Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya

Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Etu ndị ojiegbe siri gbuo ndị uweojii atọ n’Ebonyi steeti

    Ndị ojiegbe

    Ebe foto si, Getty Images

    N’ihe na-erubeghi abalị abụọ ka ndị ojiegbe gbagbuchara otu onye uweojii n’akụkụ Union Bank Junction nke Abakaliki, Ebonyi steeti, ndị ojiegbe ọzọ wakporo ma gbuo ndị uweojii atọ n’akụkụ obodo Oshiri nke okpuruọchịchị Onicha na steeti ahụ.

    E gburu ndị a ka ha nọ n'ihu ọrụ nnyocha ụgbọala ndị mmadụ ebe ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya, zipụtara ozi ma gbaa ama nke a n’ụbọchị Wenezde dịka o kwuru na otu onye n’ime ha merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.

    O kwukwara na dịka nke a mere na ha zigara ndị otu ha ebe ahụ ngwa ngwa ma hụ na ha ndị ojiegbe ahụ kwakọrịtara mgbọ nke mere abụọ n’ime ndị ojiegbe ahụ jiri nwụọ.

    Ozi Onovwakpoyeya kwuru na ha napụrụ ndị ojiegbe ahụ ọtụtụ ngwa ọgụ, ụgbọala, egbe, ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Kemgbe afo ole m ole, otu ndị ojiegbe dị iche iche na-egbeghari egbe n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa na-akwapo ndị mmadụ ọkachasị ndị ọrụ nchekwa.

    Egbe, ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ a napụrụ ndị ojiegbe ahụ.

    Ebe foto si, Nigerian Police Force

    Nkọwa foto, Egbe, ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ a napụrụ ndị ojiegbe ahụ.
  2. Tina Turner alaala mmụọ n'afọ 83

    Tina Turner

    Ebe foto si, Getty Images

    Otiegwu mba ụwa a ma ama bụ Tina Turner alaala mmụọ. Turner onye e ji egwu ya dịka ‘The Best’ nakwa ‘What’s Love Got to Do with it’ mara nwụrụ n’afọ 83.

    O nweela ọtụtụ nsogbu ahụike n’afọ ole m ole gara aga nke gụnyere ọrịa kansa, ọrịa mkpọnwụ ahụ nakwa ndatu akịrị ya.

    N’ebe afọ 1960 ya na di ya bụ Ike malitere iwu dịka egwu ha ‘Proud Mary’ na ‘River Deep, Mountain High’ saara ọkụ n’ọnụ ndị mmadụ ebe oge ahụ.

    Ọ gbara Ike alụkwaghịm n’ihi okwu mmekpa ahụ n’afọ 1978 ma gụwaziere onwe ya egwu nke ya n’ebe afọ 1980.

    Turner onye a na-akpọ ezenwaanyị ụdịrị egwu ‘Rock n Roll’, bụ onye ọtụtụ maka maka ụdịrị egwu ọ na-agba nakwa etu ngosi egwu ya si asaara ọkụ nakwa etu olu ya si adamitu ka olu nwoke.

    Ọ natara ihe nrite Grammy Awards asatọ dịka n’afọ 2021, e wepụtara aha naanị ya n’aha ndị a na-akwanyere ugwu pụrụiche na ‘Rock 'n' Roll Hall of Fame’.

    Cheta na n’afọ 1991, e wepụtarakọrọ aha ya na di ya bụ Ike n’okpuru ‘Rock 'n' Roll Hall of Fame’.

    Ọtụtụ ndị otiegwu agbụrụ ọhụrụ ekwuola na ha na-eṅọmị Turner ma na-eso nzọmụkwụ ya dịka onye mere ihe pụrụiche n’ọrụ iti egwu.

    Ndị a gụnyere Beyonce, Janet Jackson, Janelle Monae nakwa Rihanna.

