You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị ejichiela ụfọdụ ndị na-ejichi naịra ọhụrụ - DSS

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha ahụbeghị ego naịra ọhụrụ a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndeewonụ ,Igbo bụ Igbo!

    Ụnụ eteela eee?!

    Ebe bere , ugo bere!

  2. Ndị dọkịta 'Nigerian Association of Resident Doctors’ eyiela egwu ịgba abụbụọrụ

    Ndị dọkịta ahụike a kpọrọ ‘Nigerian Association of Resident Doctors’ (NARD) iyiela egwu na ha ga-agba abụbụọrụ ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti elebaghị anya n’ihe ha na-achọ.

    Onyeisi otu a bụ Emeka Orji gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụghị ebumnobi ha ịkwụsị ọrụ maka etu ọ ga-esi metụta ahụike ndị mmadụ kama na ha nwereike ime ya ma ọ bụrụ na gọọmentị gbaa ha nkịtị ruo ụbọchị 28 Jenụwarị.

    Otu a na-arịọ ndị Naịjirịa gbapụtara ihe gụnyere ndịisi ụlọomeiwu, ndị gọvanọ ka ha tinye ọnụ n’okwu a ma gbochie ịgba abụbụọrụ a.

    Ha kwuru na ihe ndị ha na-achọ bụ ka ebulie ego a na-akwụ maka ọzụzụ, ịkwụchapụ ụgwọ ndị e ji ha, nakwa imezu ụgwọ opekatampe.

    Ndị ọzọ bụ ego ụgwọ ọnwa e ji ndị otu ha nọ n’Abia, Imo, Ondo, Ekiti nakwa Gombe steetị.

  3. Aka Mendy dị ọcha n’ọnụ ebubo isii idina nwaanyị n’ike e boro ya

    A chọpụtala na aka Benjamin Mendy na-agbara Manchester City bọọlụ dị ọcha n’ebubo isii e boro ya gbakwasịrị ụkwụ n’idina ụmụnwaanyị anọ n’ike.

    Ndị okpeikpe abịaghị na mkpebi n’otu ọnụ ebubo ma sị na a ga-ekpegharị ya.

    Enyi ya nwoke bụ Saha Matturie, dị afọ iri anọ na otu ka a kụchapụrụ ebubo atọ metụtakwara idina nwaanyị n’ike.

    Mendy dị afọ iri abụọ na asatọ na enyi ya Matturie ka e boro ebubo idina ụmụnwaanyị n’ike n’ụlọ ya dị na Prestbury, Cheshire nakwa Manchester.

    Mendy kpuchiri ihu ya dịka ọkaikpe ahụ kwuru na ikpe amaghị ya n’ebubo isii.

    A nwuchiri nwamadị a n’ọnwa Nọvemba 2020 ebe otu egwurgwu ya bụ Manchester City kwụsịrị ya ịgba bọọlụ n’ọnwa Ọgọstụ 2021 mgbe e boro ebubo idina nwaanyị n’ike.

  4. Ụlọọrụ EFCC nwuchiburu m arịọla gbaghara maka mmehie ha – Doyi Okukpe

    Doyi Okupe bụbu onyeisi nchịkọta achụmnta vootu Peter Obi na Labour Pati ekwuola etu ndị ọrụ nchekwa si nwuchie ya n’ụbọchị Tọzde 12 Jenụwarị, 2023.

    O kwuru “a nwuchiri m n’ụtụtụ 12 Jenụwarị mgbe m chọrọ ịga mba UK anara ọgwụgwọ; nke a na-abịa n’ime ọtụtụ afọ e jichiri akwụkwọ njem m.

    “esila m n’ụlọọrụ ndị EFCC pụta ugbua, ebe ndịisi ha na Lagọs nakwa Abuja rịọrọ m gbaghara maka mmehie ha.”

    Ọnụ na-ekwuru ngalaba nchekwa nzuzo bụ Department of State Service (DSS) bụ Peter Afunanya sị na ha nwuchiri Okupe n’ọdọụgbọelu dị na Legọs n’ụtụtụ a.

    Ọ sị na ọ bụ ndị ngalaba Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) gwara ha nwuchie Okupe.

