Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Rọketi Elon Musk chọrọ iji abanye n’ime ‘Space’ agbawaala ma nwuru ọkụ

    Ụgbọelu SpaceX

    Ebe foto si, Reuters

    Rọketi ọhụrụ a kpọrọ SapceX bụ nke Elon Musk chọrọ iji eme njem agafe ihu eluigwe gbawara ma nwuru ọkụ dịka a na-anwale ya.

    Onweghi onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n’ụgbọelu ahụ mmadụ na-anọghị bụ nke fepuru na mpaghara Texas n’ụtụtụ Tọzde.

    N’ime nke abụọ maọbụ atọ rọketi ahụ fepuru, ọ malitere na-ama jijiji n’elu nke mere o jiri gbawa ma nwuru ọkụ n’elu.

    Musk kwuru na ha ga-anwale ọzọ n’ọnwa ole na ole na-abịa.

    Ndị injinịa rụrụ ụgbọelu SpaceX sị na nwale ha ahụ mere nke ọma. Ha na-achọ “ịnwale ọsịsọ nakwa ugboro ugboro” na egwu adịghị ha imebi ihe. Ha kwuru na ha ga-enwete akụrụngwa ha ga-eji arụ ọzọ.

    Musk dere n’akara twitter ya na-ekele ndị ọrụ ya na ha mere nke ọma, na ha amụtala ihe maka nke ọzọ ha ga-arụ.

  2. Anambra ka nwee ọnụọgụgụ ụmụaka nwere ọrịa Tuberculosis na Naịjirịa

    Foto onye nwere TB

    Ebe foto si, Thinkstock

    Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa Tuberculosis, Leprosy na Buruli Ulcer n'Anambra steeti bụ Dkt Ugochukwu Chukwuelobe, ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụaka nwere ọrịa tuberculosis n'Anambra steeti karịrị nke steeti niile na Naịjiria.

    Chukwuelobe kwuru nke a n'ọgbakọ nke ngalaba gọọmentị etiti n'ahụ maka ahụike na ụlọọrụ KNCV Tuberculosis Foundation and Breakthrough Action Nigeria haziri n'Awka n'ụbọchị Tọzde.

    "Dịka ngụkọ gbasara ọrịa tuberculosis na Naịjirịa si gosi, Naịjirịa bụ mba nke isii n'ụwa niile nakwa mba nke mbụ n'Afrịka kacha nwee ọrịa tuberculosis," Chukwuelobe kwuru n'ọgbakọ ahụ.

    "Anambra bụ steeti kacha nwee ndị nwere ụdị tuberculosis ụdị nke ọgwụ anaghị emetụta nakwa ụmụaka nwere ọịa tuberculosis na Naịjirịa. Nke a abụghị ihe dị mma.

    "Iji wetuo ọnụọgụgụ ọrịa TB, gọọmentị Anambra steeti nakwa ụlọọrụ mgbochi ọrịa tuberculosis na ụlọọrụ ndị ọzọ ejikọọla aka ma hibe ụlọọrụ nnyochapụta ọrịa bụ ọkaibe na steeti a.

    "Anyị nwere ụlọọgwụ pụrụ iche nke ọnụọgụ ya karịrị 800 maka nnyochapụta na ọgwụgwọ TB, mana ihe bụ nsogbu bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị maka ọrịa TB.

    Chukwuelobe gwara ndị ntaakụkọ ka ha gbasie mbọ ike n'ịgbasa ozi maka ọrịa TB nakwa etu ndị mmadụ ga-esi chekwaa onwe ha maọbụ nweta ọgwụgwọ.

    "Ụkwara akụsị akwụsị ruo izuụka abụọ maọbụ karịa, ahụ ọkụ, mmadụ ịta ahụ n'ike n'ike, oke okpoofufu n'etiti abalị socha na njirimara ọrịa TB," ka o kwuru.

    "Onye ọbụla hụrụ ụdị ihe a kwesịrị ịga ụlọọgwụ dị ya nso maka ọgwụgwọ.

    "Ndị nwere ọrịa a kwesịrị ị na-aṅụ ọgwụ ha ma na-emekwa ihe niile a gwara ha n'ụlọọgwụ."

    "Onye ọbụla nwere oke na ọrụ dịịrị ya na mgbochi ọrịa TB," ka o kwuru.