  3. Etu Onyeisiala Buhari siri chịkọta nzụkọ ime ụlọ gọọmentị ya nke ikpeazụ

    Ndị ọchịchị gọọmentị

    Ebe foto si, Gọomentị Naịjirịa

    Onyeisiala Muhammmadu Buhari na ndị ọchịchị ime ụlọ ya emeela nzụkọ ime ụlọ ikpeazụ ha nke a kpọrọ ọgbakọ ‘Valedictory Federal Executive Council’ n’ime obi gọọmentị ya n’Abuja.

    Onyeisiala Buhari onye a na-atụ anya ya inyefe ọchịchị n’ụbọchị Mọnde nọọrọ n’isi nzụkọ a.

    Ndị ministri nakwa ndị isi ngalaba ndị iche iche sonyere ya bụ emume ifeaka nke ikpeazụ a.

    Ndị a ya na Buhari rụkọrọ ọrụ leghachiri anya azụ n’ọrụ ha ruru n’afọ asatọ gara aga dịka Buhari duru mmadụ asaa iyi ọrụ bụ ndị Kọmịshọna ọhụrụ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Gọọmentị Naịjriịa

    Ebe foto si, Gọọmentị Naịjriịa

    Gọọmentị Naịjriịa

    Ebe foto si, Gọọmentị Naịjriịa

    Ozi si n'aka gọọmentị n'abalị Wenezde a kọwakwara na akụsabeghi otu ọchịchị ndị a dịka ha ka ga-achịkọta ọrụ ha ruo ụbọchị enyefere ọchịchị.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  4. Etu ndị uweojii si nwụchie nwoke na-ezu asambodo ili ndị mmadụ

    Onye a na-eyo n'okwu izu asambodo ili ndị mmadụ

    Ebe foto si, KANO STATE POLICE COMMAND

    Ndị uweojii na Kano steeti ekwuola n’ụbọchị Tuzde na ha nwụchiri otu nwaokorobịa dị afọ 19 dịka ọ nọ na-ezu igwe nakwa gbam gbam e ji ede aha ndị mmadụ nakwa mgbe e liri ha n’ọdọ ili dị na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ SP Abdullahi Kiyawakwuru na ha nwụchiri nwaamadị a dịka o ji igwe na gbam gbam ndị a ruru 28 nke e kwuru na o zuuru n’ọdọ ili nke Tudun Wada dị na Kano.

    Ya bụ nwoke kwupụtara na ọ bụ ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ ka o ji aga ya bụ ọdọ ili aga ezuru igwe ndị ahụ.

    O kwukwara na ọ na-eresị ndị na-azụ igwe ya bụ asamobodo ili nke ha ji akpụ ihe.

    Akụkọ na-ekwu ya bụ nwoke na-ere igwe ndị a n’ọnụ ego N300 otu Kilo.

    SP Kiyawa kwuru na aga akpụpụ ya ụlọikpe ma e mechaa nyocha n’okwu a.

    Magaji Adamu na-arụ n’ọdọ ili ahụ kwuru na nke a ga-eme ya ugboro abụọ ụdịrị ihe a na-eme n’ebe ahụ dịka ọ rụrụla ebe ahụ afọ 25.

    Adamu kwuru na ndị na-ezu ụdịrị ihe a na-abịa n’ime abalị abịa ezu ya.

    Onye a na-eyo n'okwu izu asambodo ili ndị mmadụ

    Ebe foto si, KANO STATE POLICE COMMAND

  5. 'Tear gas' ndị uweojii tụrụ n'akụkụ ụlọakwụkwọ edubala ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụlọọgwụ

    Tear gas

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe karịrị ụmụakwụkwọ 30 abanyela n'ụlọọgwụịnata ọgwụgwụ n’ihi ha kuruu anwụrụ si na gaasị mmiri anya ndị uweojii nke ngabala na-emegide ndị ọgbaghara tụrụ ebe ha na-eme ọzụzụ ụtụtụ n’akụkụ Osun steeti.

    Ihe a mere n’ihu ụlọakwụkwọ Fakunle Comprehensive, n'ime obodo Osogbo, mana anwụrụ ya bụ gaasị gafere, banye n’ime ụlọakwụkwọ ahụ.