    Okupe rụburu Peter Obi ọrụ gbara arụkwaghị n’ọnwa Disemba 2022 mgbe a mara ya ikpe ịnata ego dị nde narị naịra abụọ (N200m) n’ụzọ ezighi ezi site n’aka Sambo Dasuki bụbu onye ndụmọdụ nchekwa pụrụiche nke Goodluck Jonathan mgbe ọ na-achị.

    N’otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị EFCC bụ Wilson Uwujaren kwuru na nwuchi nwamadị a bụ mmehie.

    Ọ sị ha mere nke a maka na aha Doyin Okupe dị n’akwụkwọ ndị ha na-enyo enyo kamgbe afọ 2016 tupu a maa ya ikpe na nso nso a.

    Uwujaren sị ha ka na-achọ iwepu aha Okupe n’akwụkwọ ahụ, mgbe otu ha ụfọdụ gara nwuchie ya kama na ha ga-ewepu aha ya ozugbo.

  5. Bola Tinubu nke APC atụọla ụkwụ n'Enugwu Steeti ịchụ nta votu

    Bola Ahmed Tinubu onye jị ọkọlọtọ otu All Progressive Congress (APC) azọ ọkwa onyeisiala Naijirịa wuchịrị Enugwu Steeti taa maka achụm nta vootu.

    Dịka ya bụ emume na-aga n'ihu, ndị ọtụ ndọrọndọrọ ọchịchị a ji ohere gwa ndị mmadụ uche obi ha.

    Onye isi pati APC n'Enugwu bụ ọkaikpe Ugochukwu Agballa ekwella nkwa na pati ya anapụta ihe niile bụ nke ndị Enugwu gọmenti PDP weghara.

    Onyere ọmụma atụ dịka ebe obibi ụmụ anụmanụ n'Enugwu nakwa ebe egwuregwu polo park, ọkwara arịrị na ebe ndịa bụzị ebe obibi ndị mmadụ.

    Onye nke abụọ kwuru okwu bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu na Pati APC bụ Uche Nnaji kwere nkwa na ya ga agbanwe ndụ na akụ n'ụba ndị Enugwu. Ọ yọrọ ka onye ọbụla tinyere ya vootu.

    Gọvanọ Imo steeti Hope Uzọdimma kwuru na nanị APC bụ Pati ga eweta udo n'Naijiria. Ọ kọwara na dịka ọkwa ya bụ onye na achịkọba ntuliaka Bola Tinubu n'Enugwu na ya n'ayọ onye ọbụla ka ejikọọ aka nyere APC aka ka omerie.

  6. Otanisi mba ụwa na-abịa, onye ọbụla kee nkwụcha -World Bank

    Ụlọakụ mbaụwa bụ 'World Bank' ekwuola na akụnụba mba ụwa na-abaịwanye nso n'ọnọdụ ọtanisi n'oge na-adịghị anya.

    Ha kwuru na akụnụba ụwa ga-eji naanị otu pasentị na ụma gbalie elu n'afọ 2023, nke bụ ọnụọgụgụ dị ala karịa pasentị atọ ha kwuburu n'ọnwa Jun 2022.

    Otu ihe ha kwuru ga-adọtu akụnụba ụwa bụ agha na-aga n'ihu n'etiti mba Rọshịa na Ukraine, nakwa mmetụta ọrịa ozuruụwa ọnụ bụ covid-19.

    Onyeisi World Bank bụ David Malpass kwuru na mgbatu akụnụba a ga-emetụta ọtụtụ dịka ego na-abata ndị mmadụ n'aka n'akụkụ ụwa niile ga-agbatu karịa etu ọ dị n'ime afọ iri tupu ọrịa covid-19.

  7. Child Trafficking: Ndị uweojii anwụchiela ndị na-atụ mgbere nwa na Port Harcourt

    Ndị uweojii Rivers Steeti ejichiela mmadụ anọ ndị ha sị ji ụmụaka a mụrụ ọhụrụ atụ mgbere.

    Dịka ndị uweojii si kwuo, ọ bụ mmadụ gbaara ha ama gbasara ụlọ abụọ dị n'Igwuruta nakwa Omagwa, n'okpuruọchịchị Ikwere, Rivers Steeti, ebe ndị ọjọọ a ji mere isi ụlọọrụ ha.

    Ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ime ka ndị uweojii zọpụtara ebe ahụ, ụfọdụ ka ku nwa a mụrụ ọhụrụ n'aka. Ụfọdụ n'ime ha ka bụ ụmụaka dị ebe afọ 15.

    Otu n'ime ụmụnwaanyị ahụ dị ime sị na ndị nwe ebe ahụ kwere ya nkwa ego N800,000 ma ọ bụrụ na ọ mụọ nwa nwoke, na N700,000 maka nwa nwaanyị.

    Grace Iringe-Koko bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers Steeti kwuru na ha akpụrụla mmadụ anọ bụ ndị nwe ụlọ ịtụ mgbere ahụ gawa n'isi ụlọọrụ ha, ma malitekwa nnyocha miri emi.

  8. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ abọọla chi.

    Igbo ndị ọ ga-adịrị mma, ya gaziere anyị niile taa.

    Ngwa, ka anyị malite njem mgbasaozi anyị nke taa.

  9. Nigerian Immigration Service achụọla mmadụ anọ ma butuo ọkwa ndị ọzọ maka nrụrụaka

    Ngalaba Nigeria Immigration Service (NIS) ebutuola ọkwa ndị otu ha mmadụ 14 ma rie mmadụ 22 ngha maka nrụrụaka.

    Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba a bụ Tony Akuneme kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Tuzde ebe ọ nọrọ kwuo sị, " A chụọla mmadụ anọ, butuo ọkwa mmadụ iri na anọ dịka ha bịara zara ọnụ ha".

    Akuneme kwuru na nke a bụ iji hụ na ya bụ ngalaba na-arụ ọrụ ha etu ọ kwesịrị.

    O kwuru na dịka ewepụrụ mmadụ anọ n'ọrụ ha, na ezịgara mmadụ abụọ ọzọ ebe ọzọ.

    Na mgbakwunye ka o kwuru sị, " Mmadụ iri na otu bụ ndị enyere akwụkwọ ịdọ aka na ntị ebe otu onye bụ onye enyere ezụmike nke n'erughị eru".

  10. Ndị uweojii Rivers Steeti enyopuola ebe a na-ere ụmụaka

    Ndị uweojii Rivers Steeti enyochapụtala ogige ebe a na-ere ụmụaka dị na Port Harcourt bụ isiobodo steetị ahụ.

    Ngalaba ndị uweojii a kpọrọ C4i Intelligence wakporo ụlọ abụọ nọ n’Igwuruta na Omagwa nke okpuruọchịchị Ikwere bụ ebe a na-edosa ụmụaka ndị a tụrụ mgbere.

    Ụfọdụ ụmụaka ndị a dịcha afọ iri na ise ma dịkwa ime, ebe ndị ọzọ kucha nwa n’aka.

    E kwere ha nkwa ego nke ga-agbakwasọ ụkwụ ma ha ọ mụrụ nwoke maọbụ nwaanyị.

    Otu n’ime ha sị na e kwere ya nkwa puku narị naịra asatọ (N800,000) ma ọ mụọ nwa nwoke, mana ọ bụrụ nwa nwaanyị a ga-enye ya puku narị naịra asaa (700,000).

    A nwụchiri mmadụ anọ bụ ndị a na-enyo enyo na-ahazi ịtụ mgbere ụmụaka ndị a.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Grace Iringe-Koko kwuru na ndị a niile nọ n’aka ndị uweojii ugbua.

  11. Ụnụ asaala chi

    Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa n'uju.

    Daalụ maka isonyere anyị.

  12. Etu nkịta atọ si tagbuo onye nwe ya na Saụt Afrịka

    Ndị uweojii Saụt Afrịka ekwupụtala ọnwụ otu nwoke bụ Philemon Mulala dị afọ iri isii gbabuuru mba Zambia bọọlụ.

    Ndị uweojii ngalaba North West, kwuru na nke a mere n’ụbọchị 7 Jenụwarị n’elekere atọ.

    Nwunye nwoke ahụ sị na ọ nọ n’akụkọ ụlọ ha nke ọzọ na-anụ ka nkịta ndị a na-agbọ ụja mana ọ gaghị chọpụta ihe mere ha ji agbọrọ ụja.

