Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. , Ụnụ asaala chi?

    Igbo ndị ọma anyị ji eme ọnụ, ndeewonu o!

    Ụnụ asaala chi?

  2. Etu nwata akwụkwọ mahadum siri gbaa Onyeisiala Buhari akwụkwọ maka abụbụọrụ Asuu

    Nwata akwụkwọ

    Ebe foto si, Presidency/Aker Agatha Soo/Facebook

    Otu nwata akwụkwọ nọ na Klasị ikpeazụ ya na mahadumm akpụpụla onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ọchịchị ndị ọzọ ụlọikpe mana abụbọ ọrụ otu ndị nkuzi mahadum bụ Asuu na-agba.

    Nwaada Soohemba Agatha Aker na-anata ọzụzụ agụmakwụkwọ na ngalaba ndị ọkaiwu nke mahadum Benue State University buuru ikpe a gaa ụlọikpe ukwu dịka aha onyeisiala na ndị gọvanọ mmadụ 36 ọzọ nọ na ya bụ ikpe.

    O kwuru na ya bụ abụbọọrụ a rurula ọnwa asatọ ugbua megidere ikike dịịrị nke metụtara agụmakwụkwọ ya ma kwuo na etu gọọmentị etiti na ndị ọchịchị ndị a si eso ya bụ nsogbu nọ n’etiti ha na ndị nkuzi mahadum ezighi ezi.

    O mere mkpesa nye ụlọikpe ahụ ka akwụsị ịkwụ onyeisiala Buhari, ndị gọvanọ, na ndị ndọrọnọdọrọ ọchịchị niile na Naịjirịa ụgwọ ọnwa ha ruo mgbe ekpeziri nsogbu nọ n’etiti ha na ndị nkuzi mahadum.

    O gara n’ihu rụọ ka a kpachịe ụgwọ ọnwa ndị sinetọ, onyeisi ọrụ Naịjirịa, odeakwụkwọ ukwu gọọmentị etiti, na ọtụtụ ndị ọrụ oyibo nke gọọmentị tinyekwuoro ndị isi ụlọakwụkwọ mahadum na ndị nkuzi ha ruo mgbe okwu Asuu biri.

    Agatha gwara BBC na ụmụakwụkwọ niile nọ na Naịjirịa nwere ikike ịgba gọọmentị akwụkwọ maka ikpachi ikike dịịrị ha n’agụmakwụkwọ.

    Ọ sị “Gọọmentị akpachịela ikike diiri m n’agụmakwụkwọ site na ịghara ime ihe ha kwesịrị ma igbochi ezigbo agụmakwụkwọ m kwesịrị inweta”

    “Ọkachasị dịka m n’onwe m emeela ihe niile m kwesịrị ime dịka nwa akwụkwọ mahadum”

    Nwaada onye bụ onyeisi otu ụmụakwụkwọ mahadum nke ụlọakwụkwọ ya kọwara na abụbọọrụ Asuu a emetụtala ya n’ụzọ ọjọọ.