    Akụkọ na-ekwu na akpọgara ụmụakwụkwọ sekọndrị ndị ahụ n'ụlọọgwụ abụọ dị iche iche maka nlekọta ahụike ngwa ngwa ka ụfọdụ n’ime ha kubituru.

    Ihe ahụ merenụ kpalitere oke ụjọ ebe ahụ ka ụfọdụ ndị nne na nna ji ọsọ kpọpụwa ụmụ ha ngwa ngwa dịka ndị isi ụlọakwụkwọ dụrụ ọdụ ka ha mechie ụbọchị ahụ.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Osun bụ Yemisi Opalola rịọrọ mgbaghara maka ihe ahụ merenụ ma kwuo na ndị ọrụ ha ga-eme "ngbanwe dị mkpa" iji gbochie ụdịrị ihe a ime ọzọ.

  6. Etu e siri tọhapụ Seun Kuti

    Seun Kuti

    Ebe foto si, Lagos police command/Twitter

    A tọhapụla onye otiegwu ‘Afrobeat’ Naijiria ama dịka Seun Kuti ka o sizie n’ụlọ na-abịa ikpe ya dịka nọrọ abalị ole m ole n’aka ndị uweojii maka ebubo ebubo ịmekpa onye uweojii ahụ.

    Onye ọkaiwu ya bụ Adeyinka Olumide-Fusika gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Punch na a tọhapụrụ Kuti - nwa Fela Kuti n'abalị Tuzdee ka o mezuru ihe ndị a chọrọ n’aka ya maka mgbapụta ya.

    Ihe onyonyo nke onye na-azọ ikike dịrị onye ndị mmadụ aha ya bụ Omoyele Sowore kesara na Twitter gosiri Kuti ka ya na ndị na-akwado ya na-enwe aṅụrị maka mgbapụta ya.

    Ndị uweojii nwụdoro ya na Legọs n'abalị iri na ise n'ọnwa Mee kwuru na ha mere nke a n’ihi na "e setere ya n’onyonyo ka ọ na-awakpo onye uweojii yi uwe ya",

    Tupu anwụchie ya, Kuti kwuru na onye uweojii ahụ nwara igbu ya na ezinụlọ ya, mana ọ kọwaghị ya bụ okwu.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Ụlọakụ etiti bụ Central Bank anapụla ụfọdụ ụlọakụ ikike ịrụ ọrụ

    Ụlọakụ etiti Naịjirịa

    Ebe foto si, CBN

    Ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Central Bank anapụla ụfọdụ ụlọakụ dị na Naịjirịa ikike ịrụ ọrụ dịka ebe nchekwa ego ndị mmadụ.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi CBN wepụtara n’ọbaozi websaịt ha n’ụbọchị Tuzde 23 Mee, 2023 bụ onyeisi ha bụ Godwin Emefiela tinyere aka na ya.

    Ndị nke a metụtara bụ ụlọakụ ‘microfinace bank’ otu narị na iri asaa na itoolu (179) na ụlọakụ mbinyeego a kpọrọ ‘mortgage bank’ anọ.

    Emefiela kwuru na a na-apụrụ ndị ikike ha maka na ha hapụrụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ mere e ji nye ha ikike ma rụwazie ihe ọzọ.

    O kwuru na agwa ndị a kpara megidere iwu na-achịkwa ụlọakụ na Naịjirịa a kpọrọ ‘Banks and other financial institutions Acts (BOFIA) nke 2020.

