You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị ejichiela ụfọdụ ndị na-ejichi naịra ọhụrụ - DSS

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha ahụbeghị ego naịra ọhụrụ a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụgbọelu akpọkasila, gbuo ọkwọụgbọelu

    Otu ọkwọụgbọelu anwụọla dịka ụgbọelu ndịagha mba India kụkọtara isi ,kpọkasịa.

    Ozi si n'aka ndịagha mba ahụ kwuru na ụgbọelu ahụ bụ ọzụz ife na-elu ka ha ji ya eme oge ihe mberede ahụ mere.

    Ụgbọelu ahụ hapụrụ ogige ndịagha India bụ Gwailor air base idị na Madhya Pradesh,ihe dịka mita 30m rue egbe ha kpọkasịrị.

    Ndịagha mba ahụ kwuru na enyela iwu ka e nyocha ihe butere ọdachi ahụ.

    Ụlọ ntaakụkọ ndị dị n'India na-ekwu na a hụrụ mpekere ụgbọelu ahụ na Bharatpur dị na Rajasthan nakwa Morena bụ ebe ha na Madhya Pradesh gbar agbataobi.

    Otu Onye uweojii a hụrụ n'ebe ihe ahụ mere gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na-ahụrụ ọkwọụgbọelu ahụ ka ọ dị ndụ mana o merụrụ ahụ. n'ọhịa Padargarh.

    O kwuru sị, "Anyị ahụla ahụ otu n'ime ụgbọelu ahụ kpọkasịrị."

    "Ụgbọelu nke ọzọ dara ebe tetụụ aka ebe a mana anyị ezigara ndị otu anyị ịchọ ya."

    Mịnịsta Madhya Pradesh bụ Shivraj Singh Chouhan kwuru na enyela ndị ọrụ okpuru ọchịchị ka ha nyere ndị agha aka ịzọ ndị mmadụ.

    Mkpọkasịa bụ otu n'ime ọdachi ụgbọelu metụtara ndịagha India.

    N'aọnwa Oktoba ,afọ gara aga, ndịagha ise nwụụ dịka helịkọpta ha kpọkasịrị na Arunachal Pradesh steeti dị nso okeala ha na mba Chaina.

    N'ọnwa Disemba afọ 2o21, otu onye isi ndịagha bụ ,Generalụ Bipin Rawat so na ihe karịrị mmadụ 12 nwụrụ ka helikọpta ha ji eme njem kpọnyere isi n'ugwu, nwuru ọkụ na Tamil Nadu steeti.

  2. Ndeewo, ndị ọma

    Ndeewonụ, Igbo ndị ọma!

    Egbe bere ,ugo bere!

    Ndụ mmiri, ndụ azụ!

  3. Ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja esila n'okporo ya dapụ

    Ihe ọdachị ozọ adapụtala n’okporo ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja dịka ya bụ ụgbọ si n’ụzọ okporo ya dapụ.

    Nke a mere mgbe ụgbọ a nọzị nso ọdọ ụgbọoloko nke Kubwa n’Abuja.

    Cheta na n’abalị ise gara aga na otu ụgbọoloko si Itakpe na-aga Warri sikwa n’ụzọ okporo ya dapụ ma danye n’ime ọhịa tupu ndị njem awụbaa n’ime ya.

    Nka mere n’ụbọchị 23 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

  4. Ụlọomeiwu chọrọ ka e mechie ụlọakwụkwọ mahadum nwamgbenta ka ụmụakwụkwọ tuọ vootu

    Ndị ụlọomeiwu nta emeela mkpesa ka gọọmentị etiti gbachie ụlọakwkwọ mahadum n’oge ntuliaka iji hụ na ụmụakwụkwọ mahadum sonyere tuo vootu ha na ntuliaka na-abịa abịa.

    Ha na-achọ ka Ministri agụmakwụkwọ Naịjriịa anakwa otu dị iche iche jikọrọ ma na-ahụ maka ọchịchị ụlọakwụkwọ mahadum gụnyere ‘National Universities Commission’, ‘National Board for Technical Education’, ‘National na Commission for Colleges of Education’ nye iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ nwa mgbe nta n’oge ahụ.