    Ọ sị na o chere ka nkịta ndị a ọ na-agbọrọ ndị na-agafe n’akụkụ ụlọ ha ụja.

    Mana o mechara banye n’ime ụlọ ha chọwa di ya mana ọ hụghị ya.

    Nwaanyị a sị na o mechara hụụ di ya ka ọ tọgbọ n’ala n’ihu ụlọ ha, mgbe o ruru nso ka ọ chọpụtara na nkịta ndị ahụ tagburu di ya.

    Ndị uweojii sị na ụlọọrụ gbata gbata bịara ma kwuo na nwoke ahụ anwụọla.

    Nwoke a kpọrọ Philemon Mulala gbabuuru Zambia bọọlụ nyere ha goolu abụọ mgbe ha zutere Kenya n’afọ 1984 n’asọmpi CECAFA.

  13. E nwereike ịkagbu ụbọchị ntuliaka n’ihi ọnọdụ ọjọo nke nchekwa – INEC

    Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa ekwuola na ọnọdụ nchekwa nke dị ọjọọ ugbua nwereike imetụta ntuliaka na-abịa n’ọnwa Febụwarị 2023.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a mgbe ha na-eleba anya n’ọzụzọ banyere nchekwa nke e mere n’Abuja na Mọnde.

    Ọ sị na nnukwu ihe ịma aka n’ihu chere ntuliaka afọ a n’ihi nke nwereike ibute nkagbu ya ma ọ bụrụ na nchekwa gaa n’ihu na-akawanye njọ.

    Yakubu sị na ọ bụrụ na-elebaghị anya na nsogbu banyere nchekwa ma gboo ya, na o nwereike ime ka a gbatịa oge ntuliaka maọbụ kagbuo ya.

    Mana ọ gara n’ihu kwee nkwa na ha ga-eme ihe n’ike nke aka ha ịhụ na e nyere ndị ọrụ ha ezi nchekwa n’oge ntuliaka.

  14. Ngagharịiwe ndị otu 'Yoruba Nation' ataala isi otu onye na Legọs

    Ngagharịiwe nke ndị otu kpọrọ onwe ha 'Yoruba Nation' mere na mpaghara Ojota nke Legọs steeti n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde edulaala otu onye mmụọ.

    Ben Hundeyin bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs kwupụtara nke a site n'akara Twitter ya.

    "N'ụtụtụ taa ka ndị ekperima kpọrọ onwe ha ndị 'Yoruba Nation' pụtara n'igwe na mpaghara Ojota ma malite imebi ihe ndị mmadụ," Hundeyin kwuru.

    "Ndị uweojii Alausa nakwa ndị otu Rapid Response Squad gbagara ebe ahụ ịkwụsị ya bụ ọgbaaghara, mana ndị ekperima a wakporo ndị uweojii na-agba ha egbe ma na-emebi ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ."

    "Ka ọ dị ugbua, otu onye anwụọla n'ọgbaaghara a ebe ndị uweojii abụọ mgbọ tụrụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Anyị ejidela mmadụ anọ n'ime ndị mere ihe a dịka nnyocha ka na-aga n'ihu."

    Otu onyonyo na-efegharị na soshal midia nke BBC hụrụ gosiri ebe otu n'ime ndị na-eme ngagharịiwe tọgbọrọ n'ala ebe ndị otu ya na-eti mkpu na ndị uweojii egbuola ya.

    Kedu otu bụ Yoruba Nation

    Otu Yoruba Nation bụ ndị na-alụ ọgụ ka nnwereonwe mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa bụrụ mba nke aka ha.

    Onyeisi otu a bụ nwa okorobịa aha ya bụ Sunday Adeyemo, onye ndị mmadụ ji Sunday Igboho mara.

    Na Julaị afọ 2021, ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ 'Department of State Services' wakporo ụlọ Sunday Igboho na Ibadan, Oyo Steeti, mana nwa amadị ahụ gbara ọsọ.

    Ndị DSS nwụchiri ọtụtụ ndị otu ya, ma kwuo na ha na-achọ Igboho achọ.

    Ka izuụka olemole gachara, e jidere Sunday Igboho na mba Benin Repọblik dịka ọ chọrọ ịgba ọsọ gbaga mba Germany.

