Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga njem abalị anọ na mba Paris ịsonye n'ọgbakọ African Summit nke onyeisial;a mba France bụ Emmanuel Macron hibere.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chioma Obianinwa and Chris Sanctus Okereke
'National grid' agharịpụla
Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ
mpaghara Naịjirịa anọrọla n’ọchịchịrị kamgbe ụbọchị Wenezde n’ihi na igwe
na-enye ọkụ latrik a kpọrọ ‘national grid’ agharịpụla.
Ụlọọrụ ọkụ
latrik dị icheiche rịọrọ ndị ahịa ha ka ha nwee ndidi dịka ha na-agba mbọ ịrụzi
ya bụ igwe ọkụ ka ndị mmadụ nwekwaa ọkụ ọzọ.
Mana ụlọọrụ 'Transmission Company of Nigeria' kwuru na ha malitere iruzi ya bụ igwe ọkụ na-egbughi oge, nke mere na ọkụ latrik alaghachila na mpaghara ụfọdụ na Naịjirịa.
Ogbunigwe na-ada aghara aghara dịka mba Izrel and Palestine na-esi imi
Ebe foto si, Reuters
Ndị Hamas atụọla ọtụtụ ogbunigwe elu banye mba Izrel ka mba ahụ ji ogbunigwe gbuo ụfọdụ ndị isi ha ma gbatuo nnukwu ụlọ elu na Gaza.
Ọgụ a malitere na Mọnde emeela ka ọgbakọ UN dọọ aka na ntị na "agha kpọm kkwem" nwereike daa ebe ahụ.
Ọgbaghara butekwara nsogbu n'okporo ụzọ n'Izrel dịka ndị Jew na ndị Izrel si agbụrụ Arab malitere ịnụ ọgụ.
Ndị na-achị agbụrụ dị iche iche na mba ahụ arịọla ka udo chịa.
Ihe ruru mmadụ 67 na Gaza nakwa mmadụ asaa n'ime Izrel anwụọla sịte na ọgbaghara a.
Ọgụ malitere na Mọnde dịka ndị mba abụọ a kwakọrọ isi n'obodo Jerusalem.
Ụnụ abọọla chi
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ.
Nke inye chiri ya zere.
Ka anyị gbapụ ya ọsọ na mgbasaozi nke taa.
Ka ọ dị echi
I meela wee nọnyere anyị taa.
Ka anyị nọkọọ echi.
Ka chi foo.
Ndume akatọọla ndị Gọvanọ Ndịda Naijiria maka ịmachi ichigharị ehi
Ebe foto si, Ali Ndume
Onyeisioche komiti ụlọomeiwu na-ahụ maka ndịagha bụ Ali Ndume akatọọla mmachi ndị gọvanọ Ndịda NAijiria machiri ndị ọchịehi ichgharị ehi.
Ndị Gọvanọ nọọrọ n'ọgbakọ ha mere ụbọchị Tozde machie ichigharị ehi na mpaghara ha.
Mana Ndume gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Tọzde na ndị gọvanọ ahụ habụrụ ihe ha ga-ekwu na-ekwu ihe ọzọ.
Dịka Daily Trust si kwuo, Ndume sịrị, " Nsogbu e nwere abụghị okwu ịchịgharị ehi. Nsogbu e nwere bụ okwu nchekwa. Ọtụtụ nsogbu nchekwa na-eche Naijiria aka mgba abụghị n'ọhịa ka ọ dị."
Ndị nchekwa anwụchiela osote Ikonso n'Abịa steeti
Ebe foto si, Nigerian Army
Ndị ọrụ nchekwa anwụchiela Awurum Eze bụ a na-ekwu bụ osote Ikonso bụbu onyeisi otu Eastern Security Network (ESN) nwụrụ anwụ.
Brg.Gen Mohammed Yerima bụ onyeisi ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa, ziputara ozi ebe o kwuru na Eze dị afọ 48 bụ otu n'ime ndị a na-enyo maka ikwado ogbugbu ndị mmadụ na-akpọtụ n'Imo steeti.
Ha kwukwara na o so na ndị a na-achọ achọ kemgbe ọnwa atọ gara aga, mana ọ gbafuru mgbe ndị agha wuchiri n'ụlọ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee, 2021.
Ha kwuru na ụfọdụ ndị ESN na Ipob ha nwụchiri kpọrọ Eze aha dịka otu n'ime ndị na-akwado ha nakwa osote Ikonso.
Ha kwuru na ndị a ha nwụchiri gwara ha na ọ bụ naanị Ikonso na Awurum nwere ụzọ e si eru Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) ntị.