    Dịka ha siri kwuo, ihe ruru nde atọ na ụma ndị debanyere aha ha maka ịtụ vootu na ntuliaka afọ a bụ ụmụakwụkwọ nke bụ na pasentị ha n’ime ndị niile debanyere ahụ ruru pasentị 40 na ụma.

    Ha mekwara mkpesa ka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) haziere ụmụakwụkwọ ohere pụrụiche maka atụmatụ inweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu bụ ‘Permanent Voters Cards’ (PVC).

    Ụlọọrụ Inec mara ọkwa kwuo na atụmatụ ịnata akwụkwọ PVC n’aka ha ga-ebi n’ụbọchị 29 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

    Inec hibere ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị dịka ụbọchị a ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala nakwa nke ndị ụlọomeiwu ebe ha hibere ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị dịka ụbọchị a ga-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ nakwa nke ndị ụlọomeiwu nta.

  5. Ihe bụ isi ngagharịiwe ndị ụkọchukwu Apostolic Christian Church Mission, Aba

    Ndị ụkọchukwu ụlọụka a kpọrọ Apostolic Christian Church Mission (ACCM) emeela ngagharịiwe n’Aba, Abia Steeti n’ụbọchị Tọzde 26 Jenụwarị 2023.

    Ndị ụkọchukwu a malitere ngagharịiwe n’Osisioma okporoụzọ awara Enugwu – Portharcourt sị na ihe ha na-eme bụ ka gọvanọ Okezie Ikpeazu nụrụ olu ha gbapee isiụlọụka ha dị n’Aba.

    Ndị a bucha akwụkwọ e dere ihe dịka “Ka gọvanọ gbapee ụlọụka anyị”, “Dkt Okezie Ikpeazu gbapere anyị isiụlọụka anyị.

    Ndị a ga-akwara n’ihu boo ebubo na ọ bụ ndị nwere agba na gọọmentị Abia chọrọ imebi ọchịchị ma kewaa ụlọụka ha n’ihi ọdịmma nke onwe ha. Ha gara n’ihu kwuo na ụ dịrị ihe a emetubeghi mbụ kamgbe afọ 72 e hiwere ụlọụka a.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọụka a bụ Christoper Ogbuagu sị na e nwere ụfọdụ ndị ndu n’ụlọụka bụ ụmụnne Gọvanọ Ikpeazu chọrọ ka e tinye e mee otu onye Bishọp ụlọụka ha ka ọ nọchie anya onye bụbu Bishọp nwụrụ anwụ.

    Ọ sị “okwu a nọ n’ụlọikpe mkpegharị dị n’Owerri ugbua, kama ndị a ga-enwe ndidi ka ụlọikpe kpee ihe ahụ, ha gara gwaa Gọvanọ ka ọ bịa gbachie isiụlọụka ahụ; ma tinye ndị ụka a n’ụjọ.

    “Anyị chọrọ ịgwa ụmụ ụwa na o nwere ihe ọbụla mere ndị ndu anyị na aka gọvanọ dị na ya.”

    Ụkọchukwu ọzọ a kpọrọ Ugochukwu Onugha sị na kamgbe otu ọnwa gara aga ka gọvanọ gbachiri isiụlọụka ha dị n’Omuma, Aba.

    Ọ sị na mgbọ niile ha gbara ịkpọtụrụ ndị maara gọvanọ ka a rịọ ka ọ gbapee ụlọụka ha mana isi apụtaghị.

    N’okwu ya “Gọvanọ abụghị onye ụlọụka anyị, ọ bụ gọvanọ steeti ma bụrụ onye ụka Seventh Day Adventist. Anyị amaghị ihe o nwere n’ebe ụlọụka anyị nọ.”

    Ndị uweojii ngalaba Osisioma gbalịrị ka ha gbochie ndị ụkọchukwu ime ngagharịiwe a mana ha gbara isi akwara mee ngagharịiwe a.

    Cheta n’ọnwa Disemba afọ 2022, Gọvanọ Okezie Ikpeazu nyere iwu ka ndị ọrụ nchekwa gbachie ụlọụka Apostolic Christian Church Mission (ACCM dị n’Omuma Road, Aba.

