Ihe Buhari gara ime na mba Paris

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga njem abalị anọ na mba Paris ịsonye n'ọgbakọ African Summit nke onyeisial;a mba France bụ Emmanuel Macron hibere.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa and Chris Sanctus Okereke

  1. Buhari amapụtala amụma nchekwa ọhụrụ maka Ọwụwa Anyanwụ, Naijia-Delta

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari amapụtala atụmatụ nchekwa ọhụhụra maka Ọwụwa anyanwụ na Ndịda Ndịda.

    Nke a pụtara ihe dịka Buhari na ndị isi ọrụ nchekwa zukọrọ n'obi gọọmenti n' Abuja taa bụ Tuzde.

    Mana onyeisi ndị uweojii Naijria onyte gbara ndị ntaakụkọ ama ka ha mechara nzukọ, ekwughị ụdị atụmatụ ọ bụ.

    Onyeisiala Buhari na ndị ịsi Agha Naijiria

    Ebe foto si, @BashirAhmaad

  2. Iwu 'Shoot-at sight' Buhari nyere ndịagha ga-ebute mkpochapụ agbụrụ- Ohaneze

    Okpu nwagọrọ

    Ohanaeze Ndigbo akatọọla atụmatụ onye-a-hụrụ- si -gbagbuo nke Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ndiagha maka ndị ntorobia na-eti mgbu ekweghị n'Ọwụwa Anyanwụ Naijria.

    Otu ahụ jikọrọ ndị Igbo na-ekwu na ọ bụrụ na ya bụ atụmatụ gaa n'ihu na ọ ga-ebute "mkpochapụ agbụrụ".

    Otu ahụ kwuru na mwuju ndịagha wujuru ala Igbo na-egosi na ya bụ kepukepu ha nwetara bụ eziokwu dịka ha rụtụrụ aka na-ekpotara ndị Ugwu mee ha isi Ogige ndịagha dịga n'Ọwụwa Anyanwụ.

    N'ozi otu ahụ wepụtara nke odeakwụkwọ otu ahụ bụ Alex Ogbonna binyere aha, Onyeisi Ohaneze bụ Ọkammụta George Obiozor, dụrụ gọọmentị Naijiria ọdụ ka ha jiri ihe mere oge ochie mụta akọ ma hapụ iji ndịagha na aka ike megide agbụrụ onye, kama ha gbasoo ụzọ udo na idinotu were dozie obodo.

    " Etu e si esitezi ndị Agha ndị Ugwu n'Ọwụwa-Anyanwụ gosiri na eziokwu dị na kepukepu ahụ bụ eziokwu. TNdịagha Naijiria zigara ndị Ugwu na-ekpope ụka Alakụba dịka ndị isi Ogige ndịaha dị na Anambara, Imo, Abia, Akwa Ibom, Enugu, Benue, Edo, Delta na Rivas steeti.

    “N' Anambara, Onyeisi 302 Artillery Regiment, Onitsha bụ Col. Abdulsalam Sambo, Onye Ugwu na-ekpe Alakụba; n'Imo, Onyeisi 34 Brigade dị n' Obinze bụ Brig-Gen. Ibrahim Tukura, onye Ugwu; n' Abia, Onyeisi 14 Brigade dị n' Ohafia, bụ Brig-Gen M. Ibrahim, onye Ugwur; ebe Akwa Ibom, Onyeisi 2 Brigade dị n' Uyo, bụ Brig-Gen. Faruk Mijinyawa, onye Ugwu kwa. Ihe nke a bụ ihe na-akpalite ịtụ uche."

    Cheta n'ụlọakụkọ Saharareporter wepụ

  3. Ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa 17 na-enwe ọgbakọ ugbua na Delta Steetị

    Ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa

    Ebe foto si, Amoke Louis Onyebuchi

    Nke na-eme ugbua bụ na ndị gọvanọ niile si na mpaghara Ndịda Naịjirịa na-enwe ọgbakọ ugbua n'obichị gọvanọ Delta Steetị.

    A mabeghi ihe bụ isiokwu ọgbakọ ha dị ọ bụ ọgbakọ ime ụlọ a na-ekweghi ndị ntaakụkọ bata.

    Ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa

    Ebe foto si, Amoke Louis Onyebuchi

    Nzukọ a gụnyere ndị gọvanọ si Ọwụwa Anyanwụ, Ndịda Anyanwụ nakwa Ndịda Naịjirịa.

    Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị nke Enugwu Steetị, Willie Obiano nke Anambra, Gọvanọ Jide Sanwolu nke Legọs, gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta na ndị ọzọ.

    Ndị gọvanọ zuteburu n'ịntanetị n'izuụka gara aga mgbe gọvanọ Ondo Steetị bụ Oluwarotimi Akeredolu, gọvanọ David Umahi na gọvanọ Ifeanyi Okowa kpọkọbara ha.

    Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ sị gịnị mere ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa anaghị enwe ọgbakọ ebe ndị ogbo ha nke Ugwu Naịjirịa na-eme nke ha kwa mgbe kwa mgbe.

    E nwere ndị gọvanọPDP itoolu, APC asaa, na otu APGA n'ime steetị iri na asaa mejupụtara Ndịda Naịjirịa.

  4. Ogbugbu mmadụ akarịala n'Owuwa Anyanwụ- Ndị Bishọp ụka Katọlik na mpaghara ahụ

    Ndị nnukwu ụkọchukwu  Katọlik n'Owụwa-Anyanwụ

    Ebe foto si, Archbishop Valerian Okeke

    Ndị nnukwu ụkọchukwu ụka Katọlik n'Ọwụwa Anyanwụ etiela mkpụ maka oke ogbugbu mmadụ na-eme ugbua na mpaghara ahụ.

    N’ozi ndị nnukwu ụkọchukwu ahụ wepụtara ka ha mechara ọgbakọ ntụmadị na nsonso a, ha kpọrọ oku ka gọọmentị etiti jichie ndị ji egbe egbu ndị mmadụ aghara aghara n' Ọwụwa Anyanwụ .

    N’ozi ahụ nke Bishop Anthony Obinna nke Owere Diayọsis kwupụtara n' aha ndị otu ya, ha boro gọọmenti etiti ebubo ịna-elefu anya ebe a na-egbu ụfọdụ ma were aka ike jide ndị ọzọ bụ ndị n'azọ onwe ha n'aka ndị na-egbusịsị ha.

    “Kama ilebanye anya n’akwa ndị mmadụ na-ebe, ha were aka ike na-achụgharị ndị na-ebe akwa maka mgbusi a na-egbusi ha.”

    N’otu aka ahụ, Bishọpụ Valerian Okeke katọrọ gọọmentị maka "ile anya n’ihu n’inye ikpenkwụmọtọ".

    “Gọọmentị napụrụ ndị mpaghara ụfọdụ ngwaọgụ ha ji echekwa onwe ha, ma hapụrụ ndị ọchiehi na ndị ekperima ji egbe egbusisi ndị mmadụ nke ha.”

    Ndị ụkọchukwu ahụ kwuru na ha na atụ anya na gọọmenti ga-eweta na njedebe mkpamkpa na-akpa n’ugbo ndị mmadụ n’Ọwụwa anyanwụ, ma rịọ ndị Ọwụwa-Anyanwụ ka ha mata na “ndụ niile dị nsọ.”

    Ndị nnukwu ụkọchukwu  Katọlik n' Owụwa-Anyanwụ

    Ebe foto si, Valerian Okeke

  5. Wenezde na Tọzde bụ ụbọchị ezumike - Gọọmentị etiti Naịjiria

    Gọọmentị etiti Naịjiria amapụtala ụbọchị Wenezde na Tọzde nke izu a maka ụbọchị ezumike.

    Nke a na-abịa dịka ndị ụka Alakụba na-eme emume Sallah ụbọchị ahụ maka iji mechie oge ebumọnụ ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Ụdịrị covid-19 na-enye India nsogbu ugbua kwesịrị inye mbaụwa nchekasị - WHO

    Ọgwụ mgbochi covid-19

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba ahụike mbaụwa bụ WHO n'ịchafụ ekwuola na ụdịrị ọrịa covid-19 na-akpa mkpamkpa na mba India bụ ụdịrị kwesịrị inye ụwa nchekasị.

    Nchọpụta izizi e mere na-egosi na ụdịrị ọrịa covid-19 ahụ a kpọrọ B.1.617 na-amụba ma na-efesa ọsịsọ karịa ụdịrị ndị ọzọ.