    Ihe ndị ọzọ dị mkpa maka abụbụọrụ Asuu

    • Asuu malitere abụbụ ọrụ ha kemgbe ọnwa Febụwarị 2022.
    • Ewezuga, okwu ụgwọ ọnwa na ọnọdụ ụlọ akwụkwọ mahadum Naịjirịa, ihe ọzọ na-esere Asuu na gọọmentị etiti bụ na Asuu achọghị iso usoro akwụmụgwo ọnwa nke gọomentị etiti bụ Integrated Personnel Payroll Information System, IPPIS.
    • Ọ bụ naanị ulọakwụkwọ mahadum nke gọọmenti etiti na ụfọdụ nke ndị steeti so na ya bụ abubụọrụ.
    • Gọọmentị etiti nwere mahadum 49 ebe steeti nwere 54, ndị mmadụ na otu ndị ọzọ nwee 109. A na-akọwa na ọ bụ maka oke abụbụọrụ ndị mahadum gọọmentị na-agbakarị na-akwanye ndị mmadụ ha ji abanye mahadum nke ndị nkịtị.
    • Na nkwekọrịta Gọọmentị etiti na Asuu nwere mgbe gara aga, gọọmentị kwetere ịtinye ọkpụrụkpụ ego kwa afọ ruo afọ ise maka iwulite ọnọdụ mahadum.
    • N'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị, onyeisiala Muhammadu Buhari nyere minista agụmakwụkwọ Naịjịrịa bụ Adamu Adamu na minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige iwu ka ha hụ na abụbụọrụ ahụ kwụsịrị n'izu abụọ mana nke a amịtaghị mkpụrụ ma ncha.
    • N'ihi na mkparịtaụka dị n'etiti Asuu na gọọmentị etiti ekweghị amịta mkpụrụ, gọọmentị etiti bupụrụ okwu ha ụlọikpe 'Industrial court' ka e kpezie ya ebe ahụ.
    • Ọtụtụ ndị omeiwu nwere agba na Naịjirịa nakwa ndị ji ọkwa a na-akpọ 'SAN' na Beekee, pụtara kwunyere Asuu n'ikpe a nke otu n'ime ha bụ ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Femi Falana
    • Gọọmentị etiti ehibela otu ndị nkuzi mahadum abụọ ọzọ dịka okwu ha na Asuu ka na-aga n’ihu, ọtụ abụọ a bụ Congress of Nigerian Universities Academics (CONUA) na National Association of Medical and Dental Academics (NAMDA).
    • Asuu ekwuola na ha ga-agba gọọmentị etiti akwụkwọ maka nhibe otu abụọ ma kwuo na o megidere iwu Naịjirịa
  3. Onweghị 'sit-at-home' ga-enwe isi na Delta Steeti - Ndị uweojii

    Delta State

    Ebe foto si, Delta State

    Ndị uweojii Delta steeti ekwuola na onweghị mgbe atụmatụ 'sit-at-home' ọbụla ga-enwe isi na steeti ahụ.

    Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede Tọzde.

    Edafe kwuru na ha ahụla onyonyo ebe ụfọdụ mmadụ kpuchiri ihu ha na-ekwu na ha etinyela 'sit-at-home' "na mpaghara Biafra" maka emume ncheta "Asaba Massacre" nke mere na 1970.

    Edafe kwuru sị: "Iji mee ka o doo onye ọbụla anya, onyeisi ndị uweojii na steeti Delta bụ Ari Muhammed Ali ekwuola na enweghị ihe ọbụla dịka 'sit-at-home' na Delta steeti."

    "Ndị uweojii dị njikere imenyụ onye maọbụ ndị ọbụla ga-achọ ịkpata ọgbaaghara na steeti a."

    Edafe gwara ndị mmadụ ka ụjọ ghara ịtụ ha, kama ka onye ọbụla na-agara mkpa ya ma na-edebe iwu obodo niile.

    O kwukwara na ha etinyela atụmatụ niile dị mkpa iji chekwaa ndụ na akụnụba ụmụ mmadụ, ma mee ka ndị ekperima ghara inwe ohere ọbụla na Delta steeti

  4. Onye ojiegbe agbagbuola mmadụ 37 gụnyere ụmụaka na mba Thailand

    Akpati ozu ụfọdụ ndị nwụrụ na mwakpo ahụ

    Ebe foto si, EPA

    Onye ojiegbe egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ na asaa gụnyere ụmụaka, n’ọtaakara dị na mpaghara Nong Bua Lamphu nke mba Thailand.

    Ndị uweojii kwuru na ya bụ onye ojiegbe e mechara chọpụta na ọ bụ Panya Khamrab, onye uweojii a chụrụ n’ọrụ maka ọgwụ ike, garuru n'ọtaakara ahụ ihe dịka ebe elekere mbụ nke ehihie, mgbe ụmụaka nọ n'ime ya na-arahụ ụra ehihie.

    Ha kwuru na o ji mma na egbe abụọ wee wakpoo ma malite ịkwa mgbọ tụgburu ndị nkuzi na ụfọdụ ndị nne na nna nwara igbochi ya ịbanye n'ime ụlọọtaakara ahụ.