Ndị agha kwuru na aka ha kpatara Eze n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee, n'Aba, Abịa steeti.
Ha kwukwara na ndị ọrụ nchekwa ka na-eme nnyocha.
Jiri naanị otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus na mpaghara Afrịka
Kamerun atụọla ndị 'transgender' abụọ nga afọ ise
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Shakiro nwere puku kwuru puku mmadụ na-eso ya na Facebook na YouTube, ebe ọ naghị ezo ihe gbasara mmekọ ya ezo
Mba Kamerun atụọla ụmụnwoke abụọ tụgharịrị onwe ha bụrụ
nwaanyị nga afọ ise.
Ha sị na mmadụ abụọ a gụnyere nke a ma ama dịka
Shakiro, dara iwu mmekọ nwoke na nwoke nke mba ahụ.
Jikọọnụ aka kpee ekpere maka ntọrị mmadụ na Naịjiria - Onyeisiala Buhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla ụmụ Naịjiria ka ha
jikọọ aka ọnụ wee kpee ekpere iji kpepụta mba a n’ihe gbasara ntọrị mmadụ na
mkpamkpa ndị omekome.
O kwuru nke a ka ọ na-ekele ndị ụka alakụba maka ntọpe
ọnụ ha, ebe ọ nọkwa kwuo ka ndị Naịjiria gbaa mbọ rubere iwu e tinyere maka
mgbochi mfesa ọrịa covid-19 isi.
Buhari kwuru nke a site n'aka Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru ya, onye zipuru ya bụ ozi n'elu Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Osibanjo atụọla ụkwụ na Uganda maka idu n'iyi ọrụ onyeisiala ha
Osote onyeisiala Yemi Osinbajo atụọla ụkwụ na mba
Uganda taa.
Osibanjo gara ịnọchite anya Onyeisiala Muhammadu Buhari n'idu n'iyi ọrụ nke Onyeisiala Yoweri
Museveni bụ onye na-achị dịka onyeisiala nke ugboro isii.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Gọvanọ Hope Uzodimma achụọla ndị kọmishọna ya n'ọrụ
Ebe foto si, Hope Uzodimma
Gọvanọ Hope Uzodimma na-achị Imo steeti achụọla ndị kọmishọna
so ya arụ ọrụ.
Oguwike Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ gwara BBC
Igbo na ọ bụ iji ṅogharịa aka e ji arụ ọrụ na mịnịstrị ndị a mere e jiri kposaa ha.
Nke a bụ mbụ ọ na-eṅogharị ndị kọmishọna ya kemgbe ọ banyere ọchịchị na Jenụwarị 15,2020.
Gọvanọ Uzodimma hapụrụ ndị kọmishọna asatọ n'ime 28 e nwere n'Imo steeti, nke ụfọdụ n'ime ha bụ ndị kọmishọna a ka were n'ọrụ ọhụrụ ọhụrụ a.
Mịnịstrị ndị a hapụrụ kọmishọna ha bụ:
Kọmishọna Mgbasaozi
Kọmishọna Ọrụ
Kọmishọna Okwu Ụmụnwaanyị dị n'aka
Kọmishọna Teknụzụ
Kọmishọna Akụnaụba
Kọmishọna Ahụike
Kọmishọna Ntorobịa na Egwuregwu
Kọmishọna Njem nlegharị anya
Ebe foto si, Imo state new media
EFCC anwụchiela mmadụ isii n'Abuja
Ụlọọrụ EFCC anwụchela mmadụ isii e cheere na ha bụ ndị na-eeme ka nwaanyị
anapụ ndị ọcha ego ha n'intanetị n'Abuja.
Akụkọ kwuru na anwụchiri ha n'etiti ụbọchị ise na ụbọchị asaa nke ọnwa
Mee n'obodo akpọrọ Gwarimpa.
Ụlọọrụ ahụ kwuru na anwụchiri mmadụ isii a dịka ha nwetara ozi gbasara agwa ha na-akpa.
"Ndị ahụ ekwuputala okwu ndị ruru iji kpụpụ ha ụlọikpe nke anyị ga-eme mgbe anyị mechara nnyocha" ka ha kwuru.
Ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha ezipula ndịọrụ ha karịrị puku atọ n'okirikiri steeti ahụ niile iji wulite nchekwa n'oge Salah.
Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti Imo kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipuru n'ụbọchị Wenezde.
Ikeokwu kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ mụ anya ka azụ iji hụ na emume Salah gara nke ọma n'Imo steeti.