  3. Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky akpọọla Tinubu oku ịbịa mba ya

    Zelensky na Tinubu

    Ebe foto si, Getty Images/Bola Tinubu/Facebook

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ezigarala Bola Ahmed Tinubu ekele dịka onye a họpụtara ịchị Naijirịa.

    Onye ndụmọdụ Tinubu n’ihe gbasara mgbasaozi bụ Tunde Rahman kwuru nke a n’ozi o zipụtara n’ụbọchị Tọọzde abalị 20 nke ọnwa Eprel, 2023.

    Zelensky kpọrọ Tinubu oku ka ọ bịa njem nleta na mba ya mgbe ọ ga-adịrị ya mfe ma e duchaa ya iyi ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa.

    O kwuru na Ukraine na-agba mbọ ịhụ na mmekọ ya na Naịjirịa siwanyere ike.

    Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na a ga-edu Bola Ahmed Tinubu nke otu All Progressives Congress (APC) iyi ọrụ dịka n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023.

  4. Ndị omekome gburu ihe ruru mmadụ 214, tọọrọ ihe ruru mmadụ 746 n'ọnwa atọ - Gọọmentị Kaduna

    Gọvanọ Kaduna steeti

    Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Facebook

    Gọọmentị Kaduna steeti ekwuola na ihe ruru mmadụ 214 abụrụla ndị egburu na mwakpo olemole mere na steeti ahụ sị n’aka ndị agha nnụpụisi, agha dị n’etiti obodo na obodo nakwa agha ịbọ ọbọ obodo ndị awakporo malite n ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Maachị 2023.

    Ozi a pụtara ihe n’akwụkwọ gbasara nchekwa n’ọnwa anọ na steeti ahụ nke Kọmịshọna nchekwa steeti bụ Samuel Aruwan wepụtara ma nye otu nchekwa steeti ahụ.

    Aruwan kọwara na ọ bụ ụmụnwoke mmadụ 196, ụmụnwaanyị mmadụ 14 nakwa ụmụaka mmadụ anọ ka e gburu ebe a tọọrọ ihe ruru mmadụ 746 n’ime ọnwa ndị a.

    Ozi ya kwukwara na ọ bụ na mpaghara Kaduna Central Senatorial District bụ ebe a kacha gbuo ndị mmadụ dịka mwakpo ndị mere ebe ahụ tara isi mmadụ 115.

    Gọvanọ Nasir El-Rufai mgbe ọ natara ozi kpọkuru gọọmentị etiti ka etinye aka kwalite ọrụ nchekwa na steeti ahụ dịka o kwuru na gọọmentị steeti agaghị enweike naanị ha mee nke a.

    O kwuru:

    "Anyị na-arịọ ka akwalite ọrụ nchekwa n'ime ụbọchị 39 na-abịa dịka ọ abalị olemole ka oge ọchịchị a bịa na njedebe ma hụkwa na n’oge nyefe ọchịchị a enyeghị ndị omekome ohere ịkpa ike."

  5. Mmadụ 78 abụrụla ndị azọgburu n’emume nkesa ihe enyemaka Ramadan na Yemen

    Akpụụkwa nakwa ihe ndị atụtụtara n'ebe ihe ọdachị a mere

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Akpụụkwa nakwa ihe ndị atụtụtara n'ebe ihe ọdachị a mere

    Azọgbuola ihe ruru mmadụ 78 n'otu ụlọakwụkwọ dị n’isiobodo Yemen bụ Sanaa ebe a na-eme emume ekesa ihe eyemaka maka Ramadan.

    Ụlọntaakụkọ Reuters kwuru na nari kwuru nari ndị mmadụ gbakọtara n’ime ụlọakwụkwọ ahụ iji nata ihe onyinye a na-eke nkeọnụego ya ruru ihe dịka dọla itoolu dọla itoolu otu onye.

    Minista ihe na-eme n’obodo mba ahụ ekwuola na a nwụchiela ndị hazịrị emume nkesa a dịka a na-eme nnyocha ihe ọdachị mere ebe ahụ.

    Cheta na ndịagha nnupụisi Houthi wụbara isi ọchịchị mba ahụ kemgbe ha chụpụrụ gọọmentị ha n'afọ 2015

    E mere emume a tara isi ndị mmadụ n'ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa abụ ọnwa ndị okpukperechi Alakụba dị nsọ nke a na-akpọ Ramadan, bụ oge ibu ọnụ.

