Ihe gọọmentị Abia kwuru maka ntọrị, ịchị ehi nakwa mpụ dị iche iche
Gọọmentị Abia Steetị agbarụọla ihu ma katọọ etu ndị ọchị ehi na ehi ha si emebisi ihe ndị a kụrụ n'ugbo nakwa ịchịgharị ehi n'obodo.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi kọmishọna mgbasaozi steetị ahụ bụ John Okiyi wepụtara n'ụbọchị Mọnde.
Ọ katọkwara ohi na mpụ ndị ọchị ehi na-eme na mpaghara Abia North ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha sie imi n'ala chọpụta ndị ohi a.
Gọọmentị gara n'ihu katọọ etu ndị mmadụ a na-amabeghi ndị ha bụ si egbusi ehi, bụ ndị na-achọ ịkpalite ọgbaghara n'obodo.
Gọọmentị nyere iwu ka ndị ọrụ nchekwa gbaa mbọ hụ na udo dapụtara na mpaghara ahụ ka ndị mmadụ nwee ike biri n'udo.
Gọọment gwara ndị mmadụ ka ha gaa mkpa dịịrị ha na ha na-agba mbọ ịhụ na udo chịrị n'ogbe ahụ.