Igbo ndị ọma ndewo nụ
Ụkpa ekele ka anyị ji bịa n'ọgbakọ anyị taa ma na-anabata unu.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo bụ ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Legọs, nwurula ọkụ n'isi ụtụtụ Sọnde.
Chioma Obianinwa
Ụkpa ekele ka anyị ji bịa n'ọgbakọ anyị taa ma na-anabata unu.
Ka chi foo!
A na-eche na ọtụtụ mmadu anwụola dịka ugbo mmiri bụ ihe karịrị mmadụ otu narị na iri isii kpuru n'etiti mmiri dịka ha sitere Naija steeti eme njem.
Dịka o siri dị, azọpụtala mmadụ iri abụọ na abụọ ebe olileanya na-aga azọpụta ndị ọzọ esichaghị ike.
Ụjọ na-atụ ndị mmadụ na o nwereike bụrụ na mmiri a eriela ndị a na-achọ achọ maọbụ ọ bụrụ na mmiri ahụ eburula ha.
Ọ na-amasị ndị mmadụ bị n'akụkụ mmiri a iji mmiri eme njem maka na okporo ụzọ adịghị mma.
A na-enwekarị ọtụtụ mberede n'elu mmiri a dịka ụgbọ mmiri na-ebu ndị mmadụ eme njem na-ebu karịa ihe ha kwesịri ibu.
Nanị izuụka abụo gara aga ka mmiri riri mmadụ iri abụọ na asatọ dịka ụgbọ mmiri ha kpuru n'akụku ebe ihe mberede a mekwara.
Onye nkuzi ndị otu Inter Milan bụ Antonio Conte ahapụla ya bụ otu dịka o duuru ha nweta mmerị iko Seria A.
Ọ bụ nanị otu afọ ka Conte nọrọ n'Inter Milan na-agbanyeghị na nkwekọrịta ya na ha bụ na ọ ga-arụ ọrụ afọ abụọ.
Otu Inter Milan depụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha tinyere na Websaịt ha.
Kepukepu na-ekwu na Conte na onyeisi Inter Milan bụ Steven Zhang nwere nghọtahe maka atụmatụ ọdịnịhu otu ahụ.
Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ọ bụ na amaghị ama ka onye otu ha jiri gbata onye otu ha ọzọ egbe n'ihu Obi Gọvanọ steeti ahụ nke ochie n'ụbọchị Tuzde.
Ọ bụ kọmishọna ndị uweojii bụ Aliyu Garba kwuru nke a ma sị na onye uweojii ahụ a gbatara egbe anwụghị kama ọ na anata ọgwụgwọ.
O kwuru sị, " Ọ bụ mgbe otu onye uweojii na edozi egbe ya ka ọ rụọ ọrụ nke ọma ka egbe ya gbara were gbata onye otu ya".
N'aka nke ọzọ ka onye enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ steeti ahụ maka mgbasa ozi gwara ndị Ebonyi steeti na ha atụla ụjọ.
Onyeisiala mba Mali nwa mgbe nta bụ Bah Ndaw na Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Mcotar Ouane agbaala arụkwaghịm dịka ụlọ ntaakụkọ AFP siri kwuo.
Cheta na ndị agha mba ahụ nwuchiri ndị ọchịchi abụọ a ma jichie ha n'ogige ndị agha nke nọ n'akụkụ oke ala obodo Bamako.
Ọ bụ Assimi Goita bụ onye agha soro weharịa ọchịchị ma bụrụzịa osote onyeisiala bụ onye boro ha ebubo na ha anaghị arụ ọrụ ha ma na-agba kwa obodo Mali mgba okpuru.
Akụkọ arụkwaghịm ha a pụtara dịka ndị ọchịchị ọdịda anyanwụ Afrịka nke gụnyere Goodluck Jonathan bịara njem ịnapụta mmadụ abụọ a n'aka ndị agha.
Ndị uweojii Delta steeti kwuru na ha anwụchiela onyeisi ndị ekperima wakporo ndị uweojii nọ ọrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde.