    Mohamed Ali al-Houthi, onyeisi kọmitii ndị Houthi, rụrụ aka na ọ bụ oke ihe isi nọ na mba ahụ ugbua kpara ihe ọdachị a mere.

    Ndị na-eme nnyocha n'okwu ihe ọdachị a mere n'emume a.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị na-eme nnyocha n'okwu ihe ọdachị a mere n'emume a.
  6. Ndị be anyị - Unu asaala chi?

    Nnọọ nụ n'ọba ozi anyị.

    Leekwa akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Eprel, 2023.

  7. Ụlọ a ka na-arụ arụ adagbuola mmadụ abụọ n’Abuja

    Ndị ọrụ gbata gbata

    Mmadụ abụọ anwụọla dịka ụlọ a ka na-arụ arụ dakwasịrị ha n’Abuja, isiobodo Naịjirịa.

    Ọdachi a mere n’ụbọchị Wenezde n’ebe a kpọrọ Ademola Adetokunbo Crescent dịna Wuse 2 n’ime etiti obodo.

    Akụkọ kwuru na a zọpụtara mmadụ anọ na ndụ, ebe mmadụ abụọ merụrụ nnukwu ahụ ebe ndị ọrụ mgbapụta ka nọ n’ọrụ.

    Ndị ọrụ nzọpụta a gụnyere ndị mgbanyụọkụ, ndị ọrụ gbata gbata nakwa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche.

    Onyeisi ụlọọrụ gbata gbata bụ Abbas Idris gwara ndị ntaakụkọ na “mmadụ abụọ merụrụ ezigbo ahụ, onye ọrụ ahụike kwupụtara ọnwụ mmadụ abụọ.”

  8. Onweghi onye m nyere N2bn ka ọ kpọpụta m dịka gọvanọ Adamawa Steeti – Binani

    Aishatu Binani ji aha APC zọọ ọkwa gọvanọ Adamawa Steeti

    Ebe foto si, Aishatu Binani/Facebook

    Onye ji aha All Progressive Congress (APC) zọọ ọkwa gọvanọ Adamawa Steeti bụ Aishatu ‘Binatu’ Dahiru ekwuola na ọ gaghi emebi usoro iwu na-achekwa ọchịchị onye kwuo uche ya.

    N’okwu ya, ọ sị na ebubo a na-ebo ya na ọ kwụrụ onye ọrụ Inec a kpọrọ Hudu Yunusa Ari ego dị ijeri naịra abụọ (N2bn) ka ọ kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ bụ asị.

    “Emeghi m nke ahụ, enweghi m ike ime ya”, ka Binani kwuru.

    “Abụ m onye ọchịchị onye kwuo uche ya na-amasị, agaghị m eme ihe ga-eme usoro ọchịchị a. Abụghị m onye ọchịchị tigbuo-zọgbuo.

    N’oge ndị gara aga, emeriela m ndọrọndọrọ ọkwa ụlọomeiwu nta nakwa nke sịnetị n’ụzọ iwu kwadoro bụ nke ziri ezi.”

    Cheta na onye ọrụ Inec bụ Ari nọọrọ n’ụbọchị ụka kpọpụta aha Binani dịka onye meriri na ntuliaka ebe onye nọ n’isi mkpọpụta mkpụtara ndị a bụ Mohammed Mele amaghị maka ya.

    Inec gara n’ihu kagbuo mkpọpụta ahụ, ma kwụsị Arrị ọrụ.

    Ha mechara malite ịkpọpụtara ndị a nke nyere Gọvanọ Ahmadu Fintiri nke PDP mmeri.

  9. Otu onye anwụola dịka ọtụtụ merụrụ ahụ n'ihe mberede okporoụzọ mere na Legọs steeti

    Mberede okporoụzọ

    Ebe foto si, followlastma/Twitter

    Otu onye anwụọla dịka otu nnukwu ụgbọala bọọsụ (BRT) nakwa ụgbọala bọọsụ obere abụọ ndị ọzọ sọkọtara isi ọnụ n’akụkụ Ifako gawa Ogudu na Legọs steeti n’ụtụtụ Wenezde a.

    Ozi gọọmentị Legọs steeti zipụtara na Twitter gbara ama nke a.

    O debeghi anya etu ihe mberede a siri mee.