    Ụfọdụ ụlọakụ ndị o metụtara gụnyere;

    Atlas Microfinance Bank, Bluewhales Microfinance Bank, Everest Microfinance Bank, Igangan Microfinance Bank, Mainsail Microfinance Bank, Merit Microfinance Bank, Minna Microfinance Bank, Musharaka Microfinance Bank, Nopov Microfinance Bank, Ohon Microfinance Bank na ndị ọzọ

    Ụlọakụ ndị a napụrụ ikike

    Ebe foto si, CBN

    Ụlọakụ ndị a napụrụ ikike

    Ebe foto si, CBN

    Ụlọakụ ndị a napụrụ ikike

    Ebe foto si, CBN

    Ụlọakụ ndị a napụrụ ikike

    Ebe foto si, CBN

    Ụlọakụ ndị a napụrụ ikike

    Ebe foto si, CBN

  8. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Anyị ji obi ọma na-anabata gị n'ọgbakọ anyị nke taa.

    Buru oche bịa chọpụta akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ ebe a.

  9. Onyeisiala mba Amerịka ewepụtala aha ndị ọchịchị ya ga-abịa emume idu iyi ọrụ Tinubu

    Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Joe Biden nke mba Amerịka zipụtara ozi n’ụbọchị Mọnde abalị 22 nke ọnwa Mee mmadụ asatọ si ọchịchị ya ga-abịa emume idu iyi ọrụ nke onye a họpụtara ọhụrụ ịchị Naijirịa bụ Bola Ahmed Tinubu.

    Ozi si obi gọọmentị Biden gbara ama na Marcia L. Fudge bụ odeakwụkwọ ngalaba na-ahụ maka ịrụ ụlọ nakwa mmepe obodo na mba ahụ ga-abụ onye ndu ndị a ga-abịa ya bụ emume.

    Ndị ọzọ e depụtara ga-esonye gụnyere:

    • David Greene
    • Sydney Kamlager-Dove
    • Marisa Lago
    • Michael E. Langley
    • Enoh T. Ebong
    • Mary Catherine Phee
    • Judd Devermont
    • Monde Muyangwa

    Ọchịchị Biden ekwuola ugboro ugboro na ọ na-adọnyere ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa usoro ọchịchị Naijirịa ukwu iji gosi nkwado mba Amerịka nye gọọmentị Naijirịa.

    A ga-eme emume idu iyi ọrụ a n'Abuja n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari onye chịrịla afọ asatọ ga-enyefe Bola Tinubu nke All Progressives Congress (APC) ọchịchị.

    Inec kpọpụtara aha Tinubu dịka onye nwetere mmeri na ntuliaka 2023 dịka o nwetere nchịkọta vootu 8,794,726 na ya bụ ntuliaka.

  10. Onyeisiala Buhari ga-agbape akwammiri Niger nke abụọ taa

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-agbape akwammiri Niger nke abụọ taa bụ Tuzde 23 Mee, 2023.

    Nke a dị n'ozi onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Bashir Ahmed wepụtara na Twitter.

    O kwuru na mgbape ụzọ a ga-enye aka belata ahụhụ ndị njem na-aga n'Ọwụwa Anyanwụ na-ata ma mee ka akụnaụba ha na-amụbawanye.

    Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ naanị ụbọchị isii ka ọchịchị ya kụrụ ọnụ na 29 Mee, 2023.

  11. Onyeisiala Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu asatọ ọhụrụ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Bashir Ahmed

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n’akwụkwọ iwu asatọ ọhụrụ nke ndị omeiwu mepụtara iji mee ka ha bụrụ iwu.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi onye enyemaka ya bụ Bashir Ahmed depụtara n’akara Twitter n’ụbọchị Tuzde 23 Mee, 2023.

    Onyeisiala Buhari mere nke a dịka ọ fọrọ naanị ụbọchị isii ka ọchịchị ya afọ asatọ kụrụ ọnụ n'ụbọchị 29 Mee, 2023.

