Mmadụ 1483 ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa

Mmadụị ise ọzọ anwụọla site n'ọrịa covid-19 na Naijirịa

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo

  1. Mba Rwanda agbachiela isi obodo ha maka mfesa covid-19 nke abụọ.

    Mba Rwanda amachiela ngagharị n’isi obodo ha bụ Kigali dịka ọrịa covid-19 malitere ifesa ọzọ n’ebe ahụ. Mmachi ngagharị ga-ebido n’elekere isii nke mgbede rue elekere anọ nke ụtụtụ ebe agbachiri ụlọ okpukperechi na ụlọakwụkwọ dị icheiche.

    Ha kọwara na mmadụ niile ga-apụ apụ ga-anatarịrị ndị uweojii ikike pụrụiche maọbụ soro na ndị ọrụ dị mkpa.

    Dika gọọmentị mba ahụ si kwuo, ọrịa na-efesi ndị mmadụ ike ma na-egbukwa ọtụtụ ndị mmadụ karịa etu ha sị tụ anya mbụ.

    Ọ bụ mmadụ otu narị na iri anọ na isii ka ọrịa ahụ gburula na mba ahụ ugbua.

    Office of the PM | Rwanda

    Ebe foto si, Office of the PM | Rwanda twitter page

    Office of the PM | Rwanda

    Ebe foto si, Office of the PM | Rwanda twitter page

  2. WHO agbarụọla ihu etu ụfọdụ mba ndị ji ego si ekpokọrọ ọgwụ mgbochi coronavirus

    Onye a na-agba ọgwụ mgbochi coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ngalaba World Health Organisation ekwuola "ọ bụ agwa ọjọọ etu e si na-ekesa ọgwụ mgbochi coronavirus n'ụzọ na-abụghị nhata nha".

    Tedros Adhanom Ghebreyesus sị na ọ dịghị mma na ndị ntoroọbịa ahụ siri ike na mba ndị nwere ego na-ebu ụzọ nata ọgwụ mgbochi coronavirus karịa ndị okenye ahụ na-esighi ike nọ na mba ndị daara ogbenye.

    Ọ sị na e nyela mba ndị ji ego dị 49 ọnụọgwụ mgbochi karịrị nde iri atọ na itoolu ebe mba daara ogbenye nwe naanị ọnụọgwụ iri abụọ na ise.

    O kwuru nke a n'ọgbakọ ndịisi WHO nwere n'ụbọchị Mọnde, sị na ọ baghị uru ize ọnụ na ụwa na-aba na nsogbu banyere etu e si ekesa ọgwụ a - nke ụgwọ ya ga-ebute ọnwụ ndị mmadụ nakwa akụnaụba mba ndị na-enweghi ego.

    Ọ sị na nke a ga-ebute ka ọtụtụ ndị na-eme ọgwụ a na-akpachi ya nke ga-eme ka ọ dị ụkọ.

  3. Mmadụ 1,617 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa na Mọnde

    Chikwe Ihekweazu, onyeisi ụlọọrụ NCDC

    Ebe foto si, NCDC/Twitter

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC ekwuola na a chọpụtara ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ otu puku, narị isii na iri na asaa n'ụbọchị Mọnde.

    Mmadụ narị asaa na iri asaa na isii si Legọs ebe mmadụ iri na isii si Ebonyi Steetị.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ya ji dịrị 112,004, ndị nwụrụla dị 1,449 ebe ndị gbakerela dị 89,939.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Igbo ndị ọma anyị ekele unu

    Ọ kwa unu hiri ụra nke ọma?

    Biko bịa n'ọnyere anyị n'ụbọchị taa maka akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ.

  5. Ka chi foo

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Ka ọ dị echi.

  6. Kamala Harris awụsala ọwa dịka Sinetọ

    Kamala Harris awụsala ọwa dịka sinetọ na-anọchi anya California.

    O mere nke a dịka ọ ga-amalite ọrụ dịka osote onyeisiala mba Amerịka mgbe a ga-edu ya iyi ọrụ n'ụbọchị Wenezde, Jenụwarị 20.

    Harris nọchitere anya California afọ anọ, tupu Joe Biden ahọrọ ya dịka onye osote ya.

    Harris ga-abụ nwaanyị mbụ na-achị dịka osote onyeisiala mba Amerịka.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  8. Ndị omekome egbuola otu onye uweojii ma merụọ ndị ọzọ ahụ na Rivas Steeti

    Onye ji egbe

    Ebe foto si, STEFAN HEUNIS

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Rivas steeti bụ Omoni Nnamdi ekwuola na ndị omekome ruru mmadụ iri na asaa ji egbe wakporo ndị uweojii ma gbuo otu onye na Amangala Junction dị na Borikiri, Pọthakụt.