    Ihe onyonyo ndị fesara na soshal midia gosiri ebe ihe dịka otu nwoke tọgbọ n’ala n’akụkụ ebe ihe mberede a mere.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka kpachị kpachị okporo ụzọ Legọs bụ Lagos State Traffic Management Authority (Lastma) agbaala ama ihe mere n’akara Twitter.

    Otu onye nọ ebe ahụ ihe a e mee gbara ma na ọ bụ otu onye n’ime ndị ọkwọ ụgbọala ahụ bụ ihe nwụrụ n’ihe ọdachị a dịka o kwuru na ụfọdụ ndị ọzọ nọ n’ime ụgbọala ahụ merụrụ ahụ.

    Ka akụkọ pụtara na ụfọdụ ndị agboro nọ ebe ahụ sunyere ụlọala a sị mkpara ihe mberede ọkụ, ụlọọrụ gbata gbata nke mmenyụ ọkụ Legọs steeti zipụtara ozi kwuo na ha wụchiri ebe ahụ n’oge menyụọ ya bụ ọkụ.

    Ozi onyeisi ụlọọrụ a bụ Adeseye Margaretzipụtara ekwughi ihe ọbụla banyere etu ọkụ a siri malite mana ọtụtụ ihe onyonyo gbara na soshal midia gosiri ka oke ọkụ nọ n’agba ebe ahụ.

    Ozi Adesaye kwuru:

    “Ndị ọrụ anyị n’akụkụ Alausa wụgara ebe ahụ ihe a mere dịka anyị natara ozi a n’ebe elekere itoolu na ọkara nke ụtụtụ”

  10. Ọnụọgụgụ mmadụ n'India ga-agafe nke China n'etiti afọ a

    India

    Ebe foto si, Getty Images

    India ga-agafe China dịka mba kacha nwee ọnụọgụgụ mmadụ n'ụwa n'ebe etiti afọ 2023 dịka ngụkọ nke otu mbaụwa bụ United Nations si gosi.

    A na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị mmadụ n'India ga-eru ijeri 1.4286, nke pụtara na ọ ga-eji ihe karịrị nde mmadụ gafee ọnụọgụgụ mmadụ na China nke ga-adị ijeri 1.4257 n'oge ahụ.

    Kamgbe afọ 70, mba abụọ a bụ China na India nwere ọnụọgụgụ mmadụ ruru otu ụzọ n'ime ụzọ atọ ọnụọgụgụ mmadụ niile dị n'ụwa.

    Ọnụọgụgụ ụmụaka ndị a na-amụ ọhụrụ na mba China gbaturu n'afọ gara aga, nke mbụ ụdị ihe a na-eme kamgbe afọ 1961.

    Ọnụọgụgụ nke a na mba India bụ si n'aka ngalaba 'United Nations Population Fund (UNFPA), maka na enwebeghị ngụkọ ọnụ ọha na mba India kamgbe afọ 2011.

    Ọzọkwa, otu UN etinyeghị ọnụọgụgụ ndị nọ na mpaghara Hong Kong na Makau maọbụ nke ndị Taiwan, bụcha ebe Chgaina na-ekwu so na mba ha. Taiwan na-ahụta onwe ya dịka mba nọpụrụ iche nke nwere iwu nke ha nakwa ndị ọchịchị nke ha.

    N'ọnwa Nọvemba afọ 2022, ọnụọgụgụ ndị mmadụ n'ụwa gafere ijeri asatọ (8 billion), mana ndị ọkachamara na-ekwu na etu ọnụọgụgụ mmadụ n'ụwa si agbali elu adịchaghị ọsịsọ etu ọ dịbu n'ebe mpaghara 1950 ga.

  11. NNPCL ekwuola na ọ ga-agbagha mpụtara ikpe inyeghachi Ifeanyi Ararume ọkwa ọchịchị

    Ifeanyi Ararume

    Ebe foto si, Ifeanyi Ararume/Facebook

    Gọọmentị etiti Naịjirịa ekwuola na ọ nụla mkpebia ụlọikpe ukwu nke Abuja mere banyere itinyeghachi Sịnetọ Ifeanyi Ararume n’ọkwa dịka oneyisioche ụlọọrụ Nigeria National Petroleum Company Limited (NNPCL).

