Onye omeiwu na-anọchiteanya Aba South na Aba North n'ụlọomeiwu nta bụ Ossy Prestige anwụọla dịka ndị omeiwu si kwuo.
Benjamin Kalu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọomeiwu nta gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na onye otu ha bụ Prestige anwụọla.
Kalu sị na ezinaụlọ Prestige mere ka ndị omeiwu mata na ọ nwụrụ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febụwarị, 2021 n'ụlọọgwụ dị na mba Jamịnị.
Ọ sị dị ka iwu ha si dị n'ụlọomeiwu na ha ga-eri uju ya ugbua tinyerekwara na ha ga-ekwupụta ọnwụ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tusde.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Ossy Prestige
Ossy Prestige bụ nwafọ Abia Steetị si n'obodo Agboji, Abiriba dị n'okpuruọchịchị Ohafia.
A mụrụ ya n'ụbọchị 24 ọnwa Jenụwarị afọ 1965.
Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Abia Steetị dị n'Uturu, n'ihe banyere ọchịchị na nlekọta ọha.
Ọ gụkwara akwụkwọ na Lloyds Maritime Academy nke Lọndọn nakwa mahadum Commonwealth dị na Belize, Saụt Amerịka.
Ọ bụ onye achụmntaego na ngalaba ibubata na ibupụ ngwaahịa ma bụrụkwa onye omeiwu.
Ọ malitere ọrụ dịka onye omeiwu n'afọ 2015 dịka onye nnọchiteanya mpaghara Aba South na Aba North.
Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ n'ịnọchiteanya ndị Aba nke mere ha jiri hụ ya n'anya nke ukwuu.
Ụfọdụ ihe o mere ha gụnyere, ibunye ndị mmadụ ụgbọala, ọgbatumtum keke, igwe e ji akwa akwa, igwe ọkụ latrik, ụgbọala ga-ebu ụmụaka gaa ụlọakwụkwọ n'efu dgz.
Ọ lụrụ nwunye ma mụta ụmụ ise.