Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya

Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, anyị ekelee.

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ya dịrị gị mma

  2. Ulọomeiwu Imo steeti akpọghachila ndi otu ha a kwụsiriburu ọrụ

    Ekene Nnodumele na Okey Onyekanma

    Ebe foto si, Okey Onyekanma/Ekene Nnodumele /Facebook

    Ụlọomeiwu Imo steeti akpoghachiela ndị otu ha mmadụ abụọ ha kwụsịburu ọrụ kemgbe ọnwa 18.

    Nkagbu nkwụsị ọrụ ahụ dị n'ozi maka ihe ụlọomeiwu ahụ mere taa nke Ojeozi ụlọomeiwu ahụ bụ Chinelo Emeghara gụpụtara.

    A kwụsịburu Okey Onyekanma, bụbụ Osote onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ nakwa Ekene Nnodumele bụbu onyeisi pati kachasịrị dị nta n'ụlọomeiwu ahụ n'abalị asatọ nke ọnwa Novemba afọ 2021 bụkwa ụbọchị ụlọomeiwu ahụ gbaara onye bụbu onyeisi ha bụ Paul Emezim ụgbọ nwa mkpi.

    Nkwusi ha ọrụ n'ike na-eso mpụtara nyochaa nke komiti onye ndu pati kachasị n'ọnụọgụgụ n'ụlọmeiwu ahụ bụ Kanayo Onyemaechi hiwere.

  3. Etu ndị 'unknown gunmen' si gbagbuo ndị uweojii atọ n'Anambra taa

    Ndị ojiegbe

    Ndị ojiegbe agbagbuola ndị uweojii atọ n'Umunze, dị n'Okpuru ọchịchị Orumba- South n'Anambara steeti n'ụbọchị Tọzde.

    Ka ya bụ ihe siri mee edochaghị anya ugbua, mana akụkọ na-ekwu na ndị uweojii o metụtara bụ ndị uweojii ngharari Bekee kpọrọ 'mobile police' so ngalaba 29 PMF nakwa 54 PMF ndị uweojii Umunze arụ ọrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ya bụ ọdachị mere n'ezie.

    Ikenga , onye kwuru na ọdachi ahụ so n'ihe ndakwasa na-adakwasị ndị uweojii, kwuru sị,"A malitela ịma imi n'ala iji chọpụta ndị mere ya bụ ihe, ụgbọala ndị uweojii na-agbagharịkwa na mpaghara ahụ maka nchekwa."

    Akụkọ ọnwu ike ndị uweojjii pụtara ihe dịka ihe onyonyo ha fegharịrị na soshal midia n'ụtụtụ Tọzde.

    Mana o bnwebeghị onye kọwara kpọmkwem ka ya bụ ọdachi siri mee.

    Cheta na kemgbe Jenụwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo na-ada n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria dịka a na-awakpo ma na-egbusisi ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị nwere agba na Naijiria.

    Gọọmentị Naijiria na ndị ọrụ nchekwa boro otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob na alaka ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' ebubo aka ha ịdị na mkpamkpa nile ndị a.

    Mana otu Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.

  4. Chris Mbah, otiegwu a ma ama a laa la mmụọ

    Chris Mbah

    Ebe foto si, Premier Music

    Otiegwu a ma ama bụ Chris Mbah anwụọla.Mbah, onye e ji "baby Don't cry, bụ egwu ya wuru ewu n'agbata 1980 nwụrụ n'ụbọchị Tuzde n'ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital, dịka onye isi nchịkọta Premier Music bụ Michael Odiong, si kwuo n'ozi o wepụtara.Egwu ndị ọzọ Mba tiri gụnyere ‘We need each other’; ‘Love everlasting’.

