Nzụkọ Gọọmentị na ndị otu SSANU na NASU tiri aka na tipa bu aja
Nzụko gọọmentị Naijirịa na ndị otu Senior Staff Association of Nigerian Universities (SSANU) na nke ndị Non-Academic Staff Union of Universities nwere maka abụbọ ọrụ ndị otu a na-agba amụtaghị mkpụrụ.
Nke a na-eme ya nzụko abụọ ha na Mịnịsta ọrụ bụ Chris Ngige na-enwe maka abụbọ ọrụ ha nọ n'ime ya.
Ndị ụlọ ntaakụkọ Channels kwuru na Ngige bidoro ya bụ nzụko site na ibo ha ebubo na abụbọ ọrụ ha bidoro n'ụbọchị ise nke ọnwa Febuwarị megidere iwu Naijirịa.
Otu abụọ a ekweghị n'ihe gọọmentị na-ekwu tutu gọọmentị emee ihe ha chọrọ nke ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ gụnyere :
- Ka ewepụ aha ndị ọrụ ha na atụmatụ Intergrated Personnel Payrol Information System.
- Ka a kwụọ ha ụgwọ opekete mpe eji ha.