Nzukọ ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ n'Enugwu

Ndịisi ndịagha na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ emeela nzukọ ime ụlọ maka nchekwa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    O bụ obi ọma ka anyị ji asị unu nnọọọ n'ụbọchị taa.

  2. Ngalaba NBC agwaala ụlọorụ mgbasaozi ha mechie akara Twitter ha

    Jack Dorsey nwe  Twitter

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba na-elekọta mgbasaozi na Naịjirịa bụ NBC n’ịchafụ enyela iwu ka ụlọọrụ mgbasaozi dị icheiche na Naịjirịa mechiesie akara Twitter ha.

    Nke a na-abịa dịka gọọmentỊ Naịjirịa machiri Twitter bụ otu n'ime ndị soshal midia a ma ama.

    Ha kwuru na ụlọọrụ ọbụla emeghi nke a gosiri na ha akwadoghi ọdịmma gọọmentị Naịjirịa.

    Ọkaikpe kachasị na Naịjirịa kwukwara na a ga-akpụpụ ndị niile dara iwu ma jiri Twitter zisa ozi ụlọikpe ma kpịchie ha na mkpọrọ.

    Cheta na gọọmentị Naịjirịa machiri ụlọọrụ Twitter kemgbe ụbọchị Satọde maka ozi Onyeisiala Muhammadu Buhari ha wepụrụ

  3. Etu Coronavirus si kwụrụ n'Afrịka taa

  4. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  5. Gọvanọ Umahi enyela ndị Enyichiri ụbọchị asaa ịtọhapụ ụmụaka ha tọọrọ

    Gọvanọ Dave Umahi

    Ebe foto si, Èbonyi State Government

    Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi Steetị enyeela ndị Enyichiri ụbọchị asaa ka ha tọhapụ ụmụaka obodo Enyigba Izzi ha tọorọ ma ọ bụ ha e chee aka ghọrọ gọọmentị.

    Ndị okpuruọchịchị Enyichiri Ikwo na Enyigba Izzi nwere ọgbaghara n'etiti ha nke butere e ji tọọrọ ụmụaka si na mpaghara Enyichiri.

    Gọvanọ Umahi nyere iwu a site n'ọnụ kọmishọna mgbasaozi bụ Uchenna Orji ma sị na ọ bụrụ ụbọchị asaa gachaa ma ụmụaka ahụ apụtaghị na gọọmentị ga-enyocha ụlọ niile dị n'ebe ahụ.

    Ọ sị na gọọmentị maara na e kpeziela okeala na-esere obodo abụọ okwu site na enyemaka otu jikọtara ndị ụka kraịst nke were ha afọ atọ.

  6. Ihe mberede ụgbọoloko ataala isi ọtụtụ mmadụ na Pakistan

    Ihe mberede ụgbọoloko

    Ebe foto si, Reuters

    Ihe karịrị mmadụ iri atọ anwụọla ebe ọtụtụ merụrụ ahụ mgbe ụgbọoloko abụọ sọkatara isi na Ndịda mba Pakistan.

    Ndị ọrụ sị na otu ụgbọoloko na-eme njem na Sindh Province gbapụrụ n’okporo ya ma sọnye isi n’ụgbọoloko ọzọ bu ndị mmadụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata kpọgara ndị merụrụ ahụ gaa n'ụlọọgwụ dịka a na-eche na ọtụtụ nọ n'ọnọdụ ọjọọ.

    Ụdịrị ihe mberede ụgbọoloko a emeela na mba Pakistan kamgbe otu afọ gara aga.

    N'afọ 2013 na 2019 mmadụ otu narị na iri isii nwụrụ n'ụdịrị ihe mberede a dịka akụkọ si kwuo.

    Onye ọrụ gọọmentị ọkwa ya gbagotere na mpaghara Ghokti bụ Usman Abdullah gwara ndị ntaakụkọ Reuters na ọ na-ara ha ahụ ịchọpụta mmadụ ole ka tọrọ n'ime ụgbọoloko ahụ.

  7. Etu mmiri si rie Kelvin Odenigbo na-agba bọọlụ na Belarus

    Kelvin Odenigbo

    Ebe foto si, Kelvin Odenigbo/Instagram

    Kelvin Odenigbo bụ nwafọ Naịjirịa dị afọ iri abụọ na-agba bọọlụ na mba Belarus anwụọla dịka mmiri richara ya.

    Otu egwuregwu FC Vitebsk bụ ndị ọ na-agbara bọọlụ wepụtara ozi na websaịt ha sị na mmiri riri Odenigbo ebe a hụrụ ozu ya n’ụbọchị Satọde.

    Ha sị na nke a mere na mmiri a kpọrọ Lake Beloye dị n'ebe nlereanya dị na mpaghara Vitebsk.

    "Anyị na-eti ezinaụlọ na ndị enyi ọgba bọọlụ a. Otu egwuregwu Vitebsk kwuru na a hụrụ ozu onye otu mmiri riri bụ Kelvin Odenigbo na mmiri Beloye dị n'ebe nlereanya Verasy."

    Otu egwuregwu a n'ozi si n'akara Instagram ha pụta na-ekwu sị na nyoche e mere banyere ọnwụ nwamadị a gosiri na o nweghi ihe ike ọbụla mere ya.

    Na onweghi mmanya ọkụ maọbụ ọgwụ ike a hụrụ n'ime ahụ ya.

    Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ ihe mberede mmiri oriri bụ ihe gburu Odenigbo na nke ahụ gbagwojuru ha anya.

    Ha sị n'oge na-adịghị anya na a ga-ekwu maka olili ya.

    Kelvin Odenigbo

    Ebe foto si, FC Vitebsk/Websaịt

    Ihe i kwesịrị ịma maka Kelvin Odenigbo

    A mụrụ Kelvin n'afọ na 13 Eprelụ afọ 2001.

    Ọ bụ nwafọ Naịjirịa

    Ọ nwụrụ n'ụbọchị 5 nke ọnwa Juun, afọ 2021 mgbe ọ gbachara afọ iri abụọ.

  8. BBC Nkeji nke ụtụtụ

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  9. Igbo ndị ọma ndewo nu

    Igbo ndị ọma, anyị ji obi ọma anabata unu n'izu a.

    Biko gbalịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.