    Ndị ọrụ nchekwa mba ahụ jichiri ya na mkpọrọ ma kpụpụ ya ụlọikpe, mana e mechara tọhapụ ya.

    Anya ọzọ a hụrụ Igboho n'ọha bụ na mba Amerịka dịka akụkọ kwuru na o nwetala nzere PhD na ngalaba Theology n'otu mahadum dị na mba ahụ.

  15. Ndị uweojii London ahapụla Raymond Dokpesi dịka ha jichiburu ya

    Raymond Dokpesi, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ mgbasaozi Daar Communications, ndị nwe ụlọọrụ Africa Independent Television (AIT) enwerela onwe ya n'aka ndị uweojii na London, mba Briten.

    N'akwụkwọ ozi si n'aka ụlọọrụ Daar Communications, ha kwuru na Dokpesi banyere ụgbọelu Lufthansa Airline si Abuja gaa Frankfurt mba Germany tupu o rute ọdọ ụgbọelu Heathrow dị na London, mana ndị ọrụ nchekwa bịara kpọpụ Dokpesi ozugbo ụgbọelu ahụ dara.

    "Ọ nọrọ awa olemole n'aka ndị ọrụ nchekwa 'immigration' tupu ha mechaa suoro ya stamp ma hapụ ya ka ọ banye na mba ha," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

    Ha kọwara na ihe bugara Dokpesi London bụ maka oku mkparịtaụka nke gọọmentị mba Briten kpọrọ Atiku Abubakar, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Peoples Democratic Party'.

    Dokpesi bụ osote onyeisi otu achụmnta vootu Atiku n'okwu gbasara nhazi Tekịnụzụ.

    N'afọ 2015 ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Dokpesi ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka.

    Ha kwuru na Dokpesi so keta oke n'izu ego ruru ijeri naịra abụọ na ụma (N2.1 billion) ekwesịrị iji gote ngwaọgụ maka ndị agha Naịjirịa nke onye nọ n'isi ya bụ nrụrụaka bụ Sambo Dasuki, jibu ọkwa 'National Security Adviser'.

    Mana n'afọ 2021 ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo niile ahụ ma kwuo na aka Dokpesi dị ọcha.

  16. Etu ndị omekome si wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii n'Umuchu

    Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Umuchu n'isi ụtụtụ ụbọchị taa bụ Mọnde, Disemba 9, ma tinye ya ọkụ.

    Umuchu bụ obodo dị n'okpuru ọchịchị Aguata n'Anambra steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na nke a mere eme n'eziokwu.

    "A na-arụgharịụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ arụgharị, tupu ndị ekperima abịa n'isi ụtụtụ taa tinye ya ọkụ," Ikenga kwuru.

    "Ihe niile adajụọla ugbua udo alaghachila na mpaghara ahụ.

    "Anyị ji ohere a na-akpọku ndị ọha mmadụ ka ha na-enyere ndị uweojii aka n'ọrụ nchekwa site n'iwetara anyị ozi dị mkpa n'oge iji nye aka na nnyocha."

  17. Ejichiela ndị ntaakụkọ wepụtara onyonyo ebe onyeisiala Sudan nyụrụ onwe ya mamịrị

    E jichiela ndị ntaakụkọ isii n'ihi ihe onyonyo fesara n'ọdịnso a nke gosiri ebe onyeisiala mba Saụt Sudan bụ Salva Kirr dịka ọ nyụrụ onwe ya mamịrị.

    Nke a bụ ihe ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị ndị ntaakụkọ na-ekwu.

    N'ọnwa Disemba ka otu onyonyo fesara na soshal midia nke gosiri ebe ọ dịks Salva Kiir nyụrụ onwe ya mamịrị n'ahụ n'otu emume ebe a na-agụ 'national anthem'.

    Ndị ntaakụkọ isii ahụ e jichiri bụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ntaakụkọ nke gọọmentị Saụt Sudan nwe.

    Onyeisi otu jikọrọ ndị ntaakụkọ na Saut Suda bụ Patrick Oyet gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na "gọọmentị na-ebo ebubo na aka mmadụ isii ahụ dị n'ikesa ya bụ onyonyo ebe onyeisiala nyụrụ onwe ya mamịrị n'ahụ."

