A machiela Andre Onan bụ oche goolu Kamerun iche bọọlụ otu afọ
Andre Onana bụ oche goolu ndị Ajax nakwa mba Kamerun agaghị eche bọọlụ otu afọ dịka a machiri ya mgbe a chọtara ọgwụ ekwesịghị n'ahụ ya n'ọnwa Ọktoba gara aga.
Onana dị afọ 24 kwuru na ọ maghị ụma ṅụọ ya bụ ọgwụ (nwere furosemide) bụ nke nwunye ya oge ahụ adịghị ya, na o che na ọ bụ ọgwụ aspirin, na mkpọ ha abụọ yiri onwe ha.
O kwuru nke a na soshal midia, ebe ọ nọ kwuo na mmachi a machiri ya karịrị ihe o mere.
"Onye ọbụla ma na m na-ebi ndụ ezi ahụike, kemgbe m malitere ime egwuregwu, anaghị m akwado ịṅụ ọgwụ ekwesịghị maọbụ ime ihe na-dịghị mma ka onye na-eme egwuregwu mee".
Ka ọ dị ugbua, Onana na Klọb ya na-akwado igakwu ụlọikpe na-ahụ maka egwuregwu, ịrịọ ka ha tụgharịa mmachi a Uefa machiri ya.
Onana cherela Kamerun bọọlụ ugboro 18 agaghị esozi ha gaa asọmpi Iko Mba Afrịka nor 2021. Kamerun bụ mba a ga-eme ya bụ asọmpi a ga-eme n'ọnwa Jenụwarị 2022.