    Ndị uweojii kwukwara na o ji ụgbọala ya suo ndị mmadụ ka ọ na-anyapụ, ma kwakanyekwa ha mgbọ, tupu ọ laa n’ụlọ gbagbuo nwunye ya na nwa ya nwoke, ma gbagbuokwa onwe ya.

    Nwa ya na-aga n'ọtaakara ahụ

    Otu onye nkuzi sị na onye ojiegbe ahụ wakporo ya, gwara ndị ntaakụkọ Thai TV na nwa Khamrab na-aga n'ọtaakara ahụ.

    Ọ gwara ụlọntaakụkọ ahụ na Khamrab na-abịa akpọsa nwa ya nwoke ebe ahụ, ma kwuo na ọ dịghị ka onye na-achọ nsogbu mgbe ya na ndị nkuzi na-akpakọrịta nkata.

  5. Ụlọomeiwu Rivas steeti ekepbiela iwepụ oke Celestine Omehia dịka onye bụbụ Gọvanọ

    Celestine Omehia

    Ebe foto si, Atiku Support Group/Facebook

    Ụlọomeiwu Rịvas steeti ekpebiela ka Gọvanọ Nyesom Wike kwụsị inye Celestine Omehia oke na ugwu dịka onye bụbu gọvanọ steeti ahụ.

    N’okwu nke onyeisi otu pati kachasị n’ụlọomeiwu ahụ bụ Martin Amaewhule, kpalitere, o kwuru ka ha kagbuo mkpebi nke ụlọomeiwu steeti ahụ kpebiri n’abalị 10 nke ọnwa Juun afọ 2015, ka a nabata Omehia dịka aka chịburu steeti ahụ ma nye ya oke niile ruru ya dịka ọkwa ahụ sị dị.

    Amaewhule, kwuru na ịnabata Omehia megidere mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere n’afọ 2007 ebe ụlọikpe ahụ wepụrụ Omehia sị na ọ bụghị ya meriri na ntuliaka e mere n’afọ ahụ.

    Dịka ha gbaghachara okwu ahụ, mmadụ 21 n’ime ha kwadoro mkpebi ahụ nke Onyeisi ụlọomeiwu bụ Iku-Owaji Ibani, kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi.

    Cheta na Celestine Omehia nke otu PDP bụbụ gọvanọ Rivas steeti malite n’ọnwa Mee afọ 2007 ruo abalị 25 nke ọnwa Oktoba 2007 bụ oge Ụlọikpe Kachasị wepụrụ ya, sị na ọ bụghị ya meriri na ntuliaka ahụ kama ọ bụ Rotimi Amaechi.

    Amaechi meriburu ntuliaka imeụlọ PDP mana pati ahụ wepụrụ aha ya tinye nke Omehia nke mere ka Amaechi kpụpụ ha ụlọikpe ebe o mechara merie.

  6. Ndeewonu o!

    Onye biri,be ya biri.

  7. Nnukwu ụjọ dị na ọrịa Ebola nwere ike ịbata Naịjiria ọzọ - NCDC

    Ebola

    Ebe foto si, EPA

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) adọọla aka na ntị na ọrịa Ebola nwere ike ịbata Naịjiria ọzọ.

    Ifedayo Adetifa, bụ ọnyeisi ụlọọrụ NCDC, kwuru n'ozi o ziputara n'ụbọchị Tuzde, na ya bụ ọrịa nwereike isi na mba Uganda bata Naịjiria "n'ihi na njem ụgbọelu ndị Naịjiria na-eme site n'ọdọụgbọelu Kenya gaa mba Uganda na mba ndị ọzọ ha na Uganda nwere okeala, arịala elu".

    Dkt Adetifa kọwara na ya bụ ọrịa nwere ike ifesa na Naịjiria n'ebe ọ dị ukwuu ma mmadụ buru ya bata, n'ihi ọtụtụ ọgbakọ na njem a na-eme n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị, njem oge ekeresimesi na-abịa nakwa emume ndị ofufe dị iche iche a na-emekarị na ngwụcha afọ.