Ọ gwara ndị okpukperechi Alakụba ka ha ghara ịtụ egwu ime emume ha dịka o si kwesị n'ihi na nchekwa ha adịla.
Ndị omekome awakpoola ụlọọrụ NDLEA n'Abia steeti
Ngalaba na-aluso ọgwụike ọgụ na Naịjirịa ekwuola na ndị amaghị ndị ha bụ
wakporo ụlọọrụ ha dị n’Abia steetin’elekere atọ nke ụzụ ụtụtụ.
Dele Akingbade bụ onyeisi ụlọọrụ ha na steeti ahụ kwuru na o nweghi onye
nwụrụ n’ihe ahụ mere.
O kwukwara sị na echeere na ọ bụ ndị anwụchiri onye otu ha chọọrọ ha bịawa n'ụlọọrụ ahụ.
Ebumọnụ ọnwa Ramadan ga-aga n'ihu - Sultan Sokoto
Ebe foto si, Getty Images
Ebumọnụ ọnwa Ramadan nke ndị okpukpere alakuba na-eme ga-aga
n’ihu taa n’ihi na ahụbeghị ọnwa eluigwe na-egosi na ọnwa ahụ abịala na
njedebe.
Nke a mere ka onyeisi otu na-elekọta ha nakwa Sultan na-achịo
Sokoto bụ Muhammad Sa’ad Abubakar kwuo na ọ bụ ụbọchị Tọzde ga-ebumọnụ a ga-ebi.
Cheta na gọọmentị etiti tinyere ụbọchị Wenzde nakwa Tọzde dịka ụbochị ezumike a ga-eji me mmemme ahụ akpọrọ "Eid-el-Fitr".
Ndị uweojii Ebonyi anwụchiela dibia anyanzụ na ndị ọzọ liri mmadụ abụọ na ndụ
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Ebonyi Steetị gwupụtara ozu mmadụ ụmụokorọbịa abụọ a sị na onye dibia anyanzụ tọọrọ ma lie ha na ndụ n'oke ọhịa Uduku Igbudu dị n'Agubia nke okpuruọchịchị Ikwo, Ebonyi Steetị.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi bụ Loveth Odah kọwara na nyocha mbụ e mere gosiri na ọ bụ mmadụ anọ ka onye dibia gaara eli na ndụ mana abụọ n'ime ha gbara ọsọ.
Ọ sị na e gwụpụtara ozu ndị a na e kechiri ha anya ma kee ha ụdọ n'olu, ọ sị na e nyochaala ha ma chọpụta ka e si gbuo ha.
Odah sị na a ga-akpụpụ ndị a n'ụlọikpe ma e mechaa nyocha ha na-eme.
Gịnị mere na Uzodinma agaghị ọgbakọ Gọvanọ Ndịda Naijiria?
Ebe foto si, Hope Uzodinma
Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti agaghị ọgbakọ ndị gọvanọ Ndịda Anyanwụ Naijiria mere n'Asaba Isiobodo Delta Steeti, ụbọchị Tuzde.
Ọ dọghị anya ihe mere na Uzodinma, onye dunyere Osote ya bụ Placid Njoku ka ọ nọchite ya n'ọgbakọ ahụ nke ndị gọvanọ iri na asa bịara n'onwe ha.
Mana Odeakwụkwọ Mgbasaozi Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu, kwuru na o nweghị ndajọ dị na Gọvanọ Uzodinma agaghị ọgbakọ ndị gọvanọ.
"Ọ bụ osote gọnaọ nọchitere ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ na gọvanọ na-eziga osote ya ị ga-anọchite ya."
"Ọ bụghị nanị ya bụ gọvanọ na-eziga mmadụ ịnọchite ya n'ọgbakọ."