Ndị ji egbe wakporo ndị uweojii nọ ọrụ na nso Otulu Junction, n' Akwukwuigbo dị n'Okpuru Ọchịchị Oshimili North, gbuo otu uweojii ma gbaa otu ụgbọala ha ọkụ .
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Bright Edafe kwuru na ọ bụ ndị amakekwu n'ogbe ihe ahụ mere bụ ndị kpara mkpamkpa ahụ.
Edafe sịrị: "Ọ bụ ndị agboro si Akwuku-Igbo mere ya. Ha gburu otu onye ọrụ anyị mana aka akparala onyeisis ha, ebe nnyocha n'aga n'ihu ugbua."
Ọdachi a na-abịa izu ole na ole ndị ekperima wakpochara isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị na Nsukwa, n'Okpuru Ọchịchị Aniocha South ebe ha gbagburu ndị uweojii atọ.
Minista ndị ntoroọbịa na egwuregwu bụ Sunday Dare ekwuola na gọọmentị etiti dị njikere ichekwa atụmatụ ji otu afọ efe ala nna.
Dare sị na atụmatụ a bụ ngwa ọrụ dị mkpa gọọmentị iji ewulite ọnọdụ ndị ntoroọbịa na Naịjirịa.
Okwu ya a na-abịa dịka akụkọ pụtara na ndị omeiwu chọrọ ime iwu ga-akachapụ atụmatụ iji otu afọ efe ala nna.
Iwu a a gafeela ngupụta nke mbụ n'ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Ndị bụbụ ndị ọrụ otu onye ntaakụkọ ahụ a nwụchiri mgbe e feturu ụgbọelu ha n'ike na mba Belarus ekwupụtela nchekasị ha gbasara nchekwa nwamadị ahụ.
A ka jichiri Roman Protasevich dị afọ iri abụọ na isii na ọyị ya nwaanyị nke Russia bụ Sofia Sapega dị afọ iri abụọ na atọ.
"Ndụ Roman nọ na nsogbu karịa ndụ onye a tụrụ mkpọrọ n'ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị" dịka Stepan Putilo si gwa BBC.
Protasevich ekwuola na ndụ ya nọ n'ihe nsogbu kamgbe e tinyechara aha n'akwụkwọ ndị na-eyi ndụ egwu.
A na-ama ikpe maka akụkọ o dere banyere ọgbaghara dapụtara n'oge ntuliaka onyeisiala nakwa nwuchi ndị mere ngagharịiwe.
Belarus bụ naanị otu mba nọ na Yurope ka na-egbu ndị a tụrụ mkpọrọ.
Gọọmentị etiti ekwuola na ha na-eke nkwụcha iji chekwaa ndị Naịjirịa site n’ụdị ọrịa coronavirus si mba India a na-akpọ B.1.617.2.
Onyeisi ngalaba ahụike primary health care bụ Faisal Shuaib kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja n’ụbọchị Tusde.
Shuaib rịọrọ ndị Naịjirịa ka ha gaa n'ihu na-edosa onwe ha nakwa gburugburu ebe obibi ha ọcha mgbe niile iji belata mfesasị ọrịa coronavirus.
Ọ sị na ha ga-aga n'ihu ile ka "eke si anya anwụ" n'ihe banyere ọrịa coronavirus na Naịjirịa.
Ọ sị na ụlọọrụ ha agbaala ihe ruru mmadụ 1,929,237 ọnụ ọgwụ mgbochi coronavirus nke mbụ na Naịjirịa nke bụ pasentị 96 na ndị a na-atụ anya ịgba ọgwụ a.
Shuaib kwukwara na ha amalite ịgba ọnụ ọgwụ nke ugboro abụọ dịka mmadụ 4,683 anatala ya.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị taa.
Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.
Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị.
Ụlọakụ etiti bụ Central Bank nke Naịjiria ekwuola na narị naịra anọ na iri na ụma ga-abụ ego ole a ga-eji na-agbanwe otu dọla n'ahịa.
Ha kwuputara mgbanwe a na websaịt ha n'abalị Mọnde, dịka ha wepụrụ N379/$1 ọ bụbu na mbido ọnwa Mee a.