    O kwuru na NCDC na ndị otu ha emeela nchọpụta maka ihe ize ndụ dị na ya iji kee nkwụcha, ma malite usoro inyocha ndị njem na-abata Naịjiria, ma tinyekwa anya na ndị si mba Uganda gafee maọbụ bata, iji mara ọnọdụ ahụike ha ma ụbọchị 21 gachaa.

    Ha kwuru na ọrịa Ebola abatabeghi Naịjiria, mana gọọmentị na-eke nkwụcha iji gbochie ma kwado ibuso ọrịa a agha ma o selite isi.

    Ọrịa Ebola ụdịrị nke Sudan enwebeghi ọgwụgwọ maọbụ ọgwụ mgbochi.

    Cheta na ndị ọrụ ahụike mba Uganda kwuputere na Ebola eselitela isi na mba ha, n'ọnwa Septemba.

    Ha kwuru na ya bụ ọrịa si n'ụdịrị nke Sudan (Sudan strain), dịka a chọtara ya n'ahụ otu onye n'obodo Madudu dị na mba Uganda.

  8. Ukraine anapụla ndị agha Russia mpaghara ndịda mba ha ejibidoburu

    Ndị agha Ukraine na-agba mba ịnapụ Russia akụkụ mba ha ejibidoro

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị agha Ukraine na-agba mba ịnapụ Russia akụkụ mba ha ejibidoro

    Ndị agha Ukraine agbapụtala ndị bi Kherson nke mpaghara ndịda mba ahụ ebe ndị agha Russia jibidoburu dịka ha weghachịrị ọchịchị ebe ahụ ugbua.

    Nke a na-abịa dịka ndị agha Ukraine na-eweghara ọchịchị ebe ndị Russia wegharaburu.

    Cheta na na nso nso a, ndị agha Ukraine napụkwara ndị Russia ikike ọchịchị na mpaghara ugwu mba ha.

    Agbanyeghị nke a, n'izu gara aga, Onyeisiala Russia bụ Vladimir Putin 'kewapụrụ' mpaghara anọ n'Ukraine, 'nye ha nnwereonwe' ma tinye ha na mpaghara nọzị na Russia.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelenskyy anabataghị nke a ma gụnyekwara ndị isi ọchịchị mba ofesi dị icheiche dịka ha kwuru na usoro akaike Putin jiri mee nke a ezighị ezi ma ncha.

  9. Sanwọ-Olu nke steetị Legọs ebuliela ụgwọọnwa ndị ọrụ oyibo na steetị ya

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu

    Gọvanọ Lagos Steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekweela ndị ọrụ oyibo steeti ahụ nkwa ibuli ụgwọ ọnwa ha na ngwụcha ọnwa Ọktoba a. Sanwo-Olu bụ onye sị na ya ma ahụhụ ndị mmadụ na-ata nkwa otu ọnụahịa siri laa elu sị na ya jiri nke a eti ha aka n’obi.

    Ọ sị na, "anyị agaghị eche gọọmentị etiti. Anyị ga-eme nke anyị maka na anyị mee ya obi adị ndị mmadụ mma."

    O kwuru na ya na ndị isiọrụ nke bụ Head of Service ga-elebe ụgwọ ha anya mara otu ha ga-esi mee ya na ngwụcha ọnwa Oktoba.

    O kwukwara na gọomentị ya ga-enye ndị isi ọrụ ụgbụọala ọhụrụ otu narị ebe ha ga-enye dị ọzọ ụgbọala mgbe e mechere.

    Ọ sịkwa na gọọmentị ya arụọla ụlọ obibi estati dị 16 na steetị ahụ.

    Ọ sị na gọọmentị ga-esepụ nwaobere ego n'ụgwọ ọnwa iji nyere ha aka ịnweta ya bụ ụlọ.

  10. North Korea atụọla Ogbunigwe fefere mba Japan

    North Korea

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba North Korea atụọla ogbunigwe ‘missile’ fefere na mba Japan, dịka ọtụtụ na-ekwu na ha kpacha anya mee nke a iji kpasuo mba Japan na mba Amerịka iwe.