  5. EFCC anwuchiela onye nwe 'Holy Family School' Abakpa, Enugu maka ohi intanet

    Chigozie Philips na ndị ọzọ a nwụchiri

    Ebe foto si, EFCC

    Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka na Naijiria bụ EFCC na ịchafụ anwụchiela onye nwe ụlọakwụkwọ Holy Family School Abakpa, Enugu bụ ndị a na-enyo enyo maka iji intanet ezu ndị mmadụ ohi. EFCC ngalaba Enugwu nwuchiri nwa amadi ahụ a kpọrọ Chigozie Philips na mmadụ 13 ndị ọzọ na Monde abalị mbụ nke ọnwa Mee, afọ 2023 bụ ndị ọ na-azụ n'ọrụ iji intanet ezu ohi. Aha ndị otu ya ndị ọzọ gụnyere: are Kingsley Okorie, Henry Chidiebere, ElochukwuChukwuemeka Micheal, Nelson Nnaji, Joacin Kelvin, Kelechi Ibe, Chinonso James, Udeh Isaiah na Micheal Chukwuemeka. Ndị ọzọ Ifeanyi Ozor Bright, Etuma John, Okafor Chukwuemeka, Raymond Chinaza, Desmond James, Ozoma Chinonso Anthony, Uchenna Aka and Ozor Celestine. Ihe ndị a natara ha gụnyere ekwentị 20 mobile phones, laptop abụọ. EFCC kwuru n'ozi ha wepụtara ụbọchị Tuzde n'akara Facebook ha na ha ga-akpụpụ ndị a ụlọikpe n'oge na adịghị anya

  6. Mahadum Imo Steeti akwụsịla onye nkuzi ọrụ maka ịma nwaakwụkwọ nwaanyị aka ntị

    Mahadum Imo steeti

    Ebe foto si, IMSU

    Mahadum Imo steeti akwụsịla onye nkuzi ha bụ Desmond Izunwanne ọrụ maka ịma nwaakwụkwọ nwaanyị aka ntị n’ihi na ọ baghị ọmụmụ ihe n’oge.

    Ọnụ na-ekwuru mahadum a bu Ralph Njokuobi wepụtara ozi a sị na agwa nwamadị a kpara jọgburu onwe ya.

    O kwuru na ndịisi ụlọakwụkwọ mere nzuko ma kpebie ịkwụsị onye nkuzi a ọrụ ruo oge a na-amabeghi.

    Njokuobi sị na e hiwela kọmitii ga-eleba anya etu ihe a siri malite nakwa mgbọrọgwụ okwu a, ha na-arịọ ndị ọha ka e nye ụlọakwụkwọ a ohere ime nyocha banyere nke a.

    Nwamadi gbara agwa a na-akuzi na ngalaba ọmụmụ ihe Physiology.

    Ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ka onye nkuzi ahụ na-ajụ nwata akwụkwọ ajụhjụ ihe mere o jiri ọ bịaghị n’oge dịka ọ ma-ama ya ụra.

    Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ agwa a ma kpọọ oku ka a taa nwamadị a ahụhụ ruru ya.

  7. Ndị uweojii anwụchiela REC a sị kpọpụtara aha Binani na ntuliaka Adamawa Steeti

    Hudu Yunusa Ari

    Onye ọrụ ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naijirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nke aha ya bụ Hudu Yunusa Ari, bụkwa onye Inec kwụsiri ọrụ nwa mgbe nta abụrụla onye e ji eji ugbua.

    Ozi n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijirịa bụ Olumuyiwa Adejobi gbara ama nke a n’ụbọchị Tuzde a ma kwuo:

    “Ndị uweojii Naijriịa na-agba ama na awụchiela ọkaiwu Hudu Yunusa-Ari bụ onye rụrụ ọrụ dịka Resident Electoral Commissioner (REC) n’Adamawa steeti nke a sị kpọpụtara aha onye zọọrọ All Progressives Congressọkwa gọvanọ na ntuliaka mgbakwunye maka ọkwa gọvanọ e mechapụrụ na steeti ahụ.”

    “Ọkaiwu Ari onye ndị ngalaba uweojii Police Election Planning, Monitoring, and Evaluation Team nwụchiri n’Abuja n’ụbọchị Tuzde. Bụ ụbọchị nke abụọ n’ọnwa Mee 2023 bụzị onye a na-enyocha ugbua iji mara ihe mere o jiri kpaa ụdịrị agwa a sị ọ kpara.”

    Nke a na-abịa dịka Ari kwuchapụrụ na mkparịtaụka ya na BBC nwere n’ụbọchị Tuzde ebe ọ nọ kwuo na ọ ga-enyefe onwe ya n’aka ndị uweojii Naijirịa.