    Iwu ndị a gụnyere;

    • Iwu ga-eme ka obibi ndụ na azụmaahịa dịrị ndị mmadụ mfe a kpọrọ ‘National Social Investment Programme Agency Act’
    • Iwu ga-ahụ maka akụmaakwụkwọ Sekọndịrị n’ogogo elu a kpọrọ ‘National Senior Secondary Education Act’
    • Iwu ihiwe mahadum ahụike ‘Federal University of Health Science Ila-Orangun (Establishment) Act
    • Iwu ihiwe mahadum ahụike ‘Federal University of Health Sciences, Azare (Establishment) Act’
    • Iwu ihiwe ngalaba ‘Chartered Institute of Development Studies and Administration of Nigeria (Establishment) Act’
    • Iwu hiwere ngalaba ‘Federal Institute of Industrial Research (Establishment) Act’
    • Iwu hiwere ngalaba ‘Institute of Strategic Management of Nigeria Act’
  12. Ndị dọkịta akwụsịla abụbụọrụ ha malitere kamgbe otu izuụka

    Ndị dọkịta na Naịjirịa

    Ebe foto si, NARD

    Otu jikọtara ndị dọkịta na Naịjirịa akwụsịla abụbụọrụ ịdọ aka na ntị ha malitere ịgba kamgbe Wenesde Mee 17, 2023.

    Onyeisi ha bụ Emeka Orji gwara ndị ntaakụkọ na kagburu nke a ruo izuụka abụọ maka nkwekọrịta ha na gọọmentị nwere n’ụbọchị Fraịde.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị dọkịta ga-ezukọ ọzọ n’ọnwa Juun iji tụlee etu nkwekọrịta ahụ si aga ma kpebie ihe ọzọ ha ga-eme.

    Cheta na ndị dọkịta malitere ịgba abụbụọrụ a maka ihe dị iche iche gụnyere akwụghị ha ụgwọ ọnwa nakwa ihe ndị ọzọ.

  13. Enweela nkwekọrịta ịkwụsị ọgụ na mba Sudan ruo ụbọchị asaa - Mba Amerịka

    Ndị na-agba ọsọ agha na mba Sudan

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu abụọ na-alụ ọgụ na mba Sudan kamgbe izuụka isii gara aga ekwetela ịkwụsị ọgụ ha na-alụ ụbọchị asaa maka ahụhụ na nsogbu ndị nkịtị na-agabiga.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi ndị mba Amerịka na mba Saụdi Arabia jịkọrọ aka wepụta nke kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka ọ ga-ebido.

    E nwela mbọ a gbara na mbụ iji kwụsị ndị agha mba Sudan na ndị agha Rapid Support Forces ịlụ ọgụ kama ọ na-akụsa n'ime nkeji olemaole.

    Kama ndị mba Amerịka na-ekwu na e nwere usoro pụrụiche a ga-eji hụ na nkwekọrịta a mịtara mkpụrụ.

    Ihe ruru mmadụ otu nde esila n'ụlọ ha gbapụ dịka agha dapụtara n'ụbọchị 15 nke ọnwa Aprel dịka ndị agha mba Sudan bụ ndị nọ n'ọchịchị nke onyeisi ha bụ Abdel Fattah al-Burhan na onyeisi otu Rapid Support Forces bụ Mohamed Hamdan Daglo na-azọ onye ka e were ọchịchị.

  14. Ị bọọla chi

    Nrị oriri

    Ebe foto si, Iwaria

    Soro anyị taa maka akụkọ nile ga-amasị gị

  15. Tinubu alọtala abalị 9 tupu edumiyiọrụ

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Tinubu Media

    Onye ga-abanye dịka Onyeisiala ọhụụ Naijiria bụ Bola Tinubu alatala ka ọ fọọ abalị itoolu tupu mmemme idu iyiọrụ dịka onyeisiala.

    Tinubu si Fransi lọta dịka ọ gara mba ofesi gaa suo ike, dịka Tunde Rahman bụ ọnụ na-ekwuru ya si kwuo.

    N'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023 ka Naijiria ga-eme emume inyefe ọchịchị n'aka onyeisiala ọhụrụ.

    Oluremi Tinubu

    Ebe foto si, Tinubu Media

  16. Onye a họpụtara ọhụrụ ịchị Naịjirịa, Tinubu alọghachila Naịjirịa

    Tinubu

    Ebe foto si, @DOlusegun/Twitter

    Bola Ahmed Tinubu bụ onye a họpụtara ọhụrụ alọghachila Naịjirịa.