    Ogbunigwe ‘ballistic missile’ a gara njem ihe karịrị kilomita 4,5000 tupu ọ daa n’ime oke osimiri Pacific - Ọ bụrụ na ọ gara ụzọ ọzọ, ọ gaara eru mpaghara Guam nke mba Amerịka nwe.

    Nke a bụ ogbunigwe mbụ North Korea na-atụ na-agafe mba Japan kamgbe afọ 2017.

    Nke a mere ka ndị ọrụ nchekwa na mba Japan zipu ozi na-agwa ụfọdụ ndị mba ha ka ha kee nkwụcha.

    People in the north of Japan, including Hokkaido island and Aomori city, reportedly woke up to the noise of sirens and text alerts which read: "North Korea appears to have launched a missile. Please evacuate into buildings or underground."

    Otu mba ụwa bụ United Nations machiri North Korea ịtụ ogbunigwe ballistic na ogbunigwe nuclear.

    Ịtụ ogbunigwe ka ọ gafee mba ọzọ bụkwa ihe a machiri amachi n'ihi na ọ bụ ichọ okwu.

  11. Ụtụtụ ọma ndị ọma

    Anyị ga na-ewetara gị ọkpụrụkpụ akụkọ niile na-eme na mba ụwa taa.

  12. Nwanne agbagbuola nwanne ya dịka ha na-anwale 'odeshi'

    Ndị uweojii Kwara steeti kwuru na- ha na-achọ nwanne gbagburu nwanne ya gbara afọ 12 na Dutse Gogo, dị n'okpuru ochịchị Kaiama.

    Abubakar Abubakar ji egbe nna ha bụ dinta gbagbuo nwanne ya bụ Yusuf Abubakar dịka ọ na-anwale ọgwụ odeshi ọ zụrụ ọhụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Okasanmi Ajayi,kwuru ozi mgbasaozi o wepụtara sị, "N'ihe dịka Elekere 11 n'abalị abụọ nke ọnwa 10 nke afọ 2022, Ogige ndị uweojii natara natara mkpesa maka otu nwata nwoke bụ Yusuf Abubakar gbara afọ 12 nke nwanne ya nwoke tọrọ ya bụ Abubakar Abubakar,ụmụ otu onye dinta bụ Abubakar Abubakar n'obodo Dutse Gogo, dịka ha na-anwale ọgwụ odeshi."

    Egbe ntụ

    Ebe foto si, Getty Images

  13. NDLEA anwuchiela nwoke a hụrụ ọgwụ ike ego ya ruru N13bn n'ụlọ ya

    Ụlọ Ugochukwu Nsofor

    Ebe foto si, NDLEA

    Aka ngalaba na-ebu agha megide ọgwụike bụ NDLEA akparala aka otu nwa amadi maka akatamkpo ọgwụ ike a hụrụ n’ụlọ ya na Legos.

    A nwuchiri Ugochukwu Nsofor Chukwukadibia gbara afọ 52, dịka a hụrụ ọgwụ 'tramadol' karịrị nde iri na abuọ nke ọnụahịa ya ruru ijeri naira asatọ na ụma(N8,860,000,000),n’ụlọ ya dị na VGC,Lekki, Legos.

    Ozi nke ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Baba Femi binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde kwuru na ndị ọrụ NDLEA gbadoro ụkwụ n' ozi mgbaama ha nwetara zọchie n' ụlọ Ugochukwu dị na Plot A45 Road VGC Lekki,Legos n'abalị 30 nke ọnwa Septemba afọ 2022, ebe ha nwetara igbe ọgwụ ike Tramadol Hydrochloride 225mg dị 443 dị n'ime ya.

    Tupu a nwụchie ya, Ugochukwu , onye Ihiala n'Anambara steeti so na ndị NDLEA na-achọ achọ maka iso n' otu ndị na-ebu ọgwụike tramadol na Naijiria.

