Mmadụ 1483 ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa
Mmadụị ise ọzọ anwụọla site n'ọrịa covid-19 na Naijirịa
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Jessica Nwankwo
Gọvanọ Ebonyi steeti amachiela ụlọ oringo niile
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi amachiela ụlọ oringo niile nakwa ọgbakọ ọha niile na steeti ahụ maka igbochi ọrịa coronavirus.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na ụlọụka niile ga na-eme nzukọ naanị awa abụọ tupu ha agbasaa ụbọchị ụka ọbụla n’ihi otu ihe ahụ.
Umahi mere ka ndị mmadụ mata nke a dịka ọ na-ebido usoro ihe gbasara mfesagharị ọrịa covid-19 nke ugboro abụọ ga-esi aga na steeti ahụ.
O kwukwara na ha na-atụ anya ịmalite na-arụpụta 'oxygen' na steeti ahụ, iji belatatu ego eji ebuso ọrịa coronavirus agha na steeti ahụ.
Umahi kwuru na gọọmentị na-anwa ike ha ịhụ na ha welitere aka n'ime nnyocha maka ya bụ ọrịa ozuruụwaọnụ na steeti ahụ.
"O teela m ma maka nwa m na-eso nwoke ibe ya mana..." - Doyin Okupe

Ebe foto si, Doyin Okupe Facebook
Doyin Okupe bụbụ onye enyemaka pụrụiche n'ihe gbasara mgbasaozi nye Onyeisiala Olusegun Obasanjo nakwa onye enyemaka pụrụiche n'ihe gbasara ọha nye Onyeisiala Goodluck Jonathan, etinyela ọnụ n'ihe gbasara nwa ya nwoke kwuru na ọ na-edina ụmụnwoke.
Okupe kwuru na ọ naghị akwado nwoke idina nwoke ibe ya n'ihi na ọ bụ onye na-ekwusa oziọma nakwa onye ofufe Kraịst.
Ọ gara n'ihu kwuo "Foto a nọ ebe a bụ nke Mobolurin Okupe. Ọ bụ nwa m. Ọ bụ m gụrụ ya aha ya bụ MOBA OLUWA RIN, (MỤ NA CHI SO AGA) n'ihi na a mụrụ m ya oge m nyefere ndụ m n'aka Kraịst."

Ebe foto si, BOLU OKUPE- INSTAGRAM
"O teela m ma maka ụdịrị agwa a ọ na-akpa.
"Ọ ma na m bụ onye ofufe Kraịst (onye na-ezisa oziọma), anaghị m akwado nwoke idina nwoke ibe ya n'ihi na ọ dabaghị n'okwukwe m dịka onye na-eso Kraịst."
Nke a na-abịa dịka nwa ya nwoke bụ Bolu Okupe tinyere foto ebe o ji ọkọlọtọ ndị na-edina nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha na-eji egosi onwe ha, wee dee sị "Eh! Ihe ụmụnwoke ibe m na-amasị m."
Bolu bụ onye ịkpụ ụzụ na-amasị, na-egosiputa onwe ya dịka onye na-eso ụmụnwoke ibe ya n'elu soshal midia ya.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Tanka bu mmanụ gaasị agbaala ọkụ na Nkwo Nnewi

Ebe foto si, Nigeria Police
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na otu tanka bu gaasị agbaala ọkụ na Nkwo Nnewi dịka a na-agbapụta mmanụ gaasị dị n'ime ya.
Ihe onyonyo gosiri ebe ndị mmadụ na-agbalị ịkwụsị ya bụ ọkụ mana ndị uweojii kwuru na o nweghi onye nwụrụ na ya bụ ọdachi.
Skip X post, 1Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed gwara BBC n'ekwentị na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ nakwa ndị nọ nso ebe ihe mere emenyụọla ọkụ ahụ gbara.
"Ọ bụ mgbe ndị na-achọ ịgbapụta mmanụ gaasị ahụ gbanyere igwe ọkụ latrik 'generator' ka ebe ahụ jiri nwuru ọkụ" ka o kwuru.
Mohammed kwuru "ụlọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala nakwa otu ụlọahịa dị ya nso bụ ihe ndị gbara ọkụ".
Skip X post, 2Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Naanị 'restructure' agahị egbo nsogbu anyị - Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Facebook
Okwu banyere nghazigharị obodo bụ ‘Restructuring’ ka ọtụtụ ndị isi okpokpo na Naịjirịa kpụ n’ọnụ ugbua.
Nke a na-abịa dịka e mere ọgbakọ i8th Daily Trust Dialogue n’ụbọchị Tọsde nke isiokwu ya bụ
‘Restructuring in Nigeria: Why? How? When?’
Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa n'ọgbakọ ahụ kwuru na ọ bụghị naanị nghazigharị Naịjirịa ga-eme ka Naịjirịa dị mma kama na ndị mmadụ ga-ebu ụzọ hazigharịa ndụ ha.
Ọ sị na nsogbu ndị dị n’ọchịchị etiti Naịjirịa ugbua dị kwa n’ime ọchịchị steetị dị iche iche na Naịjirịa.

