Rọketi ọhụrụ
a kpọrọ SapceX bụ nke Elon Musk chọrọ iji eme njem agafe ihu eluigwe gbawara ma
nwuru ọkụ dịka a na-anwale ya.
Onweghi
onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n’ụgbọelu ahụ mmadụ na-anọghị bụ nke fepuru na mpaghara
Texas n’ụtụtụ Tọzde.
N’ime
nke abụọ maọbụ atọ rọketi ahụ fepuru, ọ malitere na-ama jijiji n’elu nke mere o
jiri gbawa ma nwuru ọkụ n’elu.
Musk kwuru
na ha ga-anwale ọzọ n’ọnwa ole na ole na-abịa.
Ndị
injinịa rụrụ ụgbọelu SpaceX sị na nwale ha ahụ mere nke ọma. Ha na-achọ “ịnwale
ọsịsọ nakwa ugboro ugboro” na egwu adịghị ha imebi ihe. Ha kwuru na ha
ga-enwete akụrụngwa ha ga-eji arụ ọzọ.
Musk
dere n’akara twitter ya na-ekele ndị ọrụ ya na ha mere nke ọma, na ha amụtala ihe
maka nke ọzọ ha ga-arụ.
Anambra ka nwee ọnụọgụgụ ụmụaka nwere ọrịa Tuberculosis na Naịjirịa
Ebe foto si, Thinkstock
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa Tuberculosis, Leprosy na Buruli Ulcer n'Anambra steeti bụ Dkt Ugochukwu Chukwuelobe, ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụaka nwere ọrịa tuberculosis n'Anambra steeti karịrị nke steeti niile na Naịjiria.
Chukwuelobe kwuru nke a n'ọgbakọ nke ngalaba gọọmentị etiti n'ahụ maka ahụike na ụlọọrụ KNCV Tuberculosis Foundation and Breakthrough Action Nigeria haziri n'Awka n'ụbọchị Tọzde.
"Dịka ngụkọ gbasara ọrịa tuberculosis na Naịjirịa si gosi, Naịjirịa bụ mba nke isii n'ụwa niile nakwa mba nke mbụ n'Afrịka kacha nwee ọrịa tuberculosis," Chukwuelobe kwuru n'ọgbakọ ahụ.
"Anambra bụ steeti kacha nwee ndị nwere ụdị tuberculosis ụdị nke ọgwụ anaghị emetụta nakwa ụmụaka nwere ọịa tuberculosis na Naịjirịa. Nke a abụghị ihe dị mma.
"Iji wetuo ọnụọgụgụ ọrịa TB, gọọmentị Anambra steeti nakwa ụlọọrụ mgbochi ọrịa tuberculosis na ụlọọrụ ndị ọzọ ejikọọla aka ma hibe ụlọọrụ nnyochapụta ọrịa bụ ọkaibe na steeti a.
"Anyị nwere ụlọọgwụ pụrụ iche nke ọnụọgụ ya karịrị 800 maka nnyochapụta na ọgwụgwọ TB, mana ihe bụ nsogbu bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị maka ọrịa TB.
Chukwuelobe gwara ndị ntaakụkọ ka ha gbasie mbọ ike n'ịgbasa ozi maka ọrịa TB nakwa etu ndị mmadụ ga-esi chekwaa onwe ha maọbụ nweta ọgwụgwọ.
"Ụkwara akụsị akwụsị ruo izuụka abụọ maọbụ karịa, ahụ ọkụ, mmadụ ịta ahụ n'ike n'ike, oke okpoofufu n'etiti abalị socha na njirimara ọrịa TB," ka o kwuru.
"Onye ọbụla hụrụ ụdị ihe a kwesịrị ịga ụlọọgwụ dị ya nso maka ọgwụgwọ.
"Ndị nwere ọrịa a kwesịrị ị na-aṅụ ọgwụ ha ma na-emekwa ihe niile a gwara ha n'ụlọọgwụ."
"Onye ọbụla nwere oke na ọrụ dịịrị ya na mgbochi ọrịa TB," ka o kwuru.
Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky akpọọla Tinubu oku ịbịa mba ya
Ebe foto si, Getty Images/Bola Tinubu/Facebook
Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ezigarala Bola Ahmed Tinubu
ekele dịka onye a họpụtara ịchị Naijirịa.
Onye ndụmọdụ Tinubu n’ihe gbasara mgbasaozi bụ Tunde Rahman kwuru nke a
n’ozi o zipụtara n’ụbọchị Tọọzde abalị 20 nke ọnwa Eprel, 2023.
Zelensky kpọrọ Tinubu oku ka ọ bịa njem nleta na mba ya mgbe ọ ga-adịrị
ya mfe ma e duchaa ya iyi ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa.
O kwuru na Ukraine na-agba mbọ ịhụ na mmekọ ya na Naịjirịa siwanyere
ike.
Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na a ga-edu Bola Ahmed Tinubu nke otu All Progressives
Congress (APC) iyi ọrụ dịka n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023.
Ndị omekome gburu ihe ruru mmadụ 214, tọọrọ ihe ruru mmadụ 746 n'ọnwa atọ - Gọọmentị Kaduna
Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Facebook
Gọọmentị Kaduna steeti ekwuola na ihe ruru mmadụ 214 abụrụla
ndị egburu na mwakpo olemole mere na steeti ahụ sị n’aka ndị agha nnụpụisi, agha
dị n’etiti obodo na obodo nakwa agha ịbọ ọbọ obodo ndị awakporo malite n ọnwa
Jenụwarị ruo ọnwa Maachị 2023.
Ozi a pụtara ihe n’akwụkwọ gbasara nchekwa n’ọnwa anọ na
steeti ahụ nke Kọmịshọna nchekwa steeti bụ Samuel Aruwan wepụtara ma nye otu
nchekwa steeti ahụ.
Aruwan kọwara na ọ bụ ụmụnwoke mmadụ 196, ụmụnwaanyị mmadụ
14 nakwa ụmụaka mmadụ anọ ka e gburu ebe a tọọrọ ihe ruru mmadụ 746 n’ime ọnwa
ndị a.
Ozi ya kwukwara na ọ bụ na mpaghara Kaduna Central Senatorial District bụ ebe a kacha gbuo ndị mmadụ dịka mwakpo ndị mere ebe ahụ tara isi mmadụ 115.
Gọvanọ
Nasir El-Rufai mgbe ọ natara ozi kpọkuru gọọmentị etiti ka etinye aka kwalite ọrụ
nchekwa na steeti ahụ dịka o kwuru na gọọmentị steeti agaghị enweike naanị ha
mee nke a.
O kwuru:
"Anyị
na-arịọ ka akwalite ọrụ nchekwa n'ime ụbọchị 39 na-abịa dịka ọ abalị olemole ka
oge ọchịchị a bịa na njedebe ma hụkwa na n’oge nyefe ọchịchị a enyeghị ndị
omekome ohere ịkpa ike."
Mmadụ 78 abụrụla ndị azọgburu n’emume nkesa ihe enyemaka Ramadan na Yemen
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Akpụụkwa nakwa ihe ndị atụtụtara n'ebe ihe ọdachị a mere
Azọgbuola
ihe ruru mmadụ 78 n'otu ụlọakwụkwọ dị n’isiobodo
Yemen bụ Sanaa ebe a na-eme emume ekesa ihe eyemaka maka Ramadan.
Ụlọntaakụkọ
Reuters kwuru na nari kwuru nari ndị mmadụ gbakọtara n’ime ụlọakwụkwọ ahụ
iji nata ihe onyinye a na-eke nkeọnụego ya ruru ihe dịka dọla itoolu dọla itoolu otu onye.
Minista ihe
na-eme n’obodo mba ahụ ekwuola na a nwụchiela ndị hazịrị emume nkesa a dịka a
na-eme nnyocha ihe ọdachị mere ebe ahụ.
Cheta na ndịagha
nnupụisi Houthi wụbara isi ọchịchị mba ahụ kemgbe ha chụpụrụ gọọmentị ha n'afọ
2015
E mere emume
a tara isi ndị mmadụ n'ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa abụ ọnwa ndị okpukperechi Alakụba dị nsọ nke a
na-akpọ Ramadan, bụ oge ibu ọnụ.
