Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụnụ asaala chi

    Igbo bụ Igbo mma mma nụ o!

    ụnụ asaala chi?

  2. Ndí obodo Ike Ekweremadu na-ekpere ya ekpere be ha taa bụ Fraịde

    ndi Mpu
    Nkọwa foto, Ndị Mpu, dị n'Okpuruọchịchị Aninri, Enugu steeti pụtara ikpere Ike Ekweremadu ekpere

    Ndị Mpu dị na okpuruọchịchị Aninri dị na Enugu State gbakọtara imere ya ekpere maka ọnọdụ ọjọọ ọnwetere onye ya.

    Ha na-arịọ Chineke ka ọ mee ka atọhapụ ya na-agbu nke mkpọrọ ọ nwetere onwe ya na ya.

    Cheta na Ekweremadu nọ na mkpọrọ na mba Briten maka ebubo ịtọọrọ mmadụ nkwa ichọ igoro akụkụ ahụ.

    A nwụchiela Ike Ekweremadu na nwunye ya na mba UK.

    Ike Ekweremadu na nwunye ya, Beatrice

    A nwụchiela Ike Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice Nwanneka na mba UK maka ebubo na ha chọrọ ịghụrụ ime ahụ nwatakịrị.

    Ekweremadu bụ sinetọ n'ụlọomeiwu Naịjiria, na nwunye ya ga-agba n'ụlọikpe Uxbridge Magistrate Court, ebe a ga-ekpe ha ikpe maka ihe Bekee kpọrọ 'organ harvesting'.

    Ike Ekweremadu

    Ebe foto si, EBE FOTO SI,IKE EKWEREMADU/FACEBOOK

    Ekweremadu dị afọ 60 na nwunye ya dị afọ 55, ga-azara ọnụ ha n'ụlọikpe taa bụ 23 nke ọnwa Juun.

    A malitere inyocha ya dịka a kpọkuru ndị uweojii ka ha bịa nyochaa ebubo na ha mere mmadụ ohu, n'okpuru iwu a kpọrọ 'modern slavery legislation' e hibere n'ọnwa Mee afọ 2022.

    Ndị uweojii Metropolitan Police nke mba UK kwuru na ha agaghị agbazị ihe ọbụla gbasara okwu a n'anwụ, dịka a maliterela ikpe ha ikpe.

    Onye bụ Ike Ekweremadu?

    • Ekweremadu bụ onye ọkaiwu
    • Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọrọla n'ụlọomeiwu ukwu Naịjiria kemgbe afọ 2003 ruo ugbua, n'okpuru pati People's Democratic Party (PDP)
    • Ọ na-anọchi anya ndị Enugwu Westị n'ụlọomeiwu ahụ
    • Ọ rụrụ dịka osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjiria ugboro atọ, site n'afọ 2007 ruo 2019
    • Ọ rụkwara dịka onyeisioche okpuruọchịchị Aninri n'okpuru pati United Nigeria Congress Party (UNCP) n'afọ 1997
    • Ọ rụkwara dịka onyeisi ndị ọrụ gọvanọ Enugwu steeti site n'afọ 1999 ruo 2001. E mechara mee ya odeakwụkwọ gọomentị Enugwu steeti site n'afọ 2001 ruo 2002
    • A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee afọ 1962
    • Ekwere mmadụ bụ onye obodo Amachara-Mpu nke dị n'okpuruọchịchị Aninri dị n'Enugwu steeti
    Ike Ekweremadu

    Ebe foto si, EBE FOTO SI,IKE EKWEREMADU/FACEBOOK

    Gịnị bụ 'organ harvesting'?

    'Organ Harvesting' maọbụ 'organ procurement' bụ iwere akụkụ ahụ mmadụ iji tinyere onye ọzọ.

    Usoro e si etinyere mmadụ akụkụ ahụ onye ọzọ bụ nke bekee na-akpọ 'organ transplant'.

    Akụkụ ahụ ndị a nwere ike ịbụ akịrị (kidney); umeji (liver), ngụgụ (lungs), dịrị gawazie.

    E nwere ụzọ dị icheiche e si enweta akụkụ ahụ ndị a n'ụzọ iwu kwadoro.