    Cheta na Inec kwụsiri Ari ọrụ nwa mgbe nta dịka e mechapụrụ ntuliaka mgbanwunye n’Adamawa steeti ebe a sị na ọ kpọpụtara aha Aishatu Dahiru Ahmed (Binani) nke APC dịka onye mmeri mana Inec kpụchapụrụ mkpọpụta ahụ ma kwuo na ọ nweghi ikike ime nke a ma mechaa kpọpụta aha gọvanọ Ahmadu Fintiri nke Peoples Democratic Party (PDP) dịka onye mmeri n’ezie.

    E nyere ndị ọru nchekwa iwu ka ha nwụchie Ari dịka enweghi onye hụrụ ya maọbụ nụ olu ya kemgbe izu abụọ gara aga.

  8. Workers Day: Ihe ndị ọrụ oyibo n’Enugu na-achọ n’aka gọọmentị

    Ndị ọrụ n'Enugu

    Otu abụọ jikọrọ ndị ọrụ oyibo ọnụ na Naijiria bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) ngalaba nke Enugwu ekwuola na ọbụghị ndị ọrụ niile na-enweta ya bụ ego opekatampe ụgwọ ọnwa bụ puku naịra iri atọ nke a na-akpọ ‘minimum wage’ na Bekee.

    Ha gbakọrọ n’ụbọchị Tuzde n’ama Okpara Square dị n'Enugwu dịka a na-eme mmemme ụbọchị ndị ọrụ ma kọwa ihe ndị na-akpa ha.

    Onyeisi NLC n’Enugwu bụ Maazị Fabian Nwaigbo na ogbo ya nke TUC bụ Maazị Ben Asogwa gwara BBC Igbo n’ama emume a na obi adịghị ha mma na ụfọdụ ndị nkuzi na ndị ọrụ okpuru ọchịchị anaghị eri ego opekatampe ahụ gọọmentị nyere iwu ya.

    Ha rịọrọ gọọmentị Enugwu ka ọ hazie ya bụ ihe kpam kpam tupu ndị ọhụrụ abata n'ọchịchị.

    Ọtụtụ ndị ọrụ oyibo gbakọrọ n’Okpara Square ma rịọ gọmenti etiti ka o welie aka n'ego ndị ọrụ iji mee ka ụgwọ ọnwa ndị ọrụ zuoro ha igbo mkpa.

    Onye nchịkọta otu ndị ntaakụkọ nke NUJ Enugwu bụ Sam Udekwe rịọrọ ka ndị ntaakụkọ na-agbasa eziokwu ma gbaara akụkọ ụgha.

    Ya bụ mmemme ụbọchị ndị ọrụ e kwesịburu ime n’ụbọchị Mọnde bịara bụrụ n’ụbọchị Tuzde na steeti ahụ maka nchekwa ndụ na akụnụba ndị Enugwu.

  9. Ihe gọọmentị Naịjirịa na-ekwu maka Indomie ibunye ndị mmadụ kansa

    Indomie

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-enye ndị mmadụ ikike ịṅụ ọgwụ na iri nri na Naịjirịa bụ ‘National Agency for Food and Drug Administration and Control’(Nafdac) ekwuola na ndị mmadụ nwereike ịga n’ihu na-eri Indomie ma kwuo na ọ naghị ebunye ndị mmadụ ọrịa akpụ kansa.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ ọkammụta Mojisola Adeyeye gwara BBC nri ‘noodles’ a na-ere ndị Naijriịa bụ ndị e mere n’ime Naịjirịa.

    O gbara ama na gọọmentị mba Naijirịa machiri mbubata nri Indomie n’afọ olemole gara aga iji kwalite mmepụta nakwa nrụpụta ihe na Naijirịa.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ malitere ifeghari na iri Indomie na-ebunye ndị mmadụ ọrịa kansa.

    Akụkọ a so nke kwuru na mba Taiwan nakwa mba Malaysia nyere iwu ka e bupụ Indomie ụdịrị nke ‘Special Chicken’ n’ahịa mba ha.

