You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Lee ka ọkụ si gbaa ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo dị na Lagos

Ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo bụ ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Legọs, nwurula ọkụ n'isi ụtụtụ Sọnde.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  2. Anyị ga-amachi keke ịgba n'obodo ọbụla e ji ya zuo ohi - Gọọmentị Anambara steeti

    Gọọmentị Anambara steeti ekwuola na ha ga-amachi keke napep, ụgbọala e ji achụ nta ego nakwa ọgbatumtum ịgba n'obodo ọbụla eji ya zuo ohi maọbụ kpaa mkpamkpa ọbụla, ma daa ndị isi ngalaba na-ahụ maka ya nha.

    Ọkammụta Solo Chukwulobelu bụ odeakwụkwọ steeti ahụ zipuru ozi ebe gọọmentị kwuru na ha ga-eme nke a iji kwalite ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ, dịka a hụrụ na e jirila ụgbọ ndị a kpaa ọtụtụ mkpamkpa na steeti ahụ.

    Gọọmentị kwukwara na mmachi ọgbatumtum ịgagharị n'Ọnịcha na Ọka ma n'ụtụtụ ma n'abalị ka dị ire, ma kwuo na a ga-anapụ onye ọbụla e jidere ọgbatutum ya.

    Ha gakwara n'ihu kwuo na ọgbatumtum, keke nakwa ụgbọala e ji achụ nta ego ga-akwụsị ị na-agba na steeti ahụ site n'elekere asaa nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ, bido n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2021 rugodi otu ọnwa.

    Gọọmentị machikwara ụgbọala e ji achụ nta ego inwe ugegbe ụgbọala na-eji oji maọbụ nwere akwa mgbochi na steeti ahụ, dịka ha kwuru na ụgbọala ndị ọzọ ga-agbatu mpio ha ma ha na-eru ebe ndị nchekwa nọ, iji gbochie mmenye ihere.

    Ha gara n'ihu kwuo ka ndị isi a hụrụ kwaba okpu na ndị ntorobịa steeti ahụ jiri aka ha hụ na ha chekwara mpaghara ha, ma nyerekwa ndị ọrụ nchekwa aka ịhụ na e debere iwu na steeti ahụ.

  3. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  4. Nke mere Ugbua: Gọvanọ Umahi achụọla ndị imeobi ya n'ọrụ

    Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Gọvanọ Dave Umahi, achụọla ụfọdụ ndị ọrụ ya n'ọrụ.

    Dịka odeakwụkwọ gọọmentị ya bụ Kenneth Ugbala si kwuo, ọchụchụ a dị n'agba abụọ; ndị nka a chụrụ ugbua agaghị eso ndị nke a na-achụghị.

    Ndị a na-achụghị ga-eso abanye n'agba nke abụọ gụnyere:

    • Rev.Fd. Abraham Nwali - bụ onye enyemaka pụrụiche nye gọvanọ n'ihe gbasara Ọdịmma na Okpukperechi
    • Kenneth Ugbala - Odeakwụkwọ gọọmentị Ebonyi steeti
    • Ọkaiwu Chioma Nweze - onye enyemaka pụrụiche n'ihe gbasara iji ego achụ ego
    • Francis Nwaze - Onye enyemaka pụrụiche n'ihe gbasara Mgbasaozi nakwa ndị ọzọ.

    Akụkọ ka na-abịa

  5. Ihe mere na Mali nnapụ ọchịchị n'ike - Ecowas

    Minịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffery Onyeama, kwuru na ebe ECOWAS gbadoro ụkwụ bụ na ihe mere na Mali bụ ịnapụ ọchịchị n’ike.

    Ha kwuru na ndị gbara arụkwaghịm bụ mmanye ka a manyere ha.

    Ya mere ndị agha ga-enyeghachi ọchịchị n’aka Onyeisiala Bah Ndaw na Praịm Mịnịsta Moctar Ouane.

    Mkparịtaụka ka na-aga n’ihu iji hụ na ndị agha kwetere ime nke a, mana ọ bụghị na mparịtaụka a amịtaghị mkpụrụ, a ga-ama ihe ọzọ ga-esochi ya.

    Tolu Ogunlesi bụ otu ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari, kwuru nke a na Twitter dịka o kwukwara ọrụ Onye chịburu Naịjiria bụ Goodluck Jonathan rụrụ na mkpebi a.

    Ogunlesi kwuru sị "Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan bụ onye Ecowas zigara ka o kpee udo na Mali, dịka ọ gara obodo Bamako na mbido izuụka a ịga tinye ọnụ n’ihe na-eme na mba ahụ ugbua.