Mohamed Ali
al-Houthi, onyeisi kọmitii ndị Houthi, rụrụ aka na ọ bụ oke ihe isi nọ na mba
ahụ ugbua kpara ihe ọdachị a mere.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ndị na-eme nnyocha n'okwu ihe ọdachị a mere n'emume a.
Ndị be anyị - Unu asaala chi?
Nnọọ nụ n'ọba ozi anyị.
Leekwa akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Eprel, 2023.
Ụlọ a ka na-arụ arụ adagbuola mmadụ abụọ n’Abuja
Mmadụ abụọ
anwụọla dịka ụlọ a ka na-arụ arụ dakwasịrị ha n’Abuja, isiobodo Naịjirịa.
Ọdachi a
mere n’ụbọchị Wenezde n’ebe a kpọrọ Ademola Adetokunbo Crescent dịna Wuse 2 n’ime
etiti obodo.
Akụkọ kwuru
na a zọpụtara mmadụ anọ na ndụ, ebe mmadụ abụọ merụrụ nnukwu ahụ ebe ndị ọrụ
mgbapụta ka nọ n’ọrụ.
Ndị ọrụ nzọpụta
a gụnyere ndị mgbanyụọkụ, ndị ọrụ gbata gbata nakwa ndị ọrụ nchekwa dị iche
iche.
Onyeisi ụlọọrụ
gbata gbata bụ Abbas Idris gwara ndị ntaakụkọ na “mmadụ abụọ merụrụ ezigbo ahụ,
onye ọrụ ahụike kwupụtara ọnwụ mmadụ abụọ.”
Onweghi onye m nyere N2bn ka ọ kpọpụta m dịka gọvanọ Adamawa Steeti – Binani
Ebe foto si, Aishatu Binani/Facebook
Onye ji aha
All Progressive Congress (APC) zọọ ọkwa gọvanọ Adamawa Steeti bụ Aishatu ‘Binatu’
Dahiru ekwuola na ọ gaghi emebi usoro iwu na-achekwa ọchịchị onye kwuo uche ya.
N’okwu ya, ọ
sị na ebubo a na-ebo ya na ọ kwụrụ onye ọrụ Inec a kpọrọ Hudu Yunusa Ari ego dị
ijeri naịra abụọ (N2bn) ka ọ kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ bụ asị.
“Emeghi m
nke ahụ, enweghi m ike ime ya”, ka Binani kwuru.
“Abụ m onye
ọchịchị onye kwuo uche ya na-amasị, agaghị m eme ihe ga-eme usoro ọchịchị a. Abụghị
m onye ọchịchị tigbuo-zọgbuo.
N’oge ndị
gara aga, emeriela m ndọrọndọrọ ọkwa ụlọomeiwu nta nakwa nke sịnetị n’ụzọ iwu
kwadoro bụ nke ziri ezi.”
Cheta na
onye ọrụ Inec bụ Ari nọọrọ n’ụbọchị ụka kpọpụta aha Binani dịka onye meriri na
ntuliaka ebe onye nọ n’isi mkpọpụta mkpụtara ndị a bụ Mohammed Mele amaghị maka
ya.
Inec gara n’ihu
kagbuo mkpọpụta ahụ, ma kwụsị Arrị ọrụ.
Ha mechara
malite ịkpọpụtara ndị a nke nyere Gọvanọ Ahmadu Fintiri nke PDP mmeri.
Otu onye anwụola dịka ọtụtụ merụrụ ahụ n'ihe mberede okporoụzọ mere na Legọs steeti
Ebe foto si, followlastma/Twitter
Otu onye anwụọla dịka otu nnukwu ụgbọala bọọsụ (BRT) nakwa ụgbọala
bọọsụ obere abụọ ndị ọzọ sọkọtara isi ọnụ n’akụkụ Ifako gawa Ogudu na Legọs
steeti n’ụtụtụ Wenezde a.
Ozi gọọmentị
Legọs steeti zipụtara na Twitter gbara ama nke a.
O debeghi anya etu ihe mberede a siri mee.
Ihe onyonyo ndị fesara na soshal midia gosiri ebe ihe dịka
otu nwoke tọgbọ n’ala n’akụkụ ebe ihe mberede a mere.