    Ike Ekweremadu

    Ebe foto si, EBE FOTO SI,IKE EKWEREMADU/FACEBOOK

    Ha gụnyere: mmadụ inye ikike ka e were akụkụ ahụ ya ma ọ nwụọ, maọbụ mmadụ iji aka ya wepụta onwe ya ka e were akụkụ ahụ ya tinyere onye ọzọ.

    Mana e nwekwara ndị ekperima na-atọrọ mmadụ ma were akụkụ ahụ ha n'ike iji ya kpara ego, a na-akpọ nke a 'organ theft' na bekee.

    E nwekwara ndị na-eji aka ha ga ree akụkụ ahụ ha iji nweta ego, nke bụ 'organ trade' na bekee.

    Iwu mbaụwa machiri 'organ theft' mana na mba ụfọdụ, mmadụ iji aka ya ere akụkụ ahụ ya emegideghi iwu.

  3. Lekwa Liz Truss n'ihu Downing Street díka a na-achọ onye ga-anọchị ya

    Liz Truss

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, Lizz Truss mgbe ọ gachara mmegharị ahụ n'ụtụtụ Faịde

    Dịka ndị omeiwu mba UK na-agba kpurukpuru na-achọ onye ga-anọchi onyeisiala nke rituru, Liz Truss bụ onye rituru gara ụlọ onyeisiala n'ụtụtụ a ka ọ si mmegheri ahụ pụta.

    Ụnyaahụ ka ọ kwụ n'ọnụụzọ 10 Dwoning Street kwuo na ya agbaala arụkwaghị m. nke mere ya onye ọchịchị ya kacha pee nta n'UK.

  4. Mmadụ 50 anwụọla na ngagharịiwe na mba Chad

    Ọgbaghara na mba Chad

    Ebe foto si, AFP

    Ọchịchị ndị uwe kakị kwuru na e gbuola mmadụ 50,ebe ihe karịrị mmadụ 300 merụrụ ahụ n'ọgbaghara dịka ha na-eme ngagharịiwe, eti mkpu ka e nyeghachị ọchịchị n'aka ndị nkịtị.

    Praim Mịnista a hụpụtara ọhụrụ na mba ahụ bụ Saleh Kebzabo kwuru na ụfọdụ ndị na-eme ngagharịiwe ahụ ji ngwa ọgụ.

    Ụfọdụ ndị e gburu bụ ndị ọrụ nchekwa.

    Ka ọ dị ugbua, gọọmentị etinyeela mmachi 'onye-apụla n'abalị' n'isiobodo Chad bụ N'Djamena nakwa obodo abụọ ngagharịịwe ahụ metụtara.

    Dịka gọọmentị na-ekwu na ha ga-enyocha ihe butere ngagharịiwe ahụ, otu onye ndọrọndọọ ọchịchị anọghị na gọọmentị gwara BBC na ngagharịiwe ahụ ga na-aga n'ihu rue emezuru ihe ndị na-eme ya chọrọ.

  5. Boris Jonhson ọ ga-alọghachite azụ dịka onyeisiala mba UK?

    Boris Johnson

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Boris Johnson

    Igbo is na ogori lụọ dị abụọ ọ mara nke ka ya mma.

    Kepukepu na-akpọtụ na mba Uk na onye bụbu onyeisiala ha achụdara achụda bụ Boris Johnson nwere ohere imeri ma ọpụta ịzọ ya bụ ọkwa ọzọ dịka Liz Truss bụ onyeisi ha ugbua rịdara na ya bụ oche.

    Otu n'ime onye kọmitii 1922 ndị pati ha bụ Tory sị na "obi kara m na Boris Johnson ga-emeri ma ọ pụta ọzọ".

    Na mkparịta ụka ya ndị Radio 4, Karl McCartney kwuru na Johnson ụrụ ọrụ ya nke ọma mgbe ọ nọ n'ọchịchị "site na ihe ọmere mgbe Covid-19 ruo na agha Ukraine. Ọ kwụwara aka ya ọtọ ma kpọtụkwara ndị o kwesiri ịkpọtụrụ mgbe ọ dị na mkpa".

