Mmadụ 1483 ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa

Mmadụị ise ọzọ anwụọla site n'ọrịa covid-19 na Naijirịa

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo

  1. Adị m njikere ka mụ na Joe Biden rụkọọ ọrụ - Buhari

    Buhari na Biden

    Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Twitter

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ezigarala onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden na osote ya bụ Kamala Harris ozi ekele dịka e duru ha n'iyi ọrụ.

    Ọ bụ site n'akwụkwọ ozi Garba Shehu bụ onye enyemaka pụrucihe nke onyeisiala Buhari na mgbasaozi depụtara.

    Buhari sị na ebumnobi ya bụ na ọchịchị ya na nke Biden ga-agbakọ aka 'nyụọ mmamịrị ọnụ ka ọ gbọọ ọfụfụ', na ọ dị njikere maka nke ahụ.

    O kwurukwara na ọ na-atụ anya na ọchịchị Biden nyekwara mba Afrịka aka n'ụzọ dị iche iche.

    N'okwu ya "anyị nwere olileanya na ọchịchị Biden ga-ebulite mmekọ Amerika na Naijirịa ma nye ohere ka anyị na ha rụọ ọru iji luso otu oyi egwu ọgụ, kwụsi mgbanwe ihu eluigwe, luso ụbịam ọgụ ma zụọ ahịa ga-abara mba anyị uru".

    O kwukwara na ọ bụ ihe mpako nyere ndị Naijirịa na osote Biden bụ Kamala Harris si na agbụru Afrịka nakwa Ashia.

  2. Nkeji BBC Igbo, Gere akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji

  3. Ụlọọrụ onyeisiala akatọọla iwu Gọvanọ Akeredolu nyere ndị ọchịehi

    Onyeisiala Buhari

    Ebe foto si, Garba Shehu/Facebook

    Ụlọọrụ onyeisiala Naịjirịa akatọọla iwu gọvanọ Ondo Steetị bụ Rotimi Akeredolu nyere ndị ọchịehi ka ha si n’ọhịa ha pụọ n’otu izuụka.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi Garba Shehu bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Onyeisiala Buhari na mgbasa ozi wepụtara.

    Ọ sị na gọvanọ Akeredolu dịka ọkaiwu ekwesighi ịkpa agwa ga-emegideiwu Naịjirịa.

    Cheta na Gọvanọ nyere ndị ọchịehi iwu a n'ụbọchị Mọnde maka ntọrị na ohi na-eme na mpaghara Ondo Steeti.

    Mana otu jikọtara ndị ọchịehi na steetị ahụ ekwuola na aka ha adịghị na mwakpo ndị ahụ na aka ha dị ọcha.

    N'ihi nke ahụ na o nweghi ebe ha ji azụ aga.

  4. Nkeji BBC Igbo

    Gere akụkọ banyere ihe ndị mere n'ụwa n'ime otu nkeji.

  5. Le ka e si-ere na mgbuka ụgbọala 88 Lagos steeti nwụchịrị

    A na-ere ụgbọala na mgbuka

    Gọọmenti Legọs steeti ekwuola na ha ga-ere ụgbọala iri asatọ na asatọ ndị nwe ya gbaghapụrụ makana ha dara iwu ịkwọ ụgbọala.

    A na-eme ya bụ orire mgbuka n'Ikeja, Legọs n'ụbọchị ta a bụ Wednesde dịka onyeisi ngalaba 'Lagos State Taskforce on Environmental Sanitation and Special Offences' Adebayo Taofiq si kwu.

    Ụlọọrụ taskforce kwuru na ha anatala ụloikpe ikike ire ụgbọala ndị a na mgbuka.

    Iwu ọhụrụ gbasara ịkwọ ụgbọala na Legọs kwuru ọkwọ ụgbọala enwetere n'agba "one way" ga-ebunye steeti ụgbọala ya maọbụ gaa ụlọ mkpọrọ maka iwu ahụ ọ dara.

    Nke a ga-eme ya ugboro abuọ gọọmenti Legọs na-ere ụgbọala ndị ha nwụchịrị dara iwu. Na Novemba 2020, ha rere ụịgbọala ruru iri anọ na anọ.

