Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ndị uweojii akpọpụla ọgụụ egwu 'Portable' n'ụlọikpe

    Portable
    Nkọwa foto, Ndị uweojii akpọpụla ọgụụ egwu Portable n'ụlọikpe

    Ndị uweojii akpọpụla onye otiegwu a maama dịka Portable nke ezigbo aha ya bụ Habeeb Adunni Olawunmi Okikiola n’ụlọikpe taata.

    A na-ebo ya ebubo maka mwakpo. Ndị uweojii kpọpụrụ ya n’ụlọikpe nke ukwu dị n’Ifo n’Ogun Steeti.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Muyiwa Ogunjobi si na “Portable nwere ihe karịrị ebubo isii e jiri jide ya, dịkwa iche n’ebubo na o tikwara onye uweojii ihe.

    A ga-amakwa ya iwu maka iti mmadụ ihe n’Ọta, onye bụ nwaamadị dere akwụkwọ nye ndị uweojii nye kọmịshọna ndị uweojii n’Ogun steeti.”

    Ndị uweojii akpọpụla ọgụụ egwu Portable n'ụlọikpe
  2. Anyị etinyela ọkọlọtọ Rọshịa n'obodo Bakhmut - Ndị agha Wagner

    Onye agha

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisi ndị agha egoro ego Wagner na-alụrụ mba Rọshịa ọgụ bụ Yevgeny Prigozhin ekwuola na ha etinyela ọkọlọtọ mba Rọshịa na mpaghara Bakhmut nke dị na mba Yukren.

    Ọ bụ n'ihe onyonyo ka o kwuru nke a ma sị na ndị agha Yukren ka gbadoro ụkwụ n'ala na mpaghara ndịda anyanwụ Bakhmut.

    O ruola ọnwa olemaole ndị agha Rọshịa na-achọ ịnapụa Yukren obodo Bkhmut kama onyeisi agha ndị mba Yukren na-ekwu na ndị agha ha ka nọ na Bakhmut ma sị ka ndị mmadụ hapụ ịge ntị maka ndị na-ekwu okwu mmeri ebe ha enwetabeghị mmeri ọbụla.

    Puku pụrụ puku ndị agha mba Rọshịa na Yukren anwụọla maka ọgụ obodo Bakhmut, ebe mịnịsta nchekwa mba Briten na-ekwu na ọ ga-adịrị Rọshịa mfe ịwakpo ebe ndị ọzọ na mba Yukren ma ha nweta obodo Bakhmut.

  3. Unu abọọla chi

    Unu niile ga-erite uru taata n'aha Chukwu okike.

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị