Gọvanọ Peter Obi bụ aka chịburu Anambara steeti nakwa onye zọrọ ọkwa osote onyeisiala Naịjiria ekwuola na mpụ na nrụrụaka dị na Naịjiria na-akawanye njọ.
Obi onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ụlọntaakụkọ Arise TV nwere n’ụtụtụ Tuzde, kwuru na ndị Naịjiria ekwesịghị iche ka ụlọọrụ nnyocha a kpọrọ Transparency International buru ụzọ kwuo na Naịjiria agbadaala n’ogogo mba ndị mpụ ka njọ n’ime ya, n’ihi na o zoghi ezo.
Obi kwuru sị “Anyị ekwesịghị iche ka Transparency International bịa gwa anyị maka mpụ na nrụrụaka na ụbịam dị na Naịjiria, anyị ji anya anyị ahụ ya.”
Cheta na Transparency International kwuru n’izu gara aga na Naịjiria si n’ogogo 146 daruo 149 n’ime mba 180 mpụ kacha enye nsogbu na ya.
Obi gara n’ihu kwuo na ịdọpụta ndị mmadụ n’ụbịam maọbụ nyere ndị mmadụ aka, na a ga-akawa ahụ hụ na a kwụgoduru ha ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra 30 (N30,000) gọọmentị kwere na nkwa.
O kwuru na ọ baghị uru gọọmentị ịkwụ ndị mmadụ naanị puku ise na-enweghi ebe ọ gara aga, na ebe o si ka njọ bụ ịkwụ ụgwọ a naanị ọnwa isii wee kwụsị.
A jụrụ Obi etu Naịjiria ga-esinwu nyere ụmụakwụkwọ aka n’oge mkpamkpa ọrịa ozuruụwaọnụ Covid-19 a, o kwuru sị na ọ bụ teknụzụ ga-azọpụtanwu ụmụakwụkwọ.
N’okwu ya “Ọnọdụ agụmakwụkwọ anyị jọgburu onwe ya.
Ọ taghị oke akpụ, etu ahụ ka e si akuziri ọtụtụ ndị mmadụ akwụkwọ ugbua a na mbaụwa.
Ọ bụrụ na gọọmentị nye ụmụakwụkwọ mahadum nde ise kọmputa nke Bekee kpọrọ ‘android tablet’ nke agafeghi dọla 80, nke ahụ pụtara ebe nde naịra 400 (N400m).
Anyị ga-emenwukwara ya ndị sekọndịrị nde iri. Nke a ga-enyere aka ikwalite agụmakwụkwọ nakwa mee ka ha hapụ itufucha oge.”