Gọọmentị etiti Naijirịa akatọọla nwuchi ndị agha mba Mali nwuchiri onyeisiala mba ahụ bụ Bah Ndaw na Praịm Mịnịsta bụ Moctar Ouane.
Ọ bụ n'akwụkwọ onye na-ekwuchitere ngalaba gọọmentị Naijirịa na-ahụ maka mmekọ Naijirịa na mba ndị ọzo bụ Ferdinand Nwonye kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọ depụtara ma sị ka atọhapụ ndị a nwuchiri.
O kwuru sị ," Gọọmentị Naijirịa n'akatọ nwuchi anwuchiri onyeisiala obere oge mba Mali bụ Bah Ndaw na Praịm Mịnịsta bụ Moctar Ouane mba Mali".
"Gọọmentị Naijirịa anabataghị ya bụ ihe n'ihi na o nwereike igbochi atụmatụ udo na iwehachi ọchịchị onye kwuo uche ya".
Ndị mwakpo awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Iwollo Oghe nke okpuruọchịchị Ezeaagu 'Enugwu Steeti n'isi ụtutụ ụbọchị 25 Mee afọ 202.
Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo si chọpụta, ndị ahụ a na-amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ a n'ekelere abụọ nke isi ụtụtụ taa wee gbagbuo ndị uweojii anọ nọ n'ọrụ n'abalị ebe ụfọdụ agbara egbe ka nọkwa n'ụlọọgwụ.
Ndị oji egbe a tọhapụrụ ndị mkpọrọ e ji eji ma gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ pịa pịa.
Ọtụtụ ụgbọala nakwa ụgbọ ọgbatumtum bnọca n'ogige ndị ụweojii ahụ bụkwa nke gbara ọkụ kpam kpam.
Oge BBC rutere na ya bụ ụlọorụ uweojii ndị obodo ahụ juputara n'igwe wee na-ekwu na nke a bụ nke mbụ ụdịrị ihe mgbagwoju anya a na-eme n'obodo ha.
Onyeisioche okpuru ọchịchị Ezeagụ bụ Chukwudi Ani bịara njem nleta ebe ahu ma kwuo na ya enweghị ihe ya ga-ekwu ugbua n'ihi na ọ gbagwojuru ya anya.
DPO ya bụ ụlọọrụ uweojii bụ Mazi Ugwuanyi jụrụ ịgwa ndị ntaakụkọ okwu ma gwa ha gakwuru ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu.
Ozi ya sị n'ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ekwuola na ọ bụ eziokwu na mmadụ anọ ndị uweojii nwụrụ anwụ pịị ma kwuo na kọmishọna Uweojii Enugwu bụ Ndatsu Aliyu kwuru na ha etinyela anya na mmiri ịchọpụta ndị kpara ike ọjọọ a ma mee ihe kwesiri ha.
BBC Igbo garụrụ n'Iwollo Oghe dị n'okpuru ọchịchị Ezeagu dị n'Enugwu steeti. Lee ihe onyonyo ahụ ebe a
Aka ndị uweojii ọrụ ha bụ ilebanye anya n'ihe gbasara iji aghụghọ napụ ndị mmadụ ego akparala otu nwata nwokorobịa gbara afọ 21 maka igwu ndị mmadụ chamdum ego ruru ijeri Naira abụọ(N2bn.)
Nwa amadị ahụ aha ya bụ Dominic Ngene Joshua bu onye MD/CEO of Brisk Capital Limited, bụ onye Ebonyi steeti ma biri n'Uyo isi obodo Akwa-Ibom ebe ọ nọ aka ike.
Joshua bụ onye anwụchiri dịka ọtụtụ ndị o gwuru chamdum degara ndị uweojii akwụkwọ mkpesa na-esi na soshal midia; Instagram, Facebook na Linkedin nakwa akwụkwọ akụkọ alara ndị mmadụ dịjkka ọ na-aghara ha ụgha na ya bụ onye oji ego achụ ego na-enyere ndị mmadụ aka itinye ego ha n'ihe ga-amụtara ha ego.