    O kwukwara na ndị a ji mgbọ egbe gbarie ụgbọala ndị uweojii ji arụ ọrụ ma gbata kwa ndị uweojii ọzo egbe n'ahụ.

    Omoni kwuru na edọnyela ozu onye uweojii ahụ nwụrụ n'ọba ozu ma nye iwu ka ndị uweojii pụrụ iche chọpụta ma jide ndị kpara mkpamkpa a.

  9. Ụlọakwụkwọ anaghị eso iwu covid-19 - Onyeisi NMA

    Otu ndị ọrụ ahụike Naịjiria bụ NMA n’ịchafụ akatọọla mmepe ụlọakwụkwọ na Naịjiria, ma kwuo na ọ bụ mkpebi si n’etu o si metụta onye.

    Onyeisi otu ahụ bụ Ọkammụta Innocent Ujah kwuru na e nweghi ihe mgbaama na-egosi na ụlọakwụkwọ ndị a na-eso iwu covid-19 e tinyere.

  10. Ọ ga-ara ahụ ike ọgwụ mgbochi etu o kwesịrị - WHO

    Tedros Ghebreyesus bụ onyeisi ngalaba ahụike mbaụwa bụ WHO n’ịchafụ, ekwuola na ọ ga-ara ahụ ike ọgwụ mgbochi covid-19 etu o kwesịrị.

    Ọ kọwara na ihe ruru ọgwụ mgbochi nde iri atọ na itoolu eruola ndị si na mba iri anọ na itoolu nwereego aka, ebe ọ bụ naanị mmadụ iri abụọ na ise ka e nyerela na mba ndị enweghi ego.

  11. Gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa n'otu nkeji

  12. Anwụchiela Alexei Navalny dịka ọ na-atụ ụkwụ na Russia n'ụbọchi Sụnde

    Alexei Navalny

    A tụkpuola Alexei Navalny bụ otu onye na-ama onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin aka na nga ebe ọ ga-anọ otu ọnwa.

    Cheta na ọ fọrọ ntakịrị ka Navalny nwụọ n’ọnwa Ọgọst 2020, mgbe e nyere ya oke rie ọ nwụọ na mba ya, mere ka e buga ya mba Jamini ebe a nọ gwọọ ya.

    Navalny bụ onye na-ekwu okwu megide mpụ na nrụrụịka ma bụrụ kwa onye kacha ama onyeisiala mba Russia aka.

  13. A nabatala Ozil na Fenerbahce

    A nabatala Mesut Ozil n’otu egwuregwu Fenerbahce, dịka ọ hapụrụ Arsenal ụnyaahụ.

    Cheta na ndị Mikel Arteta bụ onye nchịkọta otu Arsenal ekweghi etinye ya n’egwu kemgbe ọnwa Maachị afọ 2020.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Gọvanọ Ondo steeti enyela ndị ọchị ehi abalị asaa isi ọhịa ha pụọ

    Gọvernor Ondo state Rotimi Akeredolu Aketi

    Ebe foto si, Rotimi Akeredolu Aketi/ FACEBOOK

    Gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu enyela iwu ka ndị ọchị ehi niile nọ na steeti ahụ si n'ime ọhịa nọ na steeti ahụ pụọ.

    Ọ bụ na Facebook ya ka ọ depụtara nke a were sị na ọtụtụ arụ na-eme na steeti ahụ bụ ndị omekome na-eme ka ha abụ ndị ọchi ehi na-eme ya.

    O kọwara na ọ bụ ọrụ ya dịka onyeisi nchekwa na steeti ahụ ị hụ na echekwara ndụ na akụnaụba ndị steeti ahụ.

    Ọ gụpụtara iwu anọ nke ga-adị ire dịka abali asaa gachara :

    • Ka ndị ọchị ehi niile nọ oke ọhịa nke steeti kewapụrụ iche si ebe ahụ pụọ site taa bụ ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021.
    • Akagbuola ichi ehi na abali n'ihi na ọ bụ oge a ka e ji emebi ọrụ ubi mmadụ
    • Agaghị achị ehi n'okporo ụzọ maọbụ n'ime obodo
    • A ga-akwụsị iji ụmụaka achị ehi.
  15. Ndị gọvanọ ga-enwe ọgbakọ maka nlọghachị coronavirus nke ugboro abụọ

    Ndị gọvanọ Naịjirịa

    Ebe foto si, Nigerian Governors Forum/Facebook

    Otu jikọtara ndị Gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ga ga-enwe ọgbakọ n'ụbọchị Wenesde iji kpaa nkata ụzọ a ga-esi merie coronavirus nke ugboro abụọ a.