    Ya na ndị agha weghaara ọchịchị nwere nzuko, ya na onyeisiala nakwa Praịm Mịnịsta nwekwara nzuko ebe ndị agha jichiri ha.

    Ọ bụ ya nyere aka ka ndị agha tọghapụ ha. ECOWAS ga-anata ozi etu njem a si gaa."

  6. Eduola Faruk Yahaya n'iyi ọrụ dịka onyeisi ndịagha Naịjirịa

    Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Faruk Yahaya Onyeisiala Buhari họpụtara ọhụrụ eburula oche ya dịka n'ọkwa ahụ.

    O mere nke a n'ụbọchị Fraịde n'isi ụlọọrụ ndịagha dị n'Abuja.

    Yahaya bụ onyeisi ndịagha Naịjirịa nke ugboro iri abụọ na abụọ mgbe ọ Ibrahim Attahiru bụ onye ọ nọchiri nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu.

  7. Lee aha ndị si mba ofesi dara iwu na-achịkwa ọrịa coronavirus

    Gọọmentị etiti ebipụtala aha ọtụtụ ndị mmadụ dara iwu na-achịkwa ọrịa coronavirus mgbe ha si na mba ofesi bata na Naịjirịa.

    Cheta na otu ọtawaike onyeisiala hiwere maka ibuagha megide coronavirus nyere iwu maka ndị Naịjirịa si mba dịka Brazil, Turkey na India na-alọta.

  8. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  9. Germany ekwetela na ha gburu ndị Namibia tọọtọọ n'oge ha na-achị ha

    Mba Jamini ekwetela na ọ bụ eziokwu na ha gburu ọtụtụ ndị mba Namibia n'oge ha jị ọchịchị na mba ahụ.

    Ha gara n'ihu kwee nkwa ịkwụ ndị mba ahụ ụgwọ iji kwadoo ha.

    Minista mba Jamini na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Heiko Maas nọọrọ n'ụbọchị Fraịde kwete n'ogbugbu ahụ mere eme.

    Ndiisi ndịagha Jamini gburu puku kwuru puku ndị agbụrụ Herero na Nama na mmalite ọgbọ afọ '20th Century'

    Heiko Maas sị na ogbugbu ndị a bụ 'igbu ọchụ' ma rịọ ndị mba Namibia mgbaghara.

    Maas gara n'ihu kwuo na mba kwe nkwa ịkwụ ha ego karịrị otu ijeri yuro (£940m; $1.34bn) iji tie ha aka n'obi ma wulite ọnọdụ mba ha.

    Nkwekọrịta a ga-ahụ na a ga na-akwụ ụgwọ a ruo afọ iri atọ site na ngalaba ahụike, ịrụ ụlọ nakwa inye ndị mba ahụ ọzụzụ dị iche iche.

    Mana ụfọdụ ndị ndu ọdịnala ajụla ịnabata nkwekọrịta ahụ dịka ụlọ ntaakụkọ 'New Era' nke gọọmentị nwe si kwuo.

  10. BBC Nkeji nke ụtụtụ

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  11. Mkposasị SARS mere ka ụfọdụ ndị uweojii daa mba n'ọrụ - IGP

    Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Alkali Usman ekwuola na mkposa ngalaba SARS mere ka ohere dị bụ nke na-enye ha nsogbu n’ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

    O kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ọgba ndị mgbasaozi nke ụlọọrụ onyeisiala haziri n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.

    Usman sị na ihe dapụtara na ngagharịiwe EndSARS e mere na Naịjirịa mere ka ụfọdụ ndị uweojii daa mba n’ọrụ ha.

    Ọ sị na ndị ọrụ ya na-eme nke ọma n'ibuso ndị chọrọ nkewapụ nakwa mpụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agha.

    Ọ sị na abụbụọrụ ndị ngalaba ikpe na-agba na-eme ka ọ raa ahụ ikpe ndị ha nwuchiri ikpe ma taa ha ahụhụ zuru oke.

    Ọ sị na mbọ ha na-agba iwe ndị ọhụrụ ruru mmadụ puku iri n'ọrụ na-apụta ihe n'oge na-adịghị anya na agaghị ele anya n'ihu eme nke a.

  12. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Obi dị ọcha ka anyi ji anabata unu n'ụbọchị ọhụrụ a.

  13. Gere akụkọ dị mkpa n'otu nkeji

  14. Emeela Major General Farouk Yahaya onyeisi ndị agha Naijirịa

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari etinyela Major General Farouk Yahaya dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị agha Naijirịa.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndi agha Naijirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọ depụtara n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee afọ 2021.