    N’ozi ọnụ na-ekwuru gọọmentị etiti bụ Femi Adesina wepụtara n’ụbọchị Wenezde a, o kwuru:

    “Dịka ọkaikpe gọọmentị etiti/Minista ikpe ka na-eche inata akwụkwọ ikpe a, onyeisiala na-ekwu na ọga-esoro usoro ikpe dịịrị okwu dịka NNPCL na-agbaghi mkpebi a n’ụlọikpe mkpeghari”.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe ukwu nke Abuja mere mkpebi n'abalị 18 nke ọnwa Eprel na mwepụ Ararume n'ọnwa ezighi ezi, ma nye iwu ka e tinyeghachie ya n'ọkwa hụ ma kwụọ ya nde Naịra ise dịka ego iti aka n'obi.

    Ozi Adesina gara n’ihu rịọ ọha ka ha nọrọ jụụ dịka o kwuru na ọchịchị Buhari bụ ọchịchị na-akwanyere usoro iwu ugwu.

    Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari kpọpụtaburu aha Ararume dịka onyeisi oche ụlọọrụ ahụ na Sepụtemba 2021 mana e mechara kpọpụtazie aha Margeret Okadigbo dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ ma nye ya ikike ọrụ nke mere okwu a jiri pụọ ụlọikpe.

  12. A nwụchiela nwoke POS a sị ripịara ego akwụnyere n’ọbaegho na ndehie

    Handcuffed

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke n’Illorin, Kwara steeti maka ebubo na ọ riri ego ụlọụka kwụnyere n’ọbaego ya na-amaghị ama aghara aghara.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Ajayi Okasanmi kwuru:

    “Ọ bụ ndị uweojii nke ngalaba nnyocha ‘Force Criminal Investigation and Intelligence Department’ si akụkụ Alagbon-Close, Ikoyi, Legọs bụ ndị nwụchiri ya... Ya mere aka anyị anọghị na ya”

    Akụkọ kwuru na nwoke a bụ onye na-eji ngwa POS enyi ndị mmadụ ego nakwa na-enyere ha aka ezipụ ego ha natara ego ruru nde naịra 280 n’ọbaego ya ma malite iri ya, ikesa ya nakwa iji ya na-egboro onwe ya na ndị ezinaụlọ ya mkpa etu o siri chọọ.

    E kwuru na ọ zụtara ụlọ, zụọ ụgbọala ma ziga ụfọdụ ndị njem ala nsọ Mecca.

    Ndị ụlọakụ chọpụtara ndehie aka mere ma ziga ndị ọrụ nchekwa be nwaamadị ahụ bụ ebe a nwụchiri ya.

  13. Ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị asatọ a tọrọ na Kaduna agbapụla ma bụrụ ndị nweereonwe ha

    Ụmụaka ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị Kaduna steeti ekwuola na ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị asatọ nke ụlọakwụkwọ GSS dị n’okpuruọchịchị Awon Kachia na steeti ahụ bụ ndị a tọọrọ n’ụbọchị atọ n’ọnwa Eprel agbapụla n’aka ndị tọrọ ha.

    Gọọmentị steeti ahụ kwuru na ụmụakwụkwọ a gbapụrụ site n’ime oke ọhịa dị n’okporoụzọ Kaduna gawa Niger dịka ha ji ụkwụ gaa iji abalị ole m ole tupu ha agbapụta ebe a hụrụ ha.

    Gọvanọ Nasir El-Rufai zipụtara ozi n’abalị Tuzde ma too ụmụagbọghọ ndị ahụ maka igosi agwa obi ike ma na-atụghị egwu.

    Kọmịshọna nchekwa steeti ahụ bụ Samuel Aruwan kwuru na e bugala ụmụakwụkwọ a gbapụrụ ụlọọgwụ nọ n’ime ogige ndị agha bụ ebe a na-eleta ahụike ha anya ugbua.

    Kaduna steeti so n’otu n'ime steeti na Naịjịrịa ebe akụkọ mwakpo na ntọọrọ n'ikesi pụta n’ime afọ olemole gara aga. Egbuola ihe karịrị mmadụ 100 bụ ndị si ụfodụ obod ebe ahụ n'ime izu olemole gara aga dịka ndị omekome (Bandits) wakporo ụfọdụ obodo na mpaghara steeti ahụ ma kpaa mkpa mkpa dị egwu.

    Kaduna
  14. Nnọ nụ ndị be anyị

    Unu asaala chi?

    Leekwa akụko ndị dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Eprel, 2023.

