Ihe mere otu AU ji esonye n'ọgbakọ G7 nke afọ a

Ebe foto si, Getty Images
Otu Africa Union na-esonye n'ọgbakọ G7 nke afọ 2023 bụ nke na-aga n'ihu ugbua na mba Japan.
G7 bụ otu jikọrọ mba asaa bara ọgaranya n'ụwa nke gụnyere: Japan, Amerịka, UK, Kanada, Germany, France na Itay.
Otu a na-enwe ọgbakọ kwa afọ ọbụla iji kpaa etu ha ga-esi wulite mmekọrịta n'etiti onwe ha.
Mana nke afọ a, ha akpọọla ka Afrịka sonyere ha n'ọgbakọ ahụ, dịka Kọmishọna na-ahụ maka okwu azụmahịa n'otu AU bụ Albert Muchanga nke mba Zambia.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mba ụwa dị icheiche na-achọ iwulite mmekọrịta ha na Afrịka n'ihi ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara na mpaghara ahụ.
I ji maa atụ, Onyeisiala German na nke Fransị nakwa osote onyeisiala mba Amerịka, abịala njem nleta na mba Afrịka dị icheiche n'afọ a bụ 2023.
Praịm Mịnịsta mba Japan gakwara njem nleta na mba Egypt, Ghana, Kenya, na Mozambique, na mbido ọnwa Mee a.
Chetakwa na mba Chaịna na Russia - bụ ndị esoghị na G7 - na-ewulitekwa mmekọrịta ha na Afrịka.
Na mkparịtaụka ya na BBC, Muchanga kwuru na "Afrịka agaghịzi anabata ịbụ naanị mba ebe a na-eweta ihe akụ ọnatarachi na-ebuga mba ụwa ndị ọzọ Kama Afrịka ọdịnihu ga-eweta mmekọrịta ga-adịrị mpaghara ahụ mma, dịkwara ndị ọzọ."
"Anyị agaghị aga n'ịhụ ịbụ mba a ma ama maka mbubu ihe akụ ọnatarachi nakwa akụrụngwa e ji arụpụta ihe, nke ahụ agaghị adabazi. Dịka ọnụọgụgụ anyị na-agbalite, anyị chọrọ ohere ndị mmadụ ga-eji na-arụ ezigbo ọrụ, ohere ahụ ga-abịa ma ọ bụrụ na arụọ ụlọọrụ ndị a na-emepụta ihe n'Afrịka."
"Ezigbo ọmụmaatụ bụ na mba DRC na Zambia bụ ndị na-achọ ijikọ aka ọnụ ma hibe ụlọọrụ na-emepụta batrị maka ụgbọala latrik."
Mba abụọ a so na mba kacha emepụta 'copper' na 'cobalt' nke bụ akụrụngwa e ji arụpụta batrị, nke ọtụtụ mba dị icheiche na-achọ ugbua.

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, Mba Amerịka na-agba mbọ iwulite azụmahịa ha na mba Afrịka.
Nke a na-abịa dịka azụmahịa mba Chaịna na Afrịka na-agbago n'ike n'ike; cheta na Amerịka na-ahụta Chaịna dịka ndị ha na ha na-ama aka.
N'afọ gara aga, azụmahịa Chaịna n'Afrịka ruru ijeri dọla 282 ($282bn), dịka ngụkọ azụmahịa nke mba Chaịna si gosi. Nke a pụtara na o ji pasentị 11 rịa elu karịa afọ 2021, dịka ọnụahịa mmanụ agbịdị, 'copper', 'cobalt' na 'iron' gbaliri.
Nke a pụtakwara na azụmahịa Chaina na Afrịka ji ugboro anọ karịa azụmahịa Amerịka na Afrịka, bụ nke ego ya gbakọtara ijeri dọla 72.6 ($72.6bn) n'afọ 2022



