    Nke a ọ sị bụ maka esemokwu dị n’etiti ndị ndu ụlọụka ahụ, ma sị na onye ọbụla a hụrụ ụkwụ n’ụlọụka a ga-ata ahụhụ ruuru ya.

  6. Etu 'unknown' gunmen si gbagbuo mmadụ n' ọgbakọ achumtavootu PDP n'Enugu

    O peka mpe otu onye nwụrụ, ebe ndị ọzọ merụrụ ahu dika ndị bu egbe wakporo ọgbakọ achụmtavootu otu PDP mere n'Ọgwụ dị na Enugu steeti ụbọchị Wenezde.

    Nwaanyị a mabeghị aha ya nwụrụ dịka ndị omekome tibatara ebe a na-eme ọgbakọ ntuliaka wụwa mgbọ.

    Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC igbo na ndị bu egbe wakporo Awgu Ward ebe Osita Ngwu na-azọ ọkwa na Anayo Onwuegbu, na-azọ ọkwa ịnọchịte Awgu/Aninri/Oji-River n'Ụlọomeiwu Nta na ndị ọzọ gbakọrọ maka achụmtavootu maka ntuliaka ụlọọmeiwu Ukwu na nke Nta n'Ọgwụ, wụọ ndị gbakọrọ ebe ahụ mgbọ.

    Otu onwe gara ọgabkọ achụmta vootu ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBCIgbo si, "Ndị bu egbe bịara chụsaa ndị mmadụ."

    "O mere ka anyị kwụsị achụmta vootu anyị na-eme dịka enwerela onye nwụrụ na ya bụ tigbuo-zogbuo."

    "Nwaanyị nwụrụ bụ onye nọọrọ onwe ya, ọ bụghị na o nwere ihe nwaanyị mere iche."

    "Ha ji egbe gbakasịa ụgbọala otu onye enyemaka Gọvanọ steeti ahụ."

    Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị uweojii steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ.

    Oge, a kpọrọ Ọnụ na-ekwuru nd ị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe, kwuru ka e zitere ya ajụjụ n'ekwentị mana ọ saghị ozi ahụ rue oge anyị wepụtara akụkọ a.

  7. Ndị ojiegbe egbuola onye ụweojii n'Imo steeti

    Ndị omekome egbuola otu nwaanyị aha ya bụ Chinyere Obilor bụ onye uweojii n'Imo steeti n'ụbọchị Wenzde.

    Akụkọ kwuru na ọ nwụrụ mgbe ndị bu egbe wakporo ya na ndị otu ya mgbe ha nọ ọrụ n'ebe ụzọ gbara ọnụ dị n'okpuruọchịchị Ngor Okpala dị na steeti ahụ.

    Chinyere bụ onye Mgbidi dị n'Imo steeti ji ụmụ anọ ma sorokwa na ndị uweojii okporoụzọ a kporo 'Highway Patrol Team' tupu ọnwụ ya.

    Otu onye achọghị ka akpọọ aha ya hụ ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ ji ụgbọala akpọrọ 'Busimo' were bịa ya bụ njem dịka onye nkịtị ọzọ amabeghi aha ya nwukwara ya bụ mwakpo.

    O kwukwara na ndị ahụ gbahapụrụ 'busimo' ahụ mgbe ha na ndị uweojii kwachara mgbọ dịka ndị uweojii jichiri ya ugbua.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye azaghị ekwenti nakwa ozi ekwentị e zigaara ya gbasara ọdachi a mere.

  8. Ogbunigwe agbagbuola ndị ọchịehi 27

    Ndị okwu dị n'aka na Naijiria ekwuola na o pekata mpe mmadụ 27 nwụrụ n'ogbunigwe gbara nso okeala Nasarawa ba Benue steeti ụbọchị Tuzde.

    Ndị uweojii kwuru na ha ka na-enyocha ihe butere ogbunigwe ahụ gbara .

    E ji ọgbaghara n'etiti ndị ọrụugbo na ndị ọchịehi mara obodo dị na mpaghara ahụ.

    Ụfọdụ ndị bi na mpaghara ahụ na-ebo n'ọbụ ogbunigwe ndị agha Naijiria tụrụ na amaghị ama mana BBC enyochabeghị ma akụkọ ahụ ọ bụ eziokwu.