    Tinubu lọbatara n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe n'Abuja n'ehihe taa dịka o mere njem izuụka abụọ gara aga gaa mba Europe.

    Ndị gara nabata ya dịka ọ lọbata gụnyere osote ya bụ Kashim Shettima, omeiwu Godswill Akpabio, gọvanọ Kano Steeti bụ Umar Ganduje, onyeisi ụlọomeiwu Sineti bụ Ahmad Lawan, na ọtụtụ ndị ọzọ.

    N'oge Tinubu na-apụ njem a ụbọchị iri gara aga, ụlọọrụ mgbasaozi ya kwuru na ọ na-aga izute ndị nwere agba na mba Europe dị icheiche iji kpaa etu ha ga-esi bịa tinye ego Naịjirịa.

    Ọ fọdụrụ ụbọchị itoolu tupu e duo Tinubu na Kashim Shettima n'iyi ọrụ dịka onyeisiala na osote onyeisiala ọhụrụ nke Naịjirịa.

  17. Afrịka, ụwa niile ga-echeta usoro ọchịchị Buhari - Nana Akufo-Addo

    Nana Akufo-Addo na Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Presidency

    Nkọwa foto, Foto ochie e tinyere iji kọwaa akụkọ

    Onyeisiala mba Ghana bụ nana Akufo-Addo ekwuola na Afrịka nakwa mba ụwa niile ga-echeta ọtụtụ njirimara ọma nke ọchịchị Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari.

    Akufo-Addo kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde, Mee 19, 2023, n'Abuja dịka o bụ onyeisioche n'emume ngosipụta akwụkwọ abụọ e dere na ncheta Buhari.

    Nke a na-abịa dịka ọ fọdụrụ naanị otu izuụka ka oge Buhari dịka onyeisiala bịa na njedebe.

    Aha akwụkwọ abụọ ahụ bụ: 'State of Repair: How Muhammadu Buhari Tried to Change Nigeria for Good' nke onye dere ya bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Anthony Goldman; na 'The Legacy of Muhammadu Buhari', nke onye dere ya bụ Sịnetọ Abu Ibrahim.

    N'emume ahụ, Akufo-Addo kwuru na ọchịchị Buharị pụtara ihe n'Afrịka niile dịka o gosiri ọtụtụ njirimara ezigbo onye ndu.

    "Afrịka na ụwa niile ga-echeta ọchịchị ọma gị," ka Akufo-Addo kwuru.

    Buhari ga-arịtu n'ọkwa onyeisiala n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, bụkwa ụbọchị a ga-edu Bola Ahmed Tinubu n'iyi ọrụ dịka onyeisiala ọhụrụ.

    Ọtụtụ ndị a ma aha ha na Naịjirịa nyekwara onyinye ego maka akwụkwọ abụọ ahụ, dịka ndị haziri emume ahụ kwuru na ego ndị a ga-aga maka ọrụ enyemaka dị icheiche.

  18. Ndị Omekome egbuola ndị uweojii abụọ n'ụtụtụ taa n'Imo steeti

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Iwaria

    Ndị omekome egbuola ndị uweojii abụọ taa n'okporoụzọ Owerri/Aba n'obodo Umudim n'ụtụtụ taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Mee afọ 2023.

    Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ezie.

    O kwukwara na ha na-eche na ọ bụ ndị otu Indigenous People of Biafra na Eastern Security Network kpara ya bụ arụ.

    O kwuru sị, " Ọ bụ eziokwu na ndị omekome wakporo ndị uweoji nke Counter Terrorism Unit dịka ha na-arụ ọrụ ha n'okporoụzọ Owerri/Aba".

    Mapụ Imo steeti

    Okoye kwuru na ha anapụtala otu ụgbọala ndị omekome a jiri bịa wakpoo ndị uweojii a ma sị na ha hụtara ọbara n'ime ụgbọala ahụ.