    Njichi e jichiri ndị ntaakụkọ a bụ ụdị ihe na-emekarị ma ndị ntaakụkọ kesaa akụkọ na-anaghị eto ọrụ gọọmentị, Muthoki Mumo, bụ onyeisi ụlọọrụ na-agba mbọ maka nchekwa ndị ntaakụkọ, kwuru.

    Mịnịsta mgbasaozi nke Saut Suda bụ Michael Makuel gwara ụlọ ntaakụkọ Voice of America na gọọmentị ga-ekwupụta n'oge na-adịghị anya ihe kpatara e ji jichie ndị ntaakụkọ ahụ.

  18. Iru uju dị na Senegal dịka ihe mberede tara isi mmadụ 40

    Ihe ruru mmadụ 40 allala mmụọ dịka ụgbọala bụs abụọ takọtara isi na mba Senegal.

    Nnyocha ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ gosiri na ọ bụ ụkwụ taya otu n'ime ụgbọala ahụ gbara nke mere ka ụgbọala ahụ tụgharịa ma kụọ ụgbọala nke na-abịa n'ihu ya.

    Ihe ruru mmadụ 87 merụkwara ahụ n'ụzọ dị icheiche n'ihe mberede a bụ nke ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ihe mberede kacha njọ n'ime ọtụtụ afọ.

    Onyeisiala Macky Sall etinyela abalị atọ iji ruo uju maka ndị nwụrụ n'ihe mberede a ma kwe nkwa na gọọmentị ga-etinye atụmatụ dị icheiche maka nchekwa ndị njem

  19. New Naira: Akwụkwọ naịra ọhụrụ anaghị aṅacha aṅacha - CBN

    Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa ekwuola na akụkọ na-efegharị na soshal midia nke na-ekwu na naịra ọhụrụ ha wepụtara na-aṅacha aṅacha bụ asị ọcha.

    Ha kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke otu onye isi ha bụ Ahmed Halilu wepụtara, ma kọwaa na ọ bụkwa usoro ha si ebipụtabu naịra nke ochie ka ha sikwa pipụta nke ọhụrụ a.

    Halilu kọwara sị: "Anyị chọrọ ịkọwara ụmụ Naịjirịa niile na...naịra nke ọhụrụ a na nke ochie dịbu mbụ, e nwereike ịkpọ ha otu ihe, ọ bụrụ na i were ha tee n'akwa ọcha, ị ga-ahụ ụcha 'intaglio ink', mana ọ pụtaghị na ọ na-aṅacha aṅacha."

    "Otu njirimara 'intaglio ink' bụ na ọ naghị agbaze agbaze na mmiri, ọ na-etesakwa n'ihe ọbụla na-acha ụcha n'ihi etu e si rụpụta ya."

    "Ihe a bụ njirimara akwụkwọ ego niile iji mee ka ha dị iche n'ego adịgboroja.

    "Naịra bụ akwụkwọ ego anyị ma bụrụkwa otu n'ime njirimara Naịjiria. N'ihi nke a, anyị na-akpọku ụmụ Naịjirịa ka ha kwụsị iji ego naịra eme nnyochapụta iji chọpụta ma ọ na-aṅacha ka ọ bụ ọnaghị aṅacha."

  20. Etu ịnara PVC sị aga na mpaghara Dutsen Ward dị n'Abuja

    :Onye ntaakụkọ anyị garụrụ na Dutsen Ward nke dị na Bwari Area Council ebe ndị mmadụ gara ịweta akwụkwọ ikike eji atụ vootu nke bụ Permanent Voters Card kọwara etu ọnọdụ ebe ahụ dị.

    Ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị ji iwe laa ma sị na ike adịghị ha ịkwụ n'anwụ ọtụtụ oge.

    Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ndị ọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) nọ ebe ahụ ebughị ibu ma enweghịkwa ezi nghazị n'etiti ha.

    Ụfọdụ ndị bịara ụnyịa kwuru na e nyere ha akara sị ha bịa taa kama dịka ha bịakwara taa, a sịkwa ha dee aha ha n'akwụkwọ ọzọ.

    Ndị a kwụkwara na ha anatabeghị PVC ha.