Otu ndị dọkịta Naịjirịa akwụsịtụla abụbụ ọrụha malitere kamgbe ụbọchị iri
Otu jịkọtara ndị dọkịta na Naịjirịa akpọrọ 'National Association of Resident Doctors' na bekee akwụsịla abụbọ ọrụ ha ha malitere kamgbe ụbọchị iri.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ndị be anyị ndewonụ!
Ka ọ dị echi
Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.
Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa n'otu nkeji
Asup agbaala abụbụọrụ
Otu jịkọrọ ndị nkuzi ụlọakwụkwo politekni dị na Naijiria bụ ‘Academic Staff Union of Polytenic’ agbaala abụbụọrụ taa bụ Tuzde n’ihi okwu metụtara ụgwọonwa.
Onyeisi otu ahụ bụ Anderson Ezeibe onye gbara ama dịka otu ahụ na ndịisi ọrụ Gọọmentị etiti nwechara ọgbakọ kwuru na na abụbụọrụ ahụ ga aga n’ihi ma kwụkwasị na ha dị njikere ka ha na gọọmenti kpakọrịta iji bie ya bụ okwu.
Obi adịghị Asup mma n’ihe gbasaara mmejupụta atụmatụ ụgwọọnwa ọhụrụ ha, nakwa ụgwọ ọnwa nakwa mbulelu e ji ndị otu ha.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Na Akpọtụ Ugbu A, Nke mere ugbua: Ndị ji egbe agbaala ogige ndị uweojii dị n’Ehime Mbano, Imo steeti

Ebe foto si, Nigeria Police
Nkọwa foto, Foto a bụ nke na-egosi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Isiala Mbanọ bụ ebe a wakporo n'Ọnwa Maachị gara aga Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ekperima ahụ tọhapụrụ ndị e ji eji tupu ha zunye ogige ha ọkụ.
Nke a na-abịa awa ole ma ole Osote Onyeisiala Yemi Osibanjo gara njem nleta ịhụ mkpamkpa kpara ebe ndị bu egbe wakporo ụlọmkpọrọ dị n’Owere ma tọghapụ ndị nga druru 1800.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, onye kwuru sị na "a wakporo ụlọọrụ uweojii dị n'ehime Mbano, mana enweghi onye uweojii nwụrụ, enweghikwanụ ngwaọgụ na-efu, mana a gbara ụgbọala atọ ọkụ".
Ndị ji egbe agbagbuola ndị uweojji abụọ na Taraba steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Taraba ekwuola na ndị bu egbe gbagburu ndị otu ha mmadụ abụọ n’okporoụzọ dị n’obodo Dogongawa dị n'Okpuruọchịchị Takum dị na Taraba steeti n’abalị ụbọchị Monde.
Ndị hụrụ ihe mere kwuru na ndị ahụ ji egbe ji ọgbatumtum bịa gbagbuo ndị uweojii ahụ ma buru egbe ha gbalaga.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ David Misal gwara BBC Igbo n’ekwentị na ya bụ ihe mere n’ezie.
Lee ihe osote onyeisiala Yemi Osinbajo kwuru gbasara ihe mere n'Owerri
Osote onyeisiala Naịjiria bụ Yemi Osinbajo ezutela gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti n'Owerri, ebe ha nọ mepee okporoụzọ Dick Tiger.
N'otu ọgbakọ ahụ ka Osinbajo nọ kwuo maka ndị omekome wakporo ụlọmkpọrọ ma tọhapụ ihe karịrị mmadụ otu puku.
O kwuru sị na mwakpo a wakporo ụlọọrụ ndị uweojii na ụlọmkpọrọ bụ mwakpo a wakporo nchekwa na ọdịmma ọhanaeze n'ihi na ọ bụ itinye ndị mmadụ n'ihe ize ndụ.
Onyeisiala Buhari emeela Usman Alkali Baba onyeisi uweojii ọhụrụ

Ebe foto si, Nigeria police
Onyeisiala Muhammadu Buhari emeela Usman Alkali Baba onyeisi ndị uweojii Naịjiria ọhụrụ.
Alkali Baba bụbu osote onyeisi ndị uweojii tupu e nye ya ọkwa ọhụrụ a.
Ozi a si n'aka minista na-ahụ maka ndị uweojii bụ Maigari Dingyadi pụta n'Abuja taa.
Skip X post, 1Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Skip X post, 2Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ndị uweojii anwụchiela ụmụnwaanyị gba ọtọ mee 'photo shoot'