Ndị ọzọ tinyere ọnụ n'okwu nhazigharị obodo gụnyere; Nnia Nwodo, Ayo Adebanjo, Attahiru Jega na ndị ọzọ.
Nnia nwodobụ onyeisi Ohanaeze Ndigbo pụrụ apụ, onyeisi Afenifere bụAyo Adebanjona onyeisi Arewa Consultative Forum bụAudu Ogbehsị na e kwesịrị ịghazigharị Naịjirịa ngwa ngwa iji mee ka ọ rụọ ọrụ ọzọ.
Nwodo dị na e kwesịrị itinye anya n’ihe banyere ọrụ ugbo maka na mmanụ agbịdị na-alazi ala na Naịjirịa.
N’okwu nke ya,Attahiru Jegabụbu onyeisi ụlọọrụ Inec sị na ihe mere ndị mmadụ ji akpọ oku maka ‘restructuring’ bụ na ọchịchị adịghị mma.
Ọ sị na a ga-agbalị mee ka ọchịchị dị mma maka na ikposa ọchịchị dị ugbua na mpaghara dị iche iche adịghị mfe omume.
Na nzaghachị okwu niile a, ụlọọrụ onyeisiala Muhammdu Buhari sị na ọ bụ ndị omeiwu ka ọ dị n’aka ịhazigharị obodo.
Garba Shehubụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Buhari na mgbasaozi kwuru na ndị na-akpọ oku maka ‘restructuring’ mee ka ndị omeiwu maara ụdị nke ha chọrọ.
Ebonyi steeti ga-ebido ịrụpụta 'oxygen' iji dịrị nkwadobe maka covid-19
Ebe akụkọ a si - Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Ebe foto si, David Umahi
Gọọmentị Ebonyi steeti ekwuola na ha ga-ebido nrụpụta ikuku 'oxygen' iji dị nkwadobe maka ịlụsọ ọrịa covid-19 agha
Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi kọwara dịka ọrịa ahụ na-akawanye njọ na, ịnwe 'oxygen' ahụ bụ ihe dị mkpa.
"Ọ bụ n'ebe a na-akpọ College of Medicine nke a ka na-arụrụ arụ ka a ga-ehibe ya bụ ụlọọrụ" ka o kwuru.
O kwukwara na ụlọọgwụ ahụ ga-enwe ihe ndị ọzọ dịka ebe ọgwụgwọ ọrịa akụrụ, ụlọọgwụ nkuzi nakwa ihe ndị ọzọ.
"Gọọemtị etiti mapụtara ijeri atọ na ụma abụọ iji rụpụtakwa ụlọ ọgwụgwọ ọrịa akpụ n'ebe ahụ kwa" ka o kwuru.
"Ọ bụ ka ọ dịrị anyị mfe kama ịgbagharịwa bụ ihe mere eji achọ ịrụpụta ikuku 'oxygen' nke aka anyị" bụ ihe ọzọ o kwuru.
Mgbe BBC Igbo jụrụ ya mgbe ụlọọgwụ ahụ ga-adị njikere ịnabata ndị mmadụ, ọ zara si na nke a ga-abịa na mmezu n'oge adịghị anya.
Achọtala ọrịa coronavirus ọhụrụ na mba anọ ọzọ n'Afrịka

Ebe foto si, ncdc/twitter
Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa niile bụ WHO ekwuola na achọtala ụdịrị coronavirus ọhụrụ nke achọpụtaburu na mba Saụt Afrịka na mba anọ ọzọ.
Mba ndị ahụ gụnyere Botswana, Zambia, Gambia nakwa Kenya dịka onyeisi ngalaba ahụ n'Adrịka bụ Matshido Moeti si kwuo.
"Ọ dịka ọ bụ nke ọhụrụ ahụ achọpụtara na Saụt Afrịka na-efegharị na mba dị icheiche mana amabeghị kpọm kwem" ka ọ kọwara.
O kwukwara na a na-enyocha ụdịrị ọhụrụ ahụ iji maata etu a ga-esi kwụsị ya mfesa.
Mmadụ 1964 ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naịjirịa
Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus arịala elu kachasị kemgbe ebidoro ngụkọ ndị bu ọrịa ahụ na Naịjirịa.
Ụlọọrụ NCDC wepụtara ya bụ ngụkọ gosikwara na mmadụ asatọ nwụrụ n'ime otu ụbọchị site n'ọrịa ahụ.
Cheta na gọọmentị etiti Naịjirịa mapụtara ego ruru ijeri isii na ụma iji rụọ ụlọ nrụpụta ikuku oxygen maka ndị na-arịa ọrịa ahụ.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Burnley echiela Liverpool e cheta e bewe nke mbụ n'Anfield

