Otu ndị dọkịta Naịjirịa akwụsịtụla abụbụ ọrụha malitere kamgbe ụbọchị iri

Otu jịkọtara ndị dọkịta na Naịjirịa akpọrọ 'National Association of Resident Doctors' na bekee akwụsịla abụbọ ọrụ ha ha malitere kamgbe ụbọchị iri.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị bi mba England ga-anata nyocha maka covid 19 abuọ n'otu izu ụka

    Ndị ọrụ ahụike na-eme nyocha maka covid 19

    Ebe foto si, Reuters

    Onye ọbụkla nọ na mba England ga-anata nyocha maka covid 19 ugboro abụọ n’izuụka bido n’ụbọchị Fraide bụ Eprelu 9,2021.

    Ha ga-anata nyocha a n’efu dịka gọọmenti mba ahụ wepụtara atụmaatụ maka ndọtị nyocha maka covid 19.

    Minista ahụike mba ahụ kwuru na nke a bụ maka igbochi mfesa ọrịa covid 19 n'ọdịnihu.

  2. Anyị enweghị ego anyị na-enye ndị 'bandits' - Nasir El-Rufai

    Nasir El-Rufai

    Ebe foto si, Nasir El-Rufai twitter Page

    Gọvanọ Kaduna steeti bụ Kaduna State Governor, Nasir El-Rufai, na-ekwusi ike na gọọmenti enweghị ego ọbụla ha nwere ịkwụ ndị omekome akpọrọ ‘bandits’ na bekee dịka ha malitere ịwakpo steeti ya ọhụrụ a.

    O kwuru na mwakpo ọhụrụ a malitere mgbe gọọmenti kpebiri na ha na ndị omekome agaghị enwezi mkparịtaụka ọbụla maka ego.

  3. Etu kọmịshọna Emeka Obinwanne a tọrọ n'ọdachị Isuofia si nwere onwe ya

    Willie Obiano

    Ebe foto si, Governor Willie Obiano

    Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ekwuola na kọmịshọna ‘Public utilities’ bụ Emeka Ezenwanne atọrọ n’Isuofia mgbe ndị otu Chukwuma Soludo na-azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na-eme ọgbakọ na nso nso a enwerela onwe ya.

    Obiano tiri ezinụlọ ndị uweojii atọ agbagburu n’ọdachị ahụ ma kwuo na onweghị ego ọbụla a kwụrụ iji gbapụta Emeka Ezenwanne.