Ụmụ Naịjirịa si mba Sudan ga-abata Abuja echi bụ Fraịde - Nema

Ebe foto si, Nema Nigeria
Ngalaba gọọmentị Naịjirịa na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' (Nema) ekwuola na otu nke mbụ nke ụmụ Naịjirịa nọ na mba Sudan bụ ndị gọọmentị etiti gbatara ọsọ enyemaka iji zọpụta ha, ga-alọbata n'Abuja echi bụ Fraịde, ụbọchị 28 nke ọnwa Eprel 2023.
Ozi si'akara Twitter nke Nema kwuru na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ ndị a na-ele anya ha na Fraịde bụ mmadụ 1,600.
"Ụgbọala bus iri na atọ si obodo Khartoum nke Sudan wee buru ụmụakwụkwọ ahụ na-aga na mpaghara Aswan nke mba Egypt ugbua bụ ebe a ga-eji ụgbọelu bulata ha Naịjirịa," ozi ahụ kwuru.
"Nema na ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace, bụ ndị wepụtara ụgbọelu ha iji bulata ụmụ Naịjirịa ndị a, na-enwe mkparịtaụka ugbua."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nema kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnọdụ nchekwa na mba Sudan ugbua dị oke njọ mana ha na-agba mbọ niile ha nwereike iji nyere ụmụ Naịjirịa nọ na mba ahụ aka site na njikọta aka ọnụ nke ụlọ nnọchite anya Naịjirịa na Sudan
"Anyị na ụfọdụ ụlọọrụ ụgbọala na mba Egypt enweela nkwekọrịta iburu ụmụ Naịjirịa si Khartoum ruo Aswan. Anyị na-arịọ ụmụ Naịjirịa niile ka ha nọrọ jụụ maka na ndị ọrụ na-agba mbọ ịhụ na ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-alọta n'udo," ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.


