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii nọ na Dubai anwụchiela ụmụnwaanyị gbara ọtọ see foto ọha na-efegharị na soshal midia
Ha kwuru na agwa a megidere iwu mmekọrịta mmadụ na ọha.
Ihe nkiri bidoro fesawa n'ụbọchị satọde gosiri ụmụnwaanyị gba ọtọ na-ese foto n'ihu otu ụlọ elu.
Ụmụnwaanyị iri na otu sokwa na ndị anwụchiri dịka ụlọọrụ nnọchite anya Ukraine si gwa BBC.
Iwu a ha dara nwereike iritere ha ị ga mkpọrọ ruo ọnwa isii nakwa ikwụ ego dọla ruru narị itoolu na ụma.
Iwu ndị Dubai yitere nke Sharia ndị alakụba na-enwe nke gụnyere na ị gaghị akwa iko n'ụzọ na-ezighị ezi.
Ndị nkwado Buhari emeela ngagharị ekpere na UK

Ebe foto si, APC UK
Ndị na-akwado onyeisiala Muhammadu Buhari emeela ngagharị ekpere n'ihu ụlọ ebe onyeisiala nọ na London, dịka ọ gara ileta ahụike ya anya.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ụmụ Naịjirịa bi na mba UK mere ngagharịiwe na mba UK ma gwa Buhari ka ọ laghachi Naịjirịa.
Ndị a mere ngagharịiwe na-ekwu na ọnọdụ ahụike na Naịjirịa jọgburu onwe ya mana Buhari gbakụtara ya azụ ma na-aga ala bekee ịnata ọgwụgwọ.
Mana ndị na-akwado Buhari na-ekwu na ọ dịghị mma imenye onyeisiala ihere n'ihu kama ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere.

Ebe foto si, APC UK
Nkọwa foto, Ndị nkwado Buhari na-ekpere ya ekpere mgbake n'udo Ndewonu ndị be anyị
BBC Igbo na-anabata ụnụ n'ọgbakọ anyị ka anyị wetere ụnụ akụkọ na-apụ ọkụ na mba ụwa niile nakwa ala Igbo.
Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa
Onyeisiala Buhari akatọọla mwakpo 'ndị oyi egwu e mere n'Owere'

Ebe foto si, Nigerian Government
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari katọrọ mwakpo ndị uweojii na-asị bụ ndị otu Ipob wakporo isi ụlọ ọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ mkpọrọ n'owere.
Onyeisiala Buhari sị na ihe ahụ mere banyere n'atụmatụ "iyi obodo egwu".
Buhari kelere ndị ọrụ nchekwa site n'etu ha siri gbaa mbọ banyere ihe a mere site n'ịhụ na mmebi ihe sitere na mkpa mkpa akarịghị.
Ọ sịkwa ka ndị ọrụ nchekwa hazie malite ịchị ndị omekome ebe ọbụla ha nọ ma jide ha hụ na ekpere ha ikpe etu o si kwesi.
Onyeisiala Buhari sịkwa ka agbaa mbọ jide ndọ nọ na mkporo gbara ọsọ site na mwakpo a, dịka ọ sị na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị omekome tara akpụ.
Ọ sịkwa ka ọha mụrụ anya dika aka mmadụ niile dị n'ịhụ na ezigbote nchekwa dị.
Mmadụ 1,844 si n'ụlọmkpọrọ Owerri gbafuo - Ndị ọrụ ụlọmkpọrọ

Ozi si n'aka Francis Enobore bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ ụlọmkpọrọ na Naịjiria, na-akọwa na ọ bụ mmadụ 1,844 si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owerri, Imo steeti gbafuo ka a wakporo ya n'abalị Sọnde.
Enobore kwuru na ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ ji ogbunigwe gbarie ma bata ya bụ ụlọmkpọrọ.
N'ozi ahụ, o kwukwara na mmadụ 35 ekweghi eso ibe ha gbafuo.
Ozi ahụ kwukwara na John Mrabure bụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ ụlọmkpọrọ enyela iwu ka a maa imi n'ala ma nyochaa etu mkpamkpa a si mee.
Atụghapụla mmadụ ise n'ime umụakwụkwọ mahadum ọru ugbo ndị ntọrị tọrọla na Kaduna
Kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa obodo na Kaduna Steeti bụ Samuel Aruwan ekwuola na mmadu ise n'ime ụmụakwụkwọ mahadum Bekee kpọrọ "Federal College of Forestry Mechanization" apụtara n'aka ndị ojiegbe tọrọ ha.
Maazị Aruwan sị na akpọrọla ụmụakwụkwọ a gawa ụlọ ọgwụ ndi agha ebe a na-enyocha ha ahụ.
Maazị Aruwam sị na Gọọmentị Kaduna ga-ewepụta ozi banyere ụzọ ha sị agba mbọ maka okwu ụmụakwụkwọ ahụ e ji,
Gọọmentị Abịa Steeti amachiela ngagharị maka nsogbu nchekwa