  15. Unu abọọla chi

    Okoko osisi

    Ebe foto si, Iwaria

    Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị si ụwa niile gburugburu

  16. Ihe ị kwesiri ịma maka ọgwụ mgbochi Malaria NAFDAC nabatara

    Ọgwụ mgbochi ọrịa Malaria

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ NAFDAC enyela ikike obere oge ka ndị Naịjirịa malite ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa Malaria emepụtara ọhụrụ.

    Nke a ga-eme ka Naịjirịa bụrụ mba abụo nabatara iji ya bụ ọgwụ n'isonye nzọmụkwụ mba Gana.

    Onyeisi ngalaba ahụ bụ Christiana Adeleye kwukwara na kọmịtị na-enyocha ya bụ matara na ọ na-ekpuchi mmadụ ebe Malaria nọ rue pasentị 75%

    O kwukwara na uru ọgwụ ahụ nke arụpụtara na Serum Institute nke India bara karịrị ọghọm dị na ya.

    A na-atụ anya na Naịjirịa ga-ebu ụzọ nweta ọgwụ ruru otu puku narị site n'onyinye tupu amalite ịhazi ụzọ a ga-eso na-ere ya ere.

  17. Ihe ruru ndị nkịtị 100 anwụọla n'ọgụ dapụtara na mba Sudan

    Maapụ Khartoum

    Ihe ruru ndị nkịtị otu narị anwụọla dịka ọgụ dapụtara n'etiti ndị agha gọọmentị mba Sudan na ndị agha Rapid Support Force (RSF) n'ụbọchị satọde.

    Ese m okwu a hiwere isi na onye ga-achị ndị agha mba ahụ dịka ha na-akwado ibido okwu inyefe ọchịchị n'aka ndị nkịtị.

    Ụda ogbunigwe, egbe na ogbunigwe nke ụụgbọelu tụrụ na-ada n'ụfọdụ ebe na mba ahụ ugbua.

    Mpaghara ọgụ na-ada n'ụtụtụ taa bụ;

    • Mpaghara Republican Palace nke dị n'isi obodo Khartoum
    • Ogige ọchịchị ndị agha mba Sudan nọkwa na Khartoum
    • Na mpaghara ụlọọgwụ Al-shaab nọkwa n'isi obodo ahụ
    • Anwụrụ ọkụ sitere n'ọdọ ụgbọelu
    • Ndị agha RSF na-ekwu na ha ewerela ọdọ ụgbọleu nke Merowe dị na mpaghara ugwu Khartoum kama amatabeghị maọbụ eziokwu.
  18. Unu abọọla chi

    Ugo na-achọ ịbere n'osisi

    Ebe foto si, Iwaria

    Ị ga-enweta akụkọ ga-amasị gị taa niile ebe a...Soro anyị

  19. APGA emeriela oche Ezza North/Ishielu n'Ebonyi streeti

    Nwobashi Joseph

    Ebe foto si, Chibuike Nwanchor

    Ngụkọ ntuliaka mgbakwunye nke emere maka ụlọomeiwu nta n'Ebonyi steeti egosila na Nwobashi Joseph emeriela ọkwa nke Ezza North/Ishielu n'ebe ahụ.

    Lee ihe ọnụọgụgụ gosiri:

    AA--- 142

    ADC---117

    ADP---206

    APC---10,085

    APGA--11,896

    LP----8076

    NNPP--271

    NRM---53

    PDP---11,150 1

    SDP--15

  20. Etu e siri chọrọ iji ogbunigwe anwụrụ wakpoo onyeisiala mba Japan

    Onye chọrọ iwakpo onyeisiala mba Japan

    Ebe foto si, Reuters

    Otu onye tụrụ ogbunigwe anwụrụ iji wakpoo onyeisiala mba Japan bụ Fumio Kishida.

    Ọ bụ dịka Kishida chọrọ inye mgbasaozi n'ụbọchị satọde ka otu onye tụrụ ya bụ ogbunigwe anwụrụ.

    Enweghị onye merụrụ ahụ ma e jidekwara onye tụrụ ya bụ ogbunigwe.

    Agbanyeghị na Japan so na otu mba kacha nwee nchekwa n'ụwa niile, nke a na-eme ya ụgboro abụọ awakporo ndị ọchịchị mba Japan dịka a gbagburu Shinzo Abe onye bụbu onyeisiala mba Japan afọ gara aga.