    Mgbe e mere nke mbụ, ndị mmadụ biara ka ha gọghachị ụgbọala ha anwụchịrị emenwughị a makana ndị ọzọ biakwara ebe ahụ ka ha kwelite ọnụ ma goro ụgbọala ha. Nke a mere ka anya mmiri na-eru ebe niile.

    Dịka a na-eme nke taa, gọọmenti na-agwa ndị anwụchịrị ụgbọala ha na ha nwereike ịgọghachị ya mọbụrụ na onweghị onye kwekarịrị ha na ọnụ ego ụgbọala ahụ mgbe a na-ere ya na mgbuka.

  6. Mmadụ 1,301 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Tuusde

    Ngalaba na-ahụ maka igbochi ọrịa na-efe efe sị na ọ bụ mmadụ otu puku, narị atọ na otu ka a chọpụtara ọrịa coronavirus n'ahụ ha n'ụbọchị Tuusde.

    N'otu aka ahụ ọrịa a gburu mmadụ iri na ise ebe mmadụ karịrị otu puku na narị abụọ gbakere n'ime otu ụbọchị Tuusde ahụ.

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a kamgbe ọ batara Naịjirịa n'ọnwa Maachị 2020 dị 113,305.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Che! che!! che!!! Igbo mma mma nụ ooo!

    Obi dị anyị ụtọ ịnabata unu n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Bịa gere akụkọ gbapụtara ihe n'Ọwụwanyanwụ, Naịjirịa nakwa ụwa gbaa gburugburu.

  8. Leicester agwọọla Chelsea ka mpataka Nanka

    Ọkpụ goolu abụọ a saghị asa ka Leicester ji nyụọ Chelsea anya. Nwa afọ Naijiria bụ Wilfred Ndidi nyere goolu nke mbụ na nkeji isii asọmpi ahụ malitere.

    Madison wee nye goolu nke abụọ. Mmeri a mere ka Leicester gbagoro n'ọkwa nke mbụ na tebulu EPL.

    Chelsea anatala ogwugwo nso n’aka Leicester City

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Chelsea anatala ogwugwo nso n’aka Leicester City

    Ị gbalịala wee nọnyere anyị taa.

    Ka ọ dị mgbe anyị na gị ga-anọkọ echi.

    Ka chi foo!

  9. NCDC ga-ewepụta akụrụngwa Covid-19 ga-ebelata oke mpụtara nyocha

    Ngalaba na-ahụ maka nje na Naijirịa na-akwado ibido ịjị akụrụngwa nyocha maka ọrịa Covid-19 nke ga-ebelata oge mpụtara nyocha ya bụ ọrịa.

    Ha kwuru na nke a ga-enyere aka ime nyocha maka ya bụ ọrịa.

    Kama ha depụtara na akụrụngwa nyocha ọhụrụ a nke a kpọrọ Ag-RDT nwereike kwuo na onye na-ebughị ya bụ ọrịa bụ ya kama ha kwuru na ha ga-ehiwe atụmatụ ga-egbochi ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. A ga-eme ntuliaka gọvanọ Anambara steeti n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2021

    Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) amapụtala ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2021 dịka ụbọchị a ga-eme ntuliaka maka ọkwa gọvanọ n'Anambara steeti.

    N'ozi ha ziputara n'elu Twitter, ha biputakwara usoro ihe ga-esi mee tupu e mee ya bụ ntuliaka.

    Ha nyere ndị chọrọ ịzọ ọkwa ahụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ iji bido ịchụ nta vootu.

    N'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba ka Inec kwuru na ha ga-ebiputa aha ndị tozuru iso zọọ ya bụ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  11. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  12. Naịjiria arịọla African Union ọgwụ mgbochi nde 10

    Ndị ọrụ ahụike Naịjiria arịọla otu African Union ka e nyetu ha ọgwụ mgbochi covid-19 nde iri. Osagie Ehanire bụ minista ahụike Naịjiria kwuputere nke a.

    Mana o dobeghi anya ọgwụ mgbochi nke ha na-arịọ ka e nye ha.

