Nzukọ ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ n'Enugwu

Ndịisi ndịagha na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ emeela nzukọ ime ụlọ maka nchekwa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nkeji Coronavirus

    Gere akụkọ gbasara Coronavirus ka ọ dị n'Afrịka taa.

  2. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji.

  3. Nzukọ ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ n'Enugwu

    Nzukọ ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ

    Ebe foto si, Enugu State Government

    Ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ mere nzukọ ime ụlọ banyere ọnọdụ nchekwa n’obi ọchịchị gọọmentị Enugwu Steetị n’ụbọchị Fraịde.

    Ndị ọzọ so na nzukọ ahụ gụnyere mịnịsta na-ahụ maka ime n’obodo bụ Rauf Aregbesola, ndị eze ọdịnala na ndị ndị ụka dị iche iche.

    Nzukọ ndịisi ndịagha Naịjirịa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ

    Ebe foto si, Enugu State Government

    Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ka ọ na-ekwu nnabata ndị a sị na nzukọ a bịara n'oge dị mma ma sị na o nwere olileanya na ọ ga-amịta ezi mkpụrụ.

    Ugwuanyi kwupụtara mkpa ọ dị gọọmentị ichekwa ndụ, akụnaụba na ọdị mma ndị mmadụ nke bụ ọrụ kachasị mkpa dịịrị gọọmentị.

  4. Onye bụdị Balarabe Shehu Ilelah, Buhari họpụtala dịka onyeisi NBC ọhụrụ?

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtala Balarabe Shehu Ilelah, dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka nhazi mgbasaozi 'National Broadcasting Commission'.

    Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed onye gbara ama ụbọchị Fraide n'ozi o wepụtara n'Abuja kwuru na Ilelah ga-anọ n'ọkwa ahụ afọ ise.

    Nhọpụta na-abịa dịka Ọchịchị Buhari machiri Twitter na Naijiria dịka ha wepụchara ozi ya .

    Ilelah nọchịrị onyeisi nọbu n'ọkwa ahụ bụ Armstrong Idachaba.

    Onye Ilelah bụ

    Balarabe Shehu Ilelah bụ onye ntaakụkọ TV a ma ama nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ilelah rụbụrụ n; ụlọntakụkọ NTA Bauchi.

    Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum,"Bayero University Kano.

  5. Nuhu Bamalli Polytechnic Zaria: Atọrọla umuakụkwọ asato na ndị nzukị abụọ na Kaduna Steetị

    Nuhu Bamalli Polytechnic

    Ebe foto si, Nuhu Bamalli Polytechnic/ Website

    Ndị ọmekọme atọrọla umuakụkwọ asato na ndị nzukị abụọ n’ụlọ akwụkwọ Nuhu Bamali Polytechnic nke di na Zaria,Kaduna Steeti n’abalị Tụzde.

    Samuel Aruwan bụ komishona na-ahụ maka nchekwa ime obodo steeti ahụ kwuru na ndị omekome a gburu otu nwa akwụkwọ.

    Ntọrọ umuakwụkọ a bu nke kacha di nso n’esote ntọrọ wuru ewu na Steeti ahu na onwa atọ ka gara aga. Ya bu nke mere na ụlọ akwụkwọFederal College of Forestry Mechanization Afaka makwa na mahadum Greenfield ebe atọrọ umu akwụkwọ ịrị ise ma gbu kwa umu akwụkwọ ise.

  6. "Gbagbuo onye nkịtị ọbụla ahụrụ bu egbe AK-47" - Muhammadu Buhari

    Onyeisiala Naijria bụ Muhammadu Buhari kwughaịrị ịhe okwuru na mbu kwụsi ya ike sị ka agbagbuo onye nkịtị obula ahụrụ na-egbugharị egbe AK-47, ma ọ bụ mgbọ egbe ọbụla ọzọ puru ịche.

    O dọkwara ndị mmadu aka na ntị sị obodo ọbụla n’emegide ndị uweojị ha na-emegide onwe ya

  7. Mba Gana ga-akụ osisi nde ise n'otu ụbọchị

    Mba Gana ekwuola na ha ga-akụ osisi nde ise n'ụbọchị Frịde dịka ha chọrọ ịwehachi ọhịa na mba ha na-ala ala.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Nana Akufo Ado kwuru na ọ ga-esonye na ya bụ atụmatụ.

    Ndị ọrụ gọọmentị na-ekwu na ọhịa ha ruru passenti iri asatọ anwụchapụla.

    A na-eche na nrụputa ọru ubi a ga-agbada passenti asaa n'ihe dịka afọ 2050.