  9. A tọhapụla ndị nkwado Arsenal a nwụchiri maka inwe ahụ mmeri ManU

    Ha yi uwe Arsenal ma buru iko oge a nwụchiri ha ụbọchị Monde.

    Ndị uweojii Jinja kwuru na ha anataghị ikike tupu ha mewe ngagharị ọṅụ ahụ.

    Mana n’ụbọchị Tuzde, James Mubi, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii mpaghara bụ ndị ọrejighị akwụkwọ

  10. Mba Amerịka amachiela ndị mere nrụrụaka na ntuliaka ịbata be ha

    Gọomentị mba Amerịka ekwuola na ha ga-amachị ụfọdụ ndị Naịjirịa maka ịsọ mebi ihe na ntụliaka emere na Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a n'ụbọchị Wenzde ma kọwaa na o gisiri na ha kwadosiri usoro niile metụtara ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa ma jirikwa ohere ahụlụsọ nrụrụaka agha.

    Odeakwụkwọ gọọmentị ahụ bụ Anthony Blinken kọwara na ezinaụlọ ndị ahụ akpọbeghi aha nwereike irite na mmachi ahụ.

  11. Nnọnụ na peeji anyị taa!

    Unu abọọla chi?

    Anyi ji n'aka na unu na-esochi anyi n'azụ maka akụkọ ndị dị mkpa ka o si eme.

    Mbụ kacha mkpa bụ maka ọnwụ Ọkammuta Uche Ikonne na-efe ọkọlọtọ PDP n'ịzọ ọkwa Gọvanọ Abia steeti.

    Ikonne kwesiri ịbịa nrụrịtaụka BBC Igbo hibere maka steeti ahụ n'Abuja mana ọdachi mere n'ụtụtụ ụbọchị ahụ mgbe ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ dịka ọ rịachara ọrịa.

  12. Ndị ojiegbe agbagbuola onyeisioche APC n’Imo ma tọrọ ndị ọchịọchị ndị ọzọ

    Akụkọ si Imo steeti apụta na-ekwu na ndị ojiegbe gbagburu Christian Ihim bụ onyeisioche otu pati All Progressives Congress (APC) na wọọdụ Umuchoke dị n’Okwe nke okpuruọchịchị Onuimo na steeti ahụ.

    E kwuru na ihe a mere n’abalị Tuzde.

    Ndị nọ ebe kọwara na dịka e gburu ya na ya bụ ndị ojiegbe tọrọkwara mmadụ ise bụ ndị ọchịchị pati ahụ nọ n’obood ahụ.

    Ndị obodo ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị n’ụbọchị Wenezde na ndị ojiegbe gbara egbe aghara aghara ebe ahụ n’abalị ahụ nke mere ọtụtụ n’ime ha jiri gbapụ ọsọ ndụ ha wụba obodo agbataobi ha.

    A kọwakwara na ya bụ ndị ojiegbe wụbara obodo agbataobi Okwe bụ Okwelle ma tọrọ otu nwaanyị onye pati APC nke a kpọrọ Onyinyechi Egenti.

    Otu onye ọzọ gwara onye ntaakụkọ anyị n’Imo steeti na obodo ahụ tọgbọzi chakoo dịka ndị mmadụ agbaala ọsọ ndụ ha ma pụọ ebe mpaghara ahụ.

    Ihe a mere n’abalị 19 nke ọnwa Jenụwarị, 2023 mgbe ndị ahụ wakporo ụlọ ya dị n’obodo Imoko, Arondizuogu ma gbakwa ụlọ ya ọkụ.

    Akụkọ kwuru na ndị gburu Ohizu agbanyeghị na ha napụrụ ezinaụlọ ya ego mgbapụta ruru nde Naịra asaa.

    Olu ndị ahụ nọ na ya bụ ihe onyonyo na-ada ka olu ụmụokorobịa kwuru na ha agaghị anabata atụmatụ ntuliaka ọbụla n'akụkụ Naịjirịa ọbụla.

    Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ naanị otu ọnwa ka ntuliaka 2023 bịazuo na mmezuo.

  13. A gaghị agbatị ohere e nyere maka nkwụsị ịnabata akwụkwọ ego ochie - CBN

    Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiela ekwuola na agaghị agbatị ụbọchị ha nyere maka ịnabata akwụkwọ ego ochie nke N200, N500 na N1000.