Ụlọọrụ na-ahụ maka
kpachị kpachị okporo ụzọ Legọs bụ Lagos State Traffic Management Authority (Lastma) agbaala ama ihe
mere n’akara Twitter.
Otu onye nọ ebe ahụ ihe a e mee gbara ma na ọ bụ otu onye n’ime
ndị ọkwọ ụgbọala ahụ bụ ihe nwụrụ n’ihe ọdachị a dịka o kwuru na ụfọdụ ndị ọzọ
nọ n’ime ụgbọala ahụ merụrụ ahụ.
Ka akụkọ pụtara na ụfọdụ ndị agboro nọ ebe ahụ sunyere ụlọala
a sị mkpara ihe mberede ọkụ, ụlọọrụ gbata gbata nke mmenyụ ọkụ Legọs steeti zipụtara
ozi kwuo na ha wụchiri ebe ahụ n’oge menyụọ ya bụ ọkụ.
Ozi onyeisi ụlọọrụ a bụ Adeseye Margaretzipụtara ekwughi ihe ọbụla
banyere etu ọkụ a siri malite mana ọtụtụ ihe onyonyo gbara na soshal midia
gosiri ka oke ọkụ nọ n’agba ebe ahụ.
Ozi Adesaye kwuru:
“Ndị ọrụ anyị n’akụkụ Alausa wụgara ebe ahụ ihe a mere dịka
anyị natara ozi a n’ebe elekere itoolu na ọkara nke ụtụtụ”
Ọnụọgụgụ mmadụ n'India ga-agafe nke China n'etiti afọ a
Ebe foto si, Getty Images
India ga-agafe China dịka mba kacha nwee ọnụọgụgụ mmadụ n'ụwa n'ebe etiti afọ 2023 dịka ngụkọ nke otu mbaụwa bụ United Nations si gosi.
A na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị mmadụ n'India ga-eru ijeri 1.4286, nke pụtara na ọ ga-eji ihe karịrị nde mmadụ gafee ọnụọgụgụ mmadụ na China nke ga-adị ijeri 1.4257 n'oge ahụ.
Kamgbe afọ 70, mba abụọ a bụ China na India nwere ọnụọgụgụ mmadụ ruru otu ụzọ n'ime ụzọ atọ ọnụọgụgụ mmadụ niile dị n'ụwa.
Ọnụọgụgụ ụmụaka ndị a na-amụ ọhụrụ na mba China gbaturu n'afọ gara aga, nke mbụ ụdị ihe a na-eme kamgbe afọ 1961.
Ọnụọgụgụ nke a na mba India bụ si n'aka ngalaba 'United Nations Population Fund (UNFPA), maka na enwebeghị ngụkọ ọnụ ọha na mba India kamgbe afọ 2011.
Ọzọkwa, otu UN etinyeghị ọnụọgụgụ ndị nọ na mpaghara Hong Kong na Makau maọbụ nke ndị Taiwan, bụcha ebe Chgaina na-ekwu so na mba ha. Taiwan na-ahụta onwe ya dịka mba nọpụrụ iche nke nwere iwu nke ha nakwa ndị ọchịchị nke ha.
N'ọnwa Nọvemba afọ 2022, ọnụọgụgụ ndị mmadụ n'ụwa gafere ijeri asatọ (8 billion), mana ndị ọkachamara na-ekwu na etu ọnụọgụgụ mmadụ n'ụwa si agbali elu adịchaghị ọsịsọ etu ọ dịbu n'ebe mpaghara 1950 ga.
NNPCL ekwuola na ọ ga-agbagha mpụtara ikpe inyeghachi Ifeanyi Ararume ọkwa ọchịchị
Ebe foto si, Ifeanyi Ararume/Facebook
Gọọmentị
etiti Naịjirịa ekwuola na ọ nụla mkpebia ụlọikpe ukwu nke Abuja mere banyere itinyeghachi
Sịnetọ Ifeanyi Ararume n’ọkwa dịka oneyisioche ụlọọrụ Nigeria National
Petroleum Company Limited (NNPCL).