    Ọhịa

    Ebe foto si, Getty Images

  8. Ndi agha Naijiria emela nhọputa na ahazigharia na ngalaba dị iche iche na ulo oru ha

    Ndị agha Naijirịa

    Ebe foto si, HQ Nigerian Army/Facebook

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naijiria bụ Mohammed M Yerima ezipụla ozi sị na emela nhazigharị na nhọpụta ọkwa ọhụrụ na ndị agha Naijiria.

    O kwuru nkea sị na ndị a họputara makwa hazigharia ga-amalite oru ọhụrụ ha ozugbo.

    Nhazigharia a soro nhọpụta ahọpụtara Farouk Yahayaka ka ọ buru Onyeisi ndị agha Naijria.

    Ijiri maa atụ, Onyema Nwachukwu ga ahapu ngalaba ndi nchekwa agha ruwazia na ngalaba ndị ntaakuko agha ebe KE Inyang ga-ahapu ngalaba na-ahụ maka njem niile gbasara ndị agha ma ruwazie na ngalaba nọ n’okpuru onyeisi agha Naijiria.

  9. Mba Amerịka akgbuola mmachi gọọmentị Naijirịa machiri Twitter

    Twitter Logo

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị mba Amerịka akatọọla mmachi gọọmentị Naijirịa machiri Twitter nsonso a.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ gọọmentị mba Amerika bụ Ned Price kwuru nkea, ma sị na ya bụ mmachi abụghị njirimara ọchichi onye kwuo uche ya ma sịkwa na o megidere ikike diiri onye.

  10. Central bank ga-ewepụta 'Digital Currency' nke ha

    Digital Currency

    Ebe foto si, CBN/Facebook

    Ụlọakụ kacha na Naijirịa ekwuola na ha ga-ewepụta Dịgịtal Currency nke ha tupu afọ 2021 agwụ.

    Ọ bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ya bụ ụlọakụ bụ Rakiya Mohammed na ndị ọchịchị ụloakụ a kwuputara nke a mgbe ha nwewre nzukọ ha nandị ntaakụkọ nwere n'igwe ịntanetị.

    Mohammed kọwara sị "O ruola afọ abụọ CBN na-atule ihe gbasara Digital Currency. Ego dị ụzọ abụọ, nke akwụkwọ na nke igwe. CBN dịgịtal Curency ga-abụ nke abụọ ya. nke a pụtara na ị nwereike iji ego gị n'ekwe ntị gị kama ị ga eji ya n'akpa gị".

  11. Gọọmentị Naijirịa ehiwela Juun 14 dịka ụbọchị ezumike Democracy Day

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na ụbọchị Mọnde bụ ụbọchi iri na anọ nke ọnwa Jun afọ 2021 ga-abụ ụbọchị ezumike maka emume ncheta Democracy Day.

    Ọ bụ mịnịọsta na-ahụ maka ime obodo Naijirịa bụ Rauf Aregbesola kwuru nke a n'ụbọchị Tụzde.

  12. Unu abọọla chi!!

    Anyị bụ n'obi na ị rahụrụ nke ọma. Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.

  13. Ndị oji egbe egbuola otu onye uweojii n'Ojoto, Anambra Steetị

    Uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị oji bịara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ojoto n'okpuruọchịchị Idemili South nke Anambra Steetị gburu otu onye 'inspector' n'ehihie ụbọchị Wenesde.

    Onye ntaakụkọ gwara BBC Igbo na ndị oji egbe agbaghị ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ na mwakpo ahụ dịka ndị uweojii gbochiri ha.

    Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Ikenga Tochukwu na-ekuru ndị uweojii, ọ zaghị ekwentị ya tupu akụkọ a na-apụta.

  14. Ndị e chere na ha bụ ndị ọchịehi atọọrola ihe karịrị mmadụ 10 n'Imo steeti

    Ndi bu egbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Eke-Onuimo sị n'Okpuru Ọchịchị Onuimo n'Imo steeti chị obi n'aka dịka ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ụgbọala ma tọrọ ndị njem karịrị mmadụ 10 n'okporoụzọ si Enugwu gawa Pọịtakọt ụbọchị Tọzde.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ si n'ọhịa tipụta kpụụ ndị ahụ nọ n'ụgbọala baa ọhịa.

    Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Bala Elkanah, ọ zaghị ekwentị ya.

    Mana o zi o wepụtara n'ọgbakọ Whatsapp ndị uweojii na ndị ntakụkọ o kwuru "banyere ihe onyonyo na-efegharị, anyị enwetabeghị ozi maka ya. Anyị ga-aenye ozi ka o siri kwụrụ ma anyị nweta ya."

  15. Gọọmentị Naịjirịa sị na Mọnde 14 Juun bụ ụbọchị ezumike

    Ọkọlọtọ Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị etiti Naịjirịa etinyela ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike iji cheta ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Ogbeni Rauf Aregbesola kwupụtara nke a n'aha gọọmentị etiti kelere ndị Naịjirịa ma sị ha kwadoo gọọmentị onyeisiala Buhari.

    Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ndị ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ọbụla n'ụbọchị ahụ na ọ bụ ihe iyi egwu nye ịdịnotu nke Naịjirịa.

    Aregbesola sị na mbọ onyeisiala Buhari na-agba iji chekwaa ndụ na akụnaụba ndị Naịjirịa ga na-akawanye mma.

  16. Nkeji Coronavirus

    Gere akụkọ gbasara Coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa n'ime otu nkeji.

  17. BBC Nkeji nke abalị

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  18. Ọ bụ asị na ndị nchekwa sị na ha ga-ememila ndị obodo Nkata dị n'Ibeku, Abia State - Onye obodo Nkata

    Nkata, Ibeku Abia Stteti

    Ebe niile ederela jii n'obodo Nkata dị n'Ibeku Abia steeti dịka akụkọ bidoro feharịwa na ndị nchekwa kwere ndị obodo ahụ nhkwa na ha ga-ememila ha.

    Ya bụ kepukepu kwukwara na ọ bụ ndị omekome degaara ndị uweojii akwụkwọ were sị na ha ga-awakpo ha mere ndị nchekwa jiri bia yie ha egwu.

    Nkata Abia Steeti

    Onye ntaakụkọ BBC garụrụ nkata ebe ọ chọpụtara na ọ bụghị eziokwu.

    Otu onye ọchichị ọdịnala na nkata bụ Chimaobi Onuoha gwara BBC Igbo na dịka awakpochara ụlọọrụ State CID, na kọmịshọna uweojii nke Abia steeti biara nlegharị anya ene mpiom ndị omekome nwereike isite bata ụlọọrụ ndị uweojii.

    Onuoha kwuru na ọ bụ mgbe ndị obodo hụrụ ndị gha soro kọmishọna bia ka egwu tụwara ha.

    O kwuru sị, " enweghị ụjọ nyija ndị agha maọbụ ndị uweojii yijara ndị mmadụ. Ọ bụ mgbe ndi mmadụ hụrụ ndị agha ka ụjọ bidoro tụwa ha".

    Dịka onye ntaakụko anyị siri hụta, ebe niile deere duu ma ụlọahia mepekwara ebe ndị mmadụ na-aga ihe dịịrị ha.

    Anyị kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Godfrey Ogbonna ka o tinye ọnụ na ya bụ okwu kama ọ zagfhị ekwentị ya.

  19. Ụlọ adagbuola ụmụaka asatọ na mba India

    Umụaka asatọ so n'ime mmadụ iri na otu nwụrụ na mpaghara Mumbai mba India dịka ụlọ dara n'abalị Wenesde.

    Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ndị ọzọ ha chere tọro n'ime aja ụlọ a dara da.

    A na-eche na o bu oke mmiri na-ezo kpatara ya bu ọdịda.

    Ndị ọrụ gbatagbata

    Ebe foto si, Reuters

  20. Ihe asatọ gbara ọkpụrụkpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na mkparịta ụka ya na AriseTV

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari na ndị ụlọntaakụkọ Arise TV enweela mkparịtaụka ebe ha jụrụ ya ajụju maka ihe ndị gbasara Naijirịa.

    Ọ bụ na ya bụ mkparịtaụka ka Buhari kwuru na ihe kacha ewute ya bụ na ọdịda anyanwụ ugwu awụsa ebe ụmụnne omenala jịkọrọ na-egburita onwe ha.

    Lee ihe asatọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru

    Muhammadu Buhari kwuru sị, "Enyela m ndị agha na ndị uweojii ikike, n'ime izuụka ole na ole na-abịa ka ha were ike na ntachi obi gosi ndị a ihe ọkụ ji ntị oke eme".

    O kwuru nke a dịka o gosipụtara iwe ya maka mwakpo na ọgbaghara na-arị ibe ya elu na mpahara ugwu Naijirịa.

    Buharị kwuru na ịchụpụ ndị mmadụ n'ọrụ ubi ha, na agụụ ka adị n'obodo ma sịkwa na mgbe agụụ dị n'obodo na gọọmentị ga-anọ na nsogbu.

    O kwuru sị, "Gọọmentị achọghị nsogbu ọzọ, anyị adọọla ha aka na ntị. Ị ga-ahụta ihe dị iche n'ime izuụka ole na-abịa."

    Ebubo na Muhammadu Buhari na-ele anya n'agbụrụ ahọpụta ndị ọrụ dịka onyeisi ndị agha:

    Ọ zara ha sị, "Ọ bụ onye tozuru etozu ka a na-enye ọrụ onyeisi, ọ bụghị na mmadụ gbakọtara n'ọrụ mere a ga-eji eme ya onyeisi.