    O kwuru na ha agaghị eme nke a maka na ụfọdụ ndị mmadụ na-akpachi akwụkwọ ego ndị a ma na-emebisi ugwu akwụkwọ ego naịra nwere.

    “Ka m kwuo ya hoohaa, enweghi m akụkọ ọma nye ndị chọrọ ka anyị gbatịkwuo ụbọchị a ga-eji akwụkwọ ego ochie azụta ihe.

    Nke a bụ maka na ụbọchị otu narị anyị nyere ezuorola onye ji ego akwụkwọ ego ochie ka ọ gaa n’ụlọakụ gaa tinye ego ahụ.

    Emefiele sị ha agwala ndị ụlọụka ka ha gbatịkwuo oge ọrụ ha ka ndị mmadụ nwee ike ịbata bịa tinye ego ochie ha n’ụlọụka.

    Ọ gakwara n’ihu kwuo na o zutere ndị Gọvanọ ma kọwaara ha ihe mere na ha agaghị agbatị ụbọchị a karịa ọnwa Jenụwarị 2023.

    Ọ sị na ụlọakụ etiti nwere ọtụtụ ndị ọrụ ha ruru otu nde na ụma (1.4m) na mpaghara Naịjirịa dị iche iche na-ewere ego ochie ma na-ekesa ego ọhụrụ.

    Cheta n’ụbọchị 25 Ọktoba 2022 ka ụlọakụ etiti kwuru na ha ga-agbanwe akwụkwọ ego bụ onyeisiala Muhammadu kpuhere akwụkwọ egọ ọhụrụ nke N200, N500 na N1000.

    Ụlọakụ a nyere iwu sị ka onye ọbụla gbaa mbọ hụụ na ọ gbanwere ego ochie niile dị ha n’aka tupu ụbọchị 31 Jenụwarị 2023 eruo.

  14. Etu mwakpo ọzọ siri taa isi mmadụ asaa na Califonia, mba Amerịka

    Steeti California dị na mba Amerịka na-ama jijiji dịka mwakpo nke abụọ n'eme n'ime abalị ole m ole tara isi mmadụ asaa bụbu ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ n'akụkụ San Francisco nke steeti ahụ.

    Mwakpo a mere n'obodo Half Moon Bay dị n'ụsọ osimiri.

    Ndị ya bụ mwakpo metụtara bụ ndị agbụrụ Chịna bụkwa ndị mba Amerịa na-arụ ọrụ ugbo.

    E jidere onye a na-enyo enyo n'okwu mwakpo a bụ Zhao Chunli nke a sị gbara fọ 67, mgbe ụgbọala wuchịrị n'ịme ụlọọrụ ndị uweojii ebe ahụ.

    Nke na-abịa dịka steeti ahụ ka nọ na-eru uju maka ọnwụ nke mmadụ iri na otu bụ ndị otu nwoke gbagburu n'ama ebe a na-egbe egwu dị na Monterey Park - n'oge ememme Afọ Ọhụrụ ndị agbụrụ Asia a na-akpọ 'Lunar New Year' na Bekee.

    Gọvanọ California bụ Gavin Newsom zipụtara ozi n'akara Twitter ya na ya ọ na njem nleta n'ụlọọgwụ ebe ndị mwakpo nke mbụ ahụ metụtara mgbe e dọpụrụ ya n'akụkụ ma tiwara ya ozi mwakpo nke abụọ a.

    Ọ gara n'ihu kọwa ya bụ ihe dịka "Ihe ọdachi dakwasiri n'ọdachi ọzọ".

    E kwuru na otu onye ya bụ mwakpo metụtara nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwụ dịka ọ nọ n'ezigbo ọnọdụ ahụike ọjọọ ugbua.

    Ihe onyonyo gosiri ka ya bụ nwoke a na-enyo na mwakpo nwụchiri n'ogige ndị uweojii mgbe a nwụchiri ya ma napụ ya egbe 'semi-automatic pistol' bụ nke a na-eche o ji mee ya bụ mwakpo.

