Mba United Arab Emirates (UAE) amachiela njem ụgbọelu isi Naịjiria bata mba ahụ rue ngwụcha ọnwa Febụwarị iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.
Nke a na-abịa dịka ụlọ ọrụ ụgbọelu Emirates machiri njem niile si Naijiria ruo ngwụcha ọnwa Febrụwarị.
N'ehihie Tọzdee ka ụlọ ọrụ ụgbọelu Air Peace ziri ozi gbarala ndị so ha aga njem àmà ihe a mere.
Ndị ntị ha rụrụ n'ala na-akọwa na atụmatụ ime ndị Naịjirịa nyocha coronavirus ma ha tụọ ụkwụ na UAE makana mba ahụ ekwenyeghi na nnyocha a na-eme na Naịjiria so bute mmachi a.
Mba UAE na-ebo ndị Naịjirịa ebubo na ha ji asambodo na-egosi ma mmadụ e bu covid-19 nke adigboroja abata be ha.
Gọọmenti Naịjiria anabataghị ebubo a ma si na UAE ekwesịghị ịgwa ha etu ha ga-esi hasie maọbụ chekwaa ndị mba ha.
Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-aga UAE maka nleta, ọgwụgwọ ahụike nakwa iji ego chụọ ego.
A na-ele anya na atụmatụ a ga-awụnye àjà na garri mmekọ mba abụọ a.