  7. Ejirila egbe gbagbuo ụmụakwụkwọ asatọ n'ụlọakwụkwọ a

    Ụlọakwụkwọ ebe ihe ahụ mere na Kazan

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe ruru mmadụ itoolu gụnyere ụmụakwụkwọ asatọ anwụọla na mba Rọshịa dịka otu onye ji egbe gbagburu ha.

    Onye ọzọ nwụrụ na ya bụ ọdachi bụ onye nkuzi.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ mmadụ abụọ malitere ịgba egbe ahụ dịka a nwụchiri otu onye n'ime ndị ahụ.

    Ndị uweojii na ndị ọrụ gbatagbata nọ na mpụta ụlọakwụkwọ ahụ ebe otu ihe onyonyo gosiri ebe ụmụakwụkwọ si n'ụlọ elu ahụ awụda.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Lee mmachi ndị gọọmentị Naịjiria tinyere ọzọ n'ihi Covid-19

    Nnyocha covid-19

    Ebe foto si, Getty Images

    Site n'ụbọchị taa bụ Tuzde, ụbọchị 11 nke ọnwa Mee, gọọmentị etiti Naịjiria etighachịla mmachi n'ihi Covid-19 na mpaghara Naịjiria niile.

    Gọọmentị tinyere mmachi n'ihe karịrị mmadụ 50 ịgbakọ n'otu ebe, a gaghị ekwe onye ọbụla na-eyighi mkpuchi imi ịbata n'ụlọọrụ gọọmentị ọbụla.

    N'otu aka ahụ, ime nzukọ nakwa njem gọọmentị ga-abụzị naanị n'elu ịntanetị.

    Gọọmentị kwukwara ka ụlọmmanya nakwa ebe ndị a na-agba oringo ka nọrọ na mmechi e mechiburu ha.

    Ha kwukwara na mmachi ngagharị e tinyere site n'elekere 12 ruo elekere anọ nke isi ụtụtụ ka ga-anọ ruo n'ọdịniihu.

    Dkt Mukhtar Mohammed bụ otu onye n'ime ndị gọomentị họpụtara maka idu ndị mmadụ n'ihe gbasara mgbochi ọrịa a, nke a kpọrọ Presidential Steering Committee (PSC), kwuputere nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'abalị Mọnde.

    Mohammed kwuru na ọ bụ naanị njem mba ofesi dị mkpa ka ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ na-eme, ma kwuo na ndị na-eme njem ga-esoriri usoro gọọmentị tinyere.

    N'aka nke ọzọ, Boss Mustapha bụ odeakwụkwọ gọomentị etiti, kwuru na ndị si njem mba ofesi lọta si n'ebe nnọsapụ e tinyere ha gbapụ ọsọ maọbụ na-edebeghi iwu gọọmentị tinyere, ga-anatarịrị ntaramahụhụ.

    O kwuru na otu ha natara ozi na ụfọdụ ndị si njem bata Naịjiria nso nso a gbapụrụ ọsọ ebe e tinyere ha.

  9. Etu ndị omekome si wakpoo ụlọ onye enyemaka Buhari

    Ibrahim Gambari

    Ebe foto si, afp

    Nkọwa foto, Ibrahim Gambari bụ onye nchịkọta ndị ọrụ Buhari bị n'akụkụ bee onyeisiala

    Ụlọọrụ onyeisiala ekwetela na ndị ohi nwara ike ha ibanye wakpoo ụlọ onye enyemaka onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Ibrahim Gambari.

    Ụlọ Gambari diketere ụlọ onyeisiala Buhari ebe e nwere ezigbo nchekwa.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ onyeisiala bụ Garba Shehu depụtara n’akara twitter ya na ọ bụ Gambari gwara ha na ndị omekome ahụ biara ịwakpo bee ya n’elekere atọ nke ụtụtụ Mọnde ma na ha emenwughị ya.

    O kwukwara na ndị ohi nwakwara ibanye bee Maikano Adbullahi dịketere n’ụlọ onyesiala mana ndị uweojii ka na-achọ ndị mere ihe a na tọsde gara aga.

    Nke a mere ka ndị ntaakụkọ ime obodo Naịjirịa na-ekwu na enweghị ezi nchekwa agafeela ogo na-echekasị mmadụ ugbua.

  10. Ị bọọla chi?

    I meela wee biakwute anyị taa.