    Ọtụtụ nrụrịtaụka banyere etu ndị mmadụ si enweta ikike ibu egbe ka na-aga n'ihu na mba Amerịka dịka mwakpo n'aka ndị nkiti bu egbe na-arị elu ugbua.

  15. Ihe ndị dị mkpa ị kwesịrị ịma maka njem Onyeisiala Buhari mere na Legọs steeti na Mọnde

    Onyeisiala Muhammadu Buhari Bịara na Legọs steeti meepe ọdụ ụgbọmmiri ọhụrụ na steeti ahụ nke a na-eche nke nwereike ịmetụta akụnaụba Naịjirịa nakwa akụkụ Ọdịda Anyanwụ Afrịka ndị ọzọ.

    Nnukwu ọdụ ụgbọmmiri e ji ego ruru otu ijere dọla na uma ($1.5bn) rụọ bụ nke a kpọrọ 'Lekki Deep Sea', bụ ihe owuwu were afọ isii iji wuchaa ya.

    Ụlọọrụ ga-abụ ọnụ ụzọ ga-emepere ụgbọmmiri na-ebu ibu na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka niile. Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu kwuru na ụlọọrụ ọhụrụ a ga-enye ihe dịka puku mmadụ narị abụọ ọrụ ma na-amụtara Naịjirịa ego ruru ọtụtụ ijeri dọla.

    A na-atụ anya na ọdụ ụgbọmmiri ahụ ga-ebelata ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa n'ihi etu ọ ga-esi metụta mbubata ngwa ahịa na Naịjirịa nke na-egbochi ma na-emeụta azụmahịa ọtụtụ na Naịjirịa.

    Ka ọ dị ugbua, Legọs steeti na-adabere n'ọdụ ụgbọmmiri ochie na nke ngwaahịa na-anyịgbuzị dịka ya bụ ebe abụrụla ebe na-akpatakarị kpachi kpachi ụzọ bụ ezigbo ihe nsogbu nye steeti ahụ.

    Ihe ndị ọzọ Onyeisiala Buhari mepere gụnyere ụlọọrụ ebe a na-emepụta osikapa bụ Imota Rice Mill nakwa ụlọọrụ ebe a na-emepụta mmanụ a na-atụ igwe na ụgbọala bụ Bestaf Lubricant.

    Onyeisiala Buhari emeela njem ọrụ bịa Legọs ugboro ugboro gụnyere na Maachị 2022, Juun 2021, n'afọ 2019, nakwa n'afọ 2018.

    A na-atụ anya na Buhari ga-emepe ụlọọrụ ụgbọoloko ọhụrụ nke Blue Line of the Lagos Rail Mass Transit n'ụbọchị Tuzde a.

  16. Ndị be anyị, ndewo nụ o.

    Unu asaala chi?

    Leekwa akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa bụ Tuzde abalị 24 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

  17. Mmachi ndị agboro ka dị ire -Gọọmentị Anambra steeti

    Gọọmentị Anambra steeti ekwuola kwusie ike na mmachi ndị agboro ka dị ire na steeti ahụ.

    N’ozi nke Kọmịshịọna mgbasaozi steeti ahụ bụ steeeti bụ Paul Nwosu binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde Gọọmentị Anambra steeti nyere ntụziaka ka e nyekpe agboro ọbụla a hụrụ na-ana ndị ọkwọụgbọala ego ozizo n’aka gọọmentị.

    Ha nyergwara ndị bụbụ ndị agboro kka ha debanye aha ha n’aka gọọmentị ka a chọọrọ ha ọrụ ọzọ bara uru.

  18. Ndị uweojii anwuchiela ndị nkwado Arsenal maka igoli na e meriiri ManU

    Ndị uweojii mba Yuganda anwụchiela opekata mpe ndị nkwado otu egwu bọọlụ Arsenal asatọ n'obodo Jinja dị na mba ahụ maka ime ụṅara na mmeri otu egwu bọọlụ ha meriri etu egwu bọọlụ Manchester United n'asọmpi Premia Ligi.

    Ndị nkwado a ji akwa mmemme e ji mara otu Arsenal ma burukwa iko were n'a-awụgharị n'ọṅụ dịka Arsenal ji ọkpụ goolu atọọ asatara abụọ kụnye ManU isi aba okpu ụbọchịụka.