    E kwuru na mba ndị mere nnyocha ma nyochapụta ihe a kpọrọ ‘Ethylene oxide’ n’ime nri a nkeekwuru nwereike ibunye ndị mmadụ kansa.

    Nadfac gbara ama na ha amalitela ime nnyocha nri a n’ime ụlọọrụ ha.

    Agbanyeghi na ha kwuru na Indomie ụdịrị nke ‘Special chicken’ ahụ anọghị n’ahịa Naịjriịa mana ha na-emekwa nnyocha ịma ma ndị mmadụ e bubatara ya n’ahịa Naịjirịa dịka Naịjirịa mere mmachi mbubata nrị a.

  10. Peter Obi akọwaala ihe mere ya n'ọdọụgbọelu mba Briten n'oge gara aga

    Peter Obi

    Ebe foto si, Screengrab

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 n'otu Labour Party, bụ Peter Obi, akọwaala ihe mere oge ọ gara njem na mba Briten n'ọdị nso a dịka akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa jichiri ya nwa.

    Akụkọ ahụ wuru ewu ihe dịka izuụka abụọ gara aga ma kwuo na ndị ọrụ nchekwa mba Briten jichiri Peter Obi maka na o ji akwụkwọ adigboroja banye na mba ahụ, ebe ụfọdụ sị na ihe e ji jichie ya bụ maka na e nwere onye ọzọ ji aha ya banye na mba ahụ.

    Na mkparịtaụka nke ya na ụlọ ntaakụkọ Arise TV nwere n'ụbọchị Mọnde, Obi kwuru na akụkọ ahụ niile na-efegharị enweghị nke bụ eziokwu.

    Nke a bụ nke mbụ Peter Obi na-ekwu okwu banyere akụkọ kpọmkwem ihe mere ya na London. O kwuru na oneghị ihe ọbụla merenụ karịa nnyocha nke ndị ọrụ nchekwa na-enyocha onye ọbụla tupu ọ banye na UK.

    "Ihe niile ahụ erughị nkeji 20 tupu m gawakwa ebe m na-aga n'ụbọchị ahụ," Peter Obi kọwara.

    "Ihe merenụ bụ na ndị ọrụ 'immigration' lere akwụkwọ m anya ma sị na ha chọpụtara ihe na-edochaghị ha anya nke mere o ji kwesị ekwesị ka ha lekwuo ya anya."

    "Onye ọrụ nchekwa ahụ ji olu nwayọ na nkwanye ugwu wee kọwaara m na ọ dịka onwere onye ji aha m nọrọ na mba UK, ma gwakwa m ka uche m dị n'ihe na-emenụ."

    Gbasara ebubo nke otu onye a ma ama na mpaghara Niger Delta bụ Asari Dokubo boro ma kwuo na ya nwere ihe akaebe na-egosi na Peter Obi bụ nwaafọ na mba Solomon Island bụkwa ebe o nwere ụlọ, Obi kwuru na ebubo ahụ bụ asị.

    "Amaghị m ebe Solomon Island dị. Agabeghị m mba ahụ mbụ. Enweghị m ụlọ ọbụla n'ebe ọbụla karịa na Naịjirịa nakwa na London bụ ebe m biri ọtụtụ afọ. Mba ọbụla a hụrụ ụlọ ọbụla n'aha Peter Obi, ọ bụghị eziokwu," ka ọ kọwara.

    Obi tinyekwara ọnụ n'ebubo nke Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed boro ya na osote ya bụ Datti Baba-Ahmed na ha na-achọ ịkụsa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa nke bekee na-akpọ 'treason'.

    O kwuru na ọ bụ ihe mwute na gọmentị Naịjirịa na-emefu ego n'ihe enweghị isi nke kpatara Lai Mohammed ji mefuo ego gawa mba Amerịka nakwa UK bụ ebe ọ nọrọ bo ya ebubo 'treason'.

    Obi kwukwara na foto na-efegharị na soshal midia nke na-ekwu na ya gara leta onyeisiala a họpụtara ọhụrụ bụ Bola Tinubu nke APC bụ foto adigboroja.

    "Onweghị mgbe m gara hụ Tinubu, ihe ndị a bụcha akụkọ ụgha a na-ekesa iji ghọgbuo ndị nkwado m," ka o kwuru.