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị dị mkpa ị ga-achọ ịkọ taa niile

    Nnọọ.

  11. Edinson Cavani agbatịkwuola oge ya n'otu Manchester United

    Edinson Cavani

    Ebe foto si, cavaniofficial21

    Edinson Cavani etinyela aka n'akwụkwọ gbatịkwuru oge ya na Manchester United ruo ọnwa Juun afọ 2022.

    Nwafọ Uregia a dị afọ iri atọ na anọ enweela oge dị mma na Manchester n'afọ a dịka o nyere goolu asatọ n'asọmpi asaa ọ gbarala.

    Cavani kwuru "Enweela m oke ịhụnanya n'ebe otu a nọ na ihe niile gbasara ya.

    "Ana m ahụta oke ihe njikọ n'ebe mụ na ndị otu m nakwa ndị ọrụ niile."

    Cavani bụ onye amaghị maọbụ ya nọkwuo afọ ọzọ sị "Ha na-akpalite mmụọ m n'ụbọchị niile, amaara m na anyị gbakọta aka ọnụ anyị ga-eme ọtụtụ ihe."

    Kamgbe ọ batara na Manchester United n'afọ 2020, Cavani enyela goolu iri na ise n'asọmpi niile ọ gbarala.

  12. Nkeji Coronavirus nke BBC Igbo

    Gere akụkọ banyere Coronavirus ka ọ dị n'Afrịka taa.

  13. Ọ bụghị eziokwu na anyị chọrọ ịwakpo Legọs - Nnamdị Kanu

    Hakeem Odumosu

    Onyeisi otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdị Kanu ekwuola na ọ bụghị eziokwe na ndị otu ya nwere atụmatụ ịwakpo Legọs.

    Kanụ sị na okwu ahụ onyeisi ndị uweojii na Legọs steeti bụ Hakeem Odumosu kwuru bụ atụmatụ ọ chọrọ iji tinye nsogbu n'etiti ndị Biafra na ndị Oduduwa.

    Cheta na Maazị Odumosu kwuru na ndị otu ya tachiri otu anya ha ji enyo ndị agha nnupuisi ndị Oodua Republic na nke ndị otu Ipob.

    Ọ sị na ndị otu a sị na ha ga-akusuriri ndị mmadụ na Legọs steeti mgbe adịghị anya.

    Kọmishọna ahụ kwuru nke a n'ọgbakọ ọnọdụ nchekwa nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Babjide Sanwo-Olu nọ n'isi ya.

    Odumosu sị " ndị ọrụ anyị adịla njikere maka kepukepu na mmaji ndị agha mnwereonwe nke oodua Republic na nke ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) na-kwado nakwa ikpo ndị mmadụ n'ọkpa mgbe ha adịgh ị njikere.

    Ha sị na ha ahụtala otu mnwereonwe dị iri abụọ na anọ (24) so akwado ya bụ nkusu.

    Ọ sị na ha ji anya dinta ji enyo anụ n'ọhịa were enyo otu Ipob.

    Odumosu sị na ndị otu ya adịlarịị njikere ibuso ndị otu a agha n'ụzọ ọbụla maka ịgbambọ kposaa ajọ atụmatụ ha.

    Ọ sị " anyị ji ohere a arụọ ọha na Eze ka ha tinye anya na mmiri maka ịgbara ha ama ihe ọbụla dị aṅaa ha hụrụ n'ogbe ha".

    O jikwa otu aka ahụ arịọ Gọvanọ steeti ahụ ka o do do do do mara ihe ha ga-eme maka ndị na-anya ọkada na steeti ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. BBC Nkeji nke mgbede

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  15. Ụgbọmmiri ekpuola ma mmiri rie mmadụ 28 na Niger Steeti

    Ụgbọmmiri bu ndị mmadụ ruru otu narị kpuru na mmiri mgbe ndị a si n'odoahịa dị n'obodo Zumba nke Niger Steeti na-alọta.

    Ndị ọrụ gbata gbata sị na agụpụtara ozu mmadụ iri abụọ na asatọ ebe mmadụ iri isii na ise ka a zọpụtara na ndụ.

    Ndị nke a metụtara karịchara ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka.

    Ihe mberede a mere na mgbede ụbọchị Satọde n'ime ime obodo a mana akụkọ banyere ya ka na-apụta apụta.

