Gọọmentị mba Canada ekwupụtala na gọọmentị mba Cameroon na ndị otu dị icheiche na-azọ nnwereonwe na mba ahụ ekwetela inwe mkparịtaụka iji weghachi udo na mba ahụ.
Mịnịstrị mba Canada na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba kwupụtara nke a n'ime akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Fraịde, abalị iri abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2023.
"Canada nabatara nkwekọrịta nke a iji malite usoro zuru oke maka udo na ịkwụsị ọgbaaghara niile," Mịnịsta Mélanie Joly nke mba Canada kwuru.
Joly kwuru na gọọmentị Candata anabatala ịnọ n'isi atụmatụ a nke ga-enye aka ka ndị otu nnwereonwe ahụ họpụta ndị isi ga-eso na kọmiti ga-ekpe udo.
Ọgbaaghara malitere na mba Cameroon n'afọ 2017 n'ihi na ndị bi na mpaghara mba ahụ ebe a na-asụ asụsụ English kwuru na gọọmentị na-emekpa ha ahụ ma na-akpachapụ ha n'akụkụ.
Cheta na Cameroon nwere mpaghara abụọ - ndị na-asụ asụsụ French bụ ndị ka n'ọnụọgụgụ, na ndị na-asụ asụsụ English, ndị ọnụọgụgụ ha ka dị nta.
Kamgbe afọ 2017 ahụ ndị ọgụ nnupuisi dị icheiche na-ebuso ndị agha mba Cameroon agha na mpaghara ndị na-asụ asụsụ English dịka ha na-achọ ikewapụ ma bụrụ mba nke onwe ha a kpọrọ Ambazonia.
N'afọ 2019, e nwere ọgbakọ ebe a nọ nye mpaghara ndị a na-asụ asụsụ bekee ọnọdụ pụrụ iche, mana nke a emeghị ka ọgbaaghara kwụsị, kama ọ kawanyere njọ.
N'afọ 2021, otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) na otu Ambazonia Governing Council nwere nkwekọrịta ijikọ aka ọnụ maka mbọ ha na-agba inweta nnwereonwe Biafra nakwa nke Ambazonia.
Ihe ruru mmadụ 6000 anwụọla n'ọgbaaghara maka nnwereonwe Ambazonia, ebe ihe karịrị mmadụ 800,000 agbaala ọsọ pụọ n'ụlọ ha; o metụtakwara agụmakwụkwọ maka ụmụaka ọnụọgụgụ ha ruru 600,000.
Otu ndị na-azọ nnwereonwe binyere aka n'akwụkwọ iji kpaa udo gụnyere: Gọọmentị Camroon, otu 'Ambazonia Governing Council' na ndị agha ha bụ 'Ambazonia Defence Force'; otu 'African People's Liberation Movement' na ndị agha ha bụ 'Southern Cameroons Defence Force'; otu a na-akpọ 'Interim Government'; nakwa otu 'Ambazonia Coalition Team'.
"A na-atụ anya na otu ndị ọzọ ga-esonyekwa n'atụmatụ udo a n'oge adịghị anya," gọọmentị mba Canada kwuru.