Ebe foto si, Facebook/John Okiyi Kalu
Aka na-achị Abịa steeti bụ Gọvanọ Okezie Ikpeazu etinyela mmachi ngagharị n'Aba nakwa Umuahia site n'ebe elekere iri nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ.
Gọvanọ kwuru na mmachi ngagharị a bidoro taa bụ Mọnde, ụbọchị ise nke ọnwa Epreelụ gawa n'ihu, bụ ichekwa ndị steeti ya dịka ha na-anụ akụkọ gbasara nsogbu nchekwa dị iche iche.
N'ozi o si n'aka Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ John Okiyi Kalu gbasaa, Gọvanọ Ikpeazu kwuru na o nyela ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ iwu ịhụ na ndị mmadụ deberịrị iwu ngagharị ahụ.
Ka o si kwuo, naanị ndị ọrụ ha dị oke mkpa, ma nwekwara ihe ha ji akọwa onwe ha, ka ya bụ mmachi ngagharị agaghị emetụta.
O kwukwara ka ndị eze nakwa ndị nchekwa obodo a kpọrọ 'vigilante' na Bekee, gbaa mbọ hụ na ndị nọ n'okpuru ha debere iwu a.
Gọvanọ Uzodimma agaruola ụlọmkpọro Owerri
Aka na-achị Imo steeti bụ Gọvanọ Hope Uzodimma agaruola ụlọmkpọrọ dị n'Owerri bụ ebe ndị omekome wakporo ma tọhapụ ndị nọ na mkpọrọ n'abalị Sọnde.
Gọvanọ Uzodimma garukwara n'ụlọọrụ ndị uweojii, bụkwa ebe a gbara mpaghara ya ọkụ.
Gọvanọ banyere n'ụlọmkpọrọ, ebe o jiri anya ya hụ ụdịrị mkpamkpa kpara ebe ahụ.
O kwuru na enweghi onye ọbụla nwụrụ na ya bụ mwakpo, mana ọtụtụ ihe mebiri ebe ndị ahụ.
Ụzọ tọgbọ chakoo dịka ndị ọrụ nchekwa mechiri ụzọ n'Owerri
Ụzọ tọgbọ chakoo n'Owerri dịka ndị ọrụ nchekwa gbochiri ụfọdụ okporoụzọ, site n'ihe ndapụta dapụtara na mwakpome ndị omekome mere ụlọmkpọrọ na akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii.
Ụzọ gụnyere Okporoụzọ Nnamdi Azikiwe/Wetheral Road nakwa Mbari street, so na ndị e gbochiri.
Cheta na ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ wakporo ụlọmkpọrọ dị n'Okigwe Road ma tọhapụ ọtụtụ ndị a tụkpuru na nga, n'abalị Sọnde, ụbọchị anọ nke ọnwa Epreelụ.

Nkọwa foto, Okporoụzọ Nnamdi Azikiwe maọbụ Okigwe Road 
Nkọwa foto, Okporoụzọ Nnamdi Azikiwe maọbụ Okigwe Road 
Nkọwa foto, Ụzọ Mbari street 
Nkọwa foto, Ụzọ e si aga obi gọọmentị Imo steeti Etu ndị ntọ si nara ụkọchukwu nde naịra abụọ ma gbukwaa ya

Ebe foto si, Getty Images
Ukọchukwu otu ụlọụka dị na Legos aha ya bụ Frederick Aramuwa anwụọla n’aka ndị ntọ tọrọ ya mgbe ọ na-aga n’obodo ya dị n’Ondo steeti.
Onụ na-ekwuru ndị uweojii n’Ondo steeti kwuru na ha na-enyocha ọnwụ ụkọchukwu ahụ e kwuru na ndị ntọ nara nde naira abụọ ma gbukwaa ya.
