Ihe Buhari gara ime na mba Paris

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga njem abalị anọ na mba Paris ịsonye n'ọgbakọ African Summit nke onyeisial;a mba France bụ Emmanuel Macron hibere.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa and Chris Sanctus Okereke

  1. Ọgbaghara adapụtala na Jerusalem n'ihi ngagharị ndị ụka Kraịst

    Ndị Palestine na ndị uweojii Izrel akụkọtala isi n’ihe bụ abalị nke atọ, dịka a na-atụ ụjọ na ọgbaghara ọzọ ka nwereike ịdapụta taa, na mba Jerusalem.

    Nke a na-abịa ka ndị a ma dịka Zionists na-akwado ime ngagharị ha a kpọrọ Jerusalem Day Flag March, ebe ha ga-esi n’ogige ndị Alakụba agafe.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Anyị ebibiela ndị 'bandit' 48 - Ndị agha Naịjiria

    Ndị agha Naịjiria kwuru na ha ebibiela ndị omekome iri anọ na asatọ ma tọghapụ mmadụ iri na asatọ a tọrọla na mpaghara Maradun dị na Zamfara steeti.

    Ndị agha kwuru na ha chụsasịrị ebe ndị omekome a jiri hibe isi n'obodo Jaya, Kadaya na Bayan Ruwa.

    Ha sị na mmeri a si na Operation Tsare Mutane ha mere n’izu atọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Ndị Igwe obodo, dụọnụ ndị ntorọbịa ndụmọdụ maọbụ... - Buhari

    Onyeisiala Buhari

    Ebe foto si, @bashirahmad

    Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị isi obodo ka ha dụọ ndị ntoroọbịa nọcha n’okpuru ha ọdụ ka ha ghara isonye na mwakpo n’ụdị ọbụla, ọkachasị nke ga-etinye obodo na gbagharịa.

    O kwuru nke a dịka ọ na-ekwupute mwute ya maka etu e si awakpo obodo ma na-emebisi ụlọọrụ gọọmentị dị n’obodo dị iche iche.

  4. Nnọọ

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Ebe a ka ị ga-enweta akụkọ ndị dị mkpa ị ga-achọ ịkọ taa niile.

    Ndeewo.