N’ozi ọnụ
na-ekwuru gọọmentị etiti bụ Femi Adesina wepụtara n’ụbọchị Wenezde a, o kwuru:
“Dịka ọkaikpe
gọọmentị etiti/Minista ikpe ka na-eche inata akwụkwọ ikpe a, onyeisiala na-ekwu
na ọga-esoro usoro ikpe dịịrị okwu dịka
NNPCL na-agbaghi mkpebi a n’ụlọikpe mkpeghari”.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe ukwu nke Abuja mere mkpebi n'abalị 18 nke ọnwa Eprel na mwepụ Ararume n'ọnwa ezighi ezi, ma nye iwu ka e tinyeghachie ya n'ọkwa hụ ma kwụọ ya nde Naịra ise dịka ego iti aka n'obi.
Ozi Adesina gara
n’ihu rịọ ọha ka ha nọrọ jụụ dịka o kwuru na ọchịchị Buhari bụ ọchịchị
na-akwanyere usoro iwu ugwu.
Cheta na onyeisiala
Muhammadu Buhari kpọpụtaburu aha Ararume dịka onyeisi oche ụlọọrụ ahụ na Sepụtemba
2021 mana e mechara kpọpụtazie aha Margeret Okadigbo dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ
ma nye ya ikike ọrụ nke mere okwu a jiri pụọ ụlọikpe.
A nwụchiela nwoke POS a sị ripịara ego akwụnyere n’ọbaegho na ndehie
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii
anwụchiela otu nwoke n’Illorin, Kwara steeti maka ebubo na ọ riri ego ụlọụka kwụnyere
n’ọbaego ya na-amaghị ama aghara aghara.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii bụ Ajayi Okasanmi kwuru:
“Ọ bụ ndị uweojii nke ngalaba nnyocha ‘Force Criminal Investigation and
Intelligence Department’ si akụkụ Alagbon-Close, Ikoyi, Legọs bụ ndị nwụchiri ya...
Ya mere aka anyị anọghị na ya”
Akụkọ kwuru
na nwoke a bụ onye na-eji ngwa POS enyi ndị mmadụ ego nakwa na-enyere ha aka ezipụ
ego ha natara ego ruru nde naịra 280 n’ọbaego ya ma malite iri ya, ikesa ya
nakwa iji ya na-egboro onwe ya na ndị ezinaụlọ ya mkpa etu o siri chọọ.
E kwuru na ọ
zụtara ụlọ, zụọ ụgbọala ma ziga ụfọdụ ndị njem ala nsọ Mecca.
Ndị ụlọakụ
chọpụtara ndehie aka mere ma ziga ndị ọrụ nchekwa be nwaamadị ahụ bụ ebe a nwụchiri
ya.
Ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị asatọ a tọrọ na Kaduna agbapụla ma bụrụ ndị nweereonwe ha
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Kaduna
steeti ekwuola na ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị asatọ nke ụlọakwụkwọ GSS dị n’okpuruọchịchị
Awon Kachia na steeti ahụ bụ ndị a tọọrọ n’ụbọchị atọ n’ọnwa Eprel agbapụla n’aka
ndị tọrọ ha.
Gọọmentị
steeti ahụ kwuru na ụmụakwụkwọ a gbapụrụ site n’ime oke ọhịa dị n’okporoụzọ Kaduna
gawa Niger dịka ha ji ụkwụ gaa iji abalị ole m ole tupu ha agbapụta ebe a hụrụ
ha.
Gọvanọ Nasir
El-Rufai zipụtara ozi n’abalị Tuzde ma too ụmụagbọghọ ndị ahụ maka igosi agwa obi
ike ma na-atụghị egwu.
Kọmịshọna nchekwa
steeti ahụ bụ Samuel Aruwan kwuru na e bugala ụmụakwụkwọ a gbapụrụ ụlọọgwụ nọ n’ime
ogige ndị agha bụ ebe a na-eleta ahụike ha anya ugbua.
Kaduna steeti
so n’otu n'ime steeti na Naịjịrịa ebe akụkọ mwakpo na ntọọrọ n'ikesi pụta n’ime
afọ olemole gara aga. Egbuola ihe karịrị mmadụ 100 bụ ndị si ụfodụ obod ebe ahụ
n'ime izu olemole gara aga dịka ndị omekome (Bandits) wakporo ụfọdụ obodo na
mpaghara steeti ahụ ma kpaa mkpa mkpa dị egwu.