    N'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Abdulrazaque Bello-Barkindo wepụtara, ha sị na ọ na-agba ha n'uche ikike coronavirus na-akpa na nke ugboro abụọ a nakwa ịgba ọgwụ mgbochi nke chọrọ ịmalite na Naịjirịa.

    Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a gbagotara elu nke ukwuu n'izu ole gara aga nke mere ndị buterela ya ji karịa otu puku narị.

    Ọgbakọ a ga-abụ nke mbụ ha ga-eme n'ime afọ 2021, bụ ebe ha ga-akpa ihe ndị ọzọ dịka etu e si eke ego nakwa iwu a kpọrọ "water resources bill"

  16. Ndụmọdụ ndị ọrụ ahụike nyere maka mmepe ụlọakwụkwọ

    Ụmụakwụkwọ

    Otu jikọtara ndị ọrụ ahụike adọọla gọọmentị etiti nakwa nke steetị aka na ntị ka agbahapụla ndụmọdụ ndị ọrụ ahụike nyere banyere ọrịa coronavirus.

    Onyeisi otu a bụ ọkammụta Innocent Ujah kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ Punch okwu n'ekwentị banyere mmepe ụlọakwụkwọ n'ụbọchị Mọnde.

    Ọ sị na ha agaghị asị gọọmentị emepela ụlọakwụkwọ kama ha ga-agba mbọ hụ na e rubereisi na ntuziaka niile e nyere banyere mgbochi ọrịa a.

    Ujah sị na ọ bụrụ na ụlọakwụkwọ ga-emepe, na gọọmentị kwesịrị ike nkwụcha ma dị njikere. Ọ sị na ha amaghị oge coronavirus a ga-anọ ruo maka ị sị ka ụlọakwụkwọ ghara imepe.

  17. A chọpụtala ọrịa coronavirus ọgbara ọhụrụ na Gana

    Nana Akufo Addo

    Ebe foto si, NANA AKUFO ADDO

    Ndị nyocha sayensị na mba Gana achọpụtala ụdị coronavirus ọgbara ọhụrụ site na nyocha ha mere.

    Onyeisiala mba ha bụ Akufo-Addo sị na a chọpụtara ọrịa a n'ahụ otu onye batara n'ọdọụgbọelu.

    "Nyocha ọhụrụ ndị ọrụ sayensị mere gosiri na ha hụrụ coronavirus ọgbara ọhụrụ a n'ahụ onye si njem bata n'ọdọụgbọelu".

    Ndị ọrụ ahụike mba Gana edopula onye ahụ iche ma bido ịchọpụta ndị niile ha na ya nwere mmekọ makana na ụfọdụ ha gara agbamakwụkwọ, ịkwa ozu, ịgba oringo nakwa ọgbakọ ndị ọzọ.

    Ndị buterela ọrịa coronavirus na Gana ugbua dị 1,924, n'ime ndị a mmadụ 352 anwụọla ebe mmadụ 33 nọ n'ụlọọgwụ.

  18. Mmadụ 1,444 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa na Sọnde

    Mmadụ iri na ise ọhụrụ anwụọla site n’ọrịa coronavirus na Naịjirịa n’ụbọchị ụka.

    Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ nke ngalaba NCDC wepụtara gosiri na mmadụ otu puku na narị anọ na iri ise na anọ bụ ndị bụtekwara ọrịa ahụ n’ụbọchị ụka.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. E gbuola ndị uweojii anọ ma tọọrọ otu n'ime ha na Kano Steetị

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị omekome wakporo ndị uweojii gbuo mmadụ anọ n’ime ha ma tọrọ otu onye mgbe ha na-eme njem n’ụzọ Birnin-Gwari gawara Funta nke Kano Steetị.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Sunday Mba wepụtara n’ụbọchị ụka sị na ndị ọrụ ha a wakporo dị mmadụ iri na isii n’ụbọchị Fraịde 15 Jenụwarị, 2012.

    Ndị uweojii a bụ ndị ngalaba a kpọrọ Puff Adder e zigaara Niger Steetị iji buso mpụ dị iche iche agha.

    Dịka ha si ọrụ na Niger Steetị na-alọta ka ndị omekome karịrị otu narị wakporo ndị uweojii a.

    Mba gakwara n’ihu kwuo na ndị uweojii gburu ọtụtụ ndị omekome ahụ mgbe ha na-akwarịta mgbọ n’okporoụzọ ahụ.

    Ozi a ndị uweojii wepụtara bụ iji katọọ akụkọ pụtara na mbụ nke sị na a tọọrọ ndị ọrụ ha mmadụ iri na asatọ.

  20. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Anyị na-asị ka izu ọhụrụ a maara unu mma.

    Biko gbalịa sonyere anyị n'ụbọchị niile nke izu a maka akụkọ gbapụtara ihe.