    Karl McCartney

    Ebe foto si, Photoshot

    Nkọwa foto, MP Karl McCartney

    Ndị pati anọghị n'ọchịchị bụ Labour pati nakwa ndị ụfọdụ ndị midia rụrụ "ezigbo ajọ ọrụ" n'isi Johnson bụ ihe mere o jiri tinye akwụkwọ arụkwaghị m maka nletu anya ndị otu Pati ya, ka o McCartney kwuru.

    N'agbanyeghị, McCartney sị na ya amabeghị ka Johnson achọrọ ịpụta maka ya bụ ọkwa ọzọ mana ihe ọ ma bụ na Johnson sọ na ndị Pati ha ji anyaisi.

    MP Crispin Blunt

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, MP Crispin Blunt

    Kedụ ihe ndị Tory ọzọ n'ekwu maka Boris Johnson?

    N'aka ọzọ, otu onye pati Tory ọzọ nakwado Rishi Sunak bụ Crispin Blunt ekwuola na ọbaghị uru "ịdọchi ha azụ na Ijipt" site n'ịkpọchite Boris Johnson azụ.

    Ọ kọwara Johnson dịka "onye ejighị ihe akpọrọ ihe, onye ihuruhu" (ma ọ bụrụ ndị Mbano).

    Blunt sị na ọ bụghị ụdị mmadụ Boris Johnson ka a chọrọ ugbua iji wechita ezigbo aha pati ha bụ nke kpụgoro n'ala ugbua.

    Blunt sị, "echeghị m na ọ dị mma ịlaghachi azụ ebe ahụ ya na ihe niile so ya n'azụ. Anyị kwesiri ịgawa n'ihu ghara ịme ihe ụkpaọchị ugbua. E cheghị na ọ dị mma anyị ịlọghachị azụ ebe anyị si pụta izụka isii gara aga".

    Rishi Sunak ọ chọrọ ịzọ ọchịchị?

    Ka nke a na-akpọtụ, ya bụ onye akpụ n'ọnụ ike dị n'obi bụ Rishi Sunak ekweghị ekwụ ma uche ya a dị na ya bụ ọchịchị ka ọ dịghị ya.

    Ndị ntaakụkọ chebiiri ya n'ihuụlọ ya n'ụtụtụ a sị na ọ tụpụghịrị ha ọnụ mgbe o si n'ime ụlọ ya pụta banye n'ụgbọala ya chipu.

    Chete na Liz Truss meriri Sunak izu isii gara aga mgbe o ji vootu 81,000 merie ya na vootu 60,000 Sunak.

  6. Oge eruola ileba anya n'ihe na-achụ ndị ọrụ ahụike na Naịjiria - Gbajabiamila

    Femi Gbajabiamila

    Ebe foto si, Femi Gbajabiamila Twitter

    Femi Gbajabiamila bụ onyeisi Ụlọomeiwu Nta Naịjiria akwaala arịrị maka etu ọtụtụ ndị ọrụ ahụike si ahapụ Naịjiria n'ike n'ike agbaga mba ofesi.

    Gbajabiamila kwuru nke a oge ndị National Association of Resident Doctors (NARD) bụ otu jikọrọ ndị dọkịta, bịara njem nleta nna nke ya, sị na oge eruola mgbe gọọmentị ga-etinye anya n’ihe na-eme ka ndị ọrụ ahụike na-agbapụ karịa ịrụ ọrụ na Naịjiria.

    O kwuru sị na ọ bụghị ihe nkwalite mmụọ na ọtụtụ ndị ọrụ ahụike, ọkachasị ndị ntorobia, na-apụ n'igwe.

    Ọ sị "Ọnụọgụgụ a na-atụ ụjọ, ọ naghị akwalite mmụọ ka ọtụtụ ndị ahụike, ọkachasị ndị ntorobia ha na-apụ n'igwe na mba ihe karịrị mmadụ nde narị abụọ nọ, enwerịrị ebe mmiri si banye opi ụgbọghụrụ.

    "Unu ekwuola okwu gbasara ihe nrite ruru onye nakwa ụgwọ ọnwa, nke ahụ bụ ihe dị oke mkpa. Ị rụọ ọrụ, e kwesịrịrị ịkwụ gị ụgwọ, e kwesịrị ka a kwụọ gị ezigbo ụgwọ ọnwa nwere isi..."

