Anyị ga-ewulite ogige ebe a na-achị ehi na Naịjirịa - Ụlọọrụ Onyeisiala
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na a ga-ewulite ogige ebe a na-azụ ehi niile dị na steetị di iche iche iji gboo nsogbu ndị ọchi ehi na ndị ọrụ ugbo.
Nke a dị n’ozi onye ndụmọdụ ya bụ Garba Shehu wepụtara bụ ebe ọ katọọrọ mkpebi ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa na mkpebi ha ịmachi nchịgharị ehi.
Shehu sị na ịmachi ngagharị njem nke ndị gọvanọ a mere megidere iwu na nwereonwe na Naịjirịa nke bụ na onye ọbụla nwere ikike ibi maọbụ gaa ebe ọbụla masịrị ya na Naịjirịa.
Ọ sị na atụmatụ a bụ nke minista na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Sabo Nanono wepụtara ma degaara onyeisiala bụ nke o binyere aka na ya n'ọnwa Eprelụ.