    Onyeisi ngalaba gbatagbata na Naịjirịa gwara BBC na e liela ozu ndị ahụ agụpụtara na mmiri, zọpụta mmadụ karịrị iri isii ebe a kana-achọ ndị ọzọ achọ.

    Ihe mberede ụgbọmmiri na-emekaarị na Naịjirịa, ihe na-ebutekaarị ya bụ ibu oke ibu, mgbochi okporo mmiri nakwa ebili mmiri n'oge udummiri.

    Ọzọ bụkwa e lezighi ụgbọmmiri ndị a nke ọma.

  16. Rịvas Steeti etinyela mmachi ngagharị bido 7 nke ehihe ruo 6 nke ụtụtụ

    Nyesom Wike

    Ebe foto si, Nyesom Wike

    Aka na-achị Rịvas Steeti bụ Nyesom Wike emegharịara usoro mmachị ngagharị o tinyere na steeti ahụ.

    Ọ bụbu site elekere iri nke abalị ruo ruo elekere isii nke ụtụtu ka o tinyeburu ya, mana ugbua, ọ bụ site elekere asaa nke ehihe ruo elekere isii nke ụtụtụ ka ọ ga-akwụrụ.

    Nke a na-abịa dịka ndị omekome na-awakpọgharị ndị ọrụ nchekwa aghara aghara na steeti ahụ.

    N'ụbọchị 7 nke ọnwa Maị bu Fraịde ndi omekome a gburu ndị uweojii asaa na mwakpo atọ ha mere na steeti ahụ.

    Nke bu mere na mpaghara Rumuji, ebe ha wakporo ụlọ ọrụ ndị uweojii n'obodo ahụ, ebe ndi uweojii nọ nchekwa na Choba nakwa ulo ọrụ ndị uweojii na Elimgbu.

    Gọvanọ Wike n'ozi ọ gbasara ndị steeti ahụ sị na ha chọpụtara na ndị omekome a na-akwado ka ndị ọrụ nchekwa were na-akpa ike ha.

    Ọ bụ ka emechara mwakpo n'okpuru ọchịchị Ikwere nakwa Abua/Odual.

  17. Ụmụafọ Palestine na ndị uweojii Isreal na-ebuso onwe ha ọgụ na Jerusalem

    Ndị na-agba ọsọ ndụ ha

    Ebe foto si, Reuters

    Ọgbaghara na-ada ugbua n'etiti ụmụafọ Palestine na ndị uweojii Isreal n'ihu ụlọụka alakụba Al-Aqsa dị na Jerusalem na nkwado njem ndị Jew.

    E merụrụ mmadụ karịrị narị atọ ahụ dịka ndị mmadụ na-ama ndị uweojii okwute ebe ndị uweojii na-agba ndị a mgbọ egbe 'rubber'.

    Nke a na-abịa dịka egwu na-eri elu n'obodo, nke butere ọgbaghara n'ọtụtụ izuụka.

    Na mbụ, ndị uweojii Isreal machiri ndị Jew ịga n'ụlọ alakụba n'oge emume ncheta ụbọchị Jerusalem

    Nke a bụ emume e ji echeta mgbe Isreal kpachiri Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem - Ọtụtụ mmadụ na-efe ọkọlọtọ mba Isrea ebe ndị ntoroọbia ga-agafe n'ogbe ndị alakụba site na Damascus, na-abụ abụ.

    Ọtụtụ ndị Palestine na-ahụta ya dịka ịkpasu ha iwe nakwa mkparị. Njem nke afọ a na-abịa na ngwụcha obu u ọnụ ndị okpukperechi alakụba.

  18. Unknown Gunmen: Ndị uweojii mmadụ 13 nwụrụ Ọdịda anyanwanwụ na ngwụcha izuụka a gara aga

    Mnwakpo ụlọọrụ ndị uweojii

    Ebe foto si, b

    Ndị uweojii etufuola ndị ọrụ ha mmadụ iri na atọ n'aka ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ n'ime ngwụcha izuụka gara aga.

    Ndị uweojii a nwụru na mwakpo dị iche iche mere n'Akwa Ibom nakwa River Steeti site n'abalị asaa ruo abalị itoolụ nke ọnwa Mee, afọ 2021.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Akwa Ibom steeti bụ Odiko Macdon bụ onye kwuru nke a.