    Ọ kọwara ihe o kwuru n'uju na Twitter ya:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Sudan: Ọgụ agbụrụ ataala isi mmadụ 150

    Ọgụ agbụ na agbụrụ emebiela ihe na mba Sudan

    Ebe foto si, AFP

    O pekata mpe, mmadụ otu narị na iri ise (150) anwụọla n’ọgụ agbụrụ na agbụrụ n’ime ụbọchị abụọ, na steeti Blue Nile dị na mba Sudan.

    Ya bụ ọgụ a sị bụ nke kachasị njọ merela n’ime ọnwa ole na ole a, malitere n’izu gara aga dịka esemokwu dapụtara ebe agbụrụ abụọ ahụ na-azọ ala.

    E tinyerela 'onye-apụla-ama-n'abalị' iji belata ọgbaghara a.

    Otu UN kwuru ụbọchị Tọzde na, "tigbuo-zọgbuo akarịala na mpaghara Lagawa na Blue Nile."

    "Udo tọrọ atọ agaghị alaghachi ma ọ bụrụ na gọọmentị akpọghị ọnọdụ nchekwa n'ime ime obodo mkpa."

  8. Ndewoonụ, Igbo ndị ọma

    Ndewoonụ, Igbo ndị ọma!

    Taa maara anyị nile mma!

  9. Etu e si wakpo Bernard Odoh na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi n'APGA

    Bernard Odoh na-azọ ọkwa Gọvanọ n'APGA

    Ebe foto si, Odoh

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi steeti n’okpuru APGA bụ Bernard Odoh etiela mkpu dịka awakporo ya mgbe ọ gara achụmnta vootu n’okpuru ọchịchị Izzi dị na steeti ahụ

    Dịka Odoh si gwa ndị ntakụkọ, ọ bụ ndị agboro amaghi ebe ha sị bụ ndị wakporo ha ebe otu onye Odoh sị bụ Ebubeagu nọchiri ya ụzọ ma gbaa ụgbọala ya egbe.

    "Ọ bụ n'ụzụ ụtụtụ ebe elekere isii nke ụtụtụ ka ndị nkwado m kpọrọ m n'ekwentị na onyeisioche okpuruọchịchị Izzi gbochiri ha ịbanye n'ebe ha kwadoro ịnwe mmemme achụmnta vootu" ka o kwuru.

    BBC ka na-agbalị ịnweta onyeisioche okpuruọchịchị Izzi ịmata ihe mere n'ezie.

    Odoh kwukwara na "Mgbe anyị garuru Izzi, anyị zutere ndị Ebubeagu nọchiri anyị ụzọ, ha gbara ụgbọala anyị egbe. Anyị kpọ ndị nchekwa ga ebe ahụ, ndị uweojii, ndị DSS na ndị otu anyị".

  10. Anyị arụchaala akwammiri Naịja nke abụọ - Fashola

    Akwammiri Naịja

    Ebe foto si, Nigerian Government

    Gọọmentị etiti ekwuola na oge na-adịghị anya na a ga-agbape akwammiri Naịja nke abụọ jikọtara Delta na Anambra Steetị maka ndị njem.

    Minista na-ahụ maka ọrụ nakwa ụlọobibi bụ Babatunde Fashola kwuru nke a n’Abuja n’ọgbakọ ndị mịnịsta e mere na Wenezde.

    Ọ sị na a rụchaala akwammiri Naịja nke abụọ n’onwe ya na ndị mmadụ nwereike iji ụkwụ gafee na ya.

    Fashola sị na ihe fọziri ugbua bụ ịrụ okporoụzọ jikọrọ akwammiri ahụ n’obodo Asaba nke dị kilomita anọ.

  11. Elnaz Rekabi: nwaadi Iran na-eme asọmpi iri elu lara mba ya ma ghara ikechi isi ya dịka iwu ha kwuru

    Elnaz Rekabi

    Ebe foto si, Screengrab

    Igwe mmadụ ejirila ọṅụ nabata nwaada Elnaz Rekabi bụ onye e ji asọmpi iri elu mara n'isiobodo ha bụ Tehran dịka o si asọmpi Asian Championship ọ gara na Saụt Koria bata.