    Buhari kwuru sị, "Ị ma ebe onyeisi ndị agha Naijirịa na-arubu ọrụ na mbụ?

    Ọ bụghị onye ọbụla ka ị ga-ahọrọ, ị ga-achọ onye ndị agha ma nke ọma, onye ya na ha sorola taa ahụhụ dịka ndị agha".

    Nigerian Army

    Ebe foto si, Getty Images

    Maka mwakpo n'ọdịda anyanwụ ugwu Naijirịa

    Maka nke a, ọ zara sị," Anyị agbanweela ndị isi nchekwa, anyị na ndị ọhụrụ a enweela nzụkọ maka ọnọdụ nchekwa".

    O kwuru na gọọmentị akwụsịla ịgwuputa akụ ọnatarachi na Zamfara steeti ma sị na ha mere nke a n'agbanyeghị na gọvanọ steeti ahụ abụghị onye pati ha.

    O kwukwara na ha na-ememila ọtụtụ ndị omekome na-enye nosgbu na mpaghara ahụ kama ndị anaghị ekwu ka ndị ha chọrọ ịkpọbata n'otu ha hapụ ịgba ọsọ.

    Bandits

    Ebe foto si, FACEBOOK/SHEIKH GUMI

    Maka okwu ndị uweojii steeti

    Onyeisiala kwuru sị na o dighi mma ka oge obula a na-ekpesara ochichi etịtị ihe nille, na ọ ka mma ka ndị gọvanọ, ndị isi ozo na-eso ha nakwa ndị uweojii nọ ha nso choputa etu kacha mma ha ga-ejị chekwaa ma hụ na udo dị na mba ha.

    Herdsman

    Ebe foto si, AFP

    Maka nsogbu ịchị ehi agagharị

    O kwuru sị na a ga-eweghachịta akwụkwọ gọọmentị nke 'First Republic' ebe a hoputara maka izu atụrụ n'ala Naijiria dika etu o dibu na mbu.

    Buharị kwuru sị, "anyị were atụmatụ dị n'akwụkwọ a, nsogbu agaghị adị n'etiti ndị ọchi ehi na ndị ọrụ ugbo".

    Ọ kwukwara na ihe so ebute ọgbaghara bụ ndị sitere mba ozo na-achiri atụrụ na ehi ha bata n'obodo Naijiria, ma sị na ezigbo ndị Fulani Naijirịa anaghị ebu egbe na ọ bụ ndị nke si mba Mauritania na ndị ọzọ na-ebu egbe agagharị.

    Onyeisiala Buharị kwuru nke a maka ebubo ọ sịri na gọvanọ Benue steeti na-ebo ya na ọ naghị ata ndị Fulani na-awakpo ndị mmadụ ahụhụ.

    Ndị na-achọ Biafra

    Ebe foto si, AFP

    Okwu IPOB

    O kwuru sị, "anyị ga-akpaso ha agwa n'ụzọ ha ga-ahọta, enyela m ndị agha na ndị uweojii ikike ha ha chụwa ha niile".

    Maka mmachi Twitter

    Onyeisiala ekweghi ekwu okwu ọbụla maka nkagbu mmachi Twitter, o kwuru na o gaghi etinye onu n'okwu a maọli.

    Maka Mmekọrịta Naijiria na Mba Nijee

    O kwuru na ndị mba Nijee bụ ndị agbataobi kacha dị anyi nso, na mmekọrịta anyi na ha kwesiri ịdị ka nke nwanna na nwanne.

    Na ewepu etu mmekọrịta Naịjiria na mba Nijee sịrị di, na ndị ọmekọme ‘Boko Haram’ gaara iji anyi mme ihe egwuruegwu.

    "Odimma Nijee bukwa odimma anyi, o buru na be ha meepee be anyi emepee."

    Kedụ ihe ọ ga-eme ma ọ chị chaa?

    O kwuru na ọ ka nwere aturu na ehi n'obodo ya ma sị na ọ ga-alaghachi be ya zụwakwa atụrụ na ehi ya.

    Ọ kọwara na tupu oge ahu eruo na ọ ga-agba mbọ hu na udo na oganihu laghachitere n'obodo Naijiria.

    Buhari siri na ọ bụ naani echiche ọma ka ọ na-echere Naijirịa.

    Na nchịkọta, o kwuru ka ndị Naijirịa lee anya etu ọnọdụ nchekwa na achụmnta ego dị na Naijirịa tupu ọ bata na etu ọ dị ụgbua.

    O kwuru sị, "Ka ndị Naijirịa were eziokwu tulee ọchịchị ya".