  13. Bobi Wine ka nọkwa 'na nga' n'ụlọ ya

    Bobi Wine bụ onye so zọọ ọkwa onyeisiala mba Uganda etiela mkpu ka ọha nụrụ olu ya dịka o kwuru na ọ ka nọ na nga n’ime ụlọ ya.

    Wine kwuru na o meela ụbọchị isii ndị agha gbara ụlọ ya gburu gburu ka ọ ghara ịpụtanwu ezi, ma kwuo na ha enweghizi nri n’ụlọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Gere akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile n'otu nkeji

  15. 'E nweghị onye sị anyị pụọ Ondo steeti, enweghị kwa ebe ọbụla anyị na-aga' - Miyetti Allah

    Rotimi Akeredolu

    Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Twitter

    Onye ode akwụkwọ otu Miyetti Allah bụ Baba Othman gwara BBC na enweghị onye si ha pụọ n'Ondo steeti ma sịkwa na ndị nke ha nọ ebe ahụ anaghị akwado ị pụ.

    Ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka gọvanọ steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu kwuru ka ndị ọchị ehi sị n'ọhịaq nọ n'Ondo steeti pụọ.

    Kama Miyetti Allah na-ekwu na e nweghị mgbe gọvanọ Ondo steeti jiri gwa ha ka ha pụọ na steeti ahụ kpamkpam.

    Othman kwuru sị, "Nkata mụ na onyeisi anyị n'Ondo steeti kpara mere ka m ghọta na ihe gọvanọ steeti ahụ kwuru bụ ka ndị ọchị ehi hapụ ọhịa echekwaghị echekwa ma nọrọ ebe ndị mmadụ ga-ahụta ihe ọbụla ha na-eme".

    O kwukwara sị, "E bum n'obi gọvanọ bụ ka ndị Fulani niile nọ na steeti ahụ debanye aha ha n'akwụkwọ dịka e siri mee n'Ekiti steeti".

    Ihe butere okwu a bụ Iwu Gọvanọ Akeredolu nyere ka kwuru na ndị ọchị ehi nwere abalị asaa i site n'ọhịa ekewapụrụiche nke bụ 'Forrest Reserve' na bekee pụọ.

  16. Naịjiria ewepụtala ebe a ga-edowe ọgwụ mgbochi Covid-19

    Dịka ọrịa ozuruụwaọnụ covid-19 ka na-akpa mkpamkpa n'ụwa ugbua, ọtụtụ mba amalitela inye ndị mba ha ọgwụ mgbochi.

    BBC gara na National Strategic Cold Store, bụ ebe Naịjiria mapụtara dịka ebe a ga-etinye ọgwụ mgbochi nke a ga-agba ndị Naịjiria mgbe a ga-ebubata ya.

    Ọgwụ mgbochi nke na-abịa Naịjiria si n'aka Pfizer.

  17. Ihe mere covid 19 'Second Wave' ji ka nnukwu njọ

    Ndị na-anata 'sanitisers' n'ụgbọala

    Ebe foto si, Reuters

    Dọkịta Mcginger Ibeneme na-arụ na "infection prevention and control unit" nke Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital Nnewi akọwala ụfọdụ ihe mere ka agba nke abụọ covid-19 karía nke mbụ bịara n'afọ 2020.

    Mcginger kwuru na virus ọbụla na-agbanwe agbanwe mana ọ bụghị ya mere ka agba nke abụọ covid-19 dị njọ.

    Nke mbụ o kwuru bụ na ndị mmadụ kwụsịrị ime ha kwesiri ime dịka ikpuchi imi, ịnọsapụ anọsapụ nakwa ịkwọcha aka, nọrọ n'ụlọ maọbụrụ na ebe ahụ ị na-eje adịghị mkpa kpatara ọrịa ji ka nọdụ na-akpa ike na Naịjirịa.

    O kwukwara na ụlọọgwụ ebe a na-eleta ndị bu ọrịa a ejula nke mere na ọtụtụ mmadụ anaghị anata ọgwụgwọ zuruoke gbasara ya bụ ọrịa.