    O gara n'ihu kwuo sị, " ọbara anyị hụrụ n'ụgbọala a gosiri na ndị otu anyị lusoro ha ọgụ kama anyị ga-eme ihe niile iji hụ na anyị jidere ndị kpara arụ a".

    Cheta na ndị omekome wakporo ma gbuo ndị uweojii ise na mmadụ abụọ ọzọ n'ụzọ Owerri - Aba a n'otu ọnwa gara aga.

    Ọzọkwa abụrụ na n'ọnwa Maachị, ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ndị ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps na mpaghara okpuruọchịchị Ngor Okpala.

  19. Kwụsịnụ ịkwụ 'subsidy' ugbua - Ihe 'World Bank' gwara gọọmentị etiti

    Fuel

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisi ụlọakụ mba ụwa na Naịjirịa bụ Shubham Chaudhuri agwala gọọmentị nakwa gọọmentị steeti ka ha chemie echiche maka ịga n'ihu n'ịkwụ ụgwọ iji mee ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala dị ala, bụ nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na bekee.

    Chaudhuri kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde nke bụ ụbọchị nke atọ maka ọgbakọ ịnabata ndị gọvanọ a họpụtara ọhụrụ na ntuliaka gara aga, bụ nke e mere n'obi gọọmentị n'Abuja.

    Ọ dọrọ aka na ntị na ọnọdụ akụnụba ọjọọ dị na Naịjirịa nwereike ịkawanye njọ ma ọ bụrụ na gọọmentị enweghị ezi mkpebi gbasara ịkwụsị 'subsidy' ugbua.

    O kwuru na etu ụgwọ ụfọdụ steeti na Naịjirịa ji si agbalị elu ugbua bụ ihe e kwesịrị ileba anya, ma kwukwaa na ọnọdụ a nwereike ịkawanye njọ ma ọ bụrụ na gọọmentị na-abata abata emeghị ihe ha kwesịrị ime gbasara 'subsidy'.

    Cheta na Ngozi Okonjo-Iweala, bụbu Mịnịsta na-achịkọta akụnụba Naịjirịa gwakwara ndị gọvanọ ọhụrụ a ka ha tinye uche n'ihe ndị ọzọ nwereike iweta ego n'akpa gọọmentị, karịa ị na-eche oge niile maka ego ha ga-enweta n'aka gọọmentị etiti.

    Okonjo-Iweala dụkwara ha ọdụ ka ha mee steeti ha dị icheiche ka ọ bụrụ ebe ndị mba dị icheiche ga-enwe mmasị ịbịa tinye ego ma hibe ụlọọrụ, nke a ga-eme ka ọtụtụ ndị ntorobịa nwee ọrụ ma nwekwaa ike ịkwụnwu ụtụisi, nke ga-emekwa ka ego na-abatara gọọmentị gbalite.

  20. F-16 fighter jets: Amerịka ekwetala ka mba ndị ọzọ nye Yukren ụgbọelu agha

    ụgbọleu agha

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka ekwetela ka mba ndị ha na ha dị na mma zigara ndị mba Yukren ụgbọelu agha ọkachasị ụgbọleu F-16 nke ndị Amerịka na-emepụta.

    Ọ bụ onye ndụmọdụ pụrụiche gọọmentị Amerịka maka nchekwa bụ Jake Sulivan gwara ndị otu G7 dịka ha nwere nzụkọ na mba Japan.

    Ndị mba Amerịka ga ekuziri ndị ọkwọọ ụgbọelu mba Yukren etu esi anya ụụ̀bọleu ndị a.

    N'aka nke ọzọ ka ụlọ ntaakụkọ gọọmentị na-ekwu na mba Rọshịa si na mba ndị ga-enye Yukren ụgbọelu F-16 na-etinye onwe ha n'ọnọdụ na adịghị mma.

    Ndị ọkammụta maka agha na-ekwu na ụgbọleu F-16 ka enye ndị mba Yukren oghere ibuso ndị agha Yukren agha n'ọnụ ama ha.