Nnọ nụ ndị be anyị
Unu asaala chi?
Leekwa akụko ndị dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Eprel, 2023.
Unu abọọla chi
Ebe foto si, Iwaria
Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị si ụwa niile gburugburu
Ihe ị kwesiri ịma maka ọgwụ mgbochi Malaria NAFDAC nabatara
Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ NAFDAC enyela ikike obere oge ka ndị Naịjirịa malite ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa Malaria emepụtara ọhụrụ.
Nke a ga-eme ka Naịjirịa bụrụ mba abụo nabatara iji ya bụ ọgwụ n'isonye nzọmụkwụ mba Gana.
Onyeisi ngalaba ahụ bụ Christiana Adeleye kwukwara na kọmịtị na-enyocha ya bụ matara na ọ na-ekpuchi mmadụ ebe Malaria nọ rue pasentị 75%
O kwukwara na uru ọgwụ ahụ nke arụpụtara na Serum Institute nke India bara karịrị ọghọm dị na ya.
A na-atụ anya na Naịjirịa ga-ebu ụzọ nweta ọgwụ ruru otu puku narị site n'onyinye tupu amalite ịhazi ụzọ a ga-eso na-ere ya ere.
Ihe ruru ndị nkịtị 100 anwụọla n'ọgụ dapụtara na mba Sudan
Ihe ruru ndị nkịtị otu narị anwụọla dịka ọgụ dapụtara n'etiti ndị agha gọọmentị mba Sudan na ndị agha Rapid Support Force (RSF) n'ụbọchị satọde.
Ese m okwu a hiwere isi na onye ga-achị ndị agha mba ahụ dịka ha na-akwado ibido okwu inyefe ọchịchị n'aka ndị nkịtị.
Ụda ogbunigwe, egbe na ogbunigwe nke ụụgbọelu tụrụ na-ada n'ụfọdụ ebe na mba ahụ ugbua.
Mpaghara ọgụ na-ada n'ụtụtụ taa bụ;
Mpaghara Republican Palace nke dị n'isi obodo Khartoum
Ogige ọchịchị ndị agha mba Sudan nọkwa na Khartoum
Na mpaghara ụlọọgwụ Al-shaab nọkwa n'isi obodo ahụ
Anwụrụ ọkụ sitere n'ọdọ ụgbọelu
Ndị agha RSF na-ekwu na ha ewerela ọdọ ụgbọleu nke Merowe dị na mpaghara ugwu Khartoum kama amatabeghị maọbụ eziokwu.
Unu abọọla chi
Ebe foto si, Iwaria
Ị ga-enweta akụkọ ga-amasị gị taa niile ebe a...Soro anyị
Ngụkọ ntuliaka mgbakwunye nke emere maka ụlọomeiwu nta n'Ebonyi steeti egosila na Nwobashi Joseph emeriela ọkwa nke Ezza North/Ishielu n'ebe ahụ.
Lee ihe ọnụọgụgụ gosiri:
AA--- 142
ADC---117
ADP---206
APC---10,085
APGA--11,896
LP----8076
NNPP--271
NRM---53
PDP---11,150
1
SDP--15
Etu e siri chọrọ iji ogbunigwe anwụrụ wakpoo onyeisiala mba Japan
Ebe foto si, Reuters
Otu onye tụrụ ogbunigwe anwụrụ iji wakpoo onyeisiala mba Japan bụ Fumio Kishida.
Ọ bụ dịka Kishida chọrọ inye mgbasaozi n'ụbọchị satọde ka otu onye tụrụ ya bụ ogbunigwe anwụrụ.
Enweghị onye merụrụ ahụ ma e jidekwara onye tụrụ ya bụ ogbunigwe.
Agbanyeghị na Japan so na otu mba kacha nwee nchekwa n'ụwa niile, nke a na-eme ya ụgboro abụọ awakporo ndị ọchịchị mba Japan dịka a gbagburu Shinzo Abe onye bụbu onyeisiala mba Japan afọ gara aga.