    Dọkịta Chinelo Eluba tinyekwara ọnụ n'okwu a ma na-ekwu na agba nke abụọ covid-19 a anaghị ebucha ngosi niile ọrịa ahụ ji abịa nke bụ na o nwereike ịpiatụ mmadụ n'oge nta.

    O kwuru na nke ka ewutecha ya bụ na ọtụtụ ndị mmadụ ekwetebeghị na covid-19 dị.

    Dọkịta Eluba kwuru na ndị mmadụ na-agbara ime nyocha covid-19 ọsọ maka ha enweghị nnukwu ego a na-akpọ maka atụmaatụ ahụ.

  18. Mmadụ atọ anwụọla n'ọkụ tanka gbara n'Abeokuta

    Ọkụ Tanka

    Ebe foto si, Getty Images

    E chere na ihe ruru mmadụ atọ anwụọla n’ọkụ tanka gbara n’okporoụzo Ibrahim Babangida n'Abeokuta dị n'Ogun steeti.

    Dịka ụlọntaakụkọ Channels TV si kwuo, onye nọ ebe ihe a mere kọwara na ọdachi a mere mgbe tanka bu mmanụ agbịdị enweghi ike kwụsinwuo nke mere o sọnye isi n'ebe ụgbọala ndị ọzọ nọ.

    Ihe ruru ụgbọala ise nakwa otu ọgbatumtum bụ ihe gbara ọkụ na mberede ahụ.

    Kọmịshọna ọrụ pụrụiche na steeti ahụ bụ Femi Ogunbanwo kwuru na e burula ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ ịnata ọgwụgwọ.

  19. Gọọmentị Naịjirịa ewepụtala N10bn e ji arụpụta ọgwụ mgbochi coronavirus

    Ọgwụ mgbochi coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Minista ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire sị na gọọmentị etiti amapụtala ego dị ijeri 10 iji nye aka ka a rụpụta ọgwụ mgbochi coronavirus.

    Ọ sị na ministri na-ahụ make ego mapụtara ego iji gbaa mbọ hụ na-arụpụtara ọgwụ a ọsịsọ na Naịjirịa dịka ha na-akwado ịnabata nke si ofesi.

    Ehanire sị na ha na ụfọdụ ụlọọrụ ahụike na-arụkọ ọrụ iji nyochaa ụzọ dị iche iche e nwereike iji rụpụta ọgwụ mgbochi ọrịa a.

    Ọ gakwara n'ihu sị ka ndị mmadụ ghara ịṅa ntị n'akụkọ na-ekwu na a na-ere ọgwụ mgbochi coronavirus na Naịjirịa.

    Ọ sị na ọgwụ ọbụla batara na Naịjirịa na ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ NAFDAC ga-enyocha ya tupu a malite ịgba ya ndị mmadụ.

  20. Ụmụakwụkwọ 40 ebutela coronavirus na mba Mozambique

    Ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ agụmaakwụkwọ na mba Mozambique ekwuola na ụmụakwụkwọ anọ ebutela coronavirus na mba ahụ.

    Mpụtara nyocha ahụ e mere ha pụtara n'izuụka gara aga mana onye direktọ agụmaakwụkwọ bụ Deolinda Cossa kwupụtara ya n'ụbọchị Mọnde.

    N'ime ụmụakwụkwọ 40 ahụ, 23 n'ime ha bụ ndị ka si ezumike ha lara n'ụlọ ha n'oge ekeresimes wee lọta.

    E dopula ha iche n'ụlọ ndopu iche dị n'ụlọakwụkwọ ha.

    Gọvanọ Steetị Maputo bụ Julio Parruque agwaala ụlọakwụkwọ ka ha kee nkwụcha idobe iwu niile e nyere gbasara ahụike.

    Parruque sị na nke a gụnyere ikpuchi imi, ịnọsapụ anọsapụ nakwa iji mmiri asa aka.

    Cheta na gọọmentị Naịjirịa adịla mbụ mepee ụlọakwụkwọ ha n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị na-agbanyeghi coronavirus na-arị elu ugbua.