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Burnley bu ọgụ baata n'ụlọ Liverpool, gbaa ha ọtọ ma tikwa ha ihe n'ihu nne ha.
He mere nke a site n'iji otu ọkpụ goolu e nyere na penariti merie ha n'asọmpi Premier League ha gbara na Tọsde.
N'agbanyeghi na Liverpool kpara ike dịka dike ha bụ mana Burnley siri ọnwụ ma foro ntụtụ taa na Liverpool agaghị emeri ha.
Ọkara nke mbụ gachara mana o nweghi ndị nyere ibe ha goolu, ọ bụ zi n'ọkara nke abụọ n'ihe dịka nkeji 83' ka Ashley Barnes nke Burnley nyere goolu penariti, mgbe Allison Becker gbaturu otu onye Burnley n'ọgbọ 18'.

Ebe foto si, Getty Images
Liverpoola malitere na-akwa ndị Burnley mgbọ iji saa goolu ahụ mana otu abụghị ezi ruo mgbe ogbu pịpịrọ gbuchiri bọọlụ.
Ọ bụ ihe mgbawa obi nye Liverpool mala mmeri a bụ mbụ a na-emeri ha n'ụlọ ha n'ime asọmpi iri isii na asatọ (68) ha gbarala.
Ugbua Liverpool nọ n'ogogo anọ na tebụlụ Premier League, ebe Manchester United ji akara isii akarị ha dịka ndị mbụ.
Igbo ndị ọma anyị ekele ooo
Obi dị anyị ụtọ ịnabata unu n'ụbọchị taa, buru oche gị bịa ka anyị tụpenye gi azụ taa.
Gọọmentị Naijirịa ewepụtala nde Naira 6.45 maka ịmepụta ikuku oxygen

Ebe foto si, Femi Adesina
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị enyela iwu ka ewepụta nde Naira isii na ụma anọ iji rụpụta ebe a na-emepụta ikuku Oxygen na ebe iri atọ na asatọ na Naijirịa maka ọrịa covid-19.
Ọ bụ na nzuko National Economic Forum nke osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo bụ onye nchịkọta ya ka nke a pụtara ihe.
N'otu aka ahụ ka ekewapụta kwara narị nde abụọ na nde iri ise na ise iji ruzie ọdọ ikuku oxygen dị n'ụloọgwụ ise.
"Anyị achọghị ka ọrịa Covid-19 gbuo onye Ebonyi steeti ọzọ" - Dave Umahi

Ebe foto si, Ebonyi State Government
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola na enweghị onye Ebonyi steeti ọzọ ọrịa covid-19 ga-egbu.
Nke a na-eme dịka Ebonyi steeti na-akwado ibido imepụta ikuku ume bụ Oxygen n'okwu bekee.
Steeti a atụkwala ọgwụ mgbochi otu puku narị maka steeti ha.
Ọ bụ na nzụkọ Umahi na ndị otu pati ya nwere ka o kwuru ihe ndị a.
O kwuru sị. " Dịka ọnwa Jenuwarị na-agwụ, anyị na-atụanya na ọgwu mgbochi covid-19 otu puku narị ga-abata Ebonyi steeti maka ndị ọrụ ahụike".
Umahi kwuru na ọgwụ mgbochi a nde iri anọ ga-erute kwa ha aka n'ọnwa Machị.
Ụlọikpe atọhapụla nwata nwoke dị afọ 13 ụlọikpe Sharia tụrụ nga afọ 10

