Ogbunigwe a hụrụ n'Afaraukwu dị ka nke si oge agha Biafra - Gọvanọ Ikpeazu

Gọọmentị Abịa steeti ekwuola na ha na-agba mbọ ịchọpụta ebe ogbunigwe a hụrụ n'ụlọakwụkwọ Union Praịmari dị n'Afaraukwu nke dị n'Okpuru Ọchịchị Umuahia Nọt si.
N'akwụkwọ mgbasaozi John Okiyi Kalu bụ Kọmishọna Mgbasaozi na Steeti ahụ binyere aka, ha sị na ha na-eche ka ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe nke Uweojii Naịjirịa a kpọrọ EOD wepụta mpụtara nnyocha ha.
Mana ọ sị na iji gbochi ọn̄dachị, gọọmentị Abia emechiela ụlọakwụkwọ ahụ na nwa mgbe nta.
Gọvanọ Abia bụ Okezie Ikpeazụ amanyela ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ chọpụta ebe ọzọ ụdịrị ihe a dị.