    Ọtụtụ mmadụ jara ya ike maka obi ọ kara iji isi nkiti, ghara ikechi isi ya were gbaa ya bụ asọmpi iri elu.

    Iran nyere ụmụnwaanyị iwu ikechi isi, ukwu na aka ha mgbe dum, ọbụladị mgbe ha na-asọmpi ọbụla.

    Mana ihe mere na mba ahụ nsonso a mere ka ụmụnwaanyị gbaa isiakwara sị na ha agaghịzị ekechi isi ha n'ọha ọzọ.

    Nwaada, Rekabi gbara afọ iri atọ na atọ sị na ihe mere ya jiri mee otu ahụ bụ maka na ịchafụisi ya dapụrụ.

    Mana ndị mmadụ bụ ndị na-aja ya ike sị na nke ahụ bụ ụgha, na nke bụ eziokwu bụ na ndị gọọmentị Iran mayere ya ka ọ dee ya bụ ihe na Twitter ya.

    Elnaz Rekabi

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ọnye ama ama dịka onye ọrị elu ndị Iran mere asọmpi iri elu ma ọ o jighị Hijab kechie isi ya

    Ọtụtụ ihe onyonyo a hụrụ na ịntanetị na-egosi ebe ndị mmadụ na-akụrụ ya aka n'ọdọụgbọelụ ha na Tehran, na-etu ya aha sị "Elnaz is a heroine", nke pụtara na "Elnaz bụ dike".

    A na-ahụtazị ya bụ nwaada ka ihu onye e ji aga ọgụ.n'Iran.

    Mgbe ihe onyonyo ebe ọ na arị elu ma o jighị akwa isi pụtara na soshal midia, ọtụtụ ndị enyị ya chi obi n'aka maka ihe nwereike ịme ya ma ọ lọta.

    Mana ọtụtụ enweghị ike ịweta ya n'ekwentị.

    Ụnyaahụ bụ Tuzde ka ọ rịọrọ ndị enyi ya mgbaghara n'Instagram ya maka ekwentị ya a gaghị kemgbe ha na-akpọ ya.

  12. Onye nke anọ na ndị agha udo nke UN ogbunigwe gbara na Mali anwụọla

    Ndị agha nchekwa UN

    Ebe foto si, Minusma/Twitter

    Nkọwa foto, Ya bụ ogbunigwe gbapụrụ na Mọnde

    Onye nke anọ na ndị agha udo nke UN na mba Mali anwụọla site n'ogbunigwe IED gbapụrụ mgbe ha na-agagharị na-achọ ogbunigwe ndị e liri n'ala, na mpaghara Tessalit nke ugwu mba Mali.

    Ya bụ ogbunigwe gbapụrụ n'ụbọchị Mọnde, 17 nke ọnwa Ọktoba 2022, gburu ndị agha mmadụ anọ bụ ndị si mba Chad.

    Ka ọ dị ugbua, ihe ruru ndị agha 180 anwụọla kemgbe ihe ruru afọ iri a malitere nchekwa udo na mba Mali.

    A malitere nchekwa udo a iji buso ndị oyindụegwu agha, mana ya bụ ọgbaghara ka na-amụbawanye.

    El-Ghassim Wane, bụ onyeisi ọrụ nchekwa ahụ, gwara nzukọ ndị isi ọrụ nchekwa otu UN mere na New York nso nso a, na ha chọkwuru enyemaka ma chọsie ya ike.

  13. Atọrọla ndị ọrụ ahụike, ndị nọ n'ute ọrịa na ndị na-elekọta ha na Niger steeti

    Maapụ Niger steeti
    Nkọwa foto, Maapụ Niger steeti na-egosi Lapai, ebe ya bụ mwakpo mere

    Ndị ojiegbe awakpoola ụlọọgwụ tọrọ ma ndị ọrụ ahụike ma ndị nọ n’ute ọrịa na ụfọdụ ndị na-elekọta ha, na Niger steeti n’ụbọchị Tuzde.

    Aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Sani Bello, akatọọla ya bụ mwakpo e mere n’ụlọọgwụ Gulu General Hospital, ma kwuo na ndị kpara arụ a enweghi obi mmadụ.

    Ka ọ dị ugbua, amabeghi ọnụọgụgụ mmadụ ole a tọrọla na ya bụ mwakpo, mana otu onye bi n'ebe ihe mere gwara BBC na mmadụ atọ anwụọla ebe atọrọla mmadụ 20.

    Mara na ndị ntọ na ndị ojiegbe na-akpakarị mkpamkpa na Niger steeti nakwa ogige ya.

  14. Onweghi ihe ga-eme ka anyị ghara iji BVAS eme ntuliaka 2023 - INEC

    Mahmood Yakubu, onyeisi ụlọọrụ Inec

    Ebe foto si, Inec

    Mahmood Yakubu bụ onyeisi ụlọọrụ Inec ekwuola na o nweghi ihe ga-eme ka ha ghara iji igwe Tekịnụzụ Bimodal Voter Accreditation Sysytem (BVAS) eme ntuliaka kwụ ọtọ ma dokwaa anya n’afọ 2023

    Nke a na-abịa dịka kepukepu na-ekwu na ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ ka a kagbuo atụmatụ iji BVAS eme ntuliaka.

    Yakubu kwuru nke a mgbe n’ọgbakọ ọzụzụ maka iji tekịnụzụ eme ntuliaka nke e mere n’Abuja n’ụbọchị Tuzde.

    Ọ gara n’ihu rịọ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-azọ ọkwa ka sepụ aka n’ihe nwereike ibute ọgbaghara na ntuliaka.

  15. Igbo ndị ọma anyị ekelee

    Anyị ji obiọma anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Buru oche bịa gụrụ, kirie ma nụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Daalụ!

  16. Ogbugbu egburu nwaada Lola gbara afọ 12 wụrụ ndị mmadụ akpataoyi na Fransi

    Lola

    Ebe foto si, Facebook

    Akpataoyi awụọla ndị mmadụ na mba Fransi maka nwata akwụkwọ nwaanyị gbara afọ iri na abụọ (12) e gburu tinye n'ime akpati n'akụkụ ụlọ ebe o bi.

    N'ụlọakwụkwọ ka ya bụ nwaada Lola na anọkarị tupu ọnwụọ.

    Nna ya chọwara ya mgbe ọhụghị ya ka akwụkwọ gbasara.

    Na mgbede ka ahụrụ ozu ya n'akpati ebe a dọwara ya n'akụkụ ụlọ ha na mpaghara okpuruọchịchị ha kpọrọ arrondissement na French.

    Nna Lola bụ onye na-elekọta ebe obibi ogbe ebe ha bi.

    N'ime igbe ebe ahụ e tinyere ya, e kere ya eriri n'aka.

    Ọ nwekwara apa eriri n'olu ya.

    Mana nchọpụta gosiri na ọ bụ ụkọ ikuku bụ ihe gburu ya.

    E tinyere edemede abụọ n'ukwu ya abụọ.

    E dere 'O" n'otu, dee "I" na nke ọzọ.

    Lola

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii jidere otu nwaanyị a na-enyo n'aka ya dị na ogbugbu Lola.

    Aha ya bụ nwaanyị si Ọljiria bụ Dahbia B.

    Ọ bụ kamera dị n'ebe ahụ setere nwaanyị ahụ mgbe ya ka Lola na-ata ụlọ ebe ahụ n'ehihie Fraịde.

    Emechere hu ya ka o ji akpati sị n'ụlọ ahụ pụ naanị ya na-emegheri n'ụzọ.

    Otu onye huru ihe mere sị na ọ na-eri ngarị n'aka ndị na ere ahụ mmadụ.

    Ndị uweoji sị na ha ekweteghị na ọ bụ ya bụ nwaanyị ga-eme ụdịrị ihe ahụ.

    Ha sị na nke ka njọ bụ na Dahbia B enweghị ebe obibi na ọ dị ka isi adịchaghị mma.

    Onye ọzọ aka ji bụ otu nwaamadị gbara afọ 43, bu ya bụ Dahbia B n'ụgbọala pụọ ebe ahụ.

    Ndị uweoji na-eche na ya dụraịva bughariri Dahbia B ebe niile mechaa buchite ya n'ogbe ebe ahụ bụ ebe nwaanne ya nwaanyị bi.

    Ya na nwanne ya nwaanyị sechere okwu nke butere oke ụzụ n'ogbe ha tupu ọ gbapụ.

    O jighi akpati ahụ mgbe ọ gbapụrụ.bụ ebe ọ rahụrụ n'ezi ruo echi ya.

  17. Otu ụzọ n'ụzọ atọ n'Anambra Steeti nọzị n'okpuru mmiri ugbua - Soludo

    Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Chukwuma Soludo

    Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo ekwuola na e kee steeti ahụ ụzọ atọ, otu ụzọ nọzi n’okpuru mmiri ugbua n’ihi ọdachi idemmiri na-anyụ steeti ahụ ịkpakwụ.

    Soludo kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ Channels TV n’ụtụtụ Tuzde.

    O kwuru na ọdachi a ga-eme ka nsogbu mbuze n’Anambra kawanye njọ.

    "Ihe kacha eche anyị uche ugbua abụchaghị idemmiri a na-enye nsogbu, kama na ọ bụ maka na o meela ka ọnọdụ ọjọọ chere anyị n'ihu n'Anambra kawanye njọ," Soludo kwuru.

    "Anambra bụ isi obodo Naịjirịa ebe mbuze kacha enye nsogbu; ihe ruru pasentị 30 ala Anambra steeti na-enwe nsogbu mbuze."

    Soludo kwuru na ha amalitela ikpocha ọwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ iji nye ohere ka mmiri na-ehupu, mana ugbua, mmiri si n'osimiri ejupụtala na steeti ahụ niile.

    N'otu aka ahụ, Soludo kwuru na gọọmentị Naịjiria kwesịrị ịmalite ugbua kewe mkwụcha maka ụdị ọdachị a ịdapụta n'ọdịnihu.

    "Gịnị ka anyị na-eme iji chekwaa onwe anyị maka ide mmiri n'otu afọ maọbụ abụọ n'ọdịnihu? Ọ bụrụ na Kamerun meghee 'dam' ha ọzọ, kedụ atụmatụ gọọmentị mapụtara maka ya? Ana m eche na anyị kwesịrị inwe ọgbakọ gbatagbata iji kpaa maka nke a," Soludo kwuru.

    Anambra Flood

    Dịka ngalaba 'National Emergency Management Agency' si kwuo, idemmiri a achụpụla ihe ruru mmadụ nde abụọ na ọkara n'ụlọ ha na steeti dị icheiche na Naịjirịa.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 603 anwụọla n'ọdachi a ebe ụlọ karịrị 200,000 alaala n'iyi.

    Nsogbu idemmiri na-enye nsogbu na steeti ndị a: Lagos, Yobe, Borno, Taraba, Adamawa, Edo, Delta, Kogi, Niger, Plateau, Benue, Ebonyi, Anambra, Bauchi, Gombe, Kano, Jigawa, Zamfara, Kebbi, Sokoto, Imo, Abia States, na Abuja.

  18. Rọshịa atụwakwa ogbunigwe aghaaghara n'Ukren

    Ogbunigwe gbariri ebe ụfọdụ na Kyiv

    Ebe foto si, KYRYLO TYMOSHENKO

    Ndị Rọshịa ejirila ogbunigwe tụjachaa eriri latik ndị Ukren nke mere na ọkụ adịghị na Kyiv na obodo ndị ọzọ.

    Ụgba ogbunigwe na-ada ebe niile n'isi ụtụtụ Tuzde, ebe elekere isii nke ụtụtụ Naịjirịa nke mere ka ndị mmadụ hụ anwụrụọkụ na-ebe igweọkụ latrik dị n'akụkụ iyi dị na Dnipro.

    Ọkụ na mmiri adịghịzị na Zhytomyr dị na mpaghara ndịda kyiv ebe emebiri ọtụtụ akụrụngwa na-enye ọkụ n'obodo.

    Aka na-ekwu na Rọshịa gbara ụgbọufe kamikaze na kyiv, o rughi otu ụbọchị nke a mechere ha atụkwa ogbunigwe ọzọ bụ nke mebiri igwe na-enye ọkụ na kyiv.

    Rọshịa malitere ịmebi akụrụngwa na-enye ọkụ n'ime obodo abaụghị n'ihu agha.

    Ndị ọrụ ọkụ agalarị imezi ya bụ ọkụ na mana ọnweghị onye ma ka ihu na anya ga-adị ya mgbe e mezichara ya maka mgbe oyi a na-abanye ugbua.

    Onyeisiala Ukren bụ Volodymyr Zelensky sị na, "Rọshịa emeela ihe e jiri mara ha site ị me ka onye omekatara ihe pụọ ụjọ".

  19. Ndị India na-ebuso ụmụ Naịjirịa agha n'otu Mahadum dị n'akụkụ Delhi

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Edemede Twitter otu nwaamadị onye India dere na-ekwu na ụmụakwụkwọ ndị India nọ n'otu Mahadum nọ na Delhi na-ebuso ụmụakwụkwọ Naịjiịa agha ebe ahụ.

    Ya bụ nwaamadị gara n'ihu kwuo na ihe karịrị puku mmadụ iri atọ (30,000) ndị Naịjirịa nọ na India agụ akwụkwọ ebe ihe ruru puku mmadụ iri ise (50,000) ndị Indịa nọkwa na Naịjirịa achụ ntaego.

    Onyeọrụ gọomentị Naịjirịa n'ihe gbasara nlekọta ndị nọ na mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa kwuru na Twitter na ya bụ ọgbaghara dapụtara mgbe ụmụakwụkwọ ndị Afrịka na ndị India gbara asọmpi bọọlụ.

    Erewa sị na ha zọpụtara ụmụ Naịjirịa dị 86, nwekwaa mkparịtaụka ha na ndị nnọchịte anya gọomentị India ịhụ na ha chekwara ụmụ Naịjirịa.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  20. Ukraine war: Ameríka sí na Iran dara iwu maka ínye Rọshịa ụgbọufe aṅụ (drone) ha tụrụ n'Ukriane

    Ebe ogbunigwe Russia mebiri ihe

    Ebe foto si, Getty Images

    Amerịka sị na ha kwetere n'ihe mba ndịda ndị ọzọ kwuru na Iran dara iwu mbaụwa maka inye Rọshịa ụgbọufe aṅụ 'kamikaze' ha jiri ga-agha n'Ukraine.

    Ụbọchị Mọnde ka Rọshịa tụrụ ọtụtụ ya bụ ụgbọufe na-agbari onwe ya mgbe ọ tụchara ogbunigwe akpọrọ 'kamikaze' na Kyiv, isiobodo Ukraine.

    Amerịka nabatara nkatọ ndị Fransi na Briten n'isi Iran maka inye Rọshịa ngwaagha ha jiri gaa agha na Ukraine, na-ekwu na ọ megidere iwu UN Security Council Resolution nke 2231.

    Ha sị na ya bụ iwu megidere Iran inye maọbụ iresi mba ọzọ ụfọdụ ngwaagha.

    Ndị Ukraine chọpụtara na ya bụ ụgbọufe aṅụ akpọrọ Shahed-136 bụ ndị Iran ruru ya.

    Aha ya bụ ụgbọufe aṅụ bụ 'kamikaze' sị na aha ndị agha Japan ji onwe ha chụọ aja site n'igbari onwe ha mgbe ha tụrụ ogbunigwe n'agha mbaụwa nke abụọ.

    Vedant Patel bụ ọnyeọrụ State Department nke Amerịka sị na "anyị kwetere na ya bụ ụfọụfe aṅụ nke mmadụ anaghị anya sọ na ngwaagha a machiri amachi sịte n'iwu nke 2231 nke UN.

    Iran agọọla ụkwụ na aka na ọnweghị mgbe ha jiri nye Rọshịa ụgbọufe ahụ mana Amerịka na-ekwusi ike na Rọshịa si mba dị iche iche nata ụgbọufe aṅụ nke agha.

    Ha sị na enwere ọtụtụ ihe akaebe gosiri na Rọshịa gbara ya bụ ụgbọụfe aṅụ n'Ukraine.

    Mmadụ asatọ anwụọla n'aka ya bụ ụgbọufe aṅụ - anọ na Kyiv, anọ ọzọ na Sumy.

    Amerịka sị na ha ga-eme ka Rọshịa zara ọnụ ha na maka ebubo igbu ọchụ a na-ebo ha n'Ukraine.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post