    Tupu eme ya onyeisi ndị agha, Yahaya bụ bu onye na-achịkọta Division 1 nke ndị agha Naijirịa ma bụrụ kwa onye na-achikọta Counter Terrorism Counter Insurgency nke ndị agha na mpaghara ugwu nke a kpọrọ operation Hadin Kai.

  15. Anyị kwụsiri ike na mkpebi anyị nwere n'Asaba- Gọvanọ ndị Ndida Naijiria

    Otu jikọrọ ndị gọvanọ Ndịda Anyanwụ Naijiria ekwuola na ha kwụ ebe ha kwụ na mkpebi ha nwere n'ọgbakọ ha mere n'Asaba, isi obodo Delta steeti na nso nso a.

    Gọvanọ Rotimi Akaredolu bụ onyeisi otu a onye kwuru nke a n'Akure ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ịnụta echichie ọha banyere nhazigharị Iwu Naijiria sịrị na onye ọbụla leere anya na mkpebi ha nwegara ga-ekweta n'ezie na ọ bụ ụzọ ka mma isi gboo nsogbu na-echi Naijiria ọnụ n'ala ugbua .

    O kwuru na ọ ọ ga-aka mma ka Gọọmenti Etiti wepụ aka n'ihe ụfọdụ ha jichiri nke ọ kpọrọ ibu arọ ma na-eme naanị nchịkọta ihe mpaghara dị iche iche na-atụkọta.

    Ndị gọvanọ nọburu n'Asaba n'izuụka ole na ole gara aga were machie ichịgarị ehi ma nwekwa mkpebi ndị ọzọ.

  16. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  17. A tọhapụla onyeisiala mba Malị na praịm minista ya

    Ndịisi agha na-apụrụ ọchịchị n'ike na mba Malị atọhapụla onyeisiala mba ahụ bụ Bah Ndaw na Praịm minista bụ Moctar Ouane ha nwuchiri anwuchi.

    A họhapụrụ ha n'ihe dịka elekere otu nke ehihie Tọsde dịka onye ntaakụkọ BBC na Malị si kwuo.

    A nwuchiri mmadụ abụọ a ma dosa ha n'ogige ndịagha kamgbe ụbọchị Mọnde.

    Ndịagha magidere onyeisiala a na praịm minista ya n'ike ka ha gbaa arụkwaghịm n'ọrụ ha.

    Nke a ga-abụ nnapụ ọchịchị n'ike nke ugboro abụọ na-eme na mba n'ime ọnwa itoolu.

  18. Amerịka na Chaịna na-arụ onwe ha maka ebe ọrịa coronvirus si pụta

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden enyeela ndị ọrụ nnyocha ọnwa atọ ime nyocha ma chọpụta ebe ọrịa coronavirus si pụta dịka a na-arụrịtaụka ebe ọrịa a si.

    Ndị mba Amerịka na Chaịna na-ebo onwe ha ebubo na ọrịa coronavirus nwereike i si na mba abụọ ndị a.

    Ndị ọrụ nnyocha mba Amerịka nwere nkewa n'etiti ha ma ọrịa o si n'ụlọ nnyocha pụta ka o si n'ahụ anụmanụ banye n'ahụ mmadụ.

    Ụlọọrụ na-anọchiteanya Chaịna na mba Amerịka adọọla aka na ntị ka a ghara iji okwu ebe ọrịa a si eme ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

  19. BBC Nkeji nke ụtụtụ

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  20. Ohanaeze Ndigbo arịọla ndị chọrọ nwereonwe Biafra ka dere jụụ n'ụbọchị 30 Mee

    Ohanaeze Ndigbo arịọla otu niile na-achọ nwereonwe Biafra ka ha na ndị ọrụ nchekwa ghara ịsọkata isi dịka a na-akwado ime ụbọchị ncheta Biafra n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee a.

    Nke a dị n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenesde ma kpọọ oku ka e mee udo n'etiti gọọmentị na ndị a chọrọ nwereonwe Biafra.

    Ha rịọrọ ka otu ndị a ghara ime ngagharịiwe ọbụla maọbụ gosi ọkọlọtọ Biafra n'ụbọchị iri atọ nakwa iri atọ na otu nke ọnwa Mee.

    Ha sị ka otu dịka IPOB, MASSOB, Biafra National Council na ndị ọzọ ka ha ghara ibute ihe ọbụla ga-eme ka ndịagha wụjuo n'Ọwụwa Anyanwụ.

    Ha gwara gọọmentị ka ha tọhapụ ndị niile a nwụchiri n'ebe nakwa n'oge dị iche iche n'ihi nwereonwe Biafra.