, bubu onye aghammiri na mba Frans na-egwu mmiri, bụrụkwa onye a maama gara ebe okpokoro ụgbọmmiri Titanic ugborougboro karịa ndị nchọcha ọbụla ma sokwa ndị gara lee ụgbọmmiri Titanic n'afọ 1987.
v. Stockton Rush dị afọ 61, bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ OceanGate, bụ ụlọọrụ na-enyocha ụgbọ mmiri Titanic n'ụgbọ na-agba ime mmiri.
E jirila 114% bulie ụgwọọnwa onyeisiala, Osote ya, ndị ọzọ
Ebe foto si, APC/Twitter
Ngalaba na-ahazị ụgwọọnwa bụ Revenue Mobilisation, Allocation and Fiscal Commission (RMAFC) ejirila pasent bulie ụgwọọnwa onyeisiala, Osote ya, ndị gọvanọ, Osote ya, ndị mịnịsta, kọmishọna na ndị omeiwu na ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị.
RMAFC bekuru ụlọọmeiwu dị na steeti 36 ka ha hazigharịa iwu na steeti iji hụ na e weliri ego ndị ji ọkwa na steeti, ndị ọkaikpe na ndị na-arụ na mịnịstrị ikpe nakwa ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị.
Migrant crisis: "Mgbe ụfọdụ ana m ahụ ozu nwata ma m kọwa azụ n'ime mmiri" Onye na-akọ azụ na Tunishia, Dịka ọnụọgụgụ ndị mbịara mbịara na-agba mbọ eru Yurope na-ewu, etu a ka ọnụọgụgụ ndị na-anwụ n'osimiri Mediterranean si ebu ibu.
Nkọwa foto, Migrant crisis: "Mgbe ụfọdụ ana m ahụ ozu nwata ma m kọwa azụ n'ime mmiri" Onye na-akọ azụ na Tunishia
Ọtụtụ mgbe ọkọọazụ Oussama Dabbebi bidoro ịkọazụ ya, ọ naghị abụ sọọsọ azụ ka ọ na-ahụ.
"Kama sọọsọ azụ, ihe m na-akọta bụ ozu. Mgbe mbụ, ọ tụrụ m egwu mana nwayọ nwayọ ka ọ mawara m ahụ."
Onye ọkọazụ a dị afọ 30 sị na o tebeghị aka ọ hụrụ ozu ndị mbịara mbịara ruru iri na ise ka ọ kọtara azụ n'ụbọchị atọ.
"Mgbe ụfọdụ ana m ahụ ozu nwata ma m kọwa azụ n'ime mmiri" Onye na-akọ azụ na Tunishia. "Keezi ihe nwata a mere? Ebere m akwa. Ndị toro ihe e ji mmadụ eme ebiela ndụ ha mana ị ma, mana nke nwata a, o nwebeghị ihe ọ hụrụ."
Maazị Dabbebi akọwala azụ n'obodo Sfax na mba Tunisha ke mgbe ọ dị afọ iri.
Mgbe mbụ, o so ndị na-etụ neeti mana ugbua, ọtụtụ n'ime ha ereela ụgbọmmiri egoole ma ole nye ndị ga-eji ya ebubata mmadụ."
"Ọtụtụ mgbe ka ndị ndị na-ebubata mmadụ ejila nnukwu ego ayọ m ka m resiri ha ụgbọmmiri m, anaghị m ekwe maka na m resiri ha ụgbọmmiri m, mmiri rie mmadụ n'ime ya, agaghị m agbaghara onwe m."
Ndị otu Yuropịan Union na-anwa ịma ka ha si eme okwu ndị si obodo ha agbapụ gawa obodo ọzọ maka ụbịam na mkpagbu na-enye ndị bi n'obodo dị n'akụkụ osimiri na Tunisia gburu gburu.
A nwụchiela onye ntaakụkọ maka 'ịkparị' onyeisiala
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Zied el-Heni na-eme mgbasaozi na redio na Tunisia
Otu onye ntaakụkọ mba Tunisia maka ebubo ịkparị Onyeisiala Kais Said.
Ọkaikpe nyere iwu ka a nwụchie Zied el-Heni tupu a kpụpụ ya ụlọikpe maka okwu nwere ike iritere ya mkpọrọ afọ ise.
Mana ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye na mba ahụ na-arụtụ aka na ahụ esighị El-Heni ike dịka ọ rịara ọrịa mkpọnwụ ahụ na nso nso a.
Na nsonso a , ndị ọkaikpoe mba ndịa enyela iwu ka anwụchie maọbụ ka a malite inyocha 20 ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ ikpe, ndị ọrụ ntaakụkọ na ndị ojiegoachụego bụ ndị anaghị akwado Onyeisiala Said.
Pati ndị anọghị na gọọmentị kwuru na mwuchi ndị ahụ metụtara ndọrọndọọ ọchịchị.