Ụlọikpe mkpesa atọhapụla nwata nwoke dị afọ iri na atọ onye ụlọikpe Sharia dị na Kano steeti tụrụ nga afọ iri maka ikwu okwu megide Chukwu mgbe ya na enyi ya na-arịrụta ụka.
Ụloikpe a kwuru na ya bụ nwatakịri bụ obere nwa nke nke mere na ọdaghị iwu mgbe o kwuru ya bụ ihe n'afọ 2020.
Ihe Mkpebi ụlọikpe a pụtara bụ na nga atụrụ nwata nwoke a, agaghị a dị ire ọzọ.
Ngalaba ụmụaka bụ UNICEF nke United Nations na otu nwere onwe ndị ọzụ kwuru okwu megide ikpe ụlọikpe sharia a kpere.
Mmadụ otu narị na iri abụọ nke onye ndụ ha bụ onyeisi Auschwitz Memorial wepụtara onwe ha ị ga nga afo iri kama nwatakịrị a ga-aga nga ahụ.
Amabeghi ma ndị ọchịchị Kano steeti wepụrụ ya bụ Ikpe ụlọikpe Sharia ma ha a ga-etinye akụkọ ka ekpegharịa ya bụ ikpe.
Ụlọikpe mkpesa a nyekwara iwu ka ekpegharịa ikpe otu nwoke ụlọikpe sharia kpere ikpe ọnwụ maka na egwu ọ gụrụ megidere ọnye amụma Muhammad.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ewehachila Hadiza Bala Usman dịka onyeisi NPA

Ebe foto si, Hadiza Bala Usman/Twitter
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buharị etihachila Hadiza Bala Usman dịka onyeisi ụlọọrụ Nigerian Ports Authority.
N'otu aka ahụ ka Buhari wehachikwara ndị isi ụlọọrụ na abụghị ndị ọrụ nke Nigerian Ports Authority nke mere na onyeisi ha ugbua bụ Emmanuel Olajide Adesoye, ebe ya na Ekenyem Nwafor-Orizu, Akinwunmi Ricketts, Ghazali Mijinyawa, Mustapha Amin Dutse na Abdulwahab Adesina ga-eso rụọ ya bụ ọrụ.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gere akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji
Nyesom Wike ejirila 500m tie ndị Sokoto steeti aka n'obi maka ahịa gbara ọkụ
Aka na-achị Rivas steeti bụ gọvanọ nyesom Wike amapụta nde naira narị ise ọ ga-eji kwado gọọmentị Sokoto steeti ebe ahịa ukwu ha gbara ọkụ.
O kwukwara na ụfọdụ ego ahụ ga-abaa n’aka ndị na-azụ ahịa ihe funarịrị n’ọkụ ahụ.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ekpewela ụmụakwụkwọ abụọ ikpe maka ịmetọ ibe ha n'ụzọ mmekọahụ
A kpụpụla ụmụakwụkọ abụọ dị naanị afọ iri na atọ ụlọikpe maka mmetọ nwata akwụkwọ ibe ha n’ụzọ mmekọ ahụ n’obodo Uyo.
A kpụpụkwara mmadụ ise n’ime ndị ọrụ ụlọakwụkwọ Deeper Life High School maka mmegbu otu nwata ahụ nke ha gọrọ kpam kpam.
Cristiano Ronaldo abụrụla onye kachasị nye goolu kemgbe ebidoro egwuregwu bọọlụ
Odogwu na bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo etiwaala slate ọzọ dịka ọ bụzị onye kachasị nye goolu kemgbe e bidoro ngụkọ n’egwuregwu ahụ.
Dịka ọ dị ugbua, goolu niile o nyere kwụzị na narị asaa na iri isii.
O mere nke a mgbe otu ya bụ Juventus na Napoli zutere onwe ha n'asọmpị Italian Super Cup.
Skip Instagram postHapụ Instagram ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Covid-19 egbuola mmadụ iri atọ na atọ kemgbe mbido izu a
Dịka coronavirus ka na-akawanye njọ, ọ pụtala ihe na ọrịa ahụ mefuru ndụ mmadụ iri atọ na atọ n'ime naanị abalị atọ.
Ọnụọgụgụ nke ngalaba NCDC wepụtara n'ụbọchị Monde gosiri na ọ bụ mmadụ 1435 nwụrụla mana nke ha wepụtara gosiri na ndị nwụrụ eruola 1478.
Ndị butekwara ya bụ ọrịa n'ime ụbọchị Wenzde bụ otu puku na narị atọ na iri asatọ na isii dịka Legọs ka bụ ebe ọrịa ahụ kacha efe efe.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndewo nụ n'ụtụtụ a!
Anyị ji n'aka na unu rahụrụ ọfụma!
Soro nụ anyị taa maka akụkọ ndị dị mkpa n'ogbe gị nakwa n'ụwa niile!
Ka ụbọchị a rubere gị isi.