    Ndị uweojii si na ha dara iwu n'ihi na ha anataghị ikike ịkpagharị n'igwe.

    Ndị nkwado Arsenal ahụ ji ụgbọala ise na-agaje n'ụtụtụ Monde oge ndị uweojii nkwụsịrị ka ma kpara ha aka.

    Otu na ime ndị nkwado Arsenal ahụ bụ Baker Kasule gwara ụlọntaakụkọ mba ahụ bụ Daily Monitor na “amaghị m ihe anyị meremana anyị na-enwe aṅụrị maka mmeri anyị meriri otu Manchestaer United.”

    Onyeisi ndị uweojii mpaghara ahụ bụ James Mubi gwara BBC gwara na ya enyochabeghị ebubo a na-ebo hamana na-ajụ ihe ha na-enwere aṅụrị ebea gbabeghị as oọkara asọmpi e nwere n’agba .

    “ Kedụ ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha na ndị na-akado otu bọọlụ ọzọ zute? Ha agwaghị ndị uweojii ka ha nye ha nchekwa dịka ha na-akpagharị.”

  19. Otoro agbagbuola mmadụ atọ n'Abia steeti

    Kọmịshọna ahụike Abia steeti bụ Dkta Osuji ekwuola na mịnistrị ahụike ezigala ndị ọrụ nnyocha ahụike na akọrọngwa ọgwụ gaa ebe e kwuru otoro gbagburu mmadụ na steeti ahụ.

    Akụkọ kwuru na otoro gbagburu mmadụ atọ n' obodo Amaogwugwu dị n' Ohuhu, n' Okpuru Ọchịchị Umuahia-North dị n'Abia steeti.

    Onyeisi otu njikoro ụmụafọ obodo ahụ bụ Kelechi Uwaoma, onye kwuru na mmadụ abụọ nwụrụ n'ụlọ ha , ebe otu onye nwụrụ n'ụlọgwụ imeobodo dị n'obodo ha, kwuru na mmadụ 16 ka nọ n'ụlọgwụ anara nleta.

    Uwaoma kwụkwara na ụfọdụ agbakeela ma laghachikwa n'ụlọ ha.

    O kwuru na ha na-eche na ọrịa ahụ sitere na mmiri osimiri Ikwu ndị obodo na-aṅụ nke atịtị gbarụrụ.

    Otu onye obodo ahụ bụ Ichie Uche Aguoru, gwara onye ntaakụkọ anyị na naanị osirmiri ikwu ka ha na-aṅụ n'ihi enweghị ezi mmiri ọnụnụ na obodo ha.

    O kpokuru gọọmentị ka ọ gbatara obodo ha ọsọ enyemaka site ịrụrụ ha mmiri si n' igwe agbapụta.

  20. Ụka Metọdistị eteela Ụkọchukwu Nkechi Nwosu mmanụ dịka Bịshọpụ mbụ bụ onye nwaanyị

    A họpụtara ụkọchukwu Nkechi Nwosu dịka Bishop Jos n'ọgbakọ 'Biennial Conference of Methodist Church Nigeria' nke e mere n'afọ 2022.

    Ụka Metọdistị nke Achịdịayọsịs Kaduna tere Ụkọchukwu Nwosu mmanụ ma chie ya Bishọpụ n'ụbọchị Sọnde, abalị 23 nke ọnwa Jenụwarị, 2023.

    Nwosu ga na-elekọta Diayọsis Jos dịka ọkwa ya siri tuzie aka.

    Nke a mere ya nwaanyị mbụ a na-echi ya bụ ọkwa n'ụka ahụ na Naịjirịa.

    N'emume ahụ e mere n'ụka Christ Methodist dị na Jos, Achbishọpụ nke Kaduna bụ Joseph Nnonah tere ya mmanụ ma chiezuo Nwaada Nwosu echichi Bịshọpụ.

    Igwe ndị mmadụ gbakọtara n'emume echiche a dịka ọ bụ ihe ịgba nkiri.

    Nwosu jara ọha ume ka ha gbaa mbọ nye onwe ha dịka akụrụngwa Chineke ga-eji hazie Naịjirịa. Ọ malitere ọrụ ya ozigbo echichara ya ya bụ echichi.