    Nchọpụta ụlọọrụ ahụ merela gosiri na Ugochukwu nwere nnukwu ụlọ isii na VGC , jiri otu n'ime ụlọ ndị a meere ebe ndo ngwahịa na-edowe ọgwụ ike, oji otu mere ụ,lọọrụ ya, ebe ọzọ bụ ebe o bi ebi.

    E nwetara ụgbọala oke ọnụahịa ise n'ụlọ ya abụọ nke gunyere ụgbọala jeep na-eche mgbọ.

    Ugochukwu Nsofor Chukwukadibia

    Ebe foto si, NDLEA

  14. Ndewonu, Igbo ndị Ọma!

    Ole etu ụnụ mere?

    Soro anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa taa

  15. Ọkụ agbagbuola otu onye n’otu ụlọ dị na Bariga, Legọs

    Akụkọ si akụkụ Bariga nke Legọs steeti kwuru na otu onye nwụrụ dịka ọkụ gbara ụlọ nwere ime ụlọ 10 ma gbagbu otu nwoke gbara afọ 50 n’ụtụtụ Sọnde.

    Margaret Adeseye bụ onyeisi ụlọọrụ gbata gbata nke mmenyụ ọkụ bụ Lagos State Fire and Rescue Service gbaara ndị ụlọ ntaakụkọ Channels TV ama nke a ma kwuo na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ wụgara ebe ahụ ngwa ngwa ma gba mbọ mmeyụọ ya bụ ọkụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na otu ụlọ ọzọ gbara ọkụ n’akụkụ Shomolu nke metụtara ime ụlọ asatọ nakwa ụlọahịa anọ.

    Adeseye kọwara na ndị ọrụ ha si ebe ha gara mmenyụ ọkụ na Shomolu pụta mgbe ha nụrụ ọzị nke Bariga ahụ.

  16. Etu e si chọta ozu ụmụnwaanyị abụọ n'ọfis dọkịnta na Kwara steeti

    Foto ndị uweojii setere ebe ha sị bụ ebe ha chọtara ozu ụmụnwaanyị abụọ

    Ebe foto si, Kwara state police

    Nkọwa foto, Foto ndị uweojii setere ebe ha sị bụ ebe ha chọtara ozu ụmụnwaanyị abụọ

    Ndị uweojii achọtala ozu ụmụnwaanyị abụọ na ngwongwo ha n’ọfis otu Adio Adeyemi Adebowale, bụ dọkịta na-arụ n’ụlọọgwụ Kaiama General Hospital dị na Kwara steeti.

    N’ozi ndị uweojii steeti ahụ ziputere, ha kwuru na ha ezigarala ndị uweojii Edo steeti ozi ka ha kpọnye ha Adebowale, bụ onye ndị uweojii Edo steeti nwụchiri maka ebubo igbu enyi ya nwaanyị n’afọ 2021.

    Ha kwuru na Dkt Adebowale sara asịsa n'aka ndị uweojii dịka ọ gwara ha etu o si gbuo enyi ya nwaanyị a kpọrọ Ifeoluwa, bụ a malitere ịchọ na mpaghara Tanke dị n'Ilorin, n'afọ 2021.

    Ọ gwara ndị uweojii na ọ tọgbọrọ ozu ya n'ọhịa dị na mpaghara Alapa n'Ilorin, bụ ebe ndị uweojii mechara jee chọta ya.

    Asịsa a Adebowale sara, mere ka ndị uweojii gawa n'ụlọọrụ ya n'ụlọọgwụ ahụ, ebe ha hụrụ ihe dị ka ili e gwuru egwu ma jiri simentị nyachie, n'ime ọfis ya.

    Dịka ndị uweojii si kwuo, ha bọrọ ya bụ ili wee hụ ozu otu nwaanyị e mechara mata dịka Nofisat Halidu, dịka di ya bịara nyoo ma sị na ọ bụ nwunye ya kpọmkwem.

  17. Nnọọ n'ọgbakọ anyị

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ a.

    Nọnyere anyị ebe a dịka anyị ga na-ewetere gị akụkọ ndị a kpụ n'ọnụ na Naịjiria ma na mbaụwa.

    Ndeewo.