    N'Akwa Ibom, ndị oji egbe a obi pụrụ azụ wakpọrọ ụlọọrụ ndị uweojii tọgbọ chako na Mkpanak na Essien Udim n'Ikot Odon dị n'Okpuruọchịchị Abak.

    N'Ikot Odon, Odiko sị na ha mgbara ụgbọala ochie dị na-ebe ahụ, ya na ọgbatumtum ọkụ.

    Ụmụntọrọbịa ndị Mkpanak mere na ụlọọrụ ndị uweojii ahụ agbaghị ọkụ pịa pịa.

    Mana ha gburu otu onye ụweojii MOPOL 57 Ukana ebe ahụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru.

    Nke a na-eme ka ha wakpochere ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Odoro Ikpe otu abalị nke ọzọ mechere.

    N'Odoro Ikpe ndị oji egbe a amaghị ndị ha bụ gburu mmadụ ise ụbọchị Satọde abalị nke asatọ nke ọnwa Mee.

    Isi otu unwunye onye uweojii biakwutere ya lakwara ebe ahụ.

    River steeti

    Na River steeti ha wakporo ọnọdụ ndị uweojii atọ bụ ebe ha gburu mmadụ asaa.na Rumuji , Emohua, Choba, Elimgbu na Obia Akpo notu ahịrị.

    Ha merukwara ụfọdụ ndị uweojii ahụ, zuru egbe ha ma gbakwaa ụlọọrụ ha na ụgbọala ha ọkụ n'abalị asaa nke Ọnwa Mee.

    Anambra steeti

    Na steeti ahụ, n'Ozubulu dị na Okpuruọchịchi Ekwusigo, ha wekpokwara ndị uweojii n'elekere asaa abalị, ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee.

    Onụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Ikenga Tochukwu kwetere na ndị amaghị ama waporo ụlọọrụ ndị nche dị na Ozubulu.

    Ọ sị na mmadụ abụọ amataghị ndị ha bụ meruru ahụ na ya bụ mgbọ ha kwara.

    O kwukwara na ndị ajọ mmadụ ahụ nwakwara ịwakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii na Ozubulu mana ha emelighị ya.

  19. Ndị uweojii na Katsina sị na ha azọpụtala mmadụ 30 n'ime 40 ndị ntọrị tọrọla na steeti ahụ

    Uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii na Katsina steeti ekwuola na ha azọpụtala mmadụ 30 n'ime mmadụ 40 ndị ntọrị tọrọ na steeti ahụ dịka ha nọ na-eme ekpere.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Katsina bụ Gambo Isah gwara BBC na ọ bụ n'ime abalị ka mwakpo a mere n'obodo Unguwa Kwata.

    Ọ sị; "Ọ bụ n'abalị Mọnde ka ihe a mere oge ndị a bịara malite ịgbali egbe elu ma nwuchie ndị si ime ụlo ekpere gbapụta."

    Ọ sị dịka ha nwetere ozi ihe a mere, ndị ọrụ nchekwa malitere chụwa ndị omekome a ma zọpụta mmadụ 30 n'ime ndị ha ji.

    Ọ sị na ha na-eme nyocha ịmata etu ihe a siri mee.

    Ọ sịkwa na ndị niile ha zọpụtara alaala be ha, dịka onweghi onye mgbọ tụtara.

    Mana, otu n'ime ndị a ejibu sị na aka ndị uweojii adịghị n'etu ha siri pụta.

  20. Ihe ndị uweojii kwuru maka 'mgbọ egbe a hụrụ n'Ọnịcha'

    Mgbọ egbe dara n'Ọnịcha

    Ebe foto si, Others

    Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na ngalaba nnyocha ndị uweojii ga-enyocha ihe gbasara gwongworo dara n'Ọnịcha n'isi ụtụtụ Sọnde, nke ndị mmadụ kwuru na o bụ ọtụtụ mgbọ egbe.

    Ndị uweojii Anambara steeti gwara BBC na "otu gwongworo dara n'okporoụzọ Awka Road dị n'Ọnịcha".

    Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na "ndị uweojii, ndị agha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gbagara ebe ahụ mgbe anyị nụrụ ihe merenu."

    N'ozi ha ziputara, ndị uweojii ekwughi "eeh ọ bụ mgbọ dara" maọbụ "mba, ọ bụghị mgbọ dapụtara" na ya bụ gwongworo.