A zọpụtala ụmụagbọghọ itoolu e ji atụ mgbere akwụna n’Awka
Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service
Ministri
na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ndị uweojii Anambra steeti azọpụtala ụmụagbọghọ itoolu
e ji na-agba akwụna n’Awka ma nwuchie onyeisi ụlọ ndina ahụ.
Ha mere nke
a site na kepu kepu ha nwetere na e nwere ndị ji ụmụagbọghọ agba akwụna n’Awka
bụ isiobodo steeti ahụ.
Ụmụagbọghọ
ndị a dị n’agbata afọ iri na ise (15yrs) ruo iri abụọ na atọ (23yrs) gbara ama
na ndị kpọtara ha n’ụlọ ndịna kwere nkwa inye ha ọrụ ma gboo mkpa na-akpa ezinaụlọ
ha.
Ha kwuru na
e si na steeti dịka Ebonyi, Enugwu, Akwa Ibom na Rivers kpọta ha.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii n’Anmabra steeti bụ Tochukwu Ikenga gbarụrụ ihu ma katọọ
agwa a ndị a na-eji ụmụaka atụ mgbere akwụna iji na-enwete ego.
Ọ gwara ndị
Anambra steeti ka ha na-agba ama banyere ndị na-eme ihe dị etu ma kpọtụrụ ha
na-egbughi oge.
Emefiela akpụpụla DSS n’ụlọikpe maka ịkpọchi ya n’ụzọ na-ezighi ezi
Ebe foto si, Godwin Emefiele
Godwin
Emefiela bụbu onyeisi ụlọakụ etiti ndị ụlọọrụ nchekwa Department of State
Services (DSS) nwụchiri akpụpụla ha n’ụlọikpe maka inwuchi ya n’ụzọ n’ezighi
ezi.
Ọ na-arịọ ụlọikpe
ukwu dị n’Abuja ka e nye ya ikike nwereonwe na nke mkpagharị ruuru ya, ma kwuo
na o nweghi ihe o mere nke e ji jichie ya.
Mana ọkaiwu
gọọmenti na ụlọọrụ DSS siri ọnwụ na nwuchi a nwuchiri Emefiele so usoro iwu.
N’akwụkwọ
ha gbara megide Emefiele, ha gwara ụlọikpe ukwu a na iwu sị ka anwụchie ya si n’aka
ụlọikpe Magistrate ma rịọ ka ụlọikpe kụchapụ akwụkwọ ọ gbara.
Cheta n’ụbọchị
10 Juun, Onyeisiala Tinubu chụpụrụ Emefiele n’ọkwa onyeisi ụlọakụ etiti, ngwa
ngwa nke a mechara, DSS kwupụtara na ha anwụchiela ya.
Gọọmenti sị
na ọchụchụ n’ọrụ ya bụ ka e nye ohere mee nyocha maka ebubo e boro ụlọọrụ
banyere atụmatụ akụnaụba.
Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma nụ ooo
Anyị ji ohere a anabata unu n'ọbaozi anyị maka akụkwọ ndị gbapụtara ihe taa
Buru oche bịa sonyere anyị n'uju.
E kwesịrị ịwa Nnamdi Kanu ahụ na-egbughi oge – Mike Ozekhome gwara ụlọikpe
Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja elebala anya n’okwu
banyere mkpochi ndị nchekwa Department of State Services (DSS) na-egbochi
Nnamdi Kanu bụ onye Indigenous People of Biafra (IPOB) ịnata ọgwụgwọ site n’aka
ndị dọkịta ya.
Kanu bụ
onye nọ na nga ndị DSS si n’aka ndị ọkaiwu ya bụ Mike Ozekhome gwara ụlọikpe na
e kwesịrị iwa Kanu ntị maka ahụike ya.
Ọkaiwu a
kwuru na DSS agbaala isi akwara na Kanu agaghị ahụ ndị dọkịta ya ọtụtụ ugboro
ma ọ bụ gosi akwụkwọ ahụike ya na-agbanyeghi na ndị dọkịta kwuru na ahụ esichaghị
Kanu ike.
Ozekhome kwuru na agwa a ndị DSS na-akpa gosiri na ha achọghị ka nwete ọgwụgwọ bụ nke megidere iwu mkpagbu na ntaramahụhụ ngalaba asaa.
Na nzaghachị, ọkaiwu DSS gwara ụlọikpe a na Kanu na-anata ezigboogwụgwọ site n’aka ndị dọkịta ha ma gwaa ụlọikpe ka ọ kụchapụ mkpesa ahụ.
Ọkaikpe Binta Nyako ji ikpe ahụ gere ntị na mkpesa ndị a ma buga ikpe ahụ n’ụbọchị Julaị 20, 2023 iji kpebie ihe banyere ya.