Ndị gọvanọ Ndịda bịara ọgbakọ a bụ:
Arakunrin Oluwarotimi Akeredolu, SAN Gọvanọ Ondo Steeti
Victor Okezie Ikpeazu Gọvanọ, Abia Steeti
Emmanuel Udom Gọvanọ, Akwa Ibom Steeti (Osote ya bụ Moses Ekpo nọchitere anya ya)
Diri Draoye Gọvanọ, Bayelsa Steeti
Willie Obiano Gọvanọ, Anambra Steeti
Ben Ayade Gọvanọ, Cross Rivers Steeti
Ifeanyi Okowa Gọvanọ, Delta Steeti
David Umahi Gọvanọ, Ebonyi Steeti
Godwin Obaseki Gọvanọ, Edo Steeti
John Olukayode Fayemi Gọvanọ, Ekiti Steeti
Ifeanyi Ugwuanyi Gọvanọ, Enugu Steeti
Hope Uzodimma Gọvanọ, Imo Steeti (Osote ya bụ Placid Njoku nọchitere anya ya)
Babajide Sanwo-Olu Gọvanọ, Lagos Steeti
Dapo Abiodun Gọvanọ, Ogun Steeti
Isiaka Adegboyega Oyetola Gọvanọ, Osun Steeti
Oluwaseyi Abiodun Makinde Gọvanọ, Oyo Steeti
Ezenwo Nyesom Wike Gọvanọ, Rivers Steeti
Ebe foto si, Louis Amoke
Nkọwa foto, Ndị gọvanọ Ndịda Naijiria bịara ọgbakọ ha hiweere n'Asaba ụbọchị 11 nke ọnwa Mee,2021
Nkeji Coronavirus BBC Igbo
Gere akụkọ banyere Coronavirus ka ọ dị n'Afrịka taa.
Nke a bụ ọkpụrụkpụ okwu pụtara n'ọgbakọ ndị Gọvanọ ndịda anyanwụ Naịjirịa n'Asaba
Ebe foto si, CPS Enugu
Ndị Gọvanọ ndịda anyanwụ Naịjria zukọrọ n'Asaba, Delta Steeti taa bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Mee afọ 2021 were tinye ọnụ n'okwu gbasara ọdịmma, nchekwa, ndị kwe ndị ekwe gbasara ịdịnotu Naịjrịa nakwa agha gbasara Covid-19. Ihe ndị ka ha kpebiri:
1. Ha kwekọrịtara na ndị agburu dị na ndịda anwanwụ kwere na idinaotu Naịjrịa nke hibere isi na ikpe nkwumọtọ, onye biri ibe ya biri, udo na ihunanya na ofu obi.
2. Ndị Gọvanọ ahụ agbakọọla aka machie ichi ehi gagharịa na steeti niile ha na-achị maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa nke na-emetụta udọ na ịkpata akụ nke ndị mmadụ jiri biri.
Ọzọ bụ na mmụbanye mmadụ mere ka ala dị ụkọ nke butere na ala ezughịzị ihe e ji ya eme na mpaghara ahụ.
3. Ha chọrọ ka gọọmentị etiti hapụ steeti chọrọ ka ha mepee usoro dị ha mma ịkpa ụmụanụ.
4. Ha kwekọrịtara na ọdị mkpa na gọọmentị etiti ga-egosi mmasị, ngwa ngwa, n'ịhazịgharị Naịjirịa n'ụdị ga-enye steeti dị iche iche ikike ịhiwe ndị uweojii nke ha, kegharịa usoro e ji eke akụnaụba Naịjirịa nke ga-egosi nke Bekee kpọrọ "true Federalism".
Ha kwuru na ọ dị mkpa gọopmentị etiti ihebe ọgbakọ ebe a ga-anọ kpaa mkpa ọdịmma na ịdịnaotu nke Naịjirịa ngwa ngwa.
6.Ha na-akpoku gọomentị etiti ka ha ịge ntị na mkpu ndị mmadụ na-eti maka oke ruru ndị mpaghara dị iche iche maka ọkwa wenitara isi dịka ọkwa onyeisi ndị agha na nke ndị isi uweojii. Ka ha were ọsọ were iji kegharịa ha
7. Ndị Gọvanọ ahụ kpebiri ijikọọ ọnụ na ịdị n'ọtụ nke Naịjirịa. N'ihi ya, odeakwụkwọ ndị steeti niile dị na ndịda anyanwụ ga-ezuko wepụta atụmatụ ha ga-eji hiwe usoro mmekọrịta na-etiti steeti ndị a maka mmepe akụnaụba ha.
8. Ha kpebiri na gọọmentị etiti kwesiri ịmepe odoụgbọmmiri na steeti ndị ọzọ nke ga-enyeaka ka kpachịkpachị na-adị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa, Legọs benata, mekwa ka ọrụ bụrụ gbanyụụ na steeti ndị a.
9. Ha dọrọ aka na ntị maka ihe ikpochi akụnaụba ọzọ maka egwu coronavirus nwereike ibute ma kwukwa ka gọọmentị etiti na nke steeti tikọo isi ọnụ wepụta atụmatụ ga-abara ọha.
10. Ndị gọvanọ ahụ dọrọ aka na ntị maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa ma kpokuo Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ pụta gwa ụmụ Naịjirịa okwu maka ya maka ịme ha ntụkwasị obi ha na gọomentị ya gbagote.