Karim Benzema abụrụla naanị eze ga-akwụ ọtọ n'egwuregwu bọọlụ mba ụwa

Ebe foto si, Rex Features
Karim Benzema na-agbara otu bọọlụ Real Madrid nakwa mba Fransị eritela nturuugo Ballon d'Or nke bụ nturuugo kacha nwee nkwanye ugwu n'egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile.
Benzema ritere nturuugo a n'emume e mere na mba Fransị n'ụbọchị Mọnde, ebe Sadio Mane nke mba Senegal gbara onye nke abụọ, Kevin de Bruyne nke Belgium gbara onye nke atọ.
Nke a bụ nke mbụ Benzema, onye dị afọ 34 na-erite nturuugo a, nke bụ n'ihi ike ọ kpara n'afọ bọọlọ 2021/2022.
N'ime afọ bọọlụ ahụ, Benzema nyere goolu 44, ma buo ike Champions League, iko La Liga, na nke 'World Club Cup'.
Ọ bụkwa nke mbụ nwa afọ Fransị na-erite nturuugo Balon d'Or kamgbe Zinedine Zidan nwetachara ya n'afọ 1998.
"Obi bụ m sọ aṅụrị maka nturuugo a e nyere m," Benzema kwuru. "Nke a bụ nrọ m rọrọ kamgbe m bụ nwatakịrị, mana akwụdosiri m ike. Onweghị ihe na-agaghị ekwe omume."
Ọ bụ ndị ntaakụkọ 100 n'ụwa niile na-atụ vootu iji họpụta onye a ga-enye nturuugo Balon d'Or nke afọ ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee etu e si tụọ vootu maka Balon d'Or nke afọ 2021/2022
1. Karim Benzema (Real Madrid, France).
2. Sadio Mane (Bayern Munich, Senegal).
3. Kevin de Bruyne (Manchester City, Belgium).
4. Robert Lewandowski (Barcelona, Poland).
5. Mohamed Salah (Liverpool, Egypt).
6. Kylian Mbappe (Paris St-Germain, France).
7. Thibaut Courtois (Real Madrid, Belgium).
8. Vinicius Junior (Real Madrid, Brazil).
9. Luka Modric (Real Madrid, Croatia).
10. Erling Haaland (Manchester City, Norway).
11. Son Heung-min (Tottenham Hotspur, South Korea)
12. Riyad Mahrez (Manchester City, Algeria).
13. Sebastien Haller (Borussia Dortmund, Ivory Coast).
14. Fabinho (Liverpool, Brazil) gbara nhatanha ya na Rafael Leao (AC Milan, Portugal).
16. Virgil van Dijk (Liverpool, Netherlands).
17. Luis Diaz (Liverpool, Colombia) gbara nhatanha ya na Dusan Vlahovic (Juventus, Serbia) na Casemiro (Manchester United, Brazil).
20. Cristiano